Supreme Court: Ihe ndị mere taa n'Ụlọikpe Kachasị n' ikpe Atiku,Obi megide Tinubu

Lee ihe niile gbasara ikpe mkpesa n'ụlọikpe na ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Chioma Nkemdilim Daramola, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Ndị akaebe anyị ga-akpọ ga-eru 100 - PDP, Atiku

    Ụlọikpe mkpegharị

    Atiku Abubakar na PDP ekwuola na ha dị njikere ịkpọta ndị akaebe karịrị otu narị mgbe ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023 ga-ebido n'uju dịka ha na-agbagha mpụtara ntulaiaka ahụ bụ nke Inec kwuru na ọ bụ Bola Ahmed Tinubu nke APC meriri na ya.

    Dịka ikpe ahụ bidoro ọzọ taa n'ụlọikpe mkpegharị, ọkaiwu Atiku bụ Chris Uche (SAN) kwuru na ha na ndị ọkaiwu ndị ọzọ enweela ọgbakọ ma kwekọrịta ihe niile gbasara ndị akaebe ole ha ga-akpọ nakwa oge ole a ga-enye onye akaebe ọbụla iji gbaa akaebe ya.

    Uche kwukwara na ọ ga-ewe ha izu ụka atọ iji kpọchaa ndị akaebe ha niile.

    Ihe ndị ọzọ e kwekọrịtara bụ:

    • Nkeji iri ato ka e nyere onyeisi akaebe
    • Nkeji 15 ka ọkaiwu ndị nke ọzọ ga-eji jụọ onyeisi akaebe ahụ ajụjụ (cross examination)
    • Nkeji ise ka e nyekwara iji jụgharịa onyeisi akaebe ahụ ajụjụ (re-examination)
    • Nkeji iri ka a ga-enye ndị akaebe ndị ọzọ n'otu n'otu iji gbaa akaebe
    • Nkeji ise ka ndị ọkaiwu ndị nke ọzọ ga-eji jụọ onye akaebe ọbụla ajụjụ (cross examination)
    • N'aka nke ndị APC, Tinubu, na Inec ha kpebiri inye ndị isi akaebe ha nkeji 30 n'otu n'otu.
    • Inec kwuru na ha ga-akpọ ndị akaebe abụọ, ebe APC kwuru na ha ga-akpọ mmadụ 39.
  2. Nchịkọta ihe mere n'ụlọikpe mkpegharị taa gbasara ntuliaka 2023

    Peter Obi n'ụlọikpe

    Ikpe nke taa abịala n'isi njedebe n'ụlọikpe mkpegharị Naịjirịa gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023.

    Ọ bụ pati Peoples Democratic Party na Labour Party ka ụlọikpe nụrụ mkpesa ha taa, mana ndị ọkaikpe ahụ kwuru na ha ga-amalitekwa echi.

    Otu mkpesa nke ụlọikpe tinyere anya na ya bụ gbasara arịrịọ ndị PDP na LP, nakwa ndị zọrọ ọkwa onyeisiala na patị abụọ ahụ bụ Atiku Abubakar na Peter Obi, na-arịọ ka ụlọikpe nye ikike ka e gosi ikpe ahụ n'onyonyo TV dịka ọ na-aga n'ihu.

    Gbasara nke a, ụlọikpe kwuru na ọ ga-enye mkpebi ya n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 22 nke ọnwa Mee.

    Ndị ọkaiwu

    Ọzọkwa bụ na ndị ọkaikpe gwara ndị ọkaiwu APC, PDP, LP, na Inec ka ha nwee nzukọ n'etiti onwe ha ma kwekọrịta usoro ikpe ga-esi aga.

    Ihe ha ga-enwe nkwekọrịta ya gụnyere: mmadụ ole a ga-akpọ maka ịgba akaebe, oge ole a ga-enye ndị chọrọ ịgba akaebe, oge ole a ga-enye iji jụọ onye gbara akaebe ajụjụ, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

    Ọkaiwu PDP bụ Chris Uche (SAN) kwuru na ya na ọkaiwu Inec bụ A.B. Mahmood enweela ọgbakọ a ma kwekọrịta, mana ọkaiwu APC na nke Tinubu bụ Wole Olanipekun na L.O Fagbemi kwuru na ha esoghị mee ọgbakọ ahụ. Uche kwuru na ya na Olanipekun na Fagbemi ga-enwekwa nzukọ nke ha iji kwekọrịta.

