Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ

Akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ọnwa Febuwarị afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Onyeisiala Tinubu ahọpụtala Onyeisi ụlọọrụ Immigration ọhụrụ

    Kemi Nanna Nandap

    Ebe foto si, NTA

    Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala Kemi Nanna Nandap ka ọ rụọ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ Nigeria Immigration Service (NIS) malite n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2024.

    Nandep ga-ewere ọchịchị n’aka Caroline Wura-Ola Adepoju bụ onye oge ọrụ ya ga-akụrụ ọnụ n’ụbọchị 29 Febụwarị 2024.

    Tupu a họpụta Nandep n’ọrụ a, o ji bu ọkwa dịka osote onyeisi ụlọọrụ a ngalaba na-ahazi ọpụpụ na mbata ndị mmadụ.

    Onyeisiala Tibubu kwenyere na onyeisi ulọọrụ Immigration ọhụrụ a ga-agba mbọ ịhụ na atụmatụ banyere nwulite Naịjirịa ga-eme ọfụma.

  2. Ihe mere EFCC jiri wakpoo 'Bureau d’Change' dị n’Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ

    Ọsọ gbara n'ọdụ mgbanwe ego 'Bureau d’Change' n’Enugwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọsọ gbara n'ọdụ mgbanwe ego 'Bureau d’Change' n’Enugwu

    Ndị ụlọọrụ EFCC bụ 'Economic and Financial Crime Commission' na CBN bụ 'Central Bank of Nigeria' wakporo ọdụ mgbanwe ego dọla na ego ndị ọzọ dị n’Owerri Rd Asata Enugwu taa.

    Ha bịakwasara ha na mberede nke butere 'oke na ngwere n'ọsọ' na gburugburu ahịa ego ahụ.

    Ndịagha ji ụgbọala ha mechie ụzọ si ụlọụka St ‘Brigid Catholic’ abata owerri Rd nakwa nke si ụzọ stadium na ABC abata Owerri Rd.

    Dịka nchọpụta gosiri, na ọ bụ ndị ọrụ EFCC nakwa CBN bịara nyocha i chọpụta etụ e si ere dọla, pound, Euro na ego ndị ọzọ ma ijidekwa ndị n’ezogasi dọla.

    Ha nọrọ ebe ahụ ihe karịrị awa anọ tupu ha akpụrụ ụfọdụ ndị ha nwuchiri pụọ.

    Ọsọ gbara n'ọdụ mgbanwe ego 'Bureau d’Change' n’Enugwu
    Nkọwa foto, Ọsọ gbara n'ọdụ mgbanwe ego 'Bureau d’Change' n’Enugwu

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC bụ Dele Oyiwale gwara BBC na ha emechighị ‘Beareau d Change’ na ọ bụ ndị adịgboroja ji aha Bureau d Change’ arụ-ọrụ ka e mechiri ụlọọrụ ha.

    Dịka osiri kwu ‘’O nwere ngalaba pụruiche anyị hiwere na-ahụ maka nyocha na mkpocha ndị adigboroja ji aha ‘Bureau d’ change’ arụ-ọrụ na Naịjrịa niile’

    Ọ bụghị nanị Enugwu steeti, anyị na-eme ya na Naịjirịa niile, ebumnobi anyị bụ ị hụ na ihe niile gbasara mgbanwe ego na Naịjirịa na-aga etu kwesiri’ ka ọ kọwara.

    Ihe mere EFCC jiri wakpoo 'Bureau d’Change' dị n’Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ

    Ebe foto si, EFCC

    Nkọwa foto, Ihe mere EFCC jiri wakpoo 'Bureau d’Change' dị n’Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ

    Cheta na ego dola arịala ruo ukwuọjị, otu dola nọ na #1,600 nke mere ọnọ ego ihe niile jiri rỊGO na Naịjirịa.

    Gọọmentị kwuru na ha na agba mbọ ihụ na ego dola dara mana etu osi gbata kwuru, ọkabeghị nwe ihe gbanwere.

