Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. Sam Anyanwu ga-arịtu n'ọkwa dịka odeakwụkwọ PDP - BoT

    SAM ANYANWU

    Ebe foto si, SAM ANYANWU/FACEBOOK

    Ndị isi na-achịkọta otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) akpọọla oku ka Samuel Anyanwu gbaa arụkwaghịm dịka odeakwụkwọ pati ahụ, ebe ọ bụ na ọ bụ ya ji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti.

    Otu a bụ 'Board of Trustees' (BoT) kwuru na ọ bụ ihe megidere iwu pati ahụ mmadụ iji ọkwa abụọ n'otu oge.

    N'akwụkwọ ozi nke ndị BoT a wepụtara n'ụbọchị Fraịde, nke onyeisioche BoT bụ Adolphus Wabara binyere aka na ya, o kwuru na ha bụ ndị okenye agaghị anọrọ na-ele anya ka ihe mebie na pati ha.

    "Ọ bụ ọrụ anyị ịkpọ ndị isi pati anyị ma dụzie ha nke ọma mgbe ha na-emehie ma na-eme ihe iwu anyị akwadoghị," Wabara dere.

    "Anyị na-agwa ndị otu 'National Working Committee' ka ha mee ihe kwesịrị ime ngwangwa ma hụ na onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha pati anyị (bụ Samuel Anyanwu) rituru n'ọkwa odeakwụkwọ pati anyị na-egbughị oge, ma gbado anya na ndọrọndọrọ nke ọ na-azọ bụ nke na-eruzighị ụbọchị 30 ugbua."

    Cheta na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti ga-adị n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.

    Samuel Anyanwu nke PDP na-ele anya ịchụpụ gọvanọ ji ọchịchị ugbua n'Imo steeti, bụ Hope Uzodinma nke pati 'All Progressives Congress' (APC).

  2. Ọkụ si n’ụdọ ọkụ latrik agbagbuola mmadụ asaa na Jos

    Ọkụ latrik

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe ruru mmadụ asaa anwụọla ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ọkụ malitere ịgba n’obodo Kabong, Gada Biyu dị n’okpuruọchịchị Jos North nke Plateau Steeti.

    Ọkụ a malitere ịgba n’isi ọtụtụ Satọde mgbe ụdọ ọkụ latrik abụọ na-enye ọkụ n’obodo ahụ mekọtara ọnụ ma malite ịgba ọkụ nke gburu ndị mmadụ ma gbaa ọtụtụ ngwa ụlọ ọkụ.

    Obodo bụ ebe ọtụtụ mmadụ bijuru ka a ma ama dịka ebe obibi nakwa ebe a na-azụ ọtụtụ ahịa dị iche iche ka ọkụ gbara ọtụtụ n’ime ha.

    Mmadụ abụọ si n’otu ezinaụlọ nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba ahụ mgbe ha nọ na-achọ ịkwụpụ ihe ndị kwụụ n’ọkụ mgbe ọkụ ahụ malitere.

    E bugaala ozu ndị nwụrụ n’ụlọozu ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwụ n’ụlọọgwụ.

    Ngalaba na-ahụ maka mmepe obodo Jos bụ Jos Metropolitan Development Board agaala mgbaru ebe ahụ ịhụ ka ihe a jiri mee nakwa etu a ga-esi gbochie ọzọ ime.

  3. CBN ebuliela mmachi ha tinyere maka iji dọla ebubata osikapa, tomato na ndị ọzọ

    Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa

    Ebe foto si, CBN/Facebook

    Ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Central Bank ebuliela mmachi ha machiri ndị na-ebuta ngwaahịa iri anọ na atọ ịgbanwe ego dọla ha ji ebubata ngwaahịa ndị a.

    Mmachi a bụ nke e tinyere kamgbe afọ 2015 metụtara mbubata osikapa, tomato, uwe, ọkụkọ so n’iwu Godwin Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ a mere iji gbochie ọdịda nke akwụkwọ ego naịra na-ada ma a tụnyere ya dọla na ndị ọzọ.

    “Ndị na-ebubata ngwaahịa ndị a machiburu nwereike ịmalite ịzụ dọla na ego ndị ọzọ site n’aka ụlọọrụ ‘Nigerian Foreign Exchange’” ka Isa AbdulMumin bụ ọnụ na-ekwuru CBN kwuru.

