Onyeisiala
Bola Tinubu ahọpụtala Kemi Nanna Nandap ka ọ rụọ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ Nigeria
Immigration Service (NIS) malite n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2024.
Nandep ga-ewere
ọchịchị n’aka Caroline Wura-Ola Adepoju bụ onye oge ọrụ ya ga-akụrụ ọnụ n’ụbọchị
29 Febụwarị 2024.
Tupu a họpụta
Nandep n’ọrụ a, o ji bu ọkwa dịka osote onyeisi ụlọọrụ a ngalaba na-ahazi ọpụpụ
na mbata ndị mmadụ.
Onyeisiala
Tibubu kwenyere na onyeisi ulọọrụ Immigration ọhụrụ a ga-agba mbọ ịhụ na atụmatụ
banyere nwulite Naịjirịa ga-eme ọfụma.
Ihe mere EFCC jiri wakpoo 'Bureau d’Change' dị n’Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ
Ndị ụlọọrụ
EFCC bụ 'Economic and Financial Crime Commission' na CBN bụ 'Central Bank of Nigeria' wakporo ọdụ mgbanwe ego dọla na ego ndị ọzọ dị n’Owerri Rd Asata
Enugwu taa.
Ha
bịakwasara ha na mberede nke butere 'oke na ngwere n'ọsọ' na gburugburu ahịa
ego ahụ.
Ndịagha ji
ụgbọala ha mechie ụzọ si ụlọụka St ‘Brigid Catholic’ abata owerri Rd nakwa nke
si ụzọ stadium na ABC abata Owerri Rd.
Dịka
nchọpụta gosiri, na ọ bụ ndị ọrụ EFCC nakwa CBN bịara
nyocha i chọpụta etụ e si ere dọla, pound, Euro na ego ndị ọzọ ma ijidekwa ndị
n’ezogasi dọla.
Ha nọrọ ebe ahụ ihe karịrị awa anọ tupu ha akpụrụ ụfọdụ ndị ha nwuchiri pụọ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC bụ Dele Oyiwale gwara BBC na ha emechighị ‘Beareau d Change’ na ọ bụ ndị adịgboroja ji aha Bureau d Change’ arụ-ọrụ ka e mechiri ụlọọrụ ha.
Dịka osiri kwu ‘’O nwere ngalaba pụruiche anyị hiwere na-ahụ maka nyocha na mkpocha ndị adigboroja ji aha ‘Bureau d’ change’ arụ-ọrụ na Naịjrịa niile’
Ọ bụghị nanị Enugwu steeti, anyị na-eme ya na Naịjirịa niile, ebumnobi anyị bụ ị hụ na ihe niile gbasara mgbanwe ego na Naịjirịa na-aga etu kwesiri’ ka ọ kọwara.
Ebe foto si, EFCC
Nkọwa foto, Ihe mere EFCC jiri wakpoo 'Bureau d’Change' dị n’Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ
Cheta na ego
dola arịala ruo ukwuọjị, otu dola nọ na #1,600 nke mere ọnọ ego ihe niile jiri rỊGO na Naịjirịa.
Gọọmentị
kwuru na ha na agba mbọ ihụ na ego dola dara mana etu osi gbata kwuru, ọkabeghị
nwe ihe gbanwere.
Oyiwale
kwuru na ndị na-azụ ahia dọla adigboloja so na nsogbu Naira nwere, ya mere ha
ji ebuso ha agha, iji hụ na nsogbu a kwusịrị
Ndị uweojii ekwuola ihe mere ha jiri nwuchie Onyeisioche Labour Party
Ebe foto si, Abure/Getty Images
Ndị uweojii
ekwuola ihe mere ha jiri nwuchie Onyeisioche Labour Party bụ Julius Abure na
Benin, Isiobodo Edo Steeti.