    Oyiwale kwuru na ndị na-azụ ahia dọla adigboloja so na nsogbu Naira nwere, ya mere ha ji ebuso ha agha, iji hụ na nsogbu a kwusịrị

  3. Ndị uweojii ekwuola ihe mere ha jiri nwuchie Onyeisioche Labour Party

    Abure nwere ebubo ndị nọ n'isi ya

    Ebe foto si, Abure/Getty Images

    Ndị uweojii ekwuola ihe mere ha jiri nwuchie Onyeisioche Labour Party bụ Julius Abure na Benin, Isiobodo Edo Steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ngalaba ndị uweojii Zone 5 bụ Tijani Momoh gwara ndị ntaakụkọ na ha nwuchiri Abure maka ebubo dị iche iche.

    Ebubo ndị a gụnyere, atụmatụ igbu mmadụ, ịkpa nkata imerụ mmadụ ahụ na ihe ndị ọzọ.

    Momoh kwuru na o nwere onye degara akwụkwọ mkpesa ndị a n’isiụlọọrụ ha dị n’Abuja megide Abure na mmadụ anọ ndị ọzọ.

    O kwuru na e nwere ihe onyonyo ndị gosiri mgbe e tiri onye ahụ ihe n’afọ gara aga n’Edo Steeti.

    Momoh gbakwụnyere na a hụrụ egbe na mgbọ n’aka Abure na nyocha na-aga n’ihu banyere ebubo ndị ahụ e boro ya.

    Ọ gara n’ihu gọọ na o nweghi mgbe ndị uweojii Abure ha kama na ọ bụ ụfọdụ ndị chọro igbochi ka ndị uweojii inwuchi ya.

    Mana odeakwụkwọ Labour Party bụ Obiora Ifoh kwuru na ọ bụ eziokwu na a nwụchiri onyeisi ha nakwa onyeisioche ha nke Edo Steeti bụ Kelly Ogbaloi.

    O kwuru na ọ bụ n’ihi mkpesa otu onye pati ha a chụrụ achụ na-akwado Lamidi Apapa dere ma sị na nwuchi ahụ bụ iji mebiere ha ntuliaka imeụlọ ha chọrọ ime.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. A nwụchiela Julius Abure bụ onyeisi Labour Party

    Onyeisi Labour Party na Naịjirịa bụ Julius Abure

    Ndị uweojii anwụchiela onyeisi otu Labour Party na Naịjirịa bụ Julius Abure n’obodo Benin nke Edo Steeti.

    A nwụchiri Abure n’ehihie ụbọchị Wenezde dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ngalaba Zone 5 bụ Tijani Momoh kwuru na nke a bụ eziokwu.

    Mana Momoh ekwughi n’uju ihe mere e jiri nwuchie Abure.

    Cheta na Abure bụ onyeisi Labour Party na onye ndekọ ego ha a chụrụ achụ bụ Oluchi Opara nwere esemokwu.

    Opara boro Abure ebubo nrụrụaka ego nakwa iri ego pati ha nwetere n’oge ntuliaka afọ 2023.

    Mana Abure na Labour Party agọọla na ebubo ndị ahụ bụ asị ọcha.

    Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala ekwubuola na ndị ngụkọ ego si ebe ọzọ ga-eleba anya n’akwụkwọ ego pati ahụ iji maara ebe mmiri si banye n’ime ụgbọghọrọ.

  5. DSS adọọla otu NLC aka na ntị maka ngagharịiwe ha chọrọ ime.

    Ndị ọrụ nchekwa DSS na NLC

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) arịọla otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ka ha kagbuo atụmatụ ịgba abụbụọrụ ha chọrọ ịgba maka udo na nchekwa obodo.

    Cheta na NLC kwuru n’ụbọchị Fraịde na ha ga-eme ngagharịiwe ụbọchị abụọ maka ihe isiike dị na Naịjirịa nakwa ọnọdụ nchekwa dị njọ.

    Mana ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya wepụtara kwuru ka ha jiri mkparịtaụka soro ihe niile ma ghara iji ngagharịiwe.

    O kwuru na gọọmentị na-agba mbọ ịhụ na ha gboro nsogbu ndị cheere Naịjirịa n’ihu, na e kwesịrị inye ha ohere ime nke a.