    Ndị na-ebubata ngwaahịa ndị na-esi n’aka ndị na-eregharị ego dọla na ego ndị ọzọ bụ nke buterela ọtụtụ nsogbu gụnyere ụkọ ego nakwa ọnụego ịrị elu.

    Kamgbe ọtụtụ afọ ka ndị na-ahụ maka akụnaụba na-ekwu ka e wepu mmachi ngwaahịa ndị a ka o mere ka ohere dị n’etiti ịgbanwe ego n’ahịa nakwa nke ụlọakụ etiti buo ibu ma gbochie ndị mmadụ itinye ego azụmaahịa ha na Naịjirịa.

    “Ọ dịghị mma na CBN ga-ekpebi onye nwereike inwete ohere mgbanwe ego. Atụmatụ ọhụrụ a gaewete nkwụwa aka ọtọ ma mechie ohere ahụ dị n’etiti ịgbanwe ego n’ahịa na nke ịganwe n’ụlọakụ.” Muda Yusuf, onye ọkachamaara n’okwu akụnaụba gwara BBC.

    Onyeisi ụlọakụ a bụ Gọvanọ Olayemi Cardoso kwere n’ọnwa gara aga ikpochapụ akwụkwọ ndị mmadụ na-achọ ịgbanwe ego tinyere kamgbe nke ruru ego dị nde dọla asaa ($7bn).

    N'ozi ọzọ nke CBN wepụtara na soshal midia, ha kwuru na o nweghi mgbe a machi mbubata ngwaahịa ndị a site na mba ofesi kama na ihe ha mere bụ ịkwụsị inye ndị na-ebubata ha ohere ịgbanwe dọla ha ji ebubata ha.

    Ha kwuru na nke a mere ndị a jiri banye n'ime ahịa ịzụta dọla ha ji ebubata ha, nke so n'ihe mere dọla jiri dị ụkọ ma rịa elu ọji ugbua.

    CBN kwuru na mbuli mmachi a ga-ebelata etu ndị a si aga n'ima ahịa achọ ya bụ dọla ma nye aka ibudata ọnụego dọla ma a tụnyere ya dọla

    Naịjirịa nwere akụnaụba kachasị n’Afrịka ka ọ na-arazi ahụ inwete ọnụego dị mma iji agbanwe naịra na dọla na nso nso dịka naịra ji ogogo 1030 adakpọọla ala ma a tụnyere ya otu dọla.

  4. Aka akparala nwaanyị wụrụ di ya mmanụ ọkụ gbalaga

    Nwaanyị e boro ebubo ịwụ di ya mmanụ ọkụ

    Ebe foto si, Rivers State Police

    Ndị uwe ojii awụchiela Favour Nweke, onye wụrụ di ya Ekelediri Nwokekoro mmanu ọkụ na Okehi dịna okpuruọchịchị Etche River steeti.

    Dịka ndị uwe ojii na akpọghiari Favour Nweke n’ihu ndi nkakụkọ na ụlọ ọrụ ndi uwe ojii nke dina uzọ Moscow PortHacourt, n’ubochị Fraide,ọ riọrọ sị gbahiara ya, naya agaghị eme kwa ya ọzọ.

    Ọ kọwara ihe mere n’ubochị ahu, Favour kwuru na e nwere ndị gwara ya na di ya nakwa ndị ọzọ zụrụ otu nwoke ohi ego luru nde naria iri abụọ.

    Mgbe ya jụrụ diya ma akụkọ ahụ ọbụ eziokwu,gịnị ka oji ego ọketere mepụta, di ya malitere ịtiya ihe ịhe, ya mere ya jiri gbabaa na kichin bute mmanu ọku wuo ya.

    Ọnụ na ekwuru ndi uwe ojii Rivers steeti bụ SP Grace Iringe-Koko gwara BBC Igbo na awụchịela Grace Nweke kpọrọ ya gaa isiụlọọrụ ndị uweojii na steeti ahụ ebe a ga eyocha ya ọfụma ma hụ na ekpereya ịkpe dika iwuala siri dị.

  5. Ka chi fo

    Anyị abịala na njedebe mgbasaozi nke taa.

    Sonyekwara anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Satọde.

    Ya gazie.

  6. Russia ga-arụ ụlọọrụ 'nuclear' maka ọkụ latrik na Burkina Faso

    Ibrahim Traore na Vladmir Putin

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ibrahim Traore na Vladmir Putin n'ọgbakọ 'Russia-Africa Summit' n'ọnwa Julaị afọ a

    Ndị agha na-achị mba Burkina Faso na mba Russia ebinyela aka n'akwụkwọ nkweọrịta maka ịrụ ụlọọrụ nuclear ga-abawanye ọkụ latrik na mba Afrịka ahụ.

