Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. Nnọọ na peeji anyị taa

    Soro anyị maka akụkọ ndị dị mkpa na mba ụwa taa

  2. Ndị ojiegbe egbuola ma bepụ onye uweojii isi n’Aba

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Nigeria Police Force

    Ndị ojiegbe awakpoola ndị uweojii nọ n’ọrụ n’okporoụzọ Umuode/Isiahia dị n’okpurọchịchị Osisioma Ngwa nke Abia Steeti gbuo otu onye n’ime ha ma bepụ ya isi.

    Akụkọ kwuru na mkpamkpa a mere n’ihe dịka elekere anọ nke mgbede Tọzde 26 Ọktoba 2023 mgbe ndị ojiegbe wakporo ndị uweojii ahụ.

    Mgbe nke mere ndị uweojii ndị ọzọ buuru egbe ahụ gbaa ọsọ dịka ndị uweojii egbe jidere otu n’ime ha gbuo ya ma bepụ ya isi.

    Ndị ojiegbe a gara n’ihu buru isi onye uweojii ahụ ma hapụ ozu ahụ ya ebe ahụ.

    Nke a emeela ka ọtụtụ ndị bi n’obodo Umuode gbaa ọsọ n’ihi ụjọọ na ndị uweojii nwereike ịbịa wakpoo obodod ha na nzaghachị.

    Tupu akụkọ a apụta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abia bụ Maureen Chinaka azaghị ọtụtụ oku a kpọrọ ya n’ekwentị.

    Cheta na n’ọnwa ole na ole gara aga, ka ndị ojiegbe gbukwara ma bepụ onye uweojii isi n’okporoụzọ East dị n’Aba South nke Abia Steeti.

  3. Opekatampe mmadụ 16 anwụọla na mwakpo onyejiegbe na mba Amerịka

    Ndị uweojii na-achọ onye ahụ n'ọdọ mbusa ụgbọala

    Ebe foto si, CBS

    Opekatampe mmadụ 16 anwụọla na mwakpo ojiegbe mere n'obodo Lewiston dị na Maine nke mba Amerịka dịka a na-achọ onye ojiegbe ahụ.

    Ndi uweojii kwuru na ebidoro ị gba egbe na elekere asaa n’ụbọchị wenesde n'ebe a na-egwu egwu Bowling nakwa ụlọoriri.

    Robert Card dị afọ 40 bụ onye ndị uweojii na-atụ aka kpara mkpamkpa a dịka ha na-agwa ndị mmadụ zee ya n'ihi na ọ bụ egbe ma dịrị njikere ịgbapụ ya.

    Ndị uweojii ekwubeghi hoo haa mmadụ ole nwụrụ na ya bụ ihe mana onye otu BBC n'Amerịka bụ CBS kwuru na o nwereike iru mmadụ iri na isii.

    Akukọ na efegjhiarị kwụrụ na ihe ruru mmadu 50 meruru-ahu.

    Kọmishọna na ahu maka nchekwa ọha na obodo Maine bụ Micheal Sauschuck kwuru na ya bụ ihe metụtara ọtụtụ mmadu.

    Lewiston bụ obodo nke abụọ kacha ibu na Maine ma agụchaa Portland, ọnu ọgugu mmadu 38,000 bi na Lewiston.

    Ndị uweojii Lewiston kwuru na ha na-elebanye anya na egbe ahu agbara n’ụlọriri Schemengees nakwa ụlọezụmịke akpọrọ ‘’Sparetime Recreation’’ ebe abụọ dị onwe ha nso.

  4. Unu abọọla chi?

    Daalụ maka isonye anyị taa.

    Jisike.

  5. Ndị Sịnetị chọrọ ime iwu ga-egbochi onyeisi CBN ịzọ ọkwa ọchịchị

    Ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Central Bank

    Ebe foto si, CBN/Facebook

    Ndị Sịnetọ na-atụ arọ ime iwu ga-egbochi onyeisi ụlọakụ etiti bụ Central Bank na osote ya ịzọ ọkwa ọchịchị mgbe ha ka nọ n’ọkwa ahụ.

    Iwu abụọ ahụ agafeela ngụpụta nke ugboro abụọ n’ụlọomeiwu ukwu.

