Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. Unu emeela

    N'ebe a ka anyị ga-agbado nke taa.

    Sonyekwa anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Wenezde.

    Daalụ rinne.

  2. Otu ụkọchukwu ụka Dunamis alaala mmụọ dịka ụlọụka ya dagburu ya na Benue

    Ụlọụka Dunamis dara ada na Benue Steeti

    Ebe foto si, Channels TV

    Otu ụlọụka 'Dunamis' adaala kụgbuo ụkọchukwu na-elekọta ya na mpaghara 'North Bank' nke Makurdi, isi obodo Benue steeti n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde.

    Dịka ndị ntaakụkọ Channels TV si depụta, ụkọchukwu ahụ na mmadụ atọ ọzọ nọ n'ime ụlọụka ahụ na-ekpe ekpere oge ọ dara, mana ọ bụ naanị ụkọchukwu ahụ nwụrụ na ya bụ ọdachi.

    O dobeghị anya kpọmkwem ihe kpatara ụlọụka ahụ ji daa, mana otu jikọrọ ndị ọrụ Injinia gwara ndị ntaakụkọ Channels TV na ụlọụka ahụ enweghị ezi eserese e ji arụ ya.

    Terna Mom, bụ otu n'ime ndị isi otu 'Council for the Regulation of Engineers (COREN)' kwuru na ụlọ ahụ ekwesịghị ka e were Igwe siri ike rụọ elu ya.

    N'aka nke ya, Gọvanọ Benue Steeti bụ Hyacinth Alia kwuru na a ga-ejide ndị niile aka ha dị n'ọrụ ụlọ ahụ dara ada maka ịrụ ụlọ na-agbasoghi ezigbo usoro ịrụ ụlọ.

    Gọvanọ Alia kwuru nke a oge ọ gara n'ebe ahụ ụlọụka dara n'ụbọchị Tuzde.

  3. Etu ọkụ latrik si dọgbuo otu di na nwunye na ụmụ ha abụọ na Taraba

    Ezinụlọ RAYMOND NFONNBOK

    Ebe foto si, RAYMOND NFONNBOK

    Otu nwoke aha ya bụ Raymond Nfonnbok, na nwunye ya, na ụmụ ha abụọ anwụọla dịka ọkụ latrik dọgburu ha na mpaghara Dinyavoh nke Taraba Steeti n'ụbọchị Mọnde, Ọktoba 2, 2023.

    Ndị agbataobi ezinụlọ ahụ kwuru na ọ bụ naanị nwa nke ikpeazụ Raymond mụrụ bụ onye fọrọ ndụ n'ọdachị ahu n'ihi na ọ nọghị n'ime ụlọ ebe ndị ọzọ nọ n'oge ihe ahụ mere.

    Oriakụ Tibwa Gambo bụ onye bidebere ezinụlọ Nfonnobok gwara BBC Pidgin, na n'ebe elekere iri nke ụtụtụ, Raymond gbapụtara n'ezi tie mkpu gwa ndị agbataobi ha na ọkụ latrik dị n'ụlọ ahụ ma gwa onye ọbụla ka ha gbanyụọ ọkụ ha.

    "Oteghị aka ọ lakpuru n'ime ụlọ ya, anyị nụrụ ihe dara ka oggbunigwe n'akụkụ ebe igwe 'transformer' na-enye mpaghara anyị ọkụ dị, anyị wee gbapụta n'ezi wee hụ ka anwụrụ si n'ime ụlọ Raymond na-apụta," nwaada Tibwa gwara BBC.

    O kwuru na ha kpọrọ Raymond oku ugboro ugboro mana ọ zaghị, mana ha mechara hụ ozu ya na ozu nwunye ya bụ Mfon na nke ụmụ ha abụọ, otu nwata nwoke na otu nwata nwaanyị.

    Nwa ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ dị afọ 15, Raymond n'onwe ya dị afọ 44.

    Nwaada Tibwa kwuru na dịka ha na-akpọ Raymond oku, ha amaghị na ọkụ latrik adọgbuola ya dịka ọ na-arụ ọrụ n'igwe kọmputa ya, otu ọkụ ahụ dọgbukwara nwunye ya na ụmụ ha bụ ndị bịara ịzọpụta ya.

    Dịka ndị agbataobi ya si kọwa, Raymond na ezinụlọ ya kwatara n'ụlọ ahụ n'ebe ọnwa Jun afọ a. Ha kwuru na ezinụlọ ahụ abụghị ndị na-achọ nsogbu ọbụla.

    Raymond bụ onye ose foto. Aha ụlọọrụ o mepere na Jalingo bụ Rayfons Galleria, ebe ọ na-ese foto, vidio, na eserese ndị ọzọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Taraba Steeti bụ Usman Abdullahi gwara BBC na ihe a mere eme n'eziokwu, dịka ọ kọwara na ọ bụ nnukwu ike si n'ọkụ latrik dọgburu ezinụlọ ahụ.