    N'otu aka ahụ kwa ụlọikpe gwakwara ọkaiwu Labour Party bụ Awa Uma Kalu ka o mekwaa otu ihe ahụ tupu ụbọchị Mọnde, nke ga-abụ ụbọchị ikpeazụ a ga-eme 'pre-hearing' tupu a malite ya bụ ikpe n'uju.

    Ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị echi bụ Satọde, n'ụtụtụ, ebe mkpebi gbasara igosi ikpe ahụ na TV ga-adị n'ụbọchị Mọnde.

  3. Etu ndị ọkaikpe si chụpụ onye ọkaiwu ọzọ kwuru na ya na-anọchite Labour Party

    Ụlọikpe

    Dịka ikpe gbasara ntuliaka 2023 na-aga n'ihu n'ụlọikpe mkpegharị n'Abuja taa, otu onye ọkaiwu aha ya bụ Oba Maduabuchi, bụkwa 'Senior Advocate of Nigeria', kuliri ọtọ kwuo na ya na-anọchite anya Labour Party.

    Cheta na Maduabuchi bụ onye nọchiteburu pati Action Alliance oge mkpesa ha dịkwa n'ụlọikpe ahụ, mana ha mechara kwuo na ha achọghịzi ịga n'ihu.

    Oge Maduabuchi kwuru nke a, ndị ọkaikpe ahụ baara ya mba ma kwuo na o kwesịrị ịma, dịka onye ọkaiwu rurula ogogo SAN, na ọ bụghị etu ahụ ka onye ọkaiwu si ekwupụta ndị ọ chọrọ ịnọchite anya ha.

    N'ụlọikpe taa, onye nọchitere anya 'Labour Party' bụ ọkaiwu Awa Uma Kalu (SAN).

    N'okwu ya dịka ụlọikpe gbasara, Kenneth Okonkwo bụ ọnụ na-ekwuru ndị Labour Party kwuru na onye ọkaiwu ahụ abụghị LP ka ọ na-anọchite kama ọ bụ onye chọrọ isi azụ ụlọ bata.

    "Mana ọ dị mma etu o si menye onwe ya ihere n'ụlọikpe ka ụwa niile hụ," Okonkwo kwuru.

  4. Peter Obi erutela n'ụlọikpe dịka ikpe maka ntuliaka malitere ọzọ taa

    Peter Obi

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na Labour Party bụ Peter Obi erutela n'ogige ụlọikpe mkpegharị dịka ikpe malitere ọzọ taa gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

    Cheta na Labour Party nakwa Peter Obi na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụbụ nke Inec kwuru na ọ bụ Bola Ahmed Tinubu nke All Progressives Congress meriri ya.

    Julius Abure bụ onyeisioche LP sokwa Peter Obi nọrọ n'ụlọikpe ahụ, mana Lamidi Apapa, bụkwa onye na-ekwu na ya bụ onyeisioche pati ahụ nọkwa n'ụlọikpe.

    Lamidi Apapa
    Nkọwa foto, Lamidi Apapa (yi akwa na-acha aja aja) na-ekwu na ọ bụ ya bụ onyeisioche Labour Party

    N'ụbọchị ikpe gara aga, ụfọdụ ndị nkwado Labour Pati chụpụrụ Lamidi Apapa n'ụlọikpe dịka ha kwuru na ọ bụghị onyeisioche pati ha, kama ha boro ebubo na ọ bụ ndị pati ọzọ na-enye ya nkwado ka o tinye ọgbaaghara na Labour Pati.

    Dịka onye ntaakụkọ anyị si hụ, ndị uweojii na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa ọzọ juputara n'okirikiri ụlọikpe ahụ iji gbochie ụdị aghara dapụtara n'ebe ahụ n'ụbọchị ikpe nke gara aga.

    Taa, tupu mmadụ abanye n'ime ụlọikpe, onye ahụ ga-egosi ihe akaebe ga-akọwa na o nwere ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ na ya bụ ụlọikpe, ma ọ bụghị otu a, ekweghị ka ọtụtụ mmadụ banye n'ime ogige ụlọikpe ahụ.