    Ndị omeiwu gụpụtara iwu ndị a mgbe ndị omeiwu abụọ kwupụtara iwu abụọ ndị a yiwere onwe ha, nke omeiwu a bụ Sịnetọ Sunday Karimi na-anọchite anya Kogi West na Darlington Nwokocha nke Abia Central.

    Mgbe a na-arụrịtaụka banyere ya, ndị omeiwu a sị ka e mezie ngalaba iwu nke itoolu nke ga-egbochi onyeisi ụlọakụ Central Bank na osote ya isonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ha ka ji ọkwa ahụ.

    Nke a na-abịa dịka onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele gbatara akwụkwọ iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka e mere n’ọnwa Febụwarị 2023 n’aha All Progressive Congress (APC).

    Mkpebi ahụ butere nkatọ site n’ebe ndị iche iche nke mere ọtụtụ ji na-akpọ oku ka onyeisiala n’oge ahụ bụ Muhammadu Buhari chụọ Emefiele n’ọkwa ahụ.

    Ngwa ngwa Tinubu batara n’ọkwa, ọ chuturu Emefiela n’ọkwa ma malite ikpe ya ikpe n’ụlọikpe.

  6. Ọgụ otu nzuzo abụọ achụsasịala ndị ahịa n'Ebonyi steeti

    Ahịa Ngkwuagu

    Ndị na-azụ ahịa n'ahịa Nkwuagu dị n'Afikpo, Abakaliki nke Ebonyi Steeti agbaala ọsọndụ maka ọgụ ndị otu nzuzo na-alụ.

    Dịka akuko si kwuo, ọtụtụ ndị mmadu anwụọla n’ọgụ ahụ, ebe e mebiri ngwongwo ọtụtụ.

    Ọgụ ahụ tinyere ndị na-azụ ahịa ụjọ, nke mere ha jiri kwụsị azụmahịa n’ahịa Nkwuagu.

    Ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na na jidere ụfọdụ ndị ha na na-enyo so ns ndị otu nzuzo ahụ.

    Dịka akụkọ si kwuo, otu nzuzo abụọ lụrụ ọgụ n’obodo Nkwuagu, nke mere evjiri gbuọ ọtụtụ umuokoroọbịa.

    Ahịa Nkwuagu dị n'Ebonyi Steeti

    Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọgụ ndị otu nzuzo a na-alụ egbuola mmadụ anọ, otu n’ime ndị nwụrụ bụ onye ka gụchara akwụkwọ na mahadum.

    "Kemgbe abalị anọ, ndị ahia akwụsịla ịzụ ahịa n’ime ahịa Nkwagu, bụ ahịa dị nso n’ogige ndị agha."

    "A lụọla ọgụ ugboro abụọ n'ahịa a. Ndị bi nso n’ahịa ahụ na ezinaụlọ ha agbaala ọsọndụ."

    Dịka akụkọ si kwuo, kemgbe ọgụ a bidoro, e tinyere ndịagha nakwa ndi uweojii ebe dị icheiche n’obodo ahụ maka nchekwa.

    "Anyị nụrụ na a nwụchiri ọtụtụ mmadu ndị a na-amaghị aha ha n’obodo Nkwuagu nke gụnyere otu Onyeze ọdinala."

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steetị bụ SP Onome Onovwakpoyeya kwetere na ọ bụ eziokwu na a na-alụ ọgụ. O kwuru na ha anwụchiela ọtụtụ mmadụ dịka nyocha ka na-aga n’ihu maka nke a.

  7. Etu e si zọpụta nwa dị ọnwa atọ nnenne ya rere 50,000 n'Anambra

    Nwata dị ọnwa atọ e reere ere

    Ebe foto si, Ministry of Women Affairs Anambra State

    Ministri na-ahụ maka ụmụnwaanyị n’Anambra Steeti azọpụtala obere nwata dị ọnwa atọ bụ onye a sị nnenne ya refuru n’ọnụego puku naịra iri ise (N50,000).