    “Anyị anatala ozi na ụfọdụ ndị ọrụ chọrọ ime ngagharịiwe n’ụbọchị 27 na 28 Febụwarị 2023 maka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa,” ka o kwuru.

    “O doro ụlọọrụ anyị anya na nke a bụ ikike dịịrị ndị ọrụ ime ngagharịiwe, mana anyị na-arịọ ka ndị mịnye mma ha n’ọbọ ma were mkparịtaụka soro okwu a maka udo nakwa nchekwa obodo.”

  6. Davido amapụtala 300m ịnye ụlọ ndị enweghi nne na nna na Naịjirịa

    David Adeleke

    Ebe foto si, @Davido/Instagram

    Otiegwu a ma ama bụ David Adeleke maọbụ Davido kwuputara n'ụbọchị Tuusde na ọ ga-eweputa nde naira narị atọ maka ụlọ ndị enweghi nne na nna na mpaghara Naịjirịa.

    O kwuputara nke a n'akara X bụbu Twitter ya ma kwuo na "atụmatụ nkesa na nhazi ga-apụta echi".

    Nke a abụghị mbụ Davido na-eme ụdịrị ihe a banyere ndị enweghi nne na nna.

    N'afọ 2021, ọ nara ndị enyi ya niile otu nde naira kwa mmadụ iji gbapụta ụgbọala ya mana o mechara tinye ego n'elu ya ma nye ya bụ ego pụtara nde naira narị abụo na ọkara dịka onyinye n'ụlọ ndị enweghi nne na nna.

    Ọ mechara malitekwa ụlọọrụ onyinye nke ya akpọrọ David Adeleke n'afọ 2022.

  7. Ụlọọrụ Custom ga-amalite ikesa ngwa nri ha kpachiri akpachi

    Osikapa ndị ụlọọrụ Custom kpachiri akpachi

    Ebe foto si, Nigeria Custom Service

    Ụlọọrụna-ahụ maka mbubata ngwa ahịa na Naịjirịa bụ Nigeria Custom Service (NCS) ekwuola na ha ga-amalite ikesa ngwa nri ndị ha kpachiri akpachi maka nsogbu ụkọ nri dị na Naịjirịa ugbua.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụAbdullahi Maiwada kwuru na ha a ga-amalite ikesa nri ndị a ma ọ bụrụ e meechaa nyocha ma chọpụta na nri ndị a dị mma oriri.

    N’okwu ha wepụtara n’ụbọchị Tuzde o kwuru na nke a bụ iji belata ihe isiike cheere ndị Naịjirịa n’ihu ma mee ka ha nwete nri n’ụlọ ha.

    “Ụlọọrụ Custom na-eme nke a iji nyere ndị Naịjirịa aka n’oge ụkọ nri na ihe isiike a. Ndị ọrụ na-ahụ maka nri ga-eme nyocha ma chọpụta na ha ka dị mma iri tupu anyị amalite ikesa ya.”

    O kwuru na atụmatụ a bụ site na nkwenye onyeisi ha bụ Bashir Adewale Adeniyi nwere n’atụmatụ ikpochapụ agụụ na Naịjirịa nke Onyeisiala Bola Tinubu.

  8. A kwụsịtụrụ akara obaozi 'X' nwụnye Alexei Nalvalnaya nwụrụanwụ

    A kwụsịtụrụ akara X nwụnye Alexei Nalvalny nwụrụ-anwụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, A kwụsịtụrụ akara X nwụnye Alexei Nalvalny nwụrụ-anwụ

    X bụbu ‘Twitter’ akwụsịtala akaraozi nwụnye Nalvalny bụ Yulia Navalnaya ịrụ ọrụ.

    Nke a mere ka Yulia gbasachara ozi na-ekwu na ya ga-aga n’ihu ime ihe di ya kwadoro tupu ọ nwụọ, nke bụ ịlụọgụ nnwereonwe ndị Rọshịa.

    N’ụbọchị Monde, Yulia tinyere ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-ama ọkwa na-ekwu na ya agaghị akwụsị ọgụ nnwereonwe.

