Lebanye anya na nkwafu ọbara na-eme na mpaghara Okigwe - Achonu na-arịọ Tinubu

Ebe foto si, Athan Achonu
Otu n'ime ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti bụ Athan Achonu, akpọkuola onyeisiala Tinubu ka o hibe kọmiti pụrụ iche iji nyochaa "ogbunigwe nke ndị agha na-atụ na mpaghara Okigwe, nke gburula ọtụtụ mmadụ ma lakwaa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'iyi".
Achonu, onye na-azọ gọvanọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'Owerri, isi obodo Imo Steeti n'ụbọchị Sọnde.
"Ọ bụ nnukwu mwute ka m ji eme mgbasaozi a gbasara ogbunigwe nke ndị agha Naịjirịa na-atụ aghara aghara na mpaghara Okigwe," Achonu kwuru.
"Ụdị mwakpo na aka ike dị otu a nke gọọmentị na-akwado ekwesịghị ịdakwasa mpaghara ọbụla maọbụ obodo ọbụla.
"Ana m akpọku onyeisiala ka o hibe otu ga-etinye anya ma nyochaa ndị a na-ebute nkwafu ọbara na mmebi ngwongwo ndị mmadụ bụ nke na-aga n'ihu ugbua n'Imo Steeti.
"Onyeisiala werekwa ọkwa ya kpọọ gọvanọ Imo steeti ma dọọ ya aka na ntị, ọ kachasị dịka o kwuru n'ọdị nso a na ya ga-atụ ogbunigwe n'obodo dị icheiche n'Imo Steeti."
Achonu sị na ọ bụrụ na ya merie ntuliaka, ọ ga-agba mbọ hụ na ndị mwakpo a metụtara ga-enweta ikpe ziri ezi.
Mana onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Hope Uzodinma n'ihe gbasara mgbasaozi, bụ Collins Ughalaa, kwuru na ebubo Achonu na-ebo abụghị eziokwu.
Na mkparịtaụka ya na onyentaakụkọ BBC, Ughalaa kwuru na ọ bụ ndị agha Naịjirịa malitere atụmatụ nchekwa ha kpọrọ 'Operation Golden Dawn III" bụ nke ha sị na ọ bụ iji kpochapụ ndị ekperima na-eme ndị Imo steeti ụra aga n'anya.
"Kedụ etu Achonu ga-esi taa gọvanọ ụta maka atụmatụ nchekwa nke ndị agha na-eme iji buso ndị ekperima agha," Ughalaa jụrụ.
"Ọtụtụ ndị ekperima, bụ ndị na-enweta nkwado n'aka ụfọdụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị, na-eyi ndị mmadụ egwu na mpaghara Okigwe. Ihe gbasara nchekwa bụ ihe dị mkpa nke onye ọbụla kwesịrị itinye aka ka o wee dị mma, ọ bụghị ihe e kwesịrị iji na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị."
Ọ gara n'ihu kwuo na ugbua abụghị oge onye ọbụla ji ata ibe ya ụta, kama ọ bụ oge e kwesịrị ijikọ aka ọnụ maka ọdịmma ndị Imo steeti.
Cheta na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Imo Steeti ga-abụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 2023.




