    Abdullahi sị na e bugala ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu nke ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' dị na Jalingo.

    O kwukwara na nnyocha amalitela gbasara ọdachi a.

  4. Kenya ga-eziga ndị uweojii ịga weta nchekwa na mba Haiti

    William Ruto

    Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto ekwuola na mba ya anabatala mkpebi nke otu mba ụwa bụ 'UN Security Council' ịbụ isi ndị uweojii a ga-eziga na mba Haiti maka iweta udo na mba ahụ dịka ndị otu ojiegbe dị icheiche weghaara ọnọdụ na mba ahụ.

    Ruto kwere nkwa na Kenya agaghị agharịpụ ndị mba Haiti, ma kwukwaa na ọrụ a ha na-aga ịrụ pụrụ iche ma dịkwa ezigbo mkpa.

    N'ụbọchị Mọnde, otu UN kpebiri iziga ndị uweojii pụrụ iche, nke ndị uweojii mba Kenya ga-anọ n'isi ya, na mba Haiti iji nyere ha aka weta ezi nchekwa na mba ahụ maka na otu ndị ojiegbe na-enye nsogbu n'ebe dị icheiche.

    "N'ime mkpa nke anyị, anyị nwere ndị enyi oge niile. Agbanyeghị na ha adịghị ọtụtụ maọbụ ndị nwere ike nke ukwuu, mana ha bụ ndị enyi anyị n'eziokwu nakwa n'ikwudosi ike. Taa, ndị mba Haiti, ndị ezigbo enyi anyị, chọrọ enyemaka anyị. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ịkwudoro ha iji gosi ha na anyị bụ enyi ha n'ezie," Ruto kwuru.

    Mana ọtụtụ akatọọla atụmatụ a ma na-ajụ ma ndị uweojii Kenya a ga-enwenwu ike ibuso ndị ekperima mba Haiti agha.

    Otu nnukwu ọkaikpe nke mba Kenya n'oge gara aga bụ Willy Mutanga gwara BBC n'ụbọchị Tuzde na iwu akwadoghi izipu ndị ọrụ nchekwa mba ahụ gaa mba ọzọ, na-ebughị ụzọ jụọ ndị mmadụ, maka na ya bụ okwu bụ ihe dị oke mkpa.

    Otu Amnesty International akpọọla oku ka e nye ndị ọrụ nchekwa ahụ ọzụzụ zuru oke maka ikike dịịrị mmadụ tupu ezipu ha.

  5. Nwata dị afọ 14 agbagbuola mmadụ abụọ n'otu ụlọahịa na Thailand

    Bangkok

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ndị mmaọ̄ụ gbasasịrị dịka nwatakịrị ahụ bidoro ịgba egbe aghara aghara

    Ndị uweojii mba Thailand ejichiela otu nwatakịrị nwoke dị naanị afọ 14, onye a sị na o bu egbe banye n'otu ụlọahịa Siam Paragon Mall, na Bangkok gbagbuo mmadụ abụọ ma merụkwaa mmadụ ise ọzọ ahụ.

    Siam Paragon bụ ebe a ma ama nke ọma na mba Thailand. A na-eche na ọ bụ ebe ndị njem nlereanya kacha aga na mpaghara Asia niile.

    Ndị ọrụ nchekwa kwuburu na ọ bụ mmadụ atọ nwụrụ na mwakpo ahụ, mana ha mechara kwuo na ọ bụ mmadụ abụọ ka a ma nwụrụla, ha si mba China na Myanmar.

    Akụkọ kwuru na nwtakịrị mere ihe a bụ nwa akwụkwọ n'otu ụlọakwụkwọ dị nso n'ebe ahụ. Odobeghị anya ihe kpaliri ya o ji kpaa ụdị agwa ahụ.

    Onye uweojii ji mmadụ n'ala

    Ebe foto si, Thai Police

    Nkọwa foto, Ndị uweojii jidere nwatakịrị gbara egbe ahụ

    Ndị uweojii sị na ndekọ ahụike nwata ahụ gosiri na ọ na-anata ọgwụgwọ maka ọnọdụ ahụike uche, mana ọ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ya n'ọdị nso a.

    Ụdị ihe dị otu a emebeghị n'ime obodo Bangkok na nsonso a, n'agbanyeghị na e nweela ụfọdụ akụkọ dị ka ya na mpaghara nọdebere obodo ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, akpụgala nwatakịrị nwoke ahụ n'lọọrụ ndị uweojii dị na Pathumwan, nke dị naanị otu kilomita n'ebe mwakpo a mere.

  6. Etu imi na anya dị Ezzamgbo taa dịka 'unknown gunmen' wakpochara ha

    Ahịa dị na moaghara ahụ

    Ndụ amalitekwala ọzọ n'ebe akpọrọ Ezzamgbo junction dị n'Ebonyi steeti dịka ndị echeere bụ ndị Ipob wakporo ha n'ụbọchị Monde.