Ọnụ
na-ekwuru ngalaba ndị uweojii Zone 5 bụ Tijani Momoh gwara ndị ntaakụkọ na ha
nwuchiri Abure maka ebubo dị iche iche.
Ebubo ndị
a gụnyere, atụmatụ igbu mmadụ, ịkpa nkata imerụ mmadụ ahụ na ihe ndị ọzọ.
Momoh
kwuru na o nwere onye degara akwụkwọ mkpesa ndị a n’isiụlọọrụ ha dị n’Abuja
megide Abure na mmadụ anọ ndị ọzọ.
O kwuru
na e nwere ihe onyonyo ndị gosiri mgbe e tiri onye ahụ ihe n’afọ gara aga n’Edo
Steeti.
Momoh
gbakwụnyere na a hụrụ egbe na mgbọ n’aka Abure na nyocha na-aga n’ihu banyere ebubo
ndị ahụ e boro ya.
Ọ gara n’ihu
gọọ na o nweghi mgbe ndị uweojii Abure ha kama na ọ bụ ụfọdụ ndị chọro igbochi
ka ndị uweojii inwuchi ya.
Mana
odeakwụkwọ Labour Party bụ Obiora Ifoh kwuru na ọ bụ eziokwu na a nwụchiri
onyeisi ha nakwa onyeisioche ha nke Edo Steeti bụ Kelly Ogbaloi.
O kwuru
na ọ bụ n’ihi mkpesa otu onye pati ha a chụrụ achụ na-akwado Lamidi Apapa dere
ma sị na nwuchi ahụ bụ iji mebiere ha ntuliaka imeụlọ ha chọrọ ime.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
A nwụchiela Julius Abure bụ onyeisi Labour Party
Ndị
uweojii anwụchiela onyeisi otu Labour Party na Naịjirịa bụ Julius Abure n’obodo
Benin nke Edo Steeti.
A nwụchiri
Abure n’ehihie ụbọchị Wenezde dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ngalaba Zone 5 bụ
Tijani Momoh kwuru na nke a bụ eziokwu.
Mana Momoh
ekwughi n’uju ihe mere e jiri nwuchie Abure.
Cheta na
Abure bụ onyeisi Labour Party na onye ndekọ ego ha a chụrụ achụ bụ Oluchi Opara
nwere esemokwu.
Opara
boro Abure ebubo nrụrụaka ego nakwa iri ego pati ha nwetere n’oge ntuliaka afọ
2023.
Mana
Abure na Labour Party agọọla na ebubo ndị ahụ bụ asị ọcha.
Peter
Obi bụ onye ji ọkọlọtọ pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala ekwubuola na ndị ngụkọ ego
si ebe ọzọ ga-eleba anya n’akwụkwọ ego pati ahụ iji maara ebe mmiri si banye n’ime
ụgbọghọrọ.
DSS adọọla otu NLC aka na ntị maka ngagharịiwe ha chọrọ ime.
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ
nchekwa Department of State Services (DSS) arịọla otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa
bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ka ha kagbuo atụmatụ ịgba abụbụọrụ ha chọrọ ịgba
maka udo na nchekwa obodo.
Cheta na
NLC kwuru n’ụbọchị Fraịde na ha ga-eme ngagharịiwe ụbọchị abụọ maka ihe isiike dị
na Naịjirịa nakwa ọnọdụ nchekwa dị njọ.
Mana ozi ọnụ
na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya wepụtara kwuru ka ha jiri mkparịtaụka soro ihe
niile ma ghara iji ngagharịiwe.
O kwuru na
gọọmentị na-agba mbọ ịhụ na ha gboro nsogbu ndị cheere Naịjirịa n’ihu, na e
kwesịrị inye ha ohere ime nke a.
“Anyị anatala
ozi na ụfọdụ ndị ọrụ chọrọ ime ngagharịiwe n’ụbọchị 27 na 28 Febụwarị 2023 maka
ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa,” ka o kwuru.