    Nke a bụ ihe ngosipụta ọzọ gosiri mmasị ndị ndu Burkina Faso nwere ka ha na Russia jikọọ aka ọnụ, dịka ha jụrụ mmekọ nke mba Fransị na mba mpaghara Ọdịda Anyanwụ ndị ọzọ.

    Cheta na ndị agha Burkina Faso gbakwuuru Russia maka enyemaka akụnụba na nchekwa oge ha weghaara ọchịchị na mba ahụ n'afọ gara aga.

    N'ọnwa Julaị, Ibrahim Traore, bụ onyeisi ndị agha na-achị Burkina Faso sonyere n'ọgbakọ 'Russia-Africa Summit' nke e mere na Moscow, bụ ebe ọ nọrọ rịọ onyeisiala Vladmir Putin maka enyemaka gbasara ọkụ latrik.

    "Ọkụ latrik dị anyị oke mkpa. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ọ ga-amasị m ma e nwee igwe 'nuclear' ga na-enye ọkụ latrik na Burkina Faso," ka Traore rịọrọ Putin n'ọgbakọ ahụ.

    "Anyị nọ n'etiti mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka, mana anyị enweghị ọkụ latrik na-ezuru anyị"

    Burkina Faso so na mba ebe ọkụ latrik kacha dị nta n'ụwa niile. Naanị pasentị 21 ndị mba ahụ na-enweta ọkụ latrik.

    Mana ha na-atụ anya ime ka pasentị 95 ndị bi n'obodo mepere emepe, na pasentị 50 ndị bi n'ime obodo, nwee ọkụ latrik n'ebe afọ 2030.

    Dịka ngalaba 'International Energy Agency' si kwuo, ọkụ latrik nke mba Burkina Faso na-enwe ugbua na-esite na 'charcoal nakwa na mmadụ agbịdị.

    Ka ọ dị ugbua, naanị Saụt Afrịka bụ mba Afrịka na-emepụta ọkụ latrik site n'ike nuclear, mana ọtụtụ mba na mpaghara ahụ akpawala atụmatụ isite n'ụzọ dị otu a mụbawanye ọkụ latrik na mba ha.

  7. Ghana na South Africa ekwekọrịtala na ndị be ha agaghị eji viza abanye mba ha

    Nana Akufo-Addo na Cyril Ramaphosa

    Ebe foto si, Getty Images

    Mga Ghana na South Afriịka enweela nkwekọrịta nke kwuru na onye Ghana ọbụla nwereike iji naanị Passport banye na mba Saụt Afrịka na-anataghị visa.

    Nkwekọrịta a kwuru na ndị si mba ahụ ga-enweike ịga njem na mba abụọ a na-ejighi visa ruo ụbọchị 90 n'ime otu afọ.

    N'ime otu akwụkwọ ozi si n'aka mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta mba Ghana na mba ndị ọzọ, e kwuru na nkwekọrịta a ga-amalite ịdị ire n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ a.

    "Ndị njem nwereike ịbanye, nọrọ maọbụ pụọ na mpaghara Ghana na Saụt Afrịka ruo ụbọchị 90, mana ha agaghị enwe ikike ịrụ ọrụ," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

    Ọ bụrụ na ụbọchị 90 agafee n'ime otu afọ, onye ahụ ga-enweta visa iji nwee ike ịbanye Saụt Afrịka, akwụkwọ ozi si n'ụlọọrụ nnọchite anya mba Saut Afrịka na Ghana kwuru.

    Tupu ugbua, ndị Ghana ga-enwetarịrị visa iji banye mba Saụt Afrịka, ndị Saut Afrịka ga-enwetakwa visa iji banye Ghana.

    Ndị Ghana esoghị na ndị nwere ohere inweta visa ma ọ bụrụ na ha bịaruo na Saụt Afrịka, nke a pụtara na onye njem chọrọ ịga mba ahụ ga-ebu ụzọ tinye akwụkwọ maka inweta visa, nke nwere ịnọ ọtụtụ izuụka maọbụ ọtụtụ ọnwa tupu ọ pụta.

    Otu onye Ghana aha ya bụ Ernest Apraku gwara BBC na oge ikpeazụ ya gara Saụt Afrịka maka ezumike, o were ya ọnwa abụọ iji nweta visa.