  5. Eyigharịala ikpe PDP gbara maka ntuliaka onyeisiala Naịjirịa gaa ụbọchị 19 nke ọnwa Mee

    Ndị ọkaikpe

    Eyigharịala ụbọchị ikpe otu Peoples Democratic Party na otu Action Peoples Movement gbara maka mpụtara ntuliaka onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023 gaaa ụbọchị 19 nke ọnwa Mee afọ 2023.

    Ọ bụ ọkaikpe ise na-ekpe ya bụ ikpe nke onyeisi ha bụ Ọkaikpe Haruna Tsammani.

    Nke a mere dịka ha sị ezumike nkeji ise bata ka ndị ọkaiwu na anọchite anya ndị niile so na ya bụ ikpe gwara ọkaiwu ka ọ yigharịa ya bụ ikpe gaa echi bụ ụbọchị 190 nke ọnwa mee.

    Ha kwuru na nke a ga-enye ha ohere ka ha bido isiokwu niile butere ya bụ ikpe na-egbugfhị oge.

    ọkaiwu
  6. Ebidola ikpe otu pati PDP gbara maka mpụtara ntuliaka onyeisiala Naịjirịa afọ 2023

    Ndị ọkaiwu

    Taa bụ ụbọchị a ga-ebido ikpe otu Peoples Democratic Party na otu Action Peoples Movement gbara maka mpụtara ntuliaka onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Ọ bụ ọkaikpe ise ga-ekpe ya bụ ikpe.

    Ọ bụ Ọkaikpe Haruna Tsammani ga-abụ onyeisi ndị ọkaikpe a.

    Ndị ga-aza akwụkwọ ikpe a otu PDP na APM gbara bụ ngalaba Independent National Electoral Commission (INEC) , Bola Ahmed Tinubu na otu pati All Progressive Congress.

    Chris Uche ( SAN) bụ onyeisi ndị ọkaiwu na-anọchite anya otu PDP, ebe Wole Olanipekun na-anọchite anya ndị nke otu APC.

    N'aka nke ọzọ ka L.O Fagbemi ( SAN) na-anọchite anya Bola Tinubu.

    Ndị ọkaiwu

    Etu ya bụ ikpe sị aga

    Ọkaịwu bụ Chris Uche kwuru na ndị niile ya bụ ikpe metụtara nwewre nkwekọrịta na ọ bụ naanị akwụkwọ niile nke ngalaba Inec binyere aka maka ya bụ ikpe ka ha ga-anabata ma sịkwa na nwereike ịkụchapụ akwụkwọ ọbụla nke na-esoghị n'usoro a.

    Ndị niile ya bụ ikpe metụtara kwadoro okwu a.

    Ndị ọkaiwu

    Maka igosi ya n'igwe onyonyo

    Chris Uche kwukwara na akwụkwọ nke etinyere n'ụbọchị 5 nke ọnwa Mei 2023 na nke ụbọchị 7 ọnwa Mei afọ 2023 kwadoro ka egosi etu ya bụ ikpe sị aga n'igwe onyonyo.

    Uche gara n'ihu kwuo na enweghị ihe gosiri na iwu Naịjirịa akwadpoghị ya.

    O kwuru sị, "E gosila etu ikpe sị aga oge mbụ n'ihe onyonyo na Naịjirịa. I lee anya, e nwere ihe onyonyo n'ime ụlọikpe a".

    Kama ndị ọkaiwu Inec na ndị ọzọ na-aza ya bụ ikpe akwadọghị ya bụ okwu igosi ikpe a n'igwe onyonyo ma sị ka akụpụ ya.

    A.B Mahmood kwuru sị, " E nwere ihe dị iche n'igosi n'igwe onyonyo na iji intanetị egosi ya dịka ọ na-eme. Nke ga-abụ ibu dị arụ nye anyị ma ọ ga-emebi ụsoro ụkpụrụ eji ekpe ikpe".

    Wole Olanipekun kwadoro Mahmood were sị, " Ụlọikpe abụghị ama egwuregwu maọbụ ebe a na-eme emume okpukperechi, ihe ngosi maọbụ ihe nka, nke amere na-ekwesịghị ikwu okwu maka nke a na mbido. Biko ka ụlọikpe kụchapụ ya na-egbugfhị oge".