    Kọmishọna ministri ahụ bụ Ify Obinabo na ndị ọrụ zọpụtara nwata ahụ site na ozi si n’aka otu nwaọgbọghọ bụ Ijeoma Nwosu bụ onye kwuru na nne ya bụ Oluchukwu Nwosu rere nwa ya n’ike dịka ọ mụchara ya ma jụụ ịgwa ya ebe nwa ya nwoke ahụ nọ.

    Mgbe ozi a ruru ministri a ntị, ha malitere nyocha ihe ruru otu ọnwa ma nwụchie ndị aka ha dị n’orire nakwa ọzụzụ nwata ahụ.

    Nnenne nwata ahụ sị na ihe mere o jiri ree nwa nwa ya bụ maka na ihe siiri ha ike n’ụlọ nke mere na nwata ahụ enweghi ezi nlekọta. O kwuru na nke a bụ ugboro atọ nwa ya na-amụ nwa n’ụlọ.

    O kwuru na ụmụ ha abụọ ndị a mụrụ tupu nke a nọ n’ebe a na-elekọta ụmụaka dị n’Awka nke gọọmentị hiwere.

    Oluchukwu kwuru na o rere nwa nwa ya puku naịra iri ise (N50,000)

    O kwuru na ọ hụrụ otu nwoke a kpọrọ Tochukwu Asiegbu zutere ya, kwee ya ọnụahịa ma zụnaara ya nwa ahụ n’ọnụego ahụ.

    Tochukwu Asiegbu kwuru na o nyere Oluchukwu ihe niile ọ chọrọ ma rite uru ego dị puku naịra iri atọ (N30,000) n’orire nwa ahụ.

    Mana nwaanyịzụrụ nwa ahụ bụ Evelyn Egwuatu, onye Uruagu Nnewi sị na o nyere Ebelechukwu Uba bụ nwafọ Ebonyi steeti bi n’Anambra ego dị puku narị naịra abụọ (N200,000) iji zụpụtara ya nwa ahụ.

    Ebelechukwu Uba kwuru na ọ bụ Asiegbu na nnenne nwa bụ Oluchukwu Nwosu kpebiri ịkpọnye nwa ahụ n’aka Evelyn Egwuatu.

    Ha niile kwetere na ha rere ma zụọ nwa ahụ n’ọnwa atọ gara aga, mana nwata ahụ na-arịa ọrịa ugbua ma tachaa ahụ maka na nri a na-enye ya bụ soya beans na-abụghị nri ụmụaka.

    Onye zụrụ nwa ahụ sị na o nweghi ego ịzụ nri nwa e kwesịrị inye ya.

    Ndị niile aka ha dị n’arụ a nọ n’aka ndị uweojii ugbua maka ajụjụ na nyocha.

  8. Gọvanọ Otti ezutela ndị isi otu ndị ugwu maka ahịa Lokpanta

    Govano Otti na onyeisi otu NCM bu Awwal Aliyu

    Ebe foto si, Alex C Otti/Facebook

    Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti nakwa otu na-elekọta ọdịmma ndị ugwu bụ Northern Consensus Movement enweela nzukọ gbasara ahịa Lokpanta.

    Otti kọwara na ọ dịka enwechara nzukọ ahụ na ndị isi otu ahụ enyela nkwado na nnabata na mkpebi ya bụ Otti nwere n'ịtụgharị ahịa nama ahụ ka ọ bụrụ ahịa kwa ụbọchị kama ahịa ebi ebi na ya.

    Otu ahu nke onyeisi ya bụ Awwal Abudullahi Aliyu mechara kagbuo kwara laa ha nyeburu ndị Igbo bi n'ugwu maka nghọtahie ha nwere n'ihe gọọmenti Abia steeti mere.

    Aliyu kwuru na ha ghọtara na o nweghị ikpa oke ọbụla dị n'okpuru mkpebi gọọmenti Abia mere na Lokpanta.

    "A na m eji ohere a akagbu kwara laa nke abalị iri na anọ anyị nyeburu ndị Igbo" ka o kwuru.

    O jikwa ohere ahụ dọọ ndị ugwu bi na steeti ahụ aka na ntị ha gbado anya ma bụrụ ndị na-akwụwa aka ha ọtọ mgbe niile.