    "Nkwekọrịta ọhụrụ a pụtara na ọ ga-adịziri m mfe ma dịkwa ọnụ ala ime njem dị otu a," Apraku kwuru.

  8. Naijiria na Saudi Arabia agbaala ọnyụpa n'asọmpi enyi na enyi

    Osimhen na Samuel Chukwueze

    Ebe foto si, CAF

    Nkọwa foto, Foto a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ

    Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke nke Naịjirịa bụ 'Super Eagles' na ndị ogbo ha nke mba Saudi Arabia nyere onwe ha goolu abụọ abụọ na mgbede ụbọchị Fraịde dịka ha zutere onwe ha n'asọmpi enyi na enyi.

    Saudi Arabia bu ụzọ nye Naịjirịa goolu dịka Francis Uzoho mehiere oge a gbara 'corner', were aka ya kụkpuo bọọlụ na neetị, mana Victor Boniface sara goolu ahụ ka ihe dịka nkeji 13 gara.

    Kelechi Iheanacho batara na nkeji 64 ịnọchi anya Samuel Chukwueze, o teghị aka, o nyetere goolu nke abụọ iji tinye Naịjirịa n'ihu.

    Mana dịka asọmpi ahụ na-achọ ịgwụcha, na nkeji 99, Saudi Arabia nyekwara goolu ọzọ iji mee ka asọmpi ahụ bie na onye lawa onye lawa.

    Naịjirịa ga-ezute mba Mozambique n'asọmpi enyi na enyi ọzọ n'ụbọchị Mọnde, bụ Ọktoba 16, dịka ha na-akwado maka iko mba Afrịka nke afọ na-abịa abịa, nakwa asọmpi ntozu oke maka iko mba ụwa nke afọ 2026.

    N'ụbọchị Tọzde ka ahọpụtara etu a ga-esi gbaa asịmpi iko mba Afrịka n'afọ na-abịanụ; Naịjirịa nọ n'otu A, ha na mba Cote d'Ivoire, Guinea Bissau na Equatorial Guinea.

  9. Ndị agha azọpụtala mmadụ 17 atọọrọ na Kebbi steeti

    Ndị agha Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndi agha azọpụtala mmadu iri na asaa mbochị Tọzde n’aka ndị ntọ tọọrọ ha na Kebbi steeti.

    Ha malitere njem ọrụ nzọpụta ka ha nwetere ọzị na ndị na-eyindụegwu nwụchiri mmadu agụtaghị ọnu n’obodo Kanya dị na okpuruọchịchị Wasagu dị na Kebbi steeti.

    Ọnu n’ekwuru ndi uwe ojii Kebbi steeti bụ Haradin Daji kwuputere nke a n'ụbọchị Fraịde ma kwuo na ndị agha malaitere njem nzọpụta ahu mgbe ozị ruru ha na enwere ọtụtụ mmadụ ndị omekome tọọrọ n'obodo Kanyanke dị na okpuruọchịchị Danko Wasagu na steeti ahụ.

    Ha sị na ha nụrụ akụkọ na ndị omekome ahụ kpụ ndị ha tọọrọ agbaga n'ime ọhịa na Niger steeti.

    Ndị azọpụtara gụnyere ụmụ nwaanyị isii, ụmụ nwoke iri na otu nakwa ndị uweojii ọzọ ha tọọrọ n'ụlọọrụ ha n'ebe ahụ. Ha wetakwara ọgbaatumtum ise bụ nke agbarala ọkụ.

  10. Ide mmiri achụọla ihe ruru mmadụ 4000 n'ụlọ ha na Gana

    Ideimmiri na Ghana

    Ebe foto si, SAMEUL OKUDZETO ABLAKWA

    Nnukwu Idei mmiri etochiela ụlọ ọtụtụ mmadụ mpaghara Tongu na mba Ghana, mee ka ọtụtụ ndị mmadụ gbaa ọsọ ndụ.

    Ngalaba gbatagbata nke mba ahụ bụ 'National Disaster Management Organisation (Nadmo) kwuru na ha na otu enyemaka ndị ọzọ na-agba mbọ ugbua ịọpụta ndị ka nọ na mpaghara ahụ ebe ideimmiri tojuru.

    Nke a mere dịka ngalaba 'Volta River Authority' kwuru na ha mepere ọdọ mmiri abụọ, bekee kpọrọ 'hydroelectric dam', bụ 'Akosombo' na Kpong ka mmiri gbajuru na ha wụpụtụ.