    Nke a mere abalị ole na ole ozi pụtara na di ya anwụọla n’ụlọmkpọrọ na Rọshịa.

    Na Tuzde, a chọpụtara na akara’ X’ Yulia akwụsịtụla ọrụ.

    Ụlọọrụ ọbaozi ‘X’ n’ozi ha, kwuru na ha amaghị ama machie akara ya.

    ‘’Ngalaba ụlọọrụ anyị na-ahụ maka ozi uya amaghị ama wee machie akara Yulia, ihe kpatara ya bụ na akara ahụ gosiri injrimara megịdere iwu X’’ Ka ha kwuru.

    ‘’Anyị eweghachila akara ya ozugbo anyị chọpụtara ihe mere, anyị’’

    Yulia tinyere ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-ama ọkwa na-ekwu na ya agaghị akwụsị ọgụ nwereonwe
    Nkọwa foto, Yulia tinyere ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-ama ọkwa na-ekwu na ya agaghị akwụsị ọgụ nwereonwe

    Yulia Navalnaya adịghị apụta n’okwu mgbe di ya dị ndụ, mana o mepere akara obaozi X n’aha ya na Monde.

    Ụbọchị ahụ ka o wepụtara ihe oyonyo gosiri ya ebe ọ na-ebo Gọọmentị Rọshịa ebubo ogbugbu di ya.

    O kwuru na ihe mere ha jiri egbu oge ibupụta ozu di ya bụ na ha na-eche ka ọgwụ ọjọọ ha jiri gbagbuo ya pụchaa ya n’ahụ.

    Mana Gọọmetị Rọshịa kwuru na ọ bụghị eziokwu, na ha na-eme nyocha pụrụiche n’ozụ ya mere ha jiri ka jide ya.

    Ọtụtụ mmadụ lelere ihe onyonyo ahụ o mere ma kesasịa ya. Ihe karịrị mmadụ 100,000 esonyela akara X ya kemgbe o ji hibe ya.

    Dịka iwu na-achị X siri dị, e nwereike ịmachị akara mmadụ ma o tinye ihe na-egosi mmegbu maọbụ na-ahụrụ na akara onye ahụ enweghị nchekwa.

  9. NARTO akwụsịla abụbọ ọrụ ha

    NARTO akwụsịla abụbọ ọrụ ha

    Ebe foto si, Getty

    Nkọwa foto, NARTO akwụsịla abụbọ ọrụ ha

    Ulọọrụ NARTO akwusịla abụbọ ọrụ ha gbara dịka ha na Gọọmetị nwere mkpebi.

    Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Heineken Lokpobiri kwuru na Gọọmentị elebanyela anya n’ihe ndị ha jiri maka ya gbaa abụbọ ọrụ.

    O kwuru na ha agaghị ekwe ka ihe dị etua mee ọzọ, na ha ga-aga n'iru na elebanyere ha anya, iji hụ na ihe niile ha chọrọ zụrụoke.

    Cheta na ndị ọkwọ ụgbọ ụgbọla mmanụ bụ NARTO gbara abụbọ ọrụ na Monde maka ego ole dịzụl na-ada. Ha kwuru na ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ekweghị ha arụ ọru ha etu kwesịrị.

  10. Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a gbaala abụbọ ọrụ

    Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a gbaala abụbọ ọrụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a gbaala abụbọ ọrụ

    Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ NARTO(Nigeria association of road transport owners) Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa agbaala abụbọ ọrụ dịka nzụkọ ha na Gọọmentị etiti dara ajambede.

    Gọmentị etiti na otu NARTO nwere nzụkọ na Monde iji lebanye anya na mkpesa otu NARTO kpesara maka ego ole ana-ere dịzụl nakwa ihe ndị ọzọ mere ha jiri kwụsị ọrụ.

    NARTO mara ọkwa na mbụ na ha ga-akwụsị ọrụ na Naịjirịa niile na Monde ma ọ bụrụ na ewetughị ego ole ana-ere dịzụl.

    Mara na ọ bụ Dịzụl ka ha na-agbanye n'ụgbọala nke ha ji ebugharị mmanụ na Naịjirịa niile.