    Gọvanọ Otti kelekwara otu ahụ maka nghọta ha ma na-ekwusi ike na a tụgharịrị Lokpanta dịka ahịa kwa ụbọchị iji belata oke ntọ ma wulite nchekwa maka ọdịmma mmadụ niile bi na ya bụ steeti.

  9. Inec ewepula aha Timpire Sylva n'aha ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Bayelsa

    Timpire Sylva

    Ebe foto si, Timpire Sylva/Facebook

    Ngalaba na-elekọta ntuliaka na Naijiria bụ Inec ewepụla aha Timpire Sylva bụ na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha otu APC na Bayelsa steeti n'ime aha ndị na-azọ ọkwa nke ha wepụtara na websait ha.

    Aha ndị ahụ nke onye odeakwụkwọ Inec bụ Rose Oriaran-Anthony binyere aka, gosiri "iwu ụlọikpe" bụ "court order" na Bekee dịka ihe kpatara aha ndị ahụ ejighị dị n'ebe ọ kwesiri.

    Oriaran-Anthony kọwara na ọ bụ iji debe iwu ụlọikpe nyere ka eji wepu aha Sylva nakwa osote ya bụ Jọshụa Maciver n'ahiri aha ha wepụtara.

    Cheta na ụlọikpe ukwu machiri Sylva ịzọ ya bụ ọkwa na-ekwu na ebe e duru ya n'iyi ọrụ ugboro abụọ na ọ ga-emegide iwu ikwe ya ka ọ zọọ ọkwa ọzọ.

  10. Nnọọ na peeji anyị

    Akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ ka anyị wetara gị taa.

    Gbado anya.

  11. Unu emeela

    Anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.

    Sonyekwara anyị ọzọ n'ụtụtụ Wenezde.

    Ya gazie.

  12. Ihe mere anyị ji achọ ụgbọala SUV dara oke ọnụ - Ndị omeiwu Naịjirịa

    Godswill Akpabio, Sunday Karimi, na Tajudeen Abbas

    Ebe foto si, Other

    Nkọwa foto, Godswill Akpabio, onyeisi ụlọ Sineti; Sunday Karimi, onyeisi kọmiti na-ahụ maka ọrụ dị icheiche n'ụlọ omeiwu sineti; na Tajudeen Abbas, onyeisi ụlọ omeiwu nta Naịjirịa

    Sunday Karimi bụ onyeisi kọmiti na-ahụ maka ọrụ dị icheiche n'ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa akọwaala ihe mere ndị omeiwu ji chọọ ịzụta ụgbọala SUV dara oke ọnụ ma kesaara onwe ha n'otu n'otu, dịka o kwuru na ọ bụ iji mee ka ọrụ ha dịwanyere ha mfe.

    Karimi nyere nkọwa a n'ụbọchị Tuzde na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ, dịka ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-akatọ ijeri kwuru ijeri naịra nke gọọmentị etiti mapụtara iji zụtara ndị omeiwu ụgbọala, n'agbanyeghị ihe isiike ọtụtụ mmaọ̄ụ na-agabiga na Naịjirịa ugbua n'ihi ọnọdụ akụnụba ọjọọ.

    Na nkọwa ya, Karimi jụrụ ajụjụ ihe mere o ji bụrụ naanị ndị omeiwu ka a na-akatọ, "mana ndị sinetọ na-enwecha ụgbọala Land Cruiser maọbụ Prado karịrị atọ, mana onweghị onye na-ajụ ha ajụjụ ọbụla".

    Ọ kọwara na ọ bụghị naanị ndị Sinetọ kpebiri ụgbọala a ga-azụta, kama ọbụ ndị omeiwu niile nọrọ kpebie ya.

    "Gaa lee ka okporoụzọ Naịjirịa dị. Ọ bụrụ na m mee njem gaa na mpaghara m na-anọchite anya ha lọta, ana m emefu ọtụtụ ego iji dozie ụgbọala m maka na okporoụzọ jọrọ njọ nke ukwuu," ka o kwuru.

    "Anyị tulere ọtụtụ ihe tupu anyị ekpebie na ọ ga-abụ Land Cruiser maọbụ Prado. Anyị chọrọ ihe anyị nwereike iji na-arụ ọrụ ruo afọ anọ ọzọ, maka na na ị ma na ihe gbasara ịzụta ụgbọala maka ndị omeiwu bụ ihe a na-eme kwa afọ anọ ọbụla."