    Osote onyeisi Nadmo bụ Sedzi Sadzi kwuru na opekatampe mpaghara itoolu dị na Volta nakwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ ka ideimmiri a metụtara.

    Ebe ọ kacha njọ bụ na mpaghara Ugwu, Etiti na Ndịda Tongu.

    "N'ebe ndị a, ideimmiri tojuru obodo ha niile, okporoụzọ ha niile ekpochapụkwala," Sadzi kwuru.

    Ọ sị na ha bụ nd Nadmo na-agba mbọ ịkpọga ndị mmadụ n'ebe dị icheiche e wepụtara dịka ebe obibi nchereoge maka ndị ọdachi a metụtara.

    Ideimmiri na Ghana

    Ebe foto si, SAMEUL OKUDZETO ABLAKWA

    Ụlọọrụ 'Volta River Authority' kwuru na ha mara ọkwa iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị maka mmepe ọdọmmiri abụọ ahụ, mana ndị obodo gwara BBC na oge e nyere ha dị ntakịrị.

    Ụfọdụ ndị ọzọ, dịka Amos Mawunya, onye bi na mpaghara Etiti Tongu kwuru na ha enwetaghị ozi ịdọ aka na ntị ọbụla.

    "Anyị gara ọrụ ugbo na-alọta, wee hụ ka mmiri jupụtara n'ime ụlọ anyị. Onweghị ihe ọbụla anyị nwereike ịzọpụta n'ime ụlọ ahụ," Amos kwuru.

    Ideimmiri na Ghana

    Ebe foto si, SAMEUL OKUDZETO ABLAKWA

    Otu ụlọọgwụ dị na mpaghara Ugwu Tonga kwuru na ideimmiri ahụ ewegharala ogige ụlọọgwụ ha niile.

    "Anyị nwere ozu mmadụ ruru 250 n'ụlọ ozu anyị. Ihe anyị na-eche ugbua bụ ebe anyị ga-ebuga ozu ndị a iji gbochie nnukwu ọdachi ahụike ịdapụta na mpaghara a," onyeisi ụlọọgwụ ahụ kwuru.

    N'otu aka ahụ kwa, idemmiri a gbochiri ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ịga akwụkwọ, maka na mmiri tojuru ụlọakwụkwọ ha niile.

    Ụlọọrụ ọkụ latrik nke mba Ghana, bụ Ghana Grid Company (Gridco) kwuru na ha ewepụla ọkụ latrik na mpaghara Sogakofe n'ihi ideimmiri a, iji gbochie ọkụ latrik ịdọgbu mmadụ.

  11. A machiela Divine Oduduru afọ isii maka ịda iwu ọgwụike

    Divine Oduduru

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọgbaọsọ mba Naịjirịa bụ Divine Oduduru eritela mmachi afọ isii maka ịda iwu abụo gbadoro ụkwụ n'ọgwụike.

    Ngalaba Athletics Integrity Unit kwuputara nke a n'ụbọchị Tọzde kwuru na o nwere ihe akaebe karịrị akarị megidere Oduduru.

    Ebubo abụọ e boro ya gụnyere ijide ọgwụ ndị amachiri amachi, nakwa ịnwa iji ọgwụ nakwa atụmatụ ndị amachịrị amachi.

    Okwu Oduduru na nke Blessing Okagbare bụ onye amachiri afọ iri na otu n'afọ 2022 nwere ebe ha jekọrọ.

    Cheta na amachibuola Oduduru obere oge n'ọnwa Febụwarị afọ 2023 ganye mgbe a ga-emecha nyocha banyere ebubo ndị e boro ya.

    A chọpụtara akụkọ ya dịka e bochara Eric Lira ebubo ịnye ndị na-agba ọsọ ọgwụ ga-enye ha ike n'Olympic nke Tokyo.

    Lira nwereike ị ga nga afọ iri ma ikpe maa ya dịka o kwetara na o mere ihe ndị a.

    Achụpụrụ Okagbare n'asọmpị Olympics tupu a gbaa ọsọ nke ụmụ nwaanyị 100m dịka ọ pụtara ihe na achọtara ọgwụike n'ahụ ya n'otu nyocha e mere na Slovakia n'egwuregwu ndị ahụ nke afọ 2020.

    A chọtakwara ọtụtụ ozi ekwentị Whatsapp jikọrọ Okagbare na Lira gosikwara na Okagbare na-achọ ọgwụ n'aka Lira ị nye Oduduru.