    Ọ gara n'ihu kọwaa na iwu jịkọrọ etu ndị ọkaiwu sị arụ ọrụ akwadoghị igosi ikpe n'ihe onyonyo maọbụ ise foto etu ikpe sị aga.

    Kama ọkaiwu bụ Haruna Tsammani gwara ya sị ya cheta na-kachapụla ya bụ iwu kamgbe emegharịrị iwu jịkọrọ ndị ọkaiwu

    Fagbemi kwukwara na ọ jọgburu onwe ya ma sị na e nwere ihe dị iche na "Ikpe e kpere maka ọha mmadụ" na "Ikpe e kpere n'ihu ọha mmadụ".

  7. Ị bọọla chi

    Ofe

    Ebe foto si, Iwaria

    Nkọwa foto, Were nri umunne anyị bido ụbọchị taa

    Daalụ dịọka ị na-esonye anyị taa maka akụkọ dị mkpa gbasara mpụtara ikpe ntuliaka Naịjirịa

  8. Etu esemokwu si wee dapụta n'etiti ndị otu patị Labour n'ụlọikpe taa, Ihe ntaakụkọ anyị hụrụ

    Etu esemokwu si wee dapụta n'etiti ndị otu patị Labour n'ụlọikpe taa

    Ebe foto si, Segun Dosumu

    Etu eseomokwu si wee daa n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ikpe Peter Obi taa

    Ka e yigharịrị ụbọchị ikpe mkpesa Peter Obi ruo ụbọchị Fraịde 19 Mee 2023, ka ndị mmadụ pụtara, ndị isi ọkaikpe pụtara ịgwa ndị ntaakụkọ okwu, otu nwaokoroọbịa bụ onye otu Labour Pati pụtara kwuwe sị ka e kwekwala ka Lamidi Apapa gwa ndị ntaakụkọ okwu.

    Nwa okotoọbịa gara chere ya bụ Nwaamadị Apapa n'ebe niile ka ọ pụta. Ka Maazị Apapa pụtara ikwu okwu ndị ntotoọbịa a amalite tiwa ya ihe. Ndị ọrụ ụlọikpe wee kpọzie ndị uweojii a bịara dupụ ya bụ nwa amadị Lamidi Apapa n'etiti ha.

    Mana mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo kọrọla anyị akụkọ a,ndị uweojii kpọbara Maazị Apapa baa n'ime ụlọ, ka udọ lọghachite.

    Ebe foto si, Segun Dosumu

    Nkọwa foto, Mana mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo kọrọla anyị akụkọ a,ndị uweojii kpọbara Maazị Apapa baa n'ime ụlọ, ka udọ lọghachite.

    Mgbe ndị uweoijii jụrụ ha ihe na-ese, ha sị na ha nwere nkwekọrịta na ma Maazị Julius ma Maazị Apapa agaghị agwa ndị ntaakụkọ ihe ọbụla.

    Mana mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo kọrọla anyị akụkọ a,ndị uweojii kpọbara Maazị Apapa baa n'ime ụlọ, ka udọ lọghachite.

  9. Election Tribunal: E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka Ntuliaka 2023

    Peter Obi n'ụlọikpe
    Nkọwa foto, Peter Obi n'ụlọikpe

    E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka ntuliaka 2023 gaa Fraịde Mee 19th 2023.

    Tupu ha a malite, ụlọikpe jụrụ ịnabata onye ga-anochite Labour Party, dịka patị a kewara ụzọ abụọ.

    Ụlọikpe mere nke a maka mmadụ atọ, nke gụnyere Lamidi Apapa (onyeisioche LP machiri), ọkaiwu Julius Abure (bụkwa onyeisioche LP, nke ụlọikpe machiri), na onyeisi ndị ụmụnwaanyị LP nọ na-azọ onye ga-anọchite patị ahụ.

    Ọkaiwu Livy (SAN) kwuru na ha enwetabeghi akwụkwọ ruru 70% n'aka Inec. O jiri Inec ebe ahụ gwara ha Rivers steeti ma atụ, ebe o kwuru na onye ọrụ Inec sị na akwụkwọ EC8A adịghị.