    Karimi kwuru na ọ bụladị ndị omeiwu steeti dị icheiche maọbụ ndị isi oche okpuru ọchịchị dị icheiche, "tupu ha a na-amalite ọrụ ha, gọvanọ azụọrọla ha ụgbọala dị icheiche debe edebe, ngwangwa a na-edu ha n'iyi ọrụ, e bunye ha ụgbọala ha".

    Iji kọwaa ihe mere ha ji azụ ụgbọala ndị ahụ oke ọnụ, Karimi kwuru na ọ bụ maka na anaghị akwụ ndị ha na-azụta ụgbọala ahụ ụgwọ ngwangwa.

    "Oge anyị malitere ọrụ, anyị chọpụtara na ụlọ omeiwu a ji ụgwọ maka ndị ha zụrụ ụgbọala maka ndị ụlọ omeiwu nke asaa, nke asatọ na nke itoolu. Ọ bụrụ gị ka e ji ụgwọ ụgbọala i butere kamgbe afọ 2014 maọbụ 2015, ị chọọ ibute ọzọ, ị ga-enye ha n'ọnụ ahịa a na-ere ya ugbua?"

    N'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba 2023, otu 'Socio-Economic Rights and Accountability Project' (Serap) wegara mkpesa n'ụlọikpe dị na Legọs iji kwuo ka a kwụsị gọọmentị etiti imefu ego ahụ ruru ijeri naịra 56.7 bụ nke ha chọrọ imefu maka ụgbọala ọhụrụ a ga-enye ndị omeiwu.

  13. Ụlọikpe kachasị na Naijiria atụpụla ikpe Smart Adeyemi gbara APC

    Smart Adeyemi

    Ebe foto si, @SenSmartAdeyemi/X

    Ụlọikpe kachasị atụpụla akwụkwọ Smart Adeyemi gbara otu All Progressives Congress bụ APC nakwa onye ha họpụtara ga-anọchi anya ha bụ Usman Ododo na ntuliaka ime ụlọ nke otu ahụ mere n'ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel afọ 2023.

    Ụlọikpe kachasị kọwara na ha mere nke a n'ihi na mkpegharị nke Adeyemi gbadoro aka na ya ezughị oke.

    Adeyemi agbabuola akwụkwọ n'ụlọikpe ụkwụ ka ha kagbuo nhọpụta Usman Ododo dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ Kogi steeti ga-eme n'ụbọchị 11 nke ọnwa Novemba.

    Dịka atụpụchara ikpe Adeyemi, a gwara ya kwụọ APC nakwa Ododo otu nde naira icheiche.

    Ụlọikpe ahụ gbarụrụ ihu maka atụmatụ ndị mmadụ ịga n'igwe onyonyo ekwu okwu maka ikpe ekpebibeghi na-ekwu na ọ dara iwu ha.

    Emmanuel Akomaye Agyim bụ aha okaikpe nyere mkpebi a.

  14. Lee ozi Peter Obi zigarala ụlọikpe kachasị

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Peter Obi agwaala ndị ụlọikpe ha jidesie ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa iwu Naijiria.

    Obi kwuru nke a n'akara X (bụbu Twitter) ya dịka ụlọikpe kachasị chetụrụ obere oge ime mkpebi maka akwụkwọ a gbara igbagha mmeri Bola Tinubu na ntuliaka Febrụwarị.

    Obi sị "ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ekwesịghị nkwanye ugwu maọbụrụ na ihe ha na-ebu abụghị nke ezigbo ya kama adigboroja.

    "Aha ukwu e ji edozi ndị nọ n'ọchịchị enweghị isi maọbụrụ na ọ bụ asị juru n'okpuru ya. Aha ndị ahụ apụtaghị ihe maọbụrụ na ha abụghị nke ezigbo ya.." ka o kwuru.

    Ọ kwukwara na ọ dị mkpa ka ụlọikpe kachasị kwado iwu ji obodo ma mee ka aka ha kwụrụ ọtọ n'ikpe ha.