    Dịka ego mmanụ ụgbọala na-ari, etu ahụ ka dịzụl si arị. Otu lita dịzụl nọ na # 1,250 ugbua.

    Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ ugboala bụ Heineken Lokpobiri kwuru na aga-enwe nzụkọ ọzọ taa i ji hụ na ekpeziri ihe niile, na NARTO laghachịrị n’ọru.

    O kwuru na abụbọ-ọrụ a ga-emee ka ọnọdụ Naịjirịa kawanye njọọ.

  11. Tinubu na ndị isiala Afrịka ndị ọzọ 'njenje karịrị n'ụkwụ'

    Tinubu na William Ruto

    Ebe foto si, Getty Images

    Kamgbe onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na onyeisiala Kenya bụ William Ruto banyere n'ọchịchị, a katọọla ha maka otu ihe bụ oke njem ha na-eme aga mba ofesi.

    Mmadụ abụọ ndị anatala ezigbo naktọ maka ụdị ego ha na-emefu maka njem ha na-efegharị ebe niile na mbaụwa nke na-achaghị acha maka ụdọ ọtanisi na-eme na mba ha dị icheiche.

    Otu akwụkwọ mgbasaozi na Kenya bụ, The Standard nyere Maazị Ruto aha dịka "Onyeisiala nfegharị". Akwụkwọ mgbasaozi ahụ kwuru na "ịhụnanya o nwere maka ime njem dị ike mere na o nweghi ike ịgafe ohere ọbụla" agbanyeghi etu ihe siri sie ike n'obodo ya gụnyere ọtanisi na oke ọnụ ahịa nri na Kenya.

    N'ọnwa gara aga, Maazị Tinubu gara mba ọzọ na Yurop ọzọ. Nke a mere onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati PDP bụ Atiku Abubakar jiri kwuo na Naịjirịa achọghị "onyeisiala nlegharị anya". Atiku katọrọ njem nke onyeisiala ebe o kwuru na "Naịjirịa na-egwu na mmiri nsogbu enweghi nchekwa"

    Ndị mmadụ nwereike ịhụ nke a ka ihe onye nkatọ ọbụla nwereike ikwu. Ndị isiala kwesiri ịga nzụkọ ndị isiala ibe ha ma nweta eze mmekọrịta mba ha na mba ndị ọzọ. Ọ dị ezigbo mkpa maka mmekọ mba na mba nakwa maka akụnaụba mba ebe ha nwereike ịkpa maka azụmahịa na iweta ego na mba ha.

    Mana ndị ụfọdụ na-ekwu na onyeisiala Tanzania lara mmụọ bụ John Magufuli esighi na mba Afrịka pụọ gaa mba ọzọ n'ime afọ isii ọ nọrọ n'ọchịchị.

  12. Food inflation: Ngagharịiwe adapụtala n’Ibadan

    Ngagharịiwe Ibadan

    Ndị bị n’Ibadan, isiobodo Oyo steeti awujuola n’okporoụzọ na-eme ngagharịiwe maka mgbali elu ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ n’ụtụtụ taa bụ Monde.

    Igwe mmadụ ndị jicha akwụkwọ nke e degara ihe bụ iwe ha wujuru Mokola, Ibadan.

    Ụfọdụ ozi dị n’akwụkwọ ha bụcha agagharị gụnyere sị, “Kwụsị agụụ,” “Agụụ na-egbu ụmụ ogbenye”, wdgz.

    Cheta na abalị ole na ole gara aga, e mere ngagagịiwe na steeti ụfọdụ n’Ugwu Awụsa maka oke ọnụahịa nri.

  13. Pakistan election: Onye ndọrọndọrọ ọchịchị ajụla mmeri e ji nrụrụaka nye ya

    Hafiz Naeem

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Pakistan ajụla iwere ọkwa ọchịchị e ji wuruwuru nye ya na ntuliaka mba ahụ mere na nsonso a.

    Hafiz Naeem ur Rehman nke otu pati Jamaat-e-Islami bụ onye a kpọpụtara dịka onye meriri nntuliaka maka ịnọchịte PS-129 n’obodo Karachi n'ụlọomeiwu.