“O doro ụlọọrụ
anyị anya na nke a bụ ikike dịịrị ndị ọrụ ime ngagharịiwe, mana anyị na-arịọ ka
ndị mịnye mma ha n’ọbọ ma were mkparịtaụka soro okwu a maka udo nakwa nchekwa
obodo.”
Davido amapụtala 300m ịnye ụlọ ndị enweghi nne na nna na Naịjirịa
Ebe foto si, @Davido/Instagram
Otiegwu a ma ama bụ David Adeleke maọbụ Davido kwuputara n'ụbọchị Tuusde na ọ ga-eweputa nde naira narị atọ maka ụlọ ndị enweghi nne na nna na mpaghara Naịjirịa.
O kwuputara nke a n'akara X bụbu Twitter ya ma kwuo na "atụmatụ nkesa na nhazi ga-apụta echi".
Nke a abụghị mbụ Davido na-eme ụdịrị ihe a banyere ndị enweghi nne na nna.
N'afọ 2021, ọ nara ndị enyi ya niile otu nde naira kwa mmadụ iji gbapụta ụgbọala ya mana o mechara tinye ego n'elu ya ma nye ya bụ ego pụtara nde naira narị abụo na ọkara dịka onyinye n'ụlọ ndị enweghi nne na nna.
Ọ mechara malitekwa ụlọọrụ onyinye nke ya akpọrọ David Adeleke n'afọ 2022.
Ụlọọrụ Custom ga-amalite ikesa ngwa nri ha kpachiri akpachi
Ebe foto si, Nigeria Custom Service
Ụlọọrụna-ahụ maka mbubata ngwa ahịa na Naịjirịa bụ
Nigeria Custom Service (NCS) ekwuola na ha ga-amalite ikesa ngwa nri ndị ha
kpachiri akpachi maka nsogbu ụkọ nri dị na Naịjirịa ugbua.
Ọnụ
na-ekwuru ha bụAbdullahi Maiwada kwuru
na ha a ga-amalite ikesa nri ndị a ma ọ bụrụ e meechaa nyocha ma chọpụta na nri
ndị a dị mma oriri.
N’okwu ha
wepụtara n’ụbọchị Tuzde o kwuru na nke a bụ iji belata ihe isiike cheere ndị Naịjirịa
n’ihu ma mee ka ha nwete nri n’ụlọ ha.
“Ụlọọrụ Custom na-eme nke a iji nyere ndị Naịjirịa aka n’oge ụkọ nri na ihe isiike a. Ndị ọrụ na-ahụ maka nri ga-eme nyocha ma chọpụta na ha ka dị mma iri tupu anyị amalite ikesa ya.”
O kwuru na atụmatụ a bụ site na nkwenye onyeisi ha bụ Bashir Adewale Adeniyi nwere n’atụmatụ ikpochapụ agụụ na Naịjirịa nke Onyeisiala Bola Tinubu.
A kwụsịtụrụ akara obaozi 'X' nwụnye Alexei Nalvalnaya nwụrụanwụ
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, A kwụsịtụrụ akara X nwụnye Alexei Nalvalny nwụrụ-anwụ
X bụbu ‘Twitter’ akwụsịtala akaraozi nwụnye Nalvalny bụ Yulia Navalnaya ịrụ ọrụ.
Nke a mere ka Yulia gbasachara
ozi na-ekwu na ya ga-aga n’ihu ime ihe di ya kwadoro tupu ọ nwụọ, nke bụ ịlụọgụ nnwereonwe ndị Rọshịa.
N’ụbọchị Monde, Yulia
tinyere ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-ama ọkwa na-ekwu na ya agaghị akwụsị ọgụ nnwereonwe.
Nke a mere abalị ole na ole
ozi pụtara na di ya anwụọla n’ụlọmkpọrọ na Rọshịa.
Na Tuzde, a chọpụtara na akara’
X’ Yulia akwụsịtụla ọrụ.