  15. Anwuchiela ọtụtụ mmadụ maka ebubo ịga agbamakwụkwọ nwoke na nwoke

    Ndi oru NSCDC

    Ebe foto si, NSCDC

    Ndị ọrụ nchekwa anwuchiela ihe karịrị mmadụ 70 bụ ndị e boro ebubo ihazi mmemme gụnyere agbamakwụkwọ nwoke na nwoke.

    Nwuchi a mere na Gombe steeti bụ ebe ndị okpukperechi alakuba kacha n'abalị Satọde mana ọ bụ n'ụbọchị Monde ka ozi a pụtara.

    Buhari Saad bụ ọnụ na-ekwuru ndị Civil Defence na steeti ahụ gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na "anyị nwuchiri mmadụ 76 bụ ndị echeere na edina ndị ha na ha bụ otu Okike ebe ha na-eme mmemme ncheta ụbọchị ọmụmụ nke otu onye n'ime ha haziri bụkwa onye na-akwado ịlụ nwoke ibe ya n'ebe ahụ"

    "Ndị a nwuchiri gụnyere ụmụ nwoke 59 nakwa ụmụ nwaanyị 17 nke ụmụ nwoke dị 21 kwetara na ha na-edina nwoke ibe ha" ka o kwukwara.

    Ọ bụ otu n'ime nwuchi a na-eme ndị na-edina ibe ha na Naijiria ebe a nwere iwu pụtara n'afọ 2014 na machi mmekọ na ọlụlụ n'etiti ndị otu okike.

    Iwu ahụ nyere nga afọ 14 maka onye ọ bụla dara ya bụ iwu.

    Cheta na a nwuchiri mmadụ 67 e boro ebubo ịga agbamakwụkwọ nwoke na nwoke na Delta steeti n'ọnwa Ọgọọst mana ụlọikpe kpebiri ka atọghapụ ha nwa mgbe nta.

  16. Nnọọ na peeji anyị

    Daalụ maka isonye anyị na njem ntaakụkọ nke taa

  17. Naịjirịa emeriela ụlọọrụ P&ID n'ụlọikpe London maka okwu gbasara mmanụ agbịdị

    MManụ agbịdị

    Ụlọikpe ukwu dị na London, mba UK, enyela Naịjirịa mmeri n'ike dị n'etiti mba ahụ na otu ụlọọrụ mmanụ agbịdị a na-akpọ 'Process & Industrial Developments' (P&ID) nke dị na mba 'British Virgin Islands.

    Ọkaikpe Robin Knowles kpebiri ikpe a n'ụbọchị Mọnde, Ọktoba 23, ma kụchapụ mkpebi nke otu ụlọikpe nyeburu n'afọ 2017 nke kwuru ka Naịjirịa kwụọ ụlọọrụ P&ID ijeri dọla 11.

    N'okwu ya, ọkaikpe Knowles kwuru na ụlọọrụ P&ID nyere ụfọdụ ndị isi ngalaba mmanụ agbịdị na Naịjirịa aka azụ iji nweta ọrụ ngo ahụ n'afọ 2010, mana ha ekwupụtaghị nke a gwa ụlọikpe oge e kpere ikpe ahụ na mbụ.

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu kọwara mkpebi ụlọikpe a n'ụbọchị Mọnde dịka "mmeri nye mpaghara anyị bụ nke a na-akpagbu kamgbe ogologo oge, nakwa mba ndị ka na-emepe emepe bụ ndị na-agabiga ọtụtụ mmekpa ahụ".

    Etu ikpe a si malite

    P&ID gbara Naịjirịa akwụkwọ n'ụlọikpe na Londo dịka ọ gachara afọ 20 nkwekọrịta ha na Naịjirịa nwere maka ịrụ ụlọọrụ na-emepụta gaasị na mpaghara ndịda Naịjirịa kụsara.

    N'afọ 2017, ụlọikpe kwuru na Naịjirịa ga-akwụ ụlọọrụ ahụ ijeri naịra 6.6 maka ọmụrụnwa ha furu efu, mana ego ahụ agbalitela ruo ijeri naịra 11, nke gosipụtara okwukwu iri nke ego a mapụtara maka ngalaba ahụike nke Naịjirịa.