    Onye ntaakụkọ BBC ji anya ya hụ na ndị mmadụ apụtala ịzụ ahịa dịka ndị na-agba ụgbọala nakwa ọgbatumtum pụtakwara ọrụ nke ha.

    Otu onye ọgbatumtum kwuru na ha adịghị apụta ọrụ kwa ụbọchị Monde maka ụjọ ndị na-amanye Sit at home iwakpo ha ma kpọọ gọọmentị oku ka ha wulite nchekwa na steeti ahụ.

    Onyeọzọ achọghị ka akpọo aha ya kwuru na ụbọchị Sit at home aghọrọla ha njọ ahịa n'ihi na ndị mmadụ anaghị apụta azụ ahịa.

    Cheta na ndị na-amanye sit at home wakporo ebe ahụ ma gbaa ọgbaatumtum anọ nakwa ụgbọala atọ ọkụ n'ebe ahụ.

    Ndị ọgbatumtum
  7. NLC na TUC akwụsịtụla ịgba abụbu ọrụ ha kwadoburu

    Ndị na-ere mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọnụ mmanụ ụgbọala so n'ihe mere e ji chọọ ịgba abụbụọrụ

    Otu ndị ọrụ Naịjirịa abụo bụ NLC na TUC akwụsịtụla abụbụ ọrụ ha na-akwadobu ịgba malite n'ụbọchị Tuusde.

    Mkpebi a bịara dịka emechara nzụkọ ogologo oge n'etiti otu ndị ọrụ ahụ nakwa gọọmentị etiti n'ụbọchị Monde n'Abuja.

    Ha kwuru na gọọmentị etiti binyere aka na nkwekọrịta na ha ga-emezu ọchịchọ niile nke ndị otu ndị orụ ahụ n'ime abalị iri na atọ.

    Cheta na abụbụọrụ ahụ ha na-akwadobu bu iji chọọ ụgwọ ọnwa welitere isi dịka ha na-ekwu na mwepu ego subsidy nakwa ụfọdụ atụmatụ gọọmentị etiti ebutela ahụhụ karịrị akarị na ndụ ndị mmadụ.

  8. Ka chi fo

    N'ebe a ka anyị ga-eweta mgbasaozi anyị nke taa n'isi njedebe.

    Cheta sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Tuzde.

    Ya gazie.

  9. 'AY onye nke m, biko gbaghara m' - Basketmouth

    Basketmouth na AY

    Ebe foto si, Screengrab

    Nkọwa foto, Basketmouth na AY

    Bright Okpocha, onye ọkpa ọchị a ma ama na Naịjirịa dịka 'Basketmouth', arịọla Ayo Makun, bụkwa onye ọkpa ọchị ọzọ a ma ama dịka AY, mgbaghara, "maka ihe ọjọọ ọbụla m mere gị na-amaghị ama, ma ọbụ nke m ma ama".

    Basketmouth na AY so na ndị ọkpaọchị aha ha kacha ada ụda na Naịjirịa, mana ọ bụghị ihe zoro ezo na ha abụọ abụghị enyi ma ncha.

    N'ihe onyonyo nke Basketmouth wepụtara n'ụbọchị Tuzde, o kwuru na ya chọrọ ịrịọ onye ọbụla ya mehierela n'ọrụ ya dịka onye ọkpa ọchị, mgbaghara.

    "Maka onye nke m, AY, biko gbaghara m ihe ọbụla m mere iji mejọọ gị, ma nke m ma ama ma nke mụ amaghị ama. Mụ onwe m agbagharakwala gị ihe ọjọọ niile i mere maọbụ i kwuru megide m, ma nke ị ma ama ma nke ị maghị," Basketmouth kwuru.

    "Ihe niile ndị ahụ agaala, achọrọ m ka anyị biri n'udo na obi ọma."

    Mana ọtụtụ na-ajụ ma mgbaghara a Basketmouth rịọrọ AY esikwa ya n'obi pụta, n'ihi na o mechara kwuo na ihe onyonyo ahụ bụ nke o mere iji ree tiketi maka emume ya nke na-abịa na nsonso a.

    N'ọnwa Maachị afọ a, na mkparịtaụka ya na otu onye ntaakụkọ a ma ama bụ Chude Jideonwo, AY kọrọ akụkọ etu ya na Basketmouth si nwee nghọtahie ọtụtụ afọ gara aga, ya mechaa gaa ịrịọ ya mgbaghara mana Baskethmouth jụrụ ịgbaghara ya.

    Onyonyo a Basketmouth tinyere n'ụbọchị Mọnde kpalitere mkparịtaụka na soshal midia dịka ọtụtụ ndị a ma ama toro.

    Otu onye ọkpa ọchị a ma ama dịka 'I go save', kwuru na "ọ bụ naanị ndị siri ike na-arịọ mgbaghara".

