Supreme Court: Ihe ndị mere taa n'Ụlọikpe Kachasị n' ikpe Atiku,Obi megide Tinubu

Lee ihe niile gbasara ikpe mkpesa n'ụlọikpe na ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Chioma Nkemdilim Daramola, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Inec gụghị vootu, ha kenyere pati masịrị ha vootu- Yunusa Tanko

    Ụlọikpe

    Ọnụ na-ekwuru otu Labour Party bụ Yunusa Tanko akpọọla ụlọikpe oku ka ha kagbuo mpụtara Ntuliaka Onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Tanko, onye kwuru nke a n'ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka onyeisiala n'ụbọchị Fraide dịka a kpọrọ ya akaebe kwuru na Inec gụghị vootu na ntuliaka ahụ kama, ha kenyere pati masịrị ha vootu.

    Tanko kọwara na ụbochi ntuliaka ahụ na ya agaghị ebe ọbụla karịa ọgbọ atụmvootu ya nakwa ụlọ ebe pati ha nọ achịkọta ka ihe si aga na ntuliaka ahụ nke Bekee kpọrọ, 'Situation Room'.

    Otu Labour Party kpọkwara onye akaebe ọzọ bụ Peter Emmanuel Yari, si Kaduna steeti.

    Yari rụrụ ọrụ na ntuliaka dịka 'presiding officer" sịrị na ya enweghị ike ime nnyocha aha ndị debanyere aha ha maka atụmvootu nke Bekee kpọrọ"accreditation".

    O kwukwara na ya enweghị ike iji igwe zipụ mpụtara ntuliaka e mere n'ebe ọ rụụ ọrụ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ngwangwa nke a mere na ya kpesaara onyisi ya (supervising Presiding officer).

    Yari kwukwara na ndị nnochite anya pati nọ n'ọgbọ atumvootu ya binyechara aka n'akwụkwọ EC8A ma narakwa nke ha.

  2. "server' anyụghị anyụ ụbọchị ntuliaka-Onye akaebe LP

    PEPC

    Onye ọkaibe otu Labour Party kpọrọ akaebe ekwuola na ọ bụghị eziokwu na 'server nyụrụ ụbọchị ntuliaka.

  3. E hichara mpụtara dị na BVAs - 'digital expert' PDP kpọrọ akaebe

    Ụlọikpe

    Otu onye ọkacharamara n'ihe gbasara nnyọcha igwe intanet nke otu PDP kpọrọ akaebe n'akwụkwọ ha gbara Inec,Bola Tinubu nakwa otu APC agwaala ụlọikpe na e hichara ụfọdụ mpụtara ntuliaka 2023 dị n'igwe BVAS.

    Hitler Egwuonwu Nwala gwara ụlọikpe n'ụbọchị Tozde na nnyocha ya mere BVAs dị 110 gosiri ndịiche nwere ike ịdịkwa n' igwe BVAs ndị ọzọ e ji mee ntuliaka n'abalị 18 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Nwala kwuru na e hichara mpụtara ntuliaka dị n' igwe BVAS dị 3,163 bụ nke e jiri mee ntuliaka n'Abuja na-agbanyeghị na e meghị ntuliaka gọvanọ n'Abuja.

    Cheta na Inec gara n'ụlọikpe nata ikike iji hazigharia igwe BVAS ka e mechara ntuliaka Onyeisiala, sị na ọ bụ iji dị nkwadobe maka ntuliaka Govanọ.

  4. Labour Party akpọọla 'cyber security expert', onye ọrụ Inec akaebe

    Ụlọikpe Ntuliaka

    Dịka a malitere ikpe dị n'etiti Peter Gregory Obi nke Labour Party na INEC, Tinubu, Shettima nke APC taa bụ Tọzde, otu Labour Party akpọọla ndị aka ebe ọhụrụ ụbọchị Wenezde.

    Labour Party kpọrọ Dr. Chibuike Ugwuoke, bụ onye ọkacharamara n'ihe gbasara ichekwa ọbaozi intanet(cyber security expert) akaebe.

    Pati ahụ kpọkwara Onoja Oloko Sunday, bụ onye na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye a kpọrọ, "Woman and Child Rescue Initiative,akaebe.

    Oloko rụrụ ọrụ dika onye gagharịrị ịhụ ka ntuliaka si aga(election observer) n'oge ntuliaka 2023.Labour Party kpọkwara Kephas Iya bụ onye ọrụ oyibo rụrụ ọrụ dịka onye ọrụngo Inec n'oge ntuliaka.

    Iya rụrụ ọrụ dịka 'supervising presiding officer.'

    Nwamadi ahụ gwara ụlọikpe na onye ọrụ Inec ọzọ a kpọrọ Sulieman Mustapha, gara n'ọgbọ atụmvootu 24 dị na wọọdụ ha.

    Ọ sịrị na ewezụga okwu dapụtara n'etiiti ndị ogeozi PDp na nke ndị APC, na o nweghị nsogbo ọzọ e nwre karịa izipụ mpụtara ntuliaka.

    Labour Party wetekwara ihe akaebe nke gụnyere; akwụkwọ gosiri mmadụ ole debara aha ha maka atụmvootu nakwa ndị natara PVC ha na steeti 32 nke si n'aka Inec; akwụkwọ gosiri n' Edo INEC; akwụkwọ ozi si igwe 'IREV nke ọkpụrụ ọchịchị atọ na Benue steeti; akwụkwọ ozi si IREV nke okpuru ọchịchị abụọ nna Rivas steeti;akwụkwọ ozi si Irev maka Okpuru Ọchịchị 12 na Legọs steeti; akwụkwọ ozi nke IREV maka otu Okpuru Ọchịchị na Gombe steeti.

    Ndị a gbara akwụkwọ(Inec, Tinubu nakwa APC) jụrụ sị ka a ghara ịnabata ihe akaebe ndị a mana ụlọikpe gara n'ihu nabata ha.

  5. Pati Allied People's Movement egosila ihe akaebe ha megide Tinubu n'ụlọikpe.

    Ndị ọkaiwu APM

    Ikpe nke taa malitere mgbe pati APM gosiri ụlọikpe akwụkwọ akaebe ha na onye na-agbara ha akaebe.

    Ọkaiwu na-anọchiteanya ha bụ G.A Idiagbonya gwara ụlọikpe na ha chọrọ iwepu otu akwụkwọ n’ime akwụkwọ abụọ ha tinyere.

    Ha gara n’ihi gosi akwụkwọ akaebe ha bụ nke ụlọọrụ Inec binyereaka na ya.

    Akwụkwọ akaebe ndị APM

    O nweghi onye n’ime ndị ọkaiwu Inec, APC, Tinubu na Shettima jụrụ ịnabata ya akwụkwọ akaebe ndị a.

    Nke a mere ụlọikpe gara n'ihu nabata akwụkwọ akaebe ndị ahụ dịka ihe a ga-eji kpee ikpe.

    Pati APM gakwara n’ihu gosi onye akaebe ha bụkwa onye otu ha. Ọkaiwu Inec na APC gbara ya ajụjụọnụ tupu a sị ya gawa.

    Akwụkwọ akaebe APM
  6. Ọbaozi IReV enewghị nsogbu ọbụla n'ụbọchị ntuliaka - onye akaebe LP

    Election Petitio Tribunal

    Otu onye akaebe n'ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 bụ nke na-aga n'ihu n'ụlọikpe mkpegharị n'Abuja ekwuola na ọbaozi Inec enweghị nsogbu ọbụla n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023, nke bụ ụbọchị e mere ntuliaka ahụ.

    Onye akaebe a aha ya bụ Claretta Ogor, kwuru nke a dịka ndị otu 'Labour Pati' kpọrọ ya ka ọ bịa gbaa akaebe n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde.

    Ogor, onye na-arụ n'ụlọọrụ Amazon, bidoro ịgba akaebe ya n'ụbọchị Tọzde, ma kwuo na n'ụbọchị ntuliaka bụ 25 Febrụwarị, onweghị nsogbu ọbụla a chọpụtara n'ọbaozi Inec.

    Ọ kọwara na nsogbu ọbụla a chọpụtara n'ọbaozi ahụ bụ n'ụbọchị 10 nke ọnwa Disemba afọ 2021.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ya abịaghị n'ụlọikpe ahụ n'aha ụlọọrụ Amazon, kama ya bịara dịka ọ kacha mara na ngalaba Tekịnụzụ.

    Ka Ogara gbachara akaebe ya ma zachaa ajụjụ si n'aka ndị ọkaiwu APC, na Tinubu, ọkaiwu LP bụ Livy Uzoukwu gwara ụlọikpe na Inec ewetala akwụkwọ ndị ụlọikpe nyere ha iwu ka ha weta.

    Onye ọrụ Inec bụ Morenikeji Olufumilayo wetara ụfọdụ n'ime akwụkwọ ndị ahụ, ma kwuo na ndị nke ọzọ bụ ngalaba tekịnụzụ nke Inec ga-eweta ya.

    O kwuru na ya amabeghị ụbọchị ha ga-eweta akwụkwọ ndị ahụ, n'ihi na ọ bụ na steeti dị icheiche ka a ga-esi wekọta ha tupu eweta ha n'ụlọikpe.

    Uzoukwu rịọrọ ụlọikpe ka ha nye Inec iwu ka ha weta akwụkwọ ahụ n'ụbọchị Wenezde, mana ọkaiwu Inec bụ AB Mahmood, rụtụrụ aka na ọ bụrụ na ndị LP chọrọ akwụkwọ ndị ahụ, ha gaara idegara ndị izi Inec na steeti dị icheiche akwụkwọ maka ya, dịka iwu 'Electoral Acti' si nye ntuziaka na ngalaba nke 74.

    Ka nke a mechara ụlọikpe nabatakwara akwụkwọ nke otu onye ọrụ Inec aha ya bụ Dkt Lawrence Bayode wetara, bụ onye na0arụ ọrụ na ngalaba tekịnụzụ nke Inec.

    Bayode kwuru na akwụkwọ ndị ahu o ji bịa ezuchabeghị ezu, maka na ụfọdụ n'ime ha adịghị ya chaachaa.

    Ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị n'ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị 21 nke ọnwa June, 2023.

  7. LP akpọọla onye ọkachamara n'Ịntanetị ka ọ bịa gbaa akaebe n'ụlọikpe

    Election Tribunal

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party' kpọrọ otu onye ha kwuru bụ ọkachamara n'okwu gbasara ịntaneetị dịka onye akaebe ha n'ikpe gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ nke e mere n'ọnwe Febrụwarị afọ 2023.

    Dịka ikpe a malitere n'ụlọikpe mkpegherị n'Abuja n'ụbọchị Mọnde, ọkaiwu nọchitere anya peti LP bụ Patrick Ikweto (SAN) kwuru na ha nwere otu onye akaebe aha ya bụ Clareta Ogar.

    Nwaada a sị na ọ bụ onye ọrụ n'ụlọọrụ Amazon Web Services, nke bụ ụlọọrụ na-elekọta ọbaozi websaịt dị icheiche, tinyere nke ụlọọrụ Inec.

    N'ịgba akaebe ya, Ogar wetara akwụkwọ isii bụ nke ọ sị na o gosiri ọnọdụ 'website' dị icheiche iji gosi ma ọ bụ eziokwu na ọbaozi Inec enwere nsogbu ọbụla n'ụbọchị ntuliaka dịka Inec si kwuo.

    Cheta na Inec kọwara na ọbaozi ha nwere nsogbu n'ụbọchị ntuliaka nke mere o ji siere ndịọrụ ha ike iziga mpụtara ntuliaka onyeisiala ka ọha niile hụrụ dịka Inec si kwe na nkwa nakwa dịka iwu ntuliaka si dị.

    Ndị ọkaiwu Inec, APC na Tinubu akwadoghi ka ụlọikpe nabata akwụkwọ ndị ahụ Ogar wetara dịka akaebe, mana ụlọikpe mechara nabata ha.

    Na nke dịkwa ka ibe ya, ọkaiwu Jibrin Okutepa, bụkwa ọkaiwu LP, gwara ụlọikpe na ụlọọrụ Inec ekwebeghị enye ha akwụkwọ ndị dị mkpa ha kwesịrị iji mezuo ma weta n'ụlọikpe dịka ihe akaebe.

    Mana ọkaiwu Inec bụ A.B Mahmood (SAN) kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu kama na ọ bụ ndị LP jụrụ ime ihe ha kwesịrị ime.

    Onyeisi ọkaikpe bụ Tsammani Haruna gwara ndị ọkaiwu ahụ ka ha hapụ ibuso onwe ha agha kama ka ha mee ihe ha kwesịrị maka ọdịmma obodo Naịjirịa.

    E yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị n'ụbọchị Tuzde, bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Jun 2023.

  8. Lee akaebe onye ọrụ Inec gbara megide ha maka BVAS

    Ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Pati PDP kpọtara otu onye akaebe rụrụ ụlọọrụ Inec ọrụ n’oge ntuliaka dịka a kpọrọ ‘adhoc staff’ ka ọ bịa gbaa akaebe megide Inec n’ụlọikpe.

    Onye akaebe a rụrụ ọrụ na Yobe Steeti ka onye akaebe nke ugboro iri abụọ na atọ pati PDP na-akpọta n’ụlọikpe.

    Onye akaebe kwuru n’ụbọchị ntuliaka ahụ, na o ji igwe Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) nyochaa ndị bịara ịtụ vootu na ọ gakwara nke ọma.

    Ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala

    O kwuru na o tinyere mpụtara ntuliaka vootu a tụrụ n’ọdọ ya n’ịntaneti ọkachasị nke ndị ụlọomeiwu mana mpụtara nke onyeisiala ekweghi aga.

    O kwuru na ọ nwara ọtụtụ oge ime nke a mana ọ gaghị kama ihe o mere bụ ịmagide akwụkwọ mpụtara ahụ n’ahụ aja dị n’ọdọ ntuliaka ya.

    O kwuru na ihe niile gara nke ọma ewepu itinye mpụtara n’ịntaneti ebe onye ọbụla ga-ahụ ya anya.

  9. Etu ikpe dị n'etiti APM, Inec, APC, Tinubu na Shettima si gaa taa

    Ikpe ntuliaka onyeisiala

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka bụ Presidential Election Petition Tribunal gara n’ihu taa ileba anya n’akwụkwọ otu APM, LP na PDP gbara megide mmeri Bola Ahmed Tinubu na ntuliaka ọkwa Onyeisiala 2023.

    Ikpe nke taa malitere na pati APM dịka ọkaiwu ha rịọrọ ụlọikpe biko ka eleba anya n’ikpe ha. Na ha enyochaala ikpe ahụ ụlọikpe kachasị kpere maka nhọpụta Shettima ugboro abụọ dịka osote onyeisiala nakwa sịnetọ ma kpebie ịga n’ihu n’ikpe ha.

    Ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Ha gwara ụlọikpe ka e nye ha ụbọchị ha ga-esi ihe akaebe ha nakwa onye akaebe ha .

    Ọkaiwu Inec ekwughi ihe ọbụla banyere ya, ọkaiwu APC kwuru na ọ dị ndị ọkaikpe n’aka ileba ikpe ha anya, ebe ọkaiwu Tinubu na Shettima kwuru na ebe ọ bụ na ụlọikpe kachasị ekpeela ikpe ahụ na onweghi ụlọikpe ọzọ nwereike ileba ya anya.