    Mana ndị ọkaiwu Naịjirịa gara n'ụlọikpe iji gbaghaa mkpebi ahụ e nyeburu, dịka ha kwuru na P&ID nyere ndị isi ngalaba mmanụ agbidi Naịjirịa ọtụtụ ego akaazụ iji nweta ọrụ ngo ahụ. Ha nyekwara ụfọdụ ndị ọkaiwu akaazụ iji nweta akwụkwọ nzuzo ụfọdụ ha ekwesịghị inwe.

    N'aka nke ha, P&ID gọrọ na ha akwụghịonye ọbụla ego akaazụ, kama ha tara Naịjirịa ụta na ha enweghị ụlọọrụ siri ike bụ ndị ga-ahụ na gọọmentị mejupụtara nkwekọrịta ha binyere aka na ya.

    Na mkpebi ikpe ya, ọkaikpe Knowles kwuru na okwu a egosipụtala "ụdị ihe ụfọdụ ndị mmadụ nwereike ime n'ihi ego. Naanị oke ọchịchị na-akwalite mmụọ ha nke mere na ha achọkwaghị ịma etu ihe ha na-eme ga-esi metụta ndị ọzọ n'ụzọ ọjọọ".

    Knowles chọpụtara na P&ID kwụrụ ega akaazụ nye Grace Taiga, bụbu onyeisi ngalaba iwu nke Mịnịstrị na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa, bụkwanụ onye nwụrụ kamgbe ikpe ahụ malitere. Ha nyere Taịga akaazụ ahụ tupu e binye aka na nkwekọrịta ahụ, nakwa dịka ha binyechara aka.

    Ọkaikpe ahụ chọpụtakwara na otu n'ime ndị isi P&ID bụ Michael Quinn, onye nwụrụ n'afọ 2015, agwaghị ụlọikpe bu ụzọ kpee ikpe ahụ maka ego akaazụ ahụ ha kwụrụ Grace Taiga.

    O kwuru na mpụtara ikpe nke mbụ ahụ "gaara ịdị iche ma ọ bụrụ na ụlọikpe ahụ ma na Grace Taiga riri akaazụ tupu e nye ọrụ ngo ahụ".

    Ụlọọrụ ndị ọkaiwu a kpọrọ 'Mishcon de Reya, bụ ndị nọchitere anya Naịjirịa n'ikpe a, kwuru na mkpebi nke ụlọikpe a egosila mkpụrụ ọma nke si n'agha gọọmentị Naịjirịa na-ebu megide nrụrụaka n'ụdị ọbụla.

    "Obi dị anyị ụtọ na ọkaikpe a ghọtara mkpa ikpe a dị nakwa ihe ọ pụtara iji gbochie ohi a chọrọ izu ụmụ Naịjirịa. Anyị nwere nchekwube na mkpebi a ga-egbochi ụlọọrụ ndị ekperima ndị ọzọ na-achọ ụzọ ha ga-esi jiri ngalaba iwu ghọgbuo ma zuo Naịjirịa ohi," Tom Carson, bụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Mishcon de Reya, kwuru.

  18. Etu otu onye njem si nyụọ mkpụrụ 'heroin' 93 n'ọdọụgbọelu Abuja

    Ndị e boro ebubo ibu ọgwụike

    Ebe foto si, NDLEA

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọgwụike na Naịjirịa bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) ejichiela otu nwoke aha ya bụ Sherif Egbo, onye ha boro ebubo na ọ chọrọ ibu ọgwụike 'cocaine' si na Naịjirịa gafee mba Fransi.

    Femi Babafemi bụ ọnụ na-ekwuru NDLEA kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọktoba a ka e jidere nwoke ahụ, dịka nnyocha 'body scan' gosiri na o loro ọtụtụ ọgwụike n'afọ ya.

    "Oge anyị chọpụtara nke a, anyị debere nwoke ahụ n'ime otu ọnụ ụlọ ruo mgbe ọ nyụrụ mkpụrụ 'heroin' 93 nke arụ ya bụ kilogram 2.222," Babafemi kwuru.