    Oduduru na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha n'ihe a niile.

  12. Ị bọọla chi?

    Ka ụbọchị taa maara gị mma.

    Akụkọ ndị dị mkpa ka anyị ga-ewetara gị taa. Jisike.

  13. A tụọla Silvia Bongo bụ nwunye onyeisiala mba Gabon a chụrụ achụ nga

    Silvia Bongo bụ nwunye onyeisiala Ali Bongo nke Gabon a chụrụ achụ

    Ebe foto si, AFP

    A tụọla Silvia Bongo bụ nwunye Ali Bongo onyeisiala mba Gabon ndị agha chụturu n’ọkwa mkpọrọ maka izu ego ọha n’ihe a kpọrọ ikpe kachasị ngwa ngwa na mba ahụ.

    Ọkaiwu ya bụ Francis Zimeray katọrọ mkpebi ahụ ma sị na o megidere usoro iwu.

    A kpochiri Silvia Bongo n’ime ụlọ kamgbe ụbọchị 30 nke ọnwa Ọgọstụ, 2023 mgbe ndị agha chụpụrụ onyeisiala Ali Bongo bụ di ya.

    A kpụpụrụ ya n’ụlọikpe n’ebubo ibupu ego, ịkpụ akwụkwọ asambo nke adịgboroja.

    BBC chọpụtara na ọ ga-awuchikwa n’ụlọikpe n’abali iri na-abịa abịa maka ịzara ọnụ n’ebubo ọzọ cheere ya n’ihu.

    Onye bụbu onyeisi obiọchịchị mba Gabon bụ Brice Laccruche Alihang a tụrụ mkpọrọ afọ anọ maka ebubo ibu ego, izu ego nakwa ime mpụ gbara ama n’ụlọikpe megide Silvia n’ụbọchị Wenezde.

    Ebubo e boro Silvia Bongo metụtara nke e boro onyeisi obiọchịchị a.

    N’afọ 2019, e kwuru na onye a bụbu nwunye onyeisiala so n’ihe otu na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego a kpọrọ ‘Operation Scorpion’ bụ nke tụrụla ọtụtụ ndịisi ọrụ gọọmentị mkpọrọ, nke gụnyere Brice Laccruche Alihang ebe ụfọdụ ndị Gabon kwuru na nke a bụ mmegwara.

    N’aka nke ọzọ Nourredin Bongo bụ nwa onyeisiala a chụrụ achụ nọ na mkpọrọ ugbua na-eche ka e kpee ya ikpe banyere ebubo nrụrụaka ego.

  14. Lee Ola Olukoyede Onyeisi ụlọọrụ EFCC a họpụtara ọhụrụ

    Ola Olukoyede

    Ebe foto si, Presidency

    Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala Ola Olukoyede dịka onyeisi ọhụrụ nke ụlọorụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) nakwa ndị odeakwụkwọ ụlọọrụ a.

    N’ozi onye ndụmọdụ Tinubu bụ Ajuri Ngelale wepụtara, Olukoyede ga-anọchi anya Abdulrasheed Bawa bụ onye gbarala arụkwaghịm.

    O kwuru na iwu Naịjirịa ngalaba 2(3) nke EFCC e hiwere n’afọ 2004 nyere Tinubu ikike ịhọpụta onyeisi ụlọọrụ a nakwa ndịisi ha ndị ọzọ.

    Onyeisi ọhụrụ nke EFCC ga-anọ n’ọkwa ọchịchị ruo afọ anọ nke e nwereike ịgbatịkwu, ma ọ bụrụ ndị ụlọomeiwu kwado ya.

    N’ọnwa Juun ka Onyeisiala Tinubu chụrụ Abdulrasheed Bawa dị afọ iri anọ n’ọkwa dịka onyeisi EFCC.

    Ụkọchukwu Ola Olukoyede

    Ebe foto si, FACEBOOK/PASTOROLAOLUKOYEDE

    Ike i kwesịrị ịma maka ya

    Olukoyede bị onye ọkaiwu rụrụla ọrụ ihe ruru afọ afọ iri abụọ na abụọ bụ onye ọkachamaara n’okwu banyere mpụ n’ụlọọrụ.

    Ọ rụọla ọrụ dịka onyeisi ọrụ nke onyeisi ụlọọrụ EFCC n’afọ 2016 ruo 2018 ma bụrụ odeakwụkwọ ụlọọrụ ahụ site na 2018 ruo 2023 nke mere o jiri tozuoke ịbụ onyeisi ha.

    Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Legọs Steeti, Mahadum Legọs, Institution of Arbitration ICC dị na Paris mba France nakwa Mahadum Havard.

    Ọ bụ nwafọ Ikere dị n’Ekiti Steeti, a mụrụ ya na 14 Ọktoba, 1969. O so n’otu na-ahụ maka mpụ na UK a kpọrọ Fraud Advisory Panel nakwa kọmitii gọọmentị etiti a kpọrọ Nigeria Financial Intelligence Unit.

    Olukoyede bụ onye ụkọchukwu n’ụlọụka Redeemed Christain Church of God (RCCG).

    Olukoyede arụọla ọrụ dịka onyeisi n’ime ọtụtụ nyocha banyere mpụ na nrụrụaka n’ụlọọrụ EFCC.

  15. Nwaanyị nọ n'ọsọ ụkwụ eru ala dịka ọ wụrụ di ya mmanụ ọkụ

    Mmanụ ọkụ e ji eghe ihe

    Ebe foto si, Iwaria

    Ndị uweojii na Rivas steeti ekwuola na ha na-achọ nwaanyị aha ya bụ Hope Nwala ka ọ bịa zaa ajụjụ maka ịwụ di ya mmanụ ọkụ mgbe ọ na-ehi ụra.

    Dịka di ya bụ Ekelediri Nwankwo Nwala si kọọ, o teela aka ya na nwunye na-enwe esemokwu n'alụmdinanwunye ha.

    Nke a mere n’obodo Okehi nke dị n'okpuruọchịchị Etche dị na Rivers steeti.

    Grace Iringe-Koko bụ ọnụ na-ekwuru ndịuweojii na Rivas steeti gwara BBC na ihe a mere n'ezie.

    O kwuru na ụlọọrụ ha na-agba mbọ ịhụ na aka kpaara nwaanyị ahụ ma hụ na atara ya ahụhụ dịka iwu ala si nye.

  16. "Unu ekezila foto ochie - Davido

    Davido

    Ebe foto si, Davido/Instagram

    Otiegwu amaama dika Davido ezigbo ahaya bụ David Adeleke adọọla ndị mmadu aka na ntị sị ha kwụsị ibugharị akụkọ ugha nakwa fọtọ ochie.

    Nke a mere mgbe akụkọ bidoro ifegharị na soshal midia na Davido na nwuye ya bụ Chioma amụola ejima.

    E nwere foto bidoro fegharịwa na-egosi Davido na Chioma n’ụlọọgwụ.

    Ndi amaama na Niajịrịa so kelee Davido na Chioma nwuye ya.

    Cheta na Davido na Chioma lụrụ onwe ha mgbe nwa ha bụ Ifeanyi Adeleke nwụchara.

  17. A na-achọ mmadụ isii si ụlọ mkpọrọ gbapụ na Saut Afrịka

    Ndị uweojii mba Saut Afrika

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii na mba Saụt Afrịka na-achọ mmadụ isii si n'ụlọ mkpọrọ nke ụlọikpe Magie dị n'obodo ahụ were gbapụ.

    A nwụchiela otu n'ime ndị a ma ka na-achọ mmadụ ise n'ime ha dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na ndị ahụ dị n'etiti afọ 20 na 33 ji ngwa mmerụ ahụ.

    Ha nọ na nga ụlọikpe ahụ na-eche ka ebuga ha ụlọ mkpọrọ nke ukwu dịka ha bịachara ụlọikpe mgbe ha gbapụrụ ọsọ n'ụbọchị Wenzde.

    "Nyocha mbụ anyị mere gosiri na ndị ahụ napụrụ otu onye ụweojii egbe ya. Ha gbara ndị uweojii ọzọ egbe mana o nweghi onye ha gburu maọbụ merụọ ahụ." bụ ihe ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Malcolm Pojie gwara ụlọ ntaakụkọ News 24.

    O kwukwara na ọ bụ ụkwụ ka ndị ahụ ji gbapụ ọsọ.

    E boburu ha ebubo ihe gụnyere igbu mmadụ, ịnwa igbu mmadụ, izu ohi nakwa ịmerụ mmadụ ahụ mana dịka ha gbapụrụ ọsọ etinyerela ha ebubo ndị ọzọ bụ ịgbapụ na nga, izu egbe nakwa ịnwa igbu mmadụ.

  18. Unu abọọla chi?

    Anyị ji aka na ụtụtụ ụbọchị taa ga-adịrị unu mma.