  10. Ụlọụka ezegidela ndị nọ n'ime ya n'oge emume mmirichukwu, gbuo mmadụ iri

    Ụlọụka dara na Mexico

    Ebe foto si, Reuters

    Opekata mpe mmadụ iri alaala mmụọ, tinyere ụmụaka atọ, dịka elu otu ụlọụka zere na mpaghara Ugwu mba Mexico.

    Ihe a mere n'ehihie ụbọchị Sọnde, oge a na-aka ụka mmirichukwu n'ụlọụka Santa Cruz n'obodo Ciudad Madero.

    Mmadụ 60 merụrụ ahụ n'ọdachi ahụ, abụọ n'ime ha merụrụ nnukwu ahụ dịka igwe na okwute dagidere ha n'elu.

    Ndị ọrụ gbatagbata ejirila nnukwu igwe 'crane' abụọ bupuchaa ihe ndị ahụ dara ada ma zọpụta ndị tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ.

    Ụkọchukwu na-aka ụka oge ihe a mere, bụ Ángel Vargas, kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute na ụbọchị kwesịrị ịbụ ụbọchị ọṅụ tụgharịrị bụrụ ụbọchị anyammiri.

    Ụlọụka dara na Mexico

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, N'ime ụlọụka ahụ dịka elu ya zere

    Otu onye n'ime ndị lanahụrụ ọdachi ahụ, aha ya bụ Josefina Ramirez, kwuru na o so n'otu onye n'ime ndị bịara ịmụta mmadụ na mmirichukwu.

    "Ekele dịrị Chineke na m dị ndụ... Ụjọ tụrụ m na m agaghị ahụ nwa m nwaanyị anya ọzọ. Enweghị m ike ịkọwa etu anyị si pụta," ka Josefina kwuru.

    Akụkọ kwuru na otu onye ụlọụka ahụ dagidere zipuru ozi na 'whatsapp' nke nyeere ndị ọrụ gbatagbata aka ịchọta ebe ya bụ ihe mere.

    Ụlọ ntaakụkọ Mexico bụ Milenio kwuru na otu obere nwa, na otu di na nwunye na nwa ha nwoke dị afọ asatọ so na ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ.

    Bishọp nke dayọsis Tampico, bụ ebe ụlọụka ahụ dị kwuru na ya na-ekpere ndị niile ọdachi ahụ metụtara ekpere.

  11. Ụlọikpe 'tribunal' achụọla gọvanọ Nasarawa steeti ọsọ ụkwụ eru ala

    Abdullahi Sule na David Ombugadu

    Ebe foto si, SULE/DAVID/FACEBOOK

    Nkọwa foto, Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ David Ombugadu nke PDP meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Nasarawa Steeti n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachi, ọ bụghị Abdullahi Sule nke APC

    Ụlọikpe kpere ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Nasarawa Steeti achụpụla Gọvanọ Steeti ahụ bụ Abdullahi Sule ma kwuo na ọ bụghị ya meriri na ntuliaka ahụ e nwere n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ a.

    Mmadụ abụọ n'ime ndị ọkaikpe atọ nọrọ n'isi ikpe ahụ kwuru na ọ bụ David Ombugadu nke nọ n'otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party' (PDP) meriri ntuliaka ahụ.

    Mana otu n'ime ndị ọkaikpe ahụ kwuru na ọ bụ Abdullahi Sule meriri.

    Cheta na ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ 'The Independent National Electoral Commission' (INEC) kpọpụtara Abdullahi Sule dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ na Nasarawa steeti.

    Inec sị na Sule nwetara vootu 347,209 ebe Ombugadu nwetara vootu 283,016 iji gbaa onye nke abụọ, Abdullahi Maidoya nke otu 'New Nigeria Peoples Party' (NNPP) gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu 11,726.

    Abdullahi Sule ka nwere ohere ịgbagha mkpebi ụlọikpe 'tribunal' n'ụlọikpe mkpegharị nakwa ụlọikpe kachasị. Nke a pụtara na ọ ka ga-anọ n'ọkwa gọvanọ ruo mgbe ụlọikpe kachasị nyere mkpebi n'okwu a.

  12. WHO enyela nkwado maka ọgwụ mgbochi nke abụọ maka ọrịa 'Malaria'

    Nwaanyí sayensí

    Ebe foto si, University of Oxford

    Otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' enyela nkwado maka ọgwụ mgbochi ọrịa 'malaria' bụ nke nnyocha gosiri na ịdị ire ya ruru pasentị 75.

    Ọgwụ mgbochi ahụ nke ndị rụpụtara ya bụ Mahadum Oxford, bụ naanị ọgwụ mgbochi rịa malaria nke abụọ e nwerela.

    Ọrịa malaria na-egbu ọtụtụ mmadụ kwa afọ, ọ kachasị ụmụ ntakịrị, ma bụrụkwa otu n'ime ọrịa kacha enye mmadụ nsogbu n'ụwa.