    Mana n’izụụka ka Rehman kwuru na ọ bụ onye nọ n’oyu pati PTI nke Imran Khan na-akwado kacha nweta vootu, sin a e sepụrụ ihe na iher pati ahụ nwetara, ya mere na ya agaghị enwere ọkwa ahụ.

    O kwuru dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu sị, "Ọ bụrụ na o nwere onye chọrọ ka anyị merịe n’ụzọ akwụghị ọtọ, anyị agaghị anabata.”

  14. A họpụtala Dennis Idahosa dịka onye ga-eji aha APC zọọ ọkwa gọvanọ Edo Steeti

    Idahosa Dennis bụ onye omeiwu

    Ebe foto si, Idahosa Dennis

    Dennis Idahosa bụ onye omeiwu nta emeriela dịka onye ga-eji ọkọlọtọ All Progressive Congress azọ ọkwa gọvanọ Edo Steeti .

    Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodimma rụrụ ọrụ dịka onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ntuliaka ime ụlọ APC n’Edo kpọpụtara Idahosa na ntuliaka ha mere na Satọde.

    O kwuru na Idahosa ji vootu 40,000 merie ndị ya na ha so zọọ ọkwa ahụ na ntuliaka a ga-eme n’ọnwa Sepụtemba 2024.

    Na nnabata mmeri ya, Idahosa kwuru na obi dị ya ụtọ maka nkwadọ ndị pati ha n’Edo Steeti nyere ya ma rịọ ka ndị o meriri mịnye mma ha n’ọbọ ma gbakọta aka na ntuliaka na-abịa abịa.

    Akụkọ kwuru na e nwere ọgbaghara n’oge ntuliaka ahụ dịka ndị ekperima bịara tisaa ebe a ga-anọ gụkọọ vootu.

    Mana gọvanọ Uzodimma kwuru na nke ahụ abụghi nnukwu ihe na ọ bụ nghọtahie banyere ebe e kwesịrị ịnọ kpọpụta vootu.

    O kwuru na ebe ha nọ gụpụta vootu ahụ bụ ebe e kwesịrị ịnọ.

  15. Ọrịa 'Lassa Fever' malitere ọhụrụ a egbuola mmadụ 10 n’Ebonyi Steeti

    Lassa Fever

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọrịa Lassa Fever nke malitere ọhụrụ a egbuola mmadụ iri ebe ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise ndị ọzọ bu ya ugbua n’Ebonyi Steeti.

    Okpuruọchịchị ndị o metụtara gụnyere, Onicha, Ikwo, Ezza North, Ebonyi, Izzi, Ohaukwu na Abakaliki ebe a kpọro ‘Hausa quarters na Nkaliki bụ ebe ndị ọkachasị metụta.

    Onye ọrụ ministry ahụike na steeti ahụ bụ Orogwu Samson kwuru na ọrịa a metụtara ndị nọ n’ogogo afọ niile, gụnyere ụmụaka, okenye, nwoke ma nwaanyị, mana o kwuru na ọ bụ ụmụnwoke ndị nwere iri na isii ebe ụmụnwaanyị dị itoolu.

    O kwuru na ndị nwụrụ anwụ gụnyere otu nwaanyị dị ime, ụmụaka abụọ, ndị nne nakwa ụmụnwoke.

    Ọ gara n’ihu kwuo na na ọnụọgụgụ a bụ malite n’ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị 2024 ruo 16 Febụwarị 2024.

    Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị na ọgwụgwọ ọrịa a bụ n’efu ma rịọ ka ha gaa n’ụlọọgwụ iji chọpụta ọrịa a ọsịsọ ka ọ ghara igbu ha.

  16. Ezinaụlọ Alexie Navalny na-ebo gọọmentị Rọshịa ebubo ịkpachi ozu nwa ha

    Alexie Navalny bụ onye a ma ama n'ịkatọ ọchịchị Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin

    Ebe foto si, Shutterstock

    Ndị otu Alexie Navalny bụ nwafọ mba Rọshịa nwụrụ n’ụlọmkporo kwuru na ha ahụbeghi ozu nwamadị a kamgbe ndị ụlọ mkpọro kwupụtachara ọnwụ ya.