    Sonye nu anyị maka akụkọ ndị dị mkpa.

  19. A kagbuola ndị Naịjirịa ime njem ala nsọ n'Isreal nakwa Jordan

    Ndị mere njem gaa ala nsọ

    Ebe foto si, AFP

    Ụlọọrụ na-ahụ ime njem aga ala nsọ bụ Nigerian Christain Pilgrimage Commission ekwuola na akwụsịla ime njem ọbụla aga Isreal nakwa Jordan maka ọgụ na-ada n’etiti Isreal na mba Palestine kamgbe izuụka gara aga.

    Ụlọọrụ a kwuru na ha kagburu ibuga ndị mmadụ na mba ndị a bụ nke kwesibụrụ ịbụ n’ụbọchị Tuzde 10 Ọktoba 2023 ruo oge a na-amaghị.

    “Ọgụ wetere ọnọdụ amaghị ama n’atụmatụ anyị maka njem ala nsọ nke ọnwa Disemba...Anyị nwere olileanya na ọgbaghara a ga-akwụsị tupu afọ a agwụ.” Ka Sunny Udeh bụ dịrektọ na-ahazi njem gwara BBC.

    Na ngụkọ, ụmụafọ Naịjirịa ruru 18,000 na-apụ mee njem ala nsọ na mba Isreal na Jordan kwa afọ ọbụla.

    Ụlọọrụ a kwuru na ha ga-aga n’ihu na-eleka ọnọdụ ọgbaghara ahụ si aga na mba Isreal ma sị na nchekwa ndị Naịjirịa dị ezi mkpa.

    Mana njem ụgbọelu si Naịjirịa gaa ọdọụgbọelu Tel Aviv mba Isreal ka na-aga n’ihu na-agbanyeghi ọgbaghara ahụ.

    N’ụbọchị Satọde gara aga ndịagha nnupuisi Hamas nke mba Palestine tụrụ ogbunigwe ebe ha wakporo obodo ndị dị na Gaza Strip, gbuo ọtụtụ ndị mmadụ ma nwuchie ndị ọzọ, nke a mere ka mba Isreal wakpoo kwa ha n’otu aka ahụ.

    Gọọmentị Naịjirịa arịọla mba abụọ ndị a ka ha kwụsị ọgụ ahụ ma were mkparịtaụka udo kpezie nsogbu dị n’etiti ha.

  20. Kọwaara ndị Naịjirịa onye ịbụ nakwa ebe ị gụrụ akwụkwọ - Obi gwara Tinubu

    Onyeisiala Tinubu na Peter Obi

    Ebe foto si, Tinubu/Obi/Facebook

    Peter Obi ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjiịrịa akpụkuola Onyeisiala Bola Tinubu ka ọ kọwaara ọha onye ọbụ ma ghara imechu ndị Naịjirịa ihu.

    Nke a na-abịa dịka Ụlọakwụkwọ Mahadum Steeti Chicago wepụtachara akwụkwọ banyere asambodo n’ụlọikpe dị n’Amerịka bụ nke Atiku Abubakar kpụpụụrụ ya.

    Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja n’ụbọchị Wenesde, Obi gwara Onyeisiala Tinubu ka ọ gwa ndị Naịjirịa ụlọakwụkwọ ndị ọ gara, ma o ji otu afọ fee ala nna.

    Ọ gara n’ihu gwa ya ka ọ kwuo ma o nwere mgbe ọ gbanwere aha ya ma zọpụta ndị Naịjirịa n’ihe a ọ kpọrọ imechu ihu na mbaụwa.

    “Ana m akpọku maazị Tinubu ka o jiri nwaayọọ kọwaa ndị Naịjirịa onye ọbụ, ebe a mụrụ ya na ebeebe ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị, sekọndịrị nakwa mahadum.”

    Obi kwuru na ihe niile a mere banyere ya na ndị Mahadum Chicago Steeti na mba Amerịka na-ebutere Naijirịa aha ọjọọ.

    O kwuru na ebe ọ bụ na Tinubu nọ n’isi ọchịchị na Naịjirịa na o nweghizi ihe ọbụla o kwesịrị ị na-ezo ezo banyere onwe ya.

    Cheta na Atiku gwara ụlọikpe ka o mee ka Tinubu wepụta asambodo o jiri gụọ akwụkwọ na Mahadum Chicago Steeti n’ebubo na asambodo ahụ nwereike ịbụ nke adịgboroja.