Ụlọọrụ ọbaozi ‘X’ n’ozi ha,
kwuru na ha amaghị ama machie akara ya.
‘’Ngalaba ụlọọrụ anyị na-ahụ
maka ozi uya amaghị ama wee machie akara Yulia, ihe kpatara ya bụ na akara ahụ
gosiri injrimara megịdere iwu X’’ Ka ha kwuru.
‘’Anyị eweghachila akara ya
ozugbo anyị chọpụtara ihe mere, anyị’’
Nkọwa foto, Yulia tinyere ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-ama ọkwa na-ekwu na ya agaghị akwụsị ọgụ nwereonwe
Yulia Navalnaya adịghị apụta n’okwu mgbe di ya dị ndụ, mana o mepere akara obaozi X n’aha ya na Monde.
Ụbọchị ahụ ka o wepụtara ihe oyonyo gosiri ya ebe ọ na-ebo Gọọmentị Rọshịa ebubo ogbugbu di ya.
O kwuru na ihe mere ha jiri egbu oge ibupụta ozu di ya bụ na ha na-eche ka ọgwụ ọjọọ ha jiri gbagbuo ya pụchaa ya n’ahụ.
Mana Gọọmetị Rọshịa kwuru na ọ bụghị eziokwu, na ha na-eme nyocha pụrụiche n’ozụ ya mere ha jiri ka jide ya.
Ọtụtụ mmadụ lelere ihe onyonyo ahụ o mere ma kesasịa ya. Ihe karịrị mmadụ 100,000 esonyela akara X ya kemgbe o ji hibe ya.
Dịka iwu na-achị X siri dị, e nwereike ịmachị akara mmadụ ma o tinye ihe na-egosi mmegbu maọbụ na-ahụrụ na akara onye ahụ enweghị nchekwa.
NARTO akwụsịla abụbọ ọrụ ha
Ebe foto si, Getty
Nkọwa foto, NARTO akwụsịla abụbọ ọrụ ha
Ulọọrụ NARTO akwusịla abụbọ ọrụ ha gbara dịka ha na Gọọmetị nwere mkpebi.
Mịnịsta
na-ahụ maka mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Heineken Lokpobiri kwuru na Gọọmentị elebanyela anya n’ihe ndị ha jiri
maka ya gbaa abụbọ ọrụ.
O kwuru
na ha agaghị ekwe ka ihe dị etua mee ọzọ, na ha ga-aga n'iru na elebanyere ha anya, iji hụ na ihe niile ha chọrọ zụrụoke.
Cheta na ndị ọkwọ ụgbọ ụgbọla mmanụ bụ NARTO gbara abụbọ ọrụ na Monde maka ego ole dịzụl na-ada. Ha kwuru na ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ekweghị ha arụ ọru ha etu kwesịrị.
Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a gbaala abụbọ ọrụ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a gbaala abụbọ ọrụ
Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ NARTO(Nigeria association of road transport owners) Ndị ọkwọ ụgbọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa agbaala abụbọ ọrụ dịka nzụkọ ha na Gọọmentị etiti dara
ajambede.
Gọmentị
etiti na otu NARTO nwere nzụkọ na Monde
iji lebanye anya na mkpesa otu NARTO kpesara maka ego ole ana-ere dịzụl nakwa ihe ndị
ọzọ mere ha jiri kwụsị ọrụ.
NARTO mara ọkwa
na mbụ na ha ga-akwụsị ọrụ na Naịjirịa niile na Monde ma ọ bụrụ na ewetughị ego ole
ana-ere dịzụl.
Mara na ọ bụ Dịzụl ka ha na-agbanye n'ụgbọala nke ha ji ebugharị mmanụ na Naịjirịa niile.
Dịka ego mmanụ
ụgbọala na-ari, etu ahụ ka dịzụl si arị. Otu lita dịzụl nọ na # 1,250 ugbua.