    N'otu aka ahụ kwa, ndị ọrụ NDLEA jichikwara otu nwoke dị afọ 31 maka ebubo ibu ọgwụike 'cannabis' nke ruru kilogram 182.

    Ha jidere nwoke a na mpaghara Njimtilo, n'okporoụzọ si Maiduguri gawa Damaturu, n'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba.

    Ndị ọzọ ndị NDLEA jidere gụnyere, otu nwoke aha ya bụ Ngene Chinecherem, onye ha kwuru na ọ chọrọ ibupu ọgwụ 'skunk' ruru 11.100 kilogram nakwa ọgwụ 'tramadol' dị 60 gram, bụ nke ọ chọrọ ibupu site n'ụgbọelu Qatar Airways n'ọdọụgbọelu dị na Legọs.

  19. Onye atụla egwu, 'fuel' agaghị akọ na Naịjirịa - NNPCL

    Fuel

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ 'Nigerian National Petroleu Corporation Limited (NNPCL) adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ha kwụsị iji ụjọ na-aga ịzụ mmanụ ụgbọala n'ihi akụkọ na-efesa na mmanụ ụgbọala nwereike ịdị ụkọ n'oge adịghị anya.

    Ịdọ aka na ntị a na-abịa dịka a malitere ịhụ ọtụtụ ụgbọala na-akwụ n'ahịrị n'ebe dị icheiche a na-ere mmanụ ụgbọala, nke mere ụfọdụ ji eche na ọ dịla ụkọ.

    Ụfọdụ kwukwara na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-arị elu ọzọ dịka ọnụahịọ́ Naịra na-agbatu iji tụnyere dọla.

    Akwụkwọ ozi si n'aka NNPCL kwuru na mmanụ ụgbọala Naịjirịa nwere ugbua ka ga-ezu ihe ruru ụbọchị iri ato maọbụ karịa, nke pụtara na onweghị ụjọ ọbụla dị ma ọ ga-akọ ụkọ.

    Mana ụlọọrụ ahụ ekwughị ihe ọbụla gbasara mgbali elu ọnụahịa mmanụ.

    Cheta na ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbaliri elu nke ukwuu dịka onyeisiala Bola AHmed Tinubu kwụsịrị ịkwụ ụgwọ gọọmentị na-akwụbu iji butuo ọnụahịo ya.

  20. Rema, Davido, Burna Boy chakere ka kpakpando n'emume 'Trace Awards'

    Davido, Rema na Burna Boy

    Ebe foto si, Davido/Heisrema/Burnaboygram/Instagram

    Ọtụtụ ndị otiegwu Naịjirịa chakere ka kpakpando n'emume nturuugo a kpọrọ 'Trace Awards' bụ nke e mere n'obodo Kigali nke mba Rwanda n'ụbọchị Satọde.

    Ntuurugo a so na nke a kacha akwanyere ugwu na ngalaba ndị otiegwu n'Afrịka niile.

    Ụmụ Naịjirịa kacha gbapụta ihe n'emume a gụnyere Divine Ikubor, a ma ama dịka Rema, onye egwu ya ọ kpọrọ 'Calm Down' ritere nturuugo dịka Egwu kacha mma n'afọ 2023. Rema ritekwara ntuurugo maka otiegwu Afrịka kacha wuo ewu na mba ụwa n'afọ 2023.

    David Adeleke, onye a ma dịka Davido, ritekwara nturuugo abụọ: Oti egwu nwoke kacha mee ọfụ ma, na egwu mmaọ̄ụ jikọrọ aka ọnụ gụọ kacha mma (Best Collaboration).

    Damini Ebunoluwa Ogulu, maọbụ Burna Boy dịka ọtụtụ si mara ya, ritere ntuurugo maka efere egwu kacha mma n'afọ 2023, maka egwu ya bụ 'Love Damini'.

    Lee ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ ritekwara ntuurugo n'emume Trace Awards nke afọ 2023:

    • Yemi Alade - Onyonyo Egwu kacha mma (Best Music Video)
    • Kel-P - Onye mmepụta egwu kacha mma (Mest Producer)
    • Asake - Onye otiegwu kacha mma na mpaghara Afrịka na-asụ bekee (Best Artiste Africa - Anglophone)