    Kira Yarmysh bụ ọnụ na-ekwuru ya sị na ha nne Navalny na ọkaiwu ya agaala n’ụlọozu dị n’obodo Salekhard dị nso n’ụlọmkpọro ahụ mana e mechiri ya emechi.

    Yarmysh kwuru na ndị na-eme nyocha banyere ọnwụ ya kwere ha nkwa na ozu nwamadị ahụ nọ ebe ahụ.

    Mana Yarmysh sị na mgbe ọkaiwu Navalny kpọrọ akara ekwentị dị n’ụlọmpkọrọ ahụ, a gwara ya na ọ bụ onye nke asaa ga-akpọ ha taa na “ozu Alexie anọghị n’ụlọozu ahụ.”

    Yarmysh gara n’ihu boo gọọmentị mba Rọshịa ebubo na ha maara ụma kpachie ozu Navalny.

    Kira Yarmysh bụ ọnụ na-ekwuru Alexie Navalny

    Ọ gwara BBC na ndị otu ha kwenyere na ọ bụ Onyeisiala Vladimir Putin nyere iwu ka e gbuo nwamadị a na-ahụ maka ikike dịịrị onye maka na ọ bụ ya kachasị akatọ ọchịchị Putin.

    “Ha chọrọ ikpuchi ntọala mpụ ha, ọ bụ ya mere ha jiri ezo ozu ya ka ezinaụlọ ya ghara ịhụ ya.”

    Yarmysh kwuru na ọ maghị ebe ozu ya nọ maọbụ mgbe ha chọrọ inye ndị ezinaụlọ ya.

    O kwuru na iwu mba Russia bụ na onye ọbụla nọ na mkpọro nwụọ na a ga-enye ezinaụlọ ya ozu onye ahụ n’ime ụbọchị abụọ.

    Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere mba Amerịka, Briten akatọọla ọnwụ nwamadị nwụrụ n’ime ụlọmkpọrọ dị na Rọshịa nke a na-ebo ebubo na e nyere ya nsi.

    Ọtụtụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na mpaghara Rọshịa dị iche iche maka ọnwa Navalny ebe ndị uweojii na-anwụchi ọtụtụ n'ime ha.

  17. Alexei Navalny: Biden, Macron,ndị ọzọ sị n'aka Putin dị n'ọnwụ nwoke a

    Alexei Navalny

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Rọshịa nwere agba bụ Alexei Navalny e jichiri na mkpọrọ anwụọla, dịka ndị ọrụ ụlọmkpọrọ mba ahụ si kwuo.

    E jichiri Navalny bụ onye a ma ama maka ịna-akatọ onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin nakwa ịgba nrụrụaka na-eme n'ọchịchị ahụ n'anwụ nọ na mkpọrọ kemgbe afọ 2021 maka ebubo ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị mere e ji achụgharị ya.

    Navalny gbara afọ 47 bụ onye otu pati anọghị n' ọchịchị bụ onye e ji iti mkpu megide nrụrụaka mara anapụtaa onwe ya n’ọnụ ọnwụ ugboro ugboro a nwalara inye ya nsi n’ụlọ mkpọrọ.

    Na Disemba afọ 2020, Navalny boro ebubo na ndị ọrụ otu nchekwa mba Rọshia a kpọrọ ‘FSB’ gbanyere nsi na ọbante ya, nke mere ka ọ tụbọọ n’ụgbọelu dịka ọ na-efepụ na Siberia.

    Nke mere ka e fetuo ụgbọelu ahụ ngwangwa ka ndị dọkịta leta ya.

    A gwọrọ ya na mba Jamanị, ọ laghachiri Rọshịa bụ ebe a nwụchiri ya ngwangwa ọ tụdara na mba ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị ndu mba ụwa gụnyere Joe Biden nke Amerịka, Emman Macron nke Fransi , Olaf Scholz nke Jamanị na Zelensky nke Yukren, boro ebubo na aka Putin dị n'ọnwụ Navalny.

    Mana gọọmentị Rọshịa kwuru ' na ha "na-enyocha ọnwụ" ya.