    Ihe na-akpata ọrịa malaria bụ nje nke anwụnta na-ekesa. Nje a ga-abịa zoo n'ime ahụ mmadụ ma na-agbanwe ụdị ya kwa mgbe kwa mgbe nke mere o ji ara ahụ igbu ya.

    Nke a mekwara o ji ara ahụ mmadụ inweta 'immunity' maka ọrịa ahụ, maọbụ ịrụpụta ọgwụ mgbochi ga-adị ire iji buso ya agha.

    Enweelarị nkwekọrịta ịrụpụta ihe karịrị otu narị nde ọgwụ mgbochi ahụ kwa afọ.

    Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ obere ka o ruo afọ abụọ e ji nweta ọgwụ mgbochi nke mbụ maka ọrịa a - a na-akpọ RTS,S nke ụlọọrụ GSK rụpụtara - bụkwa nke otu WHO kwadoro.

    Onyeisi otu WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus kwuru na taa bụ ụbọchị "nnukwu aṅụrị".

    "Ana m arọbu nrọ maka ụbọchị anyị ga-enweta ezigbo ọgwụ mgbochi ga-adị ire iji buso malaria agha, mana ugbua anyị enweela abụọ," ka o kwuru.

    Ọnụahịa maka otu ọgwụ mgbochi a bụ ihe dịka dọla abụọ ruo dọla anọ, otu onye kwesịrị ịgbazu anọ iji nwee ezi nchekwa.

    N'afọ 2021, ọrịa malaria metụtara ihe ruru mmadụ nde 247, ebe ihe karịrị puku mmadụ 619 nwụrụ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

    Pasentị 95 ebe malaria kacha akpa ike bụ n'Afrịịka.

  13. Diezani Alison-Madueke apụtala n'ụlọikpe na London maka ebubo iri ngarị

    Diezani Alison-Madueke

    Ebe foto si, Getty

    Onye bụbụ Minista mmadụ agbịdị Naijiria bụ Diezani Alison-Madueke pụtara n'ụlọikpe na mba Briten ụbọchị Monday(2/10/2023) maka ịzara ọnụ ya n'ebubo iri ngarị.

    A nwụchiri Diezani Alison-Madueke na London n' afọ 2015 maka ebubo iri ngarị nke bịara ya n'ụdị ego, ihe onyinye dara oke ọnụahịa, njem ụgbọelu nakwa ụlọ dị oke ọnụahịa na mba Briten nke a sị ndị na-achọ ọrụ ngo mmanụ nyegara ya.

    Oge ọ pụtara n'ụlọikpe 'Westminster Magistrates Court', Alison-Madueke kwuru bụ aha ya, ụbọchị a mụrụ ya nakwa ebe obi, dịka ụlọ ntaakụkọ Reuters si kwuo.

    A nwụchiri Alison-Madueke na London ngwangwa ọ rịtuchara n'ọkwa Minista dịka Mịnịsta Mmanụ agbịdị , ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo iri ngagrị isii.

    Mana a tọhapụrụị ya n'afọ asatọ a gara aga ka o si n'ụlọ na-abịa(bail).

  14. Etu ndị ojiegbe si wakpo Ebonyi steeti n'ụbọchị ezumike ịndịpenda

    Ụgbọala na-agba ọkụ

    Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ awakpola mpaghara okpuruọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi steeti ma gbaa ọtụtụ ụgbọala na ọgbatumtum ọkụ, chụsasịkwaa ndị mmadụ na-agara mkpa ha.

    Mwakpo a mere taa bụ Mọnde, ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọkụtoba, nke bụkwa ụbọchị ezumike maka emume ncheta afọ 63 kamgbe Naịjirịa ji nwere onwe ya.

    Ndị ekperima a nọ n'iume ụgbọala Sienna bịaruru na Ezzamgbo 'junction' malite ịgbali egbe elu, chụsaa ndị mmadụ nọ okirikiri ahụ, ọtụtụ hapụkwara ụgbọala ha na ọgbatumtum ha gbaa ọsọ ndụ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi Steeti bụ Onome Onovewakpoya si kwuo, ihe lara n'iyi na mwakpo ahụ gụnyere ụgbọala bus atọ, ọgbatumtum anọ, na otu obere ụgbọala ụkwụ atọ (keke).

    "Onweghị onye ọbụla nwụrụ na mwakpo a," Onovewakpoya kwuru.

    Ndị uweojii boro ebubo na ọ bụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) na ngalaba ọgụ ha bụ 'Easetern Security Network (ESN) mere mwakpo a.

    "Anyị ezipula ndị ọtụ anyị na mpaghara dị icheiche na steeti a iji jide ndị mere ihe. Anyị nwere nkwenye na tupu ụbọchị taa agafee, anyị ga-ejide ha."

    Ọgbatumtu anọ a gbara ọkụ

    Enweghị nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa dịka ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ na-awakpo, na-atọrọ, ma na-egbukwa ndị mmadụ aghara aghara.