    O kwukwara na n'agbanyeghi na ha gara ụlọọrụ Inec ugboro ise, akụkọ ka ha na-anụ. Ọkwaiwu Livy kwuru na o degara ọkaiwu na-anọchitere Inec, bụ Abubakar Mahmoud (SAN), ka o leba anya n'inweta akwụkwọ ndị ahụ, nke ụloikpe si ha wepụta kamgbe Maachị.

    Mana Mahmoud kwuru na ọ gbakwojuru ya anya. Na ndị otu LP abịaghi n'ụbọchị Mọnde 15, ka ha siri kwuo

    Ka ihe niile a na-eme, ụlọikpe chetara ha na mkpesa tupu ikpe ntuliaka e nwere kpọmkwem ga-eru ụbọchị 14, nke pụtara na ụbọchị ikpeazụ ga-abụ Sọnde Mee 21, 2023.

  10. Election Tribunal: E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka Ntuliaka 2023

    Peter Obi

    E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka ntuliaka 2023 gaa Wenezde izu na-abịa dịka amalitere ịnụ ya bụ ikpe n'elekere abụọ nke ehihe Wenezde a.

    Peter Obi zọọrọ Labour Party ọkwa a wụchiri n'ụlọikpe mkpegharị dịka a malitere e hibere ịmalite ikpe a n'elekere abụọ nke ehihie Wenezde a bụ abalị 10 nke ọnwa Mee, 2023.

    Labour Party rịọrọ ka e yigharịa ikpe a gaa ụbọchị Wenezde izu na-abịa bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Mee, 2022.

    Nke a bụ n’ihi na enwere ike ndị nọ n’ime akwụkwọ mkpesa ha nke ha chọrọ ihazi. Ha na-arịọkwa ka ha jiri ụbọchị Mọnde na Tuzde nyefee ndị niile akwụkwọ a metụtara ozi dịịr ha.

    Ndị ọkaiwu na-anọchịte ndị gbara ikpe nakwa ndị agbara ikpe gbakọtara nụ mkpesa ndị a.

    Wole Olanipekun bụ onye ọkaiwu na-anọchịte Bola Tinubu nọ dịka Lateef Fagbemi na-anọchite APC n'ọkwa.

    Ọkaiwu Levi Ozoukwu na-anọchite Peter Obi na LP wụchiri n'oge n'ime ụlọikpe ahụ.

    Cheta na ka e mechere ntuliaka 2023, pati ole m ole gbara akwụkwọ maka usoro ya bụ ntuliaka ebe ụfọdụ gbara akwụkwọ megide ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nakwa onye ha kpụpụtara dịka onye nwetere mmeri bụ Bola Ahmed Tinubu.

    Obi chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ntuliaka ahụ e mere n'ọnwa Febrụwarị 2023 kpamkpam ka Inec hazigharịa ntuliaka ọzọ, bụ nke Rinubu na ndị APC agaghị eso zọọ.

    Obi kwukwara na Tinubu enwetazughị vootu zuru oke n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja dịka iwu Naịjirịa si kwuo.

  11. Ndị otu nkwado pati dị iche iche awụchiela n’ogige ụlọikpe mkpegharị Abuja

    Ndị nkwado pati dị iche iche
    Nkọwa foto, Ndị nkwado pati dị iche iche

    Ọtụtụ otu ikike dịrị onye ndị mmadụ nakwa otu nkwado pati dị iche iche amalitela ịgbakọ n’ezi nakwa n’ihu ụlọikpe mkpegharị bụ ebe a na-ekpe ikpe banyere ntuliaka 2023.

    Ụfọdụ n’ime ha kwuru na ha pụrụ ebe ahụ iji kwado ndị nke ha ma hụ na e kpere ikpe ziri ezi.

    Otu onye bụ onyeisi otu a kpọrọ ‘Natives’ nke aha ya bụ Smart Edwards kwuru:

    “Dịka ohere iwu nyere maka ndị nwere mkpesa maka ntuliaka bụ ịga ụlọikpe. Ọtụtụ pati agbaala mmeri a sị Bola Ahmed Tinubu nwetere na ntuliaka”

    “Anyị pụtara ikwado pati ndị na-eso usoro ikpe a, mana anyị chọkwara ịhụ na anyị busoro ndị ọbụla na-achọ imaja ndị ọkaikpe maọbụ ndị ọrụ ikpe ọbụla agha.”

    Nke a na-abịa ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 ka kụchapụrụ mkpesa otu Action People's Party(APP) mere maka ntuliaka n’ụtụtụ Wenezde, abalị 10 nke ọnwa Mee, 2023, e hibere ikpe nke Peter Obi bụ onye zọọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 nakwa ikpe pati ya bụ Labour Party gbara maka ya bụ ntuliaka n’elekere abụọ nke ehihe Wenezde a.

    Smart Edward bụ onyeisi otu Natives kwuru na ọ chọrọ ka e kpee ikpe ziri ezi
    Nkọwa foto, Smart Edward bụ onyeisi otu Natives kwuru na ọ chọrọ ka e kpee ikpe ziri ezi
    Ndị nkwado pati dị iche iche
    Nkọwa foto, Ndị nkwado pati dị iche iche
    Otu onye pụtara naanị ya ime ngagharịiwe
    Nkọwa foto, Otu onye pụtara naanị ya ime ngagharịiwe
  12. Ụlọikpe akụchapụla ikpe APP gbara maka ntuliaka 2023

    Okaiwu Obed Agu kọwara na ọ gwara ndị ntaakụkọ na Mọnde na ha agaghị akagbu mkpesa ha
    Nkọwa foto, Okaiwu Obed Agu kọwara na ọ gwara ndị ntaakụkọ na Mọnde na ha agaghị akagbu mkpesa ha

    Dịka agbakọrọ ọzọ ikpe ikpe otu Action People's Party(APP) gbara maka ntuliaka 2023 nke malitere n’elekere itoolu nke ụtụtụ Wenezde a n’ime ogige ụlọikpe mkpegharị nke Abuja, ụlọikpe kụchapụrụ mkpesa APP mere maka ntuliaka ahụ.

    Ọkaikpe Haruna Tsammani bụ onye nọ n’isi ikpe ahụ kụchapụrụ mkpesa ahụ.

    Nke a so nkagbu patị ahụ mere n’okwu ha buteburu ụlọikpe ahụ.

    Obed O. Agu bụ onye ọkaiwu pati ahụ gwara ndị ntaakụkọ n’ogige ụlọikpe ahụ ka e mechara mkpebi a na “Ọ bụ onye kpọrọ ọrụ sị ya kagbuo ya bụ mkpesa”.

    Ọ gara n’ihu kwuo “Dịka onye ọkaiwu, a dị m ezigbo njikere iga ikpe a garuo ya na isi njedebe mana onye kpọrọ ọrụ sị ka m kagbuo ya.”

    Oge a jụrụ ya ihe mere nke a jiri mee, o kwuru “Ọ gwaghi m ebumnobi ya, ihe a sị m mee dịka onye a kpọrọ ọrụ ka m mere.”

    Mkpesa ha metụtara ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naijirịa bụ Inec, Bola Ahmed Tinubu bụ onye Inec kwuru nwetere mmeri na ntuliaka 2023 nakwa pati All Progressives Congress (APC).

    APP butebụru mkpesa maka ntuliaka 2023 maka ebubo na usoro ya esoghi usoro ohere iwu nyere nakwa na usoro Inec depụtara.

    Ndị ọkaiwu nọchitere anya ndị a bụ Wole Olanipekun (BolaTinubu) , L.O. Fagbemi (APC), A.B Mammood(Inec) wụchiri ụlọikpe ahụ oge e mere mkpebi a.

    Cheta na Nnadi Charles Osita zọọrọ pati APP ọkwa onyeisiala 2023 dịka ya na pati ahụ buuru mkpesa gaa ụlọịkpe n’ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị 2023 mana ha zigaara ụlọikpe ozi n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee maka atụmatụ nkagbu mkpesa ha.

  13. E yigharịala ikpe mkpesa PDP maka ntuliaka 2023 gaa ụbọchị Tọọzde

    Ọkaiwu Chris Uche bụ onyeisi otu ikpe PDP kwuru na ha chọrọ ka ọha hụ ikpe a n'onyonyo
    Nkọwa foto, Ọkaiwu Chris Uche bụ onyeisi otu ikpe PDP kwuru na ha chọrọ ka ọha hụ ikpe a n'onyonyo

    Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 nọ n’ime ogige ụlọikpe mkpegharị nụ mkpesa Peoples Democratic Party (PDP) mere banyere ntuliaka 2023.

    Ọkaikpe nọ n’isi ikpe a yigharịrị ikpe a gaa ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Mee, 2023.

    Ka eyigharịchara ikpe ahụ, onyeisi ikpe Atiku Abubukar na PDP bụ Chris Uche gwara ndị ntaakụkọ n’ogige ụlọịkpe ahụ

    “Anyị emeela ihe niile dịrị anyị, anyị kwupụtara okwu mkpesa anyị ka e kwee ka egosi usoro ikpe a n’ihu ọha nke anyị chọrọ ka ọ gbaa n’onyonyo n’ihi na anyị cheere na ikpe dịrị ụmụafọ Naijirịa niile mkpa.”

    “Anyị na-atụ anya na ụlọikpe a ga-ekwupụta mkpebi ya na mkpesa a n’ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị ebugaziri ikpe a.”

    Atiku Abubakar na PDP chọrọ ka ụlọike ahụ kpọpụta aha ya dịka onye nwetere mmeri na ntuliaka ahụ maọbụ nye iwu ka a hazie ntuliaka ọzọ n’etiti Atiku na Bola Ahmed Tinubu nke otu All Progressives Congress (APC) bụ onye Inec kpọpụtara ya dịka onye mmeri na ntuliaka 2023.

    Mkpesa ha nyekwara ohere ọzọ nke na-achọ ka akagbuo ntuliaka 2023 kpam kpam ma megharịa ọzọ.

    Mkpesa ahụ ha mere kwukwara na Tinubu etozughi oke ịzọ ọkwa ahụ ma fọdụzie inweta mmeri ma kwuo na ọ bụghị ya bụ onye kacha nweta vootu a tụrụ na ya bụ ntuliaka.

    Inec kwuru na Tinubu ji vootu 8,794,726 merie ebe Atiku nwetere vootu 6,984,520 na ntuliaka ahụ.

  14. E yịgharịala ikpe APM gaa ụbọchị 11 nke ọnwa Mee

    Ụlọikpe mkpegharị

    Taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee bụ ụbọchị ikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 nke a na-ekpe n’ụlọikpe mkpegharị nke Abuja bụ isiobodo Naịjirịa.

    A malitere ikpe mkpesa ntuliaka ọzọ dịka ụlọikpe ahụ malitere ịnụ mkpesa ndị pati dị iche iche nwere n’ụbọchị Mọnde abalị asatọ nke ọnwa Mee, 2023.

    A nụrụ mkpesa otu pati Allied People’s Movement (APM) mere mechee yigharịa ya bụ ikpe gaa ụbọchị 11 nke ọnwa Mee dịka ọkaikpe ise nọrụ nụ mkpesa ha.

    Ọ bụ Haruna Tsammani nọ n’isi ikpe ahụ.

    Pati APM na-agbagha mmeri onye a họpụtara ịchị Naịjirịa bụ Bola Tinubu nke APC na ntuliaka 2023.

    APM na-ekwu e nwere ọtụtụ ihe ndị dị aṅaa mere n’oge ntuliaka nyere Tinubu mmeri ma kwuo na ọtụtụ tigbuo zọgbuo dapụtara n’oge ntuliaka ahụ nke mere ha ji agbagha mmeri ya.

    Ndị ọkaiwu pati All Progressives Congress (APC), bụ pati Tinubu nakwa osote ya rịọrọ ụlọikpe ahụ ka a kụchapụ mkpesa APM.

    Ọkaikpe Tsammani gwara ndị niile ikpe ahụ metụtara ka ha gbaa mbọ tinyeaka n’arịọrọ nakwa mkpesa ha iji hụ na edeghị ihe ndị edeburu ụgbọrọ abụọ ma ghara igbu onye ọbụla oge.

    Nke a mere e ji yigharịa ikpe ha ma kwuo na a ga-amalite ịnụ mkpesa otu pati Peoples Democratic Party, (PDP).