  18. Ụlọikpe enyela iwu ka e nyocha ọnwụ Dele Giwa

    Dele Giwa

    Ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela Ọkaiwu Ukwu nke Gọọmentị Etiti iwu ka o mepe akwụkwọ maka nnyocha nakwa ịkpụpụ ndị aka ha dị n'ogbugbu Dele Giwa.

    Dele Gịwa bụ onye ntaakụkọ a ma ama mabụrụkwa onye nwe ụlọ akwụkwọ akụkọ 'Newswatch' bụ onye e ji ọgbụnigwe e zigara n'akwụkwọozi were gbuo n'ọnwa Oktoba afọ 1986.

    N'ikpe ya, Jọstis Ekwo kwuru na Ọkaiwu Ukwu Naijiria nakwa Mịnịsta na-ahụ maka ikpe nwere ikike ikpụpụ ndị gburu nwaamadi ahụ ụlọikpe ma taa ha ahụhụ maka ihe ha mere.Ụlọikpe ahụ nyekwara ha ikike inyocha ndị ntaakụkọ ndị ọzọ egbuorola n'ihu ọrụ ha ma taa ndị aka ha dị n'ọnwụ ha ahụhụ.

  19. NLC etinyela ngaghariwe Febụwarị 27 & 28

    Joe Ajaero, Onyeisioche otu Nigeria Labour Congress

    Otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe abalị abụọ n'abalị 27 na 28 nke ọnwa Febụwarị maka ihe isike ụmụamala Naijiria na-agabiga.

    Onyeisioche otu ahụ bụ Joe Ajaero gwara ndị ntaakụkọ taa bụ Fraide na ọbụrụ na gọọmentị etinye iwu onye aarụghị, ọ gaghị anataụgwọ ọnwa ya maka nke a, na ndị ọrụ ga-amalite abụbọ ọrụ na Naijiria nile.

    Ọkwa na-abịa ka ọ gacjhara otu izụka nke otu NLC mara ọkwa na ha ga-amalite abụbọ ọrụ n'ihi ọnọdụ ọrụ ha na mgbali ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa.

  20. Housing Agency: Tinubu emela ọgọ ya nwoke onyeisioche Federal Housing Authority na Naịjirịa

    Tinubu emela ọgọ ya nwoke onyeisioche Federal Housing Authority na Naịjirịa

    Ebe foto si, Oyetunde Oladimeji Ojo/Facebook

    Nkọwa foto, Housing Agency: Tinubu emela ọgọ ya nwoke onyeisioche Federal Housing Authority na Naịjirịa

    Bola Tinubu mere ọgọ ya nwoke bu Oyetunde Oladimeji Ojo onyeịsịọche ngalaba na ahụ maka ụlọ, a kpọrọ Federal Housing Authority (FHA) na Naịjirịa.

    Oyetunde Oladimeji-Ojo na-alụ Folashade Tinubu-Ojo bụ nwa nwanne nwaanyị nke Bola Tinubu.

    Nke a bụ nke mbụ Tinubu na-enye onye ezinaụlọ ya ọkwa na gọọmentị etịtị kamgbe ọ burula Onyeisiala.

    Mgbe a na-akpọpụta aha ya, gọọmentị etịtị kwụrụ na Ojo arụọla ọrụ na ngalaba arụmụlọ, nakwa nke gbasara ebe azụmahịa ụlọ nkwarị kamgbe afọ ịrị na ụma.

    Ebe ọtụtụ ndị mmadụ n'akara X bụbu Twitter na-akatọ ịhe ndị a, ụfọdụ ana-akwado ya na-ekwu na Ojo ịbụ nwanne Tinubu ekwesighị ịkwụsị ya inwete ọrụ gọọmentị.

    Federal Housing Authority ka a na-atụ anya na ha ga-arụ ụlọ ebe obibi dị ọnụ ala na gbụrụgbụrụ Naịjịrịa niịle Gọọmentị etịtị aka etinyebeghị ọnụ na nkatọ ndị mmadụ na-enye ha maka ịme Ojo onyeisioche Federal Housing Authority - FHA.