Supreme Court: Ihe ndị mere taa n'Ụlọikpe Kachasị n' ikpe Atiku,Obi megide Tinubu

Lee ihe niile gbasara ikpe mkpesa n'ụlọikpe na ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Chioma Nkemdilim Daramola, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Ụfọdụ ndị ntoroọbịa na-akpagharị n'okporoụzọ n'ịkwado Onyeisiala Tinubu

    Ụfọdụ ndị ntoroọbịa bu akwụkwọ na-eme ngagharị n'okporoụzọ Abuja iji gosi nkwado ha nye Onyeisiala Bola Tinubu.

    Ihe e dere n'akwụkwọ ha ji na-akpagharị gosiri na ha si na mpaghara Niger Delta nke Naịjirịa mana a maghị onyeisi ha kpokọtara ha.

    Uwe na-akwụkwọ ha yicha gosiri na ha na-akwado onyeisiala Tinubu.

    Ndị ntoroọbịa na-akwado Tinubu
    Ndi nkwado Onyeisiala Tinubu
    Ndị ntoroọbịa na-egosi nkwado Onyeisiala Tinubu
  2. Ndị nchekwa juru n'okporoụzọ niile dị nso n'ụlọikpe

    Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche kwụcha n'okporoụzọ e si aga n'ụlọikpe bụ ebe a na-ekpe ikpe banyere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    E mechiri okporoụzọ ahụ nke bụ na tupu onye ọbụla agafee, onye ahụ ga-egosi akwụkwọ njirimaara ya.

    Okporoụzọ ụlọikpe
    Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ọrụ
    Ndị ọrụ nchekwa juru n'okporoụzọ e si aga n'ụlọikpe ahụ
  3. Ihe onyonyo etu ikpe ahụ si aga

    Kirie ihe onyonyo etu ikpe a si aga.

  4. Shettima, Ganduje, Gbajabiamila na ndị ọzọ awụchiela n'ụlọikpe

    Kashim Shettima, osote onyeisiala Naịjirịa

    Ọtụtụ ndị isi okpokpo nọ na gọọmentị awụchiela n'ụlọikpe dịka a ga-ekpebi ikpe banyere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Ndị dịka Kashim Shettima osoAbdullahi Ganduje bụ onyeisi otu All Progressive Congress, onyeisi ndị ọrụ onyeisiala Tinubu bụ Femi Gbajabiamila nakwa ndị ọzọ.

    Okporoụzọ Abuja dị nso n'akụkụ ụlọikpe ahụ jupụtara na ndị ọrụ nchekwa dịka e mere ụgbọala ịgba n'okoroụzọ ndị ahụ.

    Ganduje bụ onyeisi APC
    Etu ok[
    Ime ụlọikpe
  5. Ihe ndị mmadụ na-atụ anya ga-eme n'ụlọikpe taa

    Ndị ọkaiwu na-ahụ maka ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa

    Dịka taa bụ ụbọchị a ga-ekpebi ikpe banyere onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa, ọtụtụ ndị mmadụ na-ele anya ịmata ka ikpe ahụ ga-esi gaa.

    Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa na-atụ anya na ndị ọkaikpe ji okwu ahụ ga-ekpe ikpe ziri ezi taa.

    Iji mee nke ụwa niile mara ke ikpe ahụ ga-esi gaa, a ga-agbasa ikpe ahụ n’ihe onyonyo TV ka ọha hụrụ.

    Ndị ọkaikpe mmadụ ise ga-achịkọta mkpesa na ọsịsa niile pati ndị o metụtara tinyere n’ụlọikpe ma kwupụta mkpebi ha banyere onye meriri.

    Ndị a gụnyere; ọkaikpe Haruna Simon Tsammani, ọkaikpe Stephen Jonah Adah, ọkaikpe Mistura Bolaji-Yusuf, ọkaikpe Boloukuoromo Moses Ugo na ọkaikpe Abba Bello Mohammed.

    Ihe ndị ha nwereike ikpe gụnyere;

    • Ihe ndị ọkaikpe a kpebiri ga-egosi ma Onyeisiala Bola Tinubu ọ ga-aga n’ihu ịnọ n’ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa.
    • O nwereike ha akagbuo ntuliaka e jiri họpụta onyeisiala Tinubu ma sị ka e megharia ya.
    • O nwekwara ike ha ekpebie na ọ bụ onye ọzọ dịka Atiku Abubakar maọbu Peter Obi meriri na ntuliaka ahụ.

    Mana etu ọbụla ọ ga-esi aga, anya ndị Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ dị n’ụlọikpe mkpegharị bụ ebe ikpe ga-eme n’elekere itoolu nke ụtụtụ a.

    Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Satọde 25 Febụwarị, 2023 ka e mere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) haziri.

    Ha kpọpụtara Bola Tinubu nke All Progressive Congress (APC) dịka onye meriri na ntuliaka ahụ mgbe o nwetere vootu 8,794,726, Atiku nke Peoples Democratic Party (PDP) nwetere vootu 6,984,529 ebe Peter Obi nke Labour Party (LP) ji vootu 6,101,533 gbaa onye atọ.

    Atiku na Obi anabataghị mpụtara ahụ nke mere ha jiri kpụpụ ụlọọrụ Bola Tinubu, Kashim Shettima, Inec na APC nakwa n’ụlọikpe sị ka a kagbuo mmeri ahụ.

    Ndị a niile enyela ọsịsa ha banyere ebubo ndị a malite kamgbe ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee 2023, ya mere ọ dịzi ụlọikpe n’aka ikwu onye meriri na ntuliaka ahụ n’ụbọchị taa.

  6. Igbo ndị ọma daalụ nụ ooo!

    Igbo sị na ụka a kpara akpa na ọ bụ isi ka e ji ekwe ya.

    Anyị ji obi ọcha anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Bia hụrụ ka ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-esi chabie ikpe banyere onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

  7. E nwereike ikpebi ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ụbọchị Wenezde

    Peter Obi, Bola Tinubu, Atiku Abubakar

    Ebe foto si, Obi/Tinubu/Atiku

    A na-atụ anya na a ga-ekpebi ikpe banyere ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’ụbọchị Wenesde 6 Sepụtemba 2023.

    Onye odeakwụkwọ ụlọikpe mkpegharị bụ Umar Bangari kwuru nke a site n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchi Mọnde ma sị na a ga-agbasa usoro ikpe ahụ n’ihe onyonyo TV.

    Cheta na pati Labour (LP), Peoples Democratic Party (PDP) na Allied Peoples Movement (APM) nakwa ndị ji aha ha zọọ ọkwa onyeisiala gara n’ụlọikpe chọrọ ka a kagbuo mmeri Bola Tinubu na ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023.

    A na-atụkwa anya na ụlọikpe ga-achabi ikpe ntuliaka ọkwa gọvanọ na steeti iri abụọ na ise, nke ndị ụlọomeiwu nke Naịjirịa nakwa nke steeti.

    A na-ama mpụtara ntuliaka ụlọọrụ Inec kpọpụtara na steeti ruru iri abụọ na ise n’ime iri abụọ na asatọ e mere ntuliaka.

    Akwụkwọ mgbasaozi maka ntuliaka

    Ebe foto si, Court of Appeal, Nigeria

  8. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Daalụ maka ịnọnyere anyị kamgbe mmalite akụkọ maka ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Biko gbaa mbọ soro anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe banyere ikpe ntuliaka a.

  9. Ka ọ dị mgbe ọzọ!

  10. "O nweghị ihe o mere maọbụrụ na e nweghị ike ịhụ edemede mpụtara ntuliaka" - Ọkaiwu Inec

    Livy Uzoukwu sị na ọkaiwu Inec emetaghị ya iwetuala uru iRev bara n'usoro ntuliaka.

    Livy Uzoukwu sị na ọkaiwu Inec emetaghị ya iwetuala uru iRev bara n'usoro ntuliaka.

    O jiri okwu Oyetola nke Osun steeti na iRev socha usoro ntuliaka e jiri wepụ ya n'ọchịchị dịka gọvanọ Osun steeti. Ọ sị na itinye mpụtara na iRev socha n'usoro ntuliaka.

    Ọ gakwara ihu kwuo na n'okwu ndị EU, ntuliaka 2023 nwere nnukwu ntụpọ. Ọ bụghị ihe a na-agọ na Bola Tinubu nyefuru ndị mba Amerika $460,000 maka okwu ọgwụike.

    Ọ gbadoro ụkwụ n'iwu Naịjirịa na mpaghara 134 nke iwu ntuliaka, onye mbụ bụ Peter Obi kwesịkarịrị imegharị ntuliaka.

    Ọ yọrọ ụlọikpe ịtụgharịa ihe "nakwa 25%" ma leekwa ya ka okwu na-enweghị njikọ doro anya ọbụla.

    Okwu Ọkaiwu ndi Inec bụ A. B. Mahmoud kwuru na mpiachi
    Nkọwa foto, Okwu Ọkaiwu ndi Inec bụ A. B. Mahmoud kwuru na mpiachi

    Okwu Ọkaiwu ndi Inec bụ A. B. Mahmoud kwuru na mpiachi

    Ọkaiwu Mahmoud ndi Inec nabatara ihe ha dere ọ sị na ndị otu pati Labour ghọtahiere ihe mere ha jiri wee webata ngwa ọrụ Bvas na ntuliaka.

    Ihe aka ebe ndị Inec webatara gbasara Amazon Web Service - AWS nọ n'ihu ụlọikpe gosiri na ndị Inec gbara mbọ ịhụ na ha jiri igwe Tecknụzụ ha nwalere tupu ha emewe ya bụ ntuliaka.

    Mahmoud kwuru na o nweghị ihe aka ebe gosiri na ha anwaleghị ya.

    Ha si na ọ bụghị iwu na ha jiri igwe intanet tụkọta vootu ndị mmadụ na ha gụkọtara vootu ha hụrụ n'anya. Dịka o kwuru, ha tụkọrịtara vootu ndị ụlọomeiwu na nke ọkwa onyeisiala n'otu ụbọchị makwa na o nweghị onye jụrụ ese maka nke ndị ụlọomeiwu maka na ha jii aka tụkọọ nke ahụ.

    Ọkaiwu Inec bụ Mahmoud sị na ebubo ndị otu pati Labour na-ebo ha na aka enwe bara na nchịkọta vootu ha abụghị eziokwu maka na o nweghị akaebe ha wetara igosi na ihe a mere n'ezie.

    Mahmoud na-ekwu na e hibere ọba IReV maka igosi ụwa niile ka o si aga, na ọ bụghị maka nchịkọta vootu.Nchịkọta vootu ka bụ nke e ji aka agụ. O nweghị ihe o mere maọbụrụ na e nweghị ike ịhụ edemede mpụtara ntuliaka.

    Ihe Inec kwuru maka okwu 25% n'Abuja

    Mahmoud kwuru na n'okwu 25% n'Abuja, enweghị ike iji maka ya kagbuo ya bụ ntuliaka ọkwa onyeisiala maka na ọ ga-eme ka a na-akwanyere Abuja ugwu karịrị ya, n'ihi na ọ dịghịrị steeti ndị ọzọ mma. N'okwu ya, Mahmoud sị na n'uche ya, e kwesịrị ka a hụ Abuja dịka steeti nke iri atọ na asaa.

    Okwu Ọkaiwu APC bụ Wole Olanipekun kwuru na mpiachi
    Nkọwa foto, Okwu Ọkaiwu APC bụ Wole Olanipekun kwuru na mpiachi

    Okwu Ọkaiwu APC bụ Wole Olanipekun kwuru na mpiachi

    1. O kwenyere n'ihe ọkaiwu Inec kwuru na nchịkọta vootu abụghị iwu. Ọ rụrụ aka n'ikpe otu pati Labour ka ụlọikpe mee ka Inec jiri ịntaneti chịkọta vootu mana ikpe a adabarala ha, makwa na ha ekpeghịzị ya ọzọ.

    2. Gbasara okwu nnyeghachị ego, Olanipekun sị na ikpe ahụ akarịala afọ iri abụọ, na n'iwu mba Naịjirịa, ọ gafee afọ iri, iwu agbagharala onye ahụ njọ ya. Na ka o nweghị nha ọzọ a dara ya.

    3. Ọ kwụsịrị ike na Tinubu nwetara vootu pasenti iri abụọ na ise n'Abuja, na ọ bụrụ na a ga-emegharị ntuliaka, Obi ekwsịghị iso maka na ọ gbara onye nke atọ, maka na ọ bụghị onye otu Labour Pati.

    Okwu onye ọkaiwu ndị APC Lateef Fagbemi kwuru na mpịachị ya

    Ọ sị na o lere anya, ịhụ ma ndị mmadụ ha tụrụ vootu n'ọdọ ntuliaka ha, makwa ma ha gụkọrọ vootu ndị mmadụ, makwa ma ha kpọpụtara mpụtara n'ọdọ ntulaiaka ha. Ọ sị na ihe a niile ka e mere dịka e kwesịrị.

    Ọ sịkwa na na ọ bụrụ na a ga-emegharị ntuliaka, Obi ekwsịghị iso maka na ọ gbara onye nke atọ, maka na ọ bụghị onye otu Labour Pati.

    N'okwu 25% n'Abuja, ọ sị na e kwesịghị iji maka ya kagbuo ya bụ ntuliaka ọkwa onyeisiala maka na ọ ga-eme ka a na-akwanyere Abuja ugwu karịrị ya, n'ihi na ọ dịghịrị steeti ndị ọzọ mma. N'okwu Fagbemi, ọ sị na n'uche ya, o kwesịrị ka a hụ Abuja dịka steeti nke iri atọ na asaa.

  11. Ụlọikpe anabatala mkpesa nakwa ihe akaebe Atiku na PDP nke ikpeazụ

    Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) enyela ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọsịsa nke ikpeazụ banyere etu ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa siri gaa.

    Ndị ọkaiwu Inec, APC, Tinubu na Shettima gbara isi akwara ma gwaa ụlọikpe ka a kụchapụ mkpesa ahụ.

    Mana ọkaiwu Atiku bụ Chris Uche gwara ụlọikpe ka ọ kagbuo mmeri ma kpọpụta Atiku dịka onye meriri.

    N'okwu ihe banyere inwete vootu pasentị iri abụọ na ise (25%) n'Abuja, ọkaiwu Tinubu kwuru na Abuja dịka steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa na o nweghi ihe dị iche.

    N'aka nke ọzọ, ọkaiwu Atiku kwuru na dịka iwu Naịjirịa si dị na inwete vootu 25 pasentị dị mkpa maka ọ bụ Isiobodo Naịjirịa na ọ bụghị steeti ụkpọrọ.

    Ụlọikpe kwuru na a ga-akwa Pati ndị a ụbọchị ha ga-achabi ikpe ahụ.

  12. Atiku Abubakar awụchiela n'ụlọikpe maka ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Atiku Abubakar

    Atiku Abubakar bụ onye ji aha Peoples Democratic Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023 awụchiela n'ụlọikpe maka ikpe banyere ntuliaka a.

    A na-atụ anya na pati abụọ ga-eso akwụkwọ mkpesa na nke ọsịsa ha nke ikpeazụ tupu ụlọikpe ehiwe ụbọchị ha ga-achabi ikpe a.

    Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja
    Ndị ọkaiwu Atiku Abubakar
  13. Presidential Election Tribunal: Gịnị ga-eme n'ụlọikpe ntuliaka taata?, Ụlọikpe amalite ịpịachie ikpe banyere ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa

    Ndị zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023

    Ebe foto si, Obi/Atiku na Tinubu

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa onyeisiala na Naịjirịa na-akwado ịpịachi ihe niile gbasara ikpe ntuliaka ahụ ma kwupụta ụbọchị ha ga-achabi ikpe a.

    Otu ụzọ ha ga-eji pịachie ikpe a bụ ma pati niile so n’ikpe tụlee ma nabata ọsịsa ibe ha nyere banyere akwụkwọ a gbara.

    Ha ga-eme nke a site na nrụrịtaụka n’etiti ndị ọkaiwu na-anọchite anya ha n’ụlọikpe a.

    N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ 2023 ka ndị ọkaikpe mmadụ ise nọ n’isi ikpe ahụ hiwere maka nrụrịtaụka a.

    Nke a pụtara na ndị ji aha Labour Pati, PDP nakwa APC zọọ ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi, Atiku Abubakar nakwa Bola Tinubu ga-ekwupụta ọsisa nke ikpeazụ ha tupu a chabie ikpe ahụ.

    Cheta na Peter Obi na Atiku na-ama Bola Tinubu na ụlọọrụ Inec aka na-ekwu na mkpọpụta Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala bụ asị ọcha.

  14. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo

    Taa anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị.

    Ebe bụ ebe ị ga-achọpụta etu ikpe banyere ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa si aga.

    Buru oche gị bịa ka ị gụrụ akụkọ niile banyere ikpe a.

  15. Peter Obi etozughi ịzọ ọkwa onyeisiala 2023 – Onye akaebe APC

    Bola Tinubu na Peter Obi

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook/Peter Obi/Facebook

    Otu onye akaebe Onyeisi Bola Ahmed Tinubu n’ikpe nụrụ asịsa maka ebubo e boro maka ntuliaka 2023 kwuru n’ụbọchị Wenezde abalị ise nke ọnwa Jụlaị na enweghi akwụkwọ ikpe ọbụla kwuru na ikpe amabuola Tinubu na mba Amerịka.

    Sịnetọ Opeyemi Bamidele bụ onye ndị ọkaiwu otu APC kpọrọ ịgba akaebe dịka ha kwuru na ha agaghị akpọku onye akaebe ọzọ n’okwu ahụ.

    Bamidele bụ onye na-arụ ọrụ dịka onye ọkaiwu na mba Amerịka bụkwa onyendu ndị pati kachasị n’ụlọomeiwu Naịjirịa wepụtara ihe akaebe n’ụlọikpe ahụ ma kwuo na enweghi akwụkwọ ọbụla gosiri na ikpe amabuola Tinubu na mba Amerịka dịka ụfọdụ ndị buteere ụlọikpe ahụ mkpesa siri kwuo.

    Ọ gaakwara n’ihu gbaa otu akwụkwọ n’anwụ ma kwuo na “Peter Obi etozughi ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'aha Labour Party”.

    Ya bụ akwụkwọ bụ kwuru na n’ebe ọnwa Eprel 2023 mgbe Labour Party zigaara Inec ha ndị otu ha na aha Peter Obi esoghi n’aha ndị otu ahụ ma ncha.

    Ọ gbakwara ama dịka onye sị na ọ ma Tinubu nke ọma ma kwuo na Tinubu bụ onye Naịjịrịa n’ezịa.

    Bamidele kwukwara na vootu a gụnyeere Tinubu na Kano fọduru 10,920.

    Cheta na ụlọikpe a na-ahụ maka ntuliaka nabatara asambodo Onyeisiala Bola Tinubu nwetere na mahadum steeti Chicago dịka ihe akaebe mgbe ọ na-azara ọnụ ya n’akwụkwọ Atiku Abubakar gbara ya maka ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    N’ikpe a, onye ọkaiwu Labour Party nwara ibuteere ụlọikpe ahụ akwụkwọ ozi otu EU banyere ọrụ nlebaanya ha na ntuliaka 2023 mana ndị na-azara ọnụ ha anabataghị ya.

    Onye ọkaiwu Labour Party anabataghịkwa akwụkwọ abụọ so n’ihe akaebe Bamidele buteere ụlọikpe ahụ mana ndị ọkaiwu APC, Tinubu na Inec nabatara ya.

    APC ji asịsa Bamidele wetere were mechie ya bụ okwu ịzara ọnụ ha.

  16. Ụlọikpe anabatala asambodo Tinubu nwetere na mahadum Chicago dịka ihe akaebe

    Ọnyeisiala Naịjirịa

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka nabatara asambodo Onyeisiala Bola Tinubu nwetere na mahadum steeti Chicago dịka ihe akaebe mgbe ọ na-azara ọnụ ya n’akwụkwọ Atiku Abubakar gbara ya maka ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    Na mmalite ịnụrụ ọsịsa Tinubu, ọkaiwu ya bụ Wole Olanipekun Tinubu wepụtara asambodo ndị o jiri gụọ akwụkwọ na mahadum mba Amerịka a, tinyekwara akwụkwọ ozi ha jiri nabata ya n’ụlọakwụkwọ ahụ.

    Ọkaiwu ahụ gosikwara akwụkwọ njem ya iji gosi na o mere njem na mba Amerịka site n’afọ 2011 ruo afọ 2021 na-enweghi ọgbatauhie ọbụla.

    Ọ gakwara n’ihu gosi akwụkwọ ikike ime njem nke ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjirịa bụ Immigration Service nyere ya n’oge ndị ahụ.

    Ha gosikwara akwụkwọ ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa nyere Tinubu iji zaghachị ajụjụ ndị uweojii Naịjirịa jụrụ ma aka Tinubu ọ dị n’ime mpụ n’Amerịka, ha kwuru n’akwụkwọ wezugara aha Tinubu n’ime mpụ ọbụla na mba Amerịka.

    Ndị ọkaiwu PDP na Atiku jụrụ ịnabata akwụkwọ akaebe ndị a mana ụlọikpe gara n’ihu nabata ha.

    Ebe ndị ọkaiwu Inec na APC nabatara akwụkwọ akaebe ndị ahụ.

  17. Inec apịachiela ịzara ọnụ ha n'ebubo Labour Pati boro ha

    Ụlọikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Inec malitere ịzara ọnụ ha n’ebubo Peter Obi nke Labour pati boro ha maka etu ha si hazie ntuliaka ọkwa onyeisiala afọ 2023.

    Ha mere nke a site n’igosi ụlọikpe akwụkwọ akaebe isii bụ nke ọkaiwu ha bụ A.B Mahmood wepụtara.

    Ha kpọpụtakwara osote onyeisi ngalaba tekinuzu nke ụlọọrụ Inec dịka onye akaebe bụ onye tinyere akụrụngwa ịntanetị ndị Amazon bụ nke ha jiri hazie ntuliaka.

    O gosikwara usoro IRev jiri rụọ ọrụ n’oge ntuliaka mana ndị ọkaiwu Labour Pati jụrụ ịnabata akwụkwọ akaebe ndị a mana ụlọikpe gara n’ihu nabata ha.

    N’oge nyocha akwụkwọ ndị a, ọkaiwu Tinubu na Shettima kwuru na akwụkwọ akaebe nke ezi ya ụlọọrụ Inec nyere dị n’akwụkwọ EC8A na EC8B na nke a na-anaghị ahụcha anya dị n’ịntaneti agaghị emetụtaha.

    Na nchịkọta, Inec pịachiri nzara ọnụ ha n’ụlọikpe maka ebubo a Labour Pati boro ha. E yigharịrị ikpe ahụ echi bụ ebe Tinubu na Shettima ga-azara ọnụ ha.

  18. Inec enyela ụlọikpe ihe akaebe gosiri na ọbaozi ha nwere nsogbu n'ụbọchị ntuliaka

    Ụlọikpe ntuliaka

    Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n'ịchafụ enyela ụlọikpe ihe akaebe nke ha si gosiri etu ọbaozi ha si nwee nsogbu n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023, nke bụ ụbọchị e mere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Ha mere nke a site n'aka onye akaebe nke ha kpọrọ n'ụlọikpe taa, dịka ha malitere ịzara ọnụ ha n'ebubo nrụrụaka na ntuliaka nke pati 'Peoples Democratic Party' (PDP) nakwa 'Labour Party' (LP) na-ebo ha.

    Dịka ikpe ahụ malitere ọzọ n'ụbọchị Mọnde, dịka ndị ọkaiwu na ndị ọkaikpe lọghachiri n'ezumike maka emume Salah, Inec kpọrọ onye akaebe aha ya bụ Lawrence Bayode, onye bụ ọkachamara na ngalaba Tekịnụzụ ma bụrụkwa onye rụrụla ọrụ n'ụlọọrụ Inec ihe ruru afọ 24.

    Bayode kwuru na ọbaozi Inec nwere nsogbu n'ụbọchị ntuliaka nke mere na mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala ekweghị eziga n'ọbaozi 'Inec Result Viewing Portal' dịka ha si kwe na nkwa.

    Ọ gara n'ihu wepụta akwụkwọ nke ọ sị na o gosiri etu nsogbu ahụ si metụta ọbaozi ha. Ụlọikpe nabatara akwụkwọ ahụ dịka akaebe.

    Bayode gbakwụnyere na nsogbu ahụ ọbaozi ha nwere n'ụbọchị ntuliaka ezughị iji kagbuo ntuliaka ahụ maọbụ kwuo na o nwere nrụrụaka, "maka na ngụkọ na mgbakọ mpụtara ntuliaka bụ aka ka e ji eme ya ọ bụghị kọmputa".

    O kwukwara na ụbọchị atọ tupu ụbọchị ntuliaka, Inec kwuru na ha agaghịzi eziga mpụtara ntuliaka n'ọbaozi Irev dịka ntuliaka na-aga n'ihu.

    O gosiri ụlọikpe ahụ akwụkwọ akụkọ nke ụlọọrụ 'Tribune' bipụtara n'ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị ebe Inec mara ọkwa ahụ. ụlọikpe nabatakwara akwụkwọ ahụ n'akaebe.

    Dịka ọkaiwu PDP bụ Chris Uche (SAN) na-agba Bayode ajụjụ, o kwuru na ọ bụ otu igwe BVAS e ji ziga mpụtara ntuliaka sineti na ụlọ omeiwu nta bụkwa nke jụrụ iziga mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    O kwetakwara na ruo n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị, oge Inec kpọpụtara Bola Ahmed Tinubu dịka onye meriri ntuliaka ahụ, ọtụtụ mpụtara ntuliaka erutebeghị n'ọbaozi Irev.

    Gbasara akwụkwọ nke ndị otu 'European Union' wepụtara gbasara ntuliaka 2023, Bayode kwuru na ọ bụ Inec nyere ndị otu ahụ ikike iso na ndị ga-elekọta etu ntuliaka siri gaa, mana o kwuru na ya ahụbeghị akwụkwọ nchọpụta ikpeazu ndị otu EU ahụ wepụtara gbasara ya bụ ntuliaka.

    Cheta na otu EU katọrọ ntuliaka ahụ ma kwuo na ọtụtụ ihe mere na ya edochaghị anya, mana gọọmentị etiti kwuru na ha anabataghị ihe ahụ ndị EU kwuru.

    Inec gwara ụlọikpe na ọ bụ naanị Lawrence Bayode bụ onye akaebe ha ga-akpọ n'ikpe ahụ, nke pụtara na ha emechiela okwu nke ha.

    A na-atụ anya na ndị ọkaiwu Bola Ahmed Tinubu ga-amalite ịzara ọnụ ha n'ikpe ahụ n'ụbọchị Tuzde.

  19. Onye akaebe anyị agaghị enweike bịa ụlọikpe taa - Inec

    Ndị bịara ụlọikpe

    Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 amalitela ịnụ ọzọ taa bụ ụbọchị Mọnde abalị atọ nke ọnwa Julaị, 2023.

    Nke a na-abịa dịka ha kwụsituru ịnụ mkpesa n’abalị 20 nke ọnwa June 2023 bụ mgbe ndị na-agbagha mpụtara ntuliaka 2023 butechaara ụlọikpe ahụ mkpesa ha nakwa ihe akaebe nye okwu ha nwere maka etu ntuliaka ahụ siri gaa.

    Otu nakwa ndị na-agbagha ya bụ ntuliaka ugbua bụ Peter Obi nke Labour Party (LP) na Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP).

    Mkpesa ha rụrụ aka na nrụrụaka dapụtara n’ọrụ ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Inec mere n’oge ntuliaka ahụ.

    Ndị bịara ụlọikpe

    Etu ikpe nke taa siri gaa

    Ụlọikpe a kwesịrị malite ịnụ asịsa so ebubo nakwa mkpesa ndị LP na PDP merela nke metụtara All Progressives Congress (APC), Onyeisiala Bola Tinubu nakwa Inec.

    Ọkaiwu Inec bụ Abubakar Mahmood kwuru na ha ga-eji abalị atọ butecha ihe na ndị akaebe ga-agba ama na aghọghọ abanyeghi n’usoro ntuliaka 2023 bụ nke kwuru na Bola Ahmed Tinubu meriri.

    Inec kwuru na onye ghara ịbịa gbaa akaebe n’ikpe taa agaghị enweike bịa n’ihe na ihe gbata gbata dapụtara n’ezinaụlọ ya.

    Ọ rịọrọ ụlọikpe ahụ ka e yigharịa ya bụ ikpe gaa ụbọchị Tuzde, abalị anọ nke ọnwa Julaị.

    Ndị ọzọ kwesịrị inye asịsa kwenyere mkpesa ahụ ka eyigharịa ya bụ ikpe mana ọkaiwu LP bụ Livy Uzoukwu kwusiriike na “Inec adịghị njikere ma ncha nke bụ na ọ tụrụ ya n’anya na ha ezipụtaghị ozi a n’oge”.

    Ụlọikpe ahụ yigharịrị ikpe ahụ gaa ụbọchị Tuzde.

    Ikpe asịsa Inec nye PDP ga-amalite n’elekere abụọ.

  20. Tinubu, APC ga-amalite ịzara ọnụ ha n'ụlọikpe ntuliaka na Julaị 3

    Tinubu na Shettima

    Ebe foto si, APC

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na pati ya bụ 'All Progressives Congress' ga-amalite ịgọrọ ọnụ ha n'ụlọikpe mkpegharị maka okwu ntuliaka ọkwa onyeisiala nke 2023 n'ụbọchị atọ nke ọnwa Julaị.

    N'ụbọchị Fraịde, Jun 23, ka ndị otu 'Peoples Democratic Party' na 'Labour Party' mechiri ikpe nke ha dịka ha na-ebo ebubo na Tinubu na APC emerịghị ntuliaka ahụ n'ezie n'agbanyeghị na Inec kpọpụtara ha dịka ndị meriri.

    PDP na Atiku kpọrọ ndị akaebe 27 iji kwado ebubo ha, ebe Peter Obi na LP kpọrọ ndị akaebe 13, ma wetakwa ọtụtụ akwụkwọ iji gbaa akaebe.

    Ọkaikpe Tinubu bụ Wole Olanipekun rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha nyetụ ha ohere iji sonyere ndị ezinụlọ ha n'oge emume Sallah bụ nke ga-adị n'izuụka na-abịanụ.

    O kwuru na ọ bụ eziokwu na etinyeburu ụbọchị 30 nke ọnwa Jun dịka ụbọchị APC kwesịrị ịmalite ịzara ọnụ ha, mana ọ ga-aka mma ka ụlọikpe yigharịa ya ka ọ bụrụzie mgbe emume Sallah gafechara.

    "Anyị na-ekwe nkwa na anyị agaghị agafe ụbọchị ole e nyere anyị. Anyị ga-amalite ikpe anyị ma mechie ya n'ime otu izuụka," Olanipekun kwuru.

    Ndị ọkaikpe ise nọ n'isi ikpe ahụ, nke onyeisi ha bụ Harunna Tsammani, kwenyere ma yigharịa ụbọchị ikpe ahụ ka ọ bụrụ n'ụbọchị atọ nke Julaị 2023.