Mịnịsta na-ahụ
maka mmanụ ugboala bụ Heineken Lokpobiri
kwuru na aga-enwe nzụkọ ọzọ taa i ji hụ na ekpeziri ihe niile, na NARTO laghachịrị
n’ọru.
O kwuru na abụbọ-ọrụ a ga-emee ka ọnọdụ Naịjirịa kawanye njọọ.
Tinubu na ndị isiala Afrịka ndị ọzọ 'njenje karịrị n'ụkwụ'
Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na onyeisiala Kenya bụ William Ruto banyere n'ọchịchị, a katọọla ha maka otu ihe bụ oke njem ha na-eme aga mba ofesi.
Mmadụ abụọ ndị anatala ezigbo naktọ maka ụdị ego ha na-emefu maka njem ha na-efegharị ebe niile na mbaụwa nke na-achaghị acha maka ụdọ ọtanisi na-eme na mba ha dị icheiche.
Otu akwụkwọ mgbasaozi na Kenya bụ, The Standard nyere Maazị Ruto aha dịka "Onyeisiala nfegharị". Akwụkwọ mgbasaozi ahụ kwuru na "ịhụnanya o nwere maka ime njem dị ike mere na o nweghi ike ịgafe ohere ọbụla" agbanyeghi etu ihe siri sie ike n'obodo ya gụnyere ọtanisi na oke ọnụ ahịa nri na Kenya.
N'ọnwa gara aga, Maazị Tinubu gara mba ọzọ na Yurop ọzọ. Nke a mere onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati PDP bụ Atiku Abubakar jiri kwuo na Naịjirịa achọghị "onyeisiala nlegharị anya". Atiku katọrọ njem nke onyeisiala ebe o kwuru na "Naịjirịa na-egwu na mmiri nsogbu enweghi nchekwa"
Ndị mmadụ nwereike ịhụ nke a ka ihe onye nkatọ ọbụla nwereike ikwu. Ndị isiala kwesiri ịga nzụkọ ndị isiala ibe ha ma nweta eze mmekọrịta mba ha na mba ndị ọzọ. Ọ dị ezigbo mkpa maka mmekọ mba na mba nakwa maka akụnaụba mba ebe ha nwereike ịkpa maka azụmahịa na iweta ego na mba ha.
Mana ndị ụfọdụ na-ekwu na onyeisiala Tanzania lara mmụọ bụ John Magufuli esighi na mba Afrịka pụọ gaa mba ọzọ n'ime afọ isii ọ nọrọ n'ọchịchị.
Food inflation: Ngagharịiwe adapụtala n’Ibadan
Ndị bị n’Ibadan, isiobodo Oyo steeti awujuola
n’okporoụzọ na-eme ngagharịiwe maka mgbali elu ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ
n’ụtụtụ taa bụ Monde.
Igwe mmadụ ndị jicha akwụkwọ nke e degara ihe bụ
iwe ha wujuru Mokola, Ibadan.
Ụfọdụ ozi dị n’akwụkwọ ha bụcha agagharị gụnyere
sị, “Kwụsị agụụ,” “Agụụ na-egbu ụmụ ogbenye”, wdgz.
Cheta na abalị ole na ole gara aga, e mere
ngagagịiwe na steeti ụfọdụ n’Ugwu Awụsa maka oke ọnụahịa nri.
Pakistan election: Onye ndọrọndọrọ ọchịchị ajụla mmeri e ji nrụrụaka nye ya
Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Pakistan ajụla iwere ọkwa ọchịchị e ji wuruwuru nye ya na ntuliaka mba ahụ mere na nsonso a.
Hafiz Naeem ur Rehman nke otu pati Jamaat-e-Islami bụ onye a kpọpụtara dịka onye meriri nntuliaka maka ịnọchịte PS-129 n’obodo Karachi n'ụlọomeiwu.
Mana n’izụụka ka Rehman kwuru na ọ bụ onye nọ n’oyu pati PTI nke Imran Khan na-akwado kacha nweta vootu, sin a e sepụrụ ihe na iher pati ahụ nwetara, ya mere na ya agaghị enwere ọkwa ahụ.
O kwuru dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu sị, "Ọ bụrụ na o nwere onye chọrọ ka anyị merịe n’ụzọ akwụghị ọtọ, anyị agaghị anabata.”
A họpụtala Dennis Idahosa dịka onye ga-eji aha APC zọọ ọkwa gọvanọ Edo Steeti
Ebe foto si, Idahosa Dennis
Dennis
Idahosa bụ onye omeiwu nta emeriela dịka onye ga-eji ọkọlọtọ All Progressive
Congress azọ ọkwa gọvanọ Edo Steeti .
Gọvanọ Imo
Steeti bụ Hope Uzodimma rụrụ ọrụ dịka onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ntuliaka
ime ụlọ APC n’Edo kpọpụtara Idahosa na ntuliaka ha mere na Satọde.
O kwuru na
Idahosa ji vootu 40,000 merie ndị ya na ha so zọọ ọkwa ahụ na ntuliaka a ga-eme
n’ọnwa Sepụtemba 2024.
Na nnabata
mmeri ya, Idahosa kwuru na obi dị ya ụtọ maka nkwadọ ndị pati ha n’Edo Steeti
nyere ya ma rịọ ka ndị o meriri mịnye mma ha n’ọbọ ma gbakọta aka na ntuliaka
na-abịa abịa.
Akụkọ kwuru
na e nwere ọgbaghara n’oge ntuliaka ahụ dịka ndị ekperima bịara tisaa ebe a ga-anọ
gụkọọ vootu.
Mana gọvanọ
Uzodimma kwuru na nke ahụ abụghi nnukwu ihe na ọ bụ nghọtahie banyere ebe e kwesịrị
ịnọ kpọpụta vootu.
O kwuru na
ebe ha nọ gụpụta vootu ahụ bụ ebe e kwesịrị ịnọ.
Ọrịa Lassa
Fever nke malitere ọhụrụ a egbuola mmadụ iri ebe ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise
ndị ọzọ bu ya ugbua n’Ebonyi Steeti.
Okpuruọchịchị
ndị o metụtara gụnyere, Onicha, Ikwo, Ezza North, Ebonyi, Izzi, Ohaukwu na
Abakaliki ebe a kpọro ‘Hausa quarters na Nkaliki bụ ebe ndị ọkachasị metụta.
Onye ọrụ
ministry ahụike na steeti ahụ bụ Orogwu Samson kwuru na ọrịa a metụtara ndị nọ
n’ogogo afọ niile, gụnyere ụmụaka, okenye, nwoke ma nwaanyị, mana o kwuru na ọ
bụ ụmụnwoke ndị nwere iri na isii ebe ụmụnwaanyị dị itoolu.
O kwuru na
ndị nwụrụ anwụ gụnyere otu nwaanyị dị ime, ụmụaka abụọ, ndị nne nakwa ụmụnwoke.
Ọ gara n’ihu
kwuo na na ọnụọgụgụ a bụ malite n’ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị 2024 ruo 16 Febụwarị
2024.
Ọ dọrọ ndị
mmadụ aka na ntị na ọgwụgwọ ọrịa a bụ n’efu ma rịọ ka ha gaa n’ụlọọgwụ iji chọpụta
ọrịa a ọsịsọ ka ọ ghara igbu ha.
Ndị otu
Alexie Navalny bụ nwafọ mba Rọshịa nwụrụ n’ụlọmkporo kwuru na ha ahụbeghi ozu
nwamadị a kamgbe ndị ụlọ mkpọro kwupụtachara ọnwụ ya.
Kira
Yarmysh bụ ọnụ na-ekwuru ya sị na ha nne Navalny na ọkaiwu ya agaala n’ụlọozu dị
n’obodo Salekhard dị nso n’ụlọmkpọro ahụ mana e mechiri ya emechi.
Yarmysh
kwuru na ndị na-eme nyocha banyere ọnwụ ya kwere ha nkwa na ozu nwamadị ahụ nọ ebe
ahụ.
Mana Yarmysh
sị na mgbe ọkaiwu Navalny kpọrọ akara ekwentị dị n’ụlọmpkọrọ ahụ, a gwara ya na
ọ bụ onye nke asaa ga-akpọ ha taa na “ozu Alexie anọghị n’ụlọozu ahụ.”
Yarmysh
gara n’ihu boo gọọmentị mba Rọshịa ebubo na ha maara ụma kpachie ozu Navalny.
Ọ gwara BBC na ndị otu ha kwenyere na ọ bụ Onyeisiala Vladimir Putin nyere iwu ka e gbuo nwamadị a na-ahụ maka ikike dịịrị onye maka na ọ bụ ya kachasị akatọ ọchịchị Putin.
“Ha chọrọ ikpuchi ntọala mpụ ha, ọ bụ ya mere ha jiri ezo ozu ya ka ezinaụlọ ya ghara ịhụ ya.”
Yarmysh kwuru na ọ maghị ebe ozu ya nọ maọbụ mgbe ha chọrọ inye ndị ezinaụlọ ya.
O kwuru na iwu mba Russia bụ na onye ọbụla nọ na mkpọro nwụọ na a ga-enye ezinaụlọ ya ozu onye ahụ n’ime ụbọchị abụọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere mba Amerịka, Briten akatọọla ọnwụ nwamadị nwụrụ n’ime ụlọmkpọrọ dị na Rọshịa nke a na-ebo ebubo na e nyere ya nsi.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na mpaghara Rọshịa dị iche iche maka ọnwa Navalny ebe ndị uweojii na-anwụchi ọtụtụ n'ime ha.
Alexei Navalny: Biden, Macron,ndị ọzọ sị n'aka Putin dị n'ọnwụ nwoke a
Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ndọrọndọrọ
ọchịchị mba Rọshịa nwere agba bụ Alexei Navalny e jichiri na mkpọrọ anwụọla, dịka ndị
ọrụ ụlọmkpọrọ mba ahụ si kwuo.
E jichiri Navalny
bụ onye a ma ama maka ịna-akatọ onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin nakwa ịgba nrụrụaka na-eme n'ọchịchị ahụ n'anwụ nọ na
mkpọrọ kemgbe afọ 2021 maka ebubo ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị
mere e ji achụgharị ya.
Navalny gbara afọ 47 bụ onye otu pati anọghị n' ọchịchị bụ onye e
ji iti mkpu megide nrụrụaka mara anapụtaa onwe ya n’ọnụ ọnwụ ugboro ugboro a nwalara inye ya nsi n’ụlọ
mkpọrọ.
Na Disemba afọ 2020, Navalny boro ebubo
na ndị ọrụ otu nchekwa mba Rọshia a kpọrọ ‘FSB’ gbanyere nsi na ọbante ya, nke mere ka ọ tụbọọ n’ụgbọelu dịka ọ
na-efepụ na Siberia.
Nke mere ka
e fetuo ụgbọelu ahụ ngwangwa ka ndị dọkịta leta ya.
A gwọrọ ya na mba Jamanị, ọ laghachiri
Rọshịa bụ ebe a nwụchiri ya ngwangwa ọ tụdara na mba ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị ndu mba ụwa
gụnyere Joe Biden nke Amerịka, Emman Macron nke Fransi , Olaf Scholz nke Jamanị na Zelensky nke Yukren,
boro ebubo na aka Putin dị n'ọnwụ Navalny.
Mana gọọmentị Rọshịa kwuru ' na ha "na-enyocha ọnwụ" ya.
Ụlọikpe enyela iwu ka e nyocha ọnwụ Dele Giwa
Ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela Ọkaiwu Ukwu nke Gọọmentị Etiti iwu ka o mepe akwụkwọ maka nnyocha nakwa ịkpụpụ ndị aka ha dị n'ogbugbu Dele Giwa.
Dele Gịwa bụ onye ntaakụkọ a ma ama mabụrụkwa onye nwe ụlọ akwụkwọ akụkọ 'Newswatch' bụ onye e ji ọgbụnigwe e zigara n'akwụkwọozi were gbuo n'ọnwa Oktoba afọ 1986.
N'ikpe ya, Jọstis Ekwo kwuru na Ọkaiwu Ukwu Naijiria nakwa Mịnịsta na-ahụ maka ikpe nwere ikike ikpụpụ ndị gburu nwaamadi ahụ ụlọikpe ma taa ha ahụhụ maka ihe ha mere.Ụlọikpe ahụ nyekwara ha ikike inyocha ndị ntaakụkọ ndị ọzọ egbuorola n'ihu ọrụ ha ma taa ndị aka ha dị n'ọnwụ ha ahụhụ.
NLC etinyela ngaghariwe Febụwarị 27 & 28
Otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe abalị abụọ n'abalị 27 na 28 nke ọnwa Febụwarị maka ihe isike ụmụamala Naijiria na-agabiga.
Onyeisioche otu ahụ bụ Joe Ajaero gwara ndị ntaakụkọ taa bụ Fraide na ọbụrụ na gọọmentị etinye iwu onye aarụghị, ọ gaghị anataụgwọ ọnwa ya maka nke a, na ndị ọrụ ga-amalite abụbọ ọrụ na Naijiria nile.
Ọkwa na-abịa ka ọ gacjhara otu izụka nke otu NLC mara ọkwa na ha ga-amalite abụbọ ọrụ n'ihi ọnọdụ ọrụ ha na mgbali ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa.
Housing Agency: Tinubu emela ọgọ ya nwoke onyeisioche Federal Housing Authority na Naịjirịa
Ebe foto si, Oyetunde Oladimeji Ojo/Facebook
Nkọwa foto, Housing Agency: Tinubu emela ọgọ ya nwoke onyeisioche Federal Housing Authority na Naịjirịa
Bola Tinubu mere ọgọ ya nwoke bu Oyetunde Oladimeji Ojo onyeịsịọche ngalaba na ahụ maka ụlọ, a kpọrọ Federal Housing Authority (FHA) na Naịjirịa.
Oyetunde Oladimeji-Ojo na-alụ Folashade Tinubu-Ojo bụ nwa nwanne nwaanyị nke Bola Tinubu.
Nke a bụ nke mbụ Tinubu na-enye onye ezinaụlọ ya ọkwa na gọọmentị etịtị kamgbe ọ burula Onyeisiala.
Mgbe a na-akpọpụta aha ya, gọọmentị etịtị kwụrụ na Ojo arụọla ọrụ na ngalaba arụmụlọ, nakwa nke gbasara ebe azụmahịa ụlọ nkwarị kamgbe afọ ịrị na ụma.
Ebe ọtụtụ ndị mmadụ n'akara X bụbu Twitter na-akatọ ịhe ndị a, ụfọdụ ana-akwado ya na-ekwu na Ojo ịbụ nwanne Tinubu ekwesighị ịkwụsị ya inwete ọrụ gọọmentị.
Federal Housing Authority ka a na-atụ anya na ha ga-arụ ụlọ ebe obibi dị ọnụ ala na gbụrụgbụrụ Naịjịrịa niịle
Gọọmentị etịtị aka etinyebeghị ọnụ na nkatọ ndị mmadụ na-enye ha maka ịme Ojo onyeisioche Federal Housing Authority - FHA.