    Ya bụ ihe rịrị elu dịka gọọmentị Naịjirịa jidechara onyeisi otu Ipob bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa n'ọnwa Jun afọ 2021.

    Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ DSS, mana ikpe gbasara ya ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa.

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nnamdi Kanu, onyeisi otu Ipob nọ ugbua n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS n'Abuja kamgbe ọnwa June afọ 2021

    Iji gosi iwe maka njide onyeisi ha, otu Ipob tinyere iwu na onweghị onye ga na-apụta ezi kwa ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ruo mgbe a ga-atọhapụ onyeisi ha.

    Mana ha mechara wepụ iwu ahụ, kama ụfọdụ ndị otu ahụ ekweghị.

    Nke a mere ka otu Ipob kewaa, ndị nke kpọrọ onwe ha 'auto-pilot' wee ṅụọ iyi na agaghị na-enwe mkpagharị na steeti ise mebere mpaghara ọwụwa anyanụ n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

    Ndị ojiegbe na-akpagharị n'ebe dị icheiche na-eyi ndị mmadụ egwu maka ịpụta ezi n'ụbọchị Mọnde.

    Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi nke a, ọtụtụ akụnụba ka a lakwara n'iyi, mwakpo ndị ojiegbe n'ụlọọrụ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche kawanyekwara njọ.

    Gọọmentị Naịjirịa na-ebo ebubo na ọ bụ otu Ipob - bụ otu a machiri amachi ma kpọọ ha ndị na-eyi ndụ egwu - na-eme ihe ndị a, mana Ipob agọọla ugboro ugboro na ọ bụghị ha.

  15. Aka akparala agadi nwoke, ndị ọzọ maka mgbere ọgwụ ike

    Ado Mai  Unguwa

    Ebe foto si, NDLEA

    Nkọwa foto, E nwetara ọgwụike dara kilogram 143.2 n'aka Ado Mai Unguwa gbara afọ 70

    Na Kano steeti,ndị ọrụ ngalaba na-ebu agha megide ọgwụ ike na Naijiria a kpọrọ,'National Drug Law Enforcement Agency'(NDLEA) anwụchiela otu papa nnukwu gbara afọ 70 aha ya bụ Ado Mai Unguwa n'obodo Dindere dị n'Okpuru Ọchịchị Tofa dịka e nwetara ọgwụike dị kilogram 143.2k n'aka ya.

    Ndlea nwụchikwara otu nwoke a na-achọ achọ maka izọ ọgwụ ike dị kilogram 1.500 n'ime akpa ntụ ọka ọ chọrọ izipụ gaa mba Briten adanyela n'ọnya e siri ya.

    Aka ghọọrọ Chigozie Obiorah gbara afọ 39 n'abalị 28 nke ọnwa Septemba n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed Airport dị na Legọs dịka ọ bịara ifepụ Naijiria.

    Dịka ozi si Ndlea si kwuo, Chigozie amaghị na ụgba akụọla n'okwe ọ zụrụ n'abalị 15 nke ọnwa Septemper bụ oge o bunyere mmadụ(Nworah Adaugo Precious) ahia o zoro ọgwụ ike n'ime ya, ya ebutekwa igbe ọgwụ ike dị kilogram abụọ maka izipụ ala Bekee aka were kpara ya.

    Oge a jụrụ ya ajụjụ ọnụ, nwa amadi ahụ kwuru na ya na-azụbu ahịa akpụkpọ ụkwụ tupu ya banye na mgbere ọgwụike.

    Na nke yiri ya, aka NDLEA kpaara ọkwọụgbọala ''truck' bu igbe ihe e ji asa eze(toothpaste) e zoro ọgwụike si Legọs aga Kano nke ọgwu ike e nwetara dị kilogram 1,188.

    A nwuchiri Amafan Fattison, gbara afọ iri abụọ na asatọ na ụgbọala ọ kwọ n'Abuja.

    Chigozie Obiorah

    Ebe foto si, NDLEA

    Nkọwa foto, Chigozie Obiorah na-azụbu ahịa akpọkpọụkwụ
  16. Spain Nightclub Fire: Etu ọkụ si gbagbuo mmadụ 13 n'ụlọ a na-agba oringo na Spain

    Ọkụ ọgbụgba

    Ebe foto si, Screen grab

    Opekatampe mmadụ 13 atụfuola ndụ ha dịka ọkụ ọgbụgba malitere n'ụlọ oringo (nightclub) atọ na mpaghara Murcia nke mba Spen.

    Ọkụ ahụ malitere ịgba n'ebe a na-akpọ 'Fonda Milagros nightclub' - nke e ji La Fonda mara - n'isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde.

    O si eba ahụ banye n'ụlọ ndị nọdebere ya nso dịka ndị mmadụ na-achọ ụzọ isi zọọ ndụ ha, ndị uweojii Spen kwuru.

    Akụkọ kwuru na otu ezinụlọ ndị nọ na-eme emume ncheta ọmụmụ otu n'ime ha so na ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ.

    Otu onye so n'emume ncheta ọmụmụ ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ya na ụmụnne ya so nọrọ n'ebe ahụ, mana ya onwe ya gbapụtara oge ọkụ ahụ na-agba mana ka ọ lọtara ụlọ, ọ nụrụ na otu n'ime ụmụnne ya apụtabeghị.

    O dobeghị anya ma nwanne ya ahụ o so na ndị nwụrụ n'ọkụ ahụ.

    Ndị uweojii kwuru na ndị niile a ma nwụrụla n'ọkụ ọgbụgba ahụ nwụrụ na La Fonda.

    Ka ọ dị ugbua, amabeghị ihe kpatara ọkụ ahụ mana ndị uweojii sị na nnyocha ka na-aga n'ihu.

  17. Mmadụ ise alaala mmụọ dịka 'tanker' bu mmanụ ụgbọala dara na Delta Steeti

    Tanker na-agba ọkụ
    Nkọwa foto, Nke a bụ foto ochie e tinyere iji kọwaa akụkọ

    Ndị uweojii Delta Steeti ekwupụtala etu ihe mberede ọkụ ọgbụgba si gbuo mmadụ ise n'okporo ụzọ si Benin gawa Warri, n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa ọktoba 2023.

    Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti kwuru na ọkụ ọgbụgba a lakwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'iyi nke gụnyere ụgbọala bus asatọ, nnukwu ụgbọala 'tanker' abụọ, ụgbọala 'trailer' ise, ụgbọala abụọ na otu ọgbatumtum.

    Edafe kwuru na dịka 'tanker' ahụ bu mmanụ ụgbọala dara n'okporo ụzọ Benin-Warri, mmanụ ụgbọala o bu wụfuru n'ụzọ nke mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa gbakọta ma na-ekuru ya bụ mmanụ ụgbọala.

    Dịka nke a na-eme, ụgbọala ahụ gbara ka ogbunige ma nwuru ọkụ n'okirikiri ahụ niile, nke gburu ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ eku mmanụ ụgbọala, ma merụkwaa ụfọdụ ndị ọzọ ahụ.

    Gọvanọ Delta Steeti bụ Sheriff Oborevwori ezigala ozi iti aka n'obi nye ezinụlọ ndị ọdachi ahụ metụtara, ma kwe nkwa inyere ndị nke merụrụ ahụ aka.

    Oborevwori kwuru na ihe kpatara ụgbọala 'tanker' ahụ ji daa bụ maka na okporoụzọ ahụ adịghị mma, mere o ji kpọkuo gọọmentị etiti ka ha mee ngwangwa mezie mpaghara ebe mebiri emebi n'okporoụzọ ahụ.

  18. Aka m adịghị n'ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị n'Imo Steeti - Gọvanọ Uzodinma

    Hope Uzodinma

    Ebe foto si, Hope Uzodinma

    Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma ekwuola na aka ya adịghị n'ọnọdụ nchekwa ọjọọ nke na-akawanye njọ na steeti ahụ.

    Uzodinma kwuru nke a n'emume ofufe nru nke e mere n'obodo ya bụ Omuma n'ụbọchị Satọdee iji mepee ụlọụka nke Uzodinma nyere ụka Katọlik nke Dayọsis Orlu dịka onyinye; aha ụlọụka ahụ bụ 'St.Rose of Lima Catholic Church Parish Ozuh Omuma'.

    O kwuru na onye ọbụla na-ebo ya ebubo itinye aka na nkwafu ọbara na enweghị udo n'Imo steeti, bụ ndị ọjọọ ndị jọrọ imetọ aha ya nakwa ọchịchị ya.

    "Onye ọbụla bụ gọvanọ chọrọ ka udo dị na steeti ya ka o wee nwee ohere iwetara ndị nke ya ọganihu na mmepe. Ebe ọ bụ na ọ bụ Chineke mere m gọvanọ, gịnị kpatara m ga-eji were ọgbaaghara kwụghachi ya ụgwọ site n'ịgbachi nkịtị ka a na-egbu ndị nke ya?" Uzodinma jụrụ.

    "Mana 'agbanyeghị ebubo niile a na mmetọ aha m na ọchịchị m, o doola onye ọbụla anya na Chineke nọnyeere m, maka na ike niile dị n'aka Chineke.

    "Dịka onye Chineke meere nnukwu amara n'ụzọ dị icheiche, eji m Chineke ụgwọ ekele oge niile, nke mere o ji bụrụ ihe na-ekweghị omume na mụ ga-etinye aka n'iweta ọgbaaghara na enweghị udo n'ime steeti Chineke mere m gọvanọ."

    Uzodinma dọrọ ndị niile na-ebute ọnọdụ nchekwa ọjọọ n'Imo Steeti aka na ntị ka ha kwụsị ime nke a "maka na ụnụ niile ga-aza ajụjụ mmehie ụnụ n'ihu Chineke n'ụbọchị ikpeazụ".

    Imo Steeti so na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ebe ọnọdụ nchekwa ọjọọ kacha arị elu n'ọdị nso a.

  19. Ọdọụgbọelu Anambra Steeti ga-azawazi aha Chinua Achebe - Soludo

    Chukwuma Soludo na Chinua Achebe

    Ebe foto si, Soludo/Getty Images

    Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo agụgharịala ọdọụgbọelu Anambra Steeti dị n'Umueri aha, ka ọ zawazie aha ọkammụta Chinua Achebe, bụ onye ode akwụkwọ ụwa niile ma ama larala mmụọ.

    Soludo kwuru nke a n'Awka, isi obodo Anambra Steeti, n'ụbọchị Sọnde, dịka a na-eme emume ncheta afọ 63 Naịjirịa ji bụrụ obodo nweereonwe ya.

    O kwuru na nnukwu mmadu dịka Achebe kwesịrị inwe ọkpụrụkpụ ihe nke a ga-eji enye aha ya, iji mee ka ncheta ya dị ọkpụtọrọkpụ na Naịjirịa.

    "N'ihi nke a, ọdọ ugboelu steeti anyị nke a na-akpọbu 'Anambra International Cargo and Passenger Airport, Umueri', ga-azawazi 'Chinua Achebe International Passenger and Cargo Airport, Umueri'", Soludo kwuru.

    Gọvanọ ahụ kwuru na ya na ọtụtụ ndị welitere isi n'Anambra steeti nwere mkparịtaụka ugboro ugboro tupu gọọmentị ekpebie ịkwanyere ncheta Chinua Achebe ugwu pụrụ iche n'ụzọ dị otu a.

    Soludo kọwara Achebe dịka otu n'ime ndị kacha wetara Naịjirịa nakwa Anambra Steeti aha ọma na nkwanye ugwu na n'ụwa niile.

    Ọkammụta Chinua Achebe bụ onye Ogidi, nke dị n'okpuruọchịchị Idemili North n'Anambra Steeti.

    O dere ọtụtụ akwụkwọ nke ụwa ma ama, tinyere: 'Things Fall Apart', Arrow of God, A man of the People, Chike and The River, There Was A Country, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ọtụtụ akwụkwọ o dere ka a tụgharịkwara n'asụsụ dị icheiche.

    Achebe lara mmụọ n'afọ 2013 dịka ọ gbachara afọ 83.

  20. Nigeria Independence: Ụgwọ ọnwa opekatampe agaghị ezu ịzụta otu akpa osikapa - NLC

    Joe Ajaero na Bola Tinubu

    Ebe foto si, BBC/Bola Tinubu

    Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Labour Congress' bụ Joe Ajaero akwaala arịrị maka ọnọdụ ọjọọ nke ọ sị na ndịọrụ Naịjirịa nọ n'ime ya dịka a na-eme emume ncheta afọ 63 Naịjirịa ji bụrụ mba nweere onwe ya.

    N'ozi ekele o zigaara ndị ọrụ, Ajaero kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute na ụgwọọnwa opekatampa nke ndị ọrụ Naịjirịa enweghị ike ịzụtali otu akpa osikapa, kama "ọ bụ ojisi ike ka ọ ga-eji zụtalie ogbe achịcha nta 30, mana n'agbanyeghị nke a, ọ bụghịkwa steeti niile na-akwụzu ụgwọ ọnwa opekatampe bụ N30,000".

    "O kweghị nghọta ihe o ji bụrụ na dịka ndị ọrụ na-arụsiwanye ọrụ ike, ụgwọ ọnwa ha a na-epewanye mpe, nke mere na ndị ọrụ Naịjirịa anaghị enweike igbo mkpa dịịrị ha."

    "Ọtụtụ ndị ọrụ na-abụ ha gaa ọrụ n'ụbọchị Mọnde, ha ga na-arahụ n'ụlọọrụ ha ruo mgbede ụbọchị Fraịde tupu ha alaa ụlọ ha, maka na ha anaghị enweike ịkwụ ego maka njem okporoụzọ kwa ụbọchị.

    "Gọọmentị a ajụla ime ihe ọbụla iji nye aka ma zọpụta ndị mmadụ na nnukwu ahụhụ a ha na-ata. Nke a mere anyị ji aga n'ihu na'alụ ọgụ maka mbuli ụgwọ ọnwa iji belata ahụhụ na ihe isiike nke mgbali ọnụahịa wetara."

    Cheta na otu NLC na TUC kanyere ụbọchị Tuzde bụ abalị atọ nke ọnwa Ọktoba dịka ụbọchị ha ga-amalite abụbụọrụ maka ihe isiike dị na Naịjirịa ugbua.

    Mana ndị isi gọọmentị na ndị isi otu abụọ ahụ amalitela ọgbakọ n'ụbọchị Sọnde a iji gbochie abụbụọrụ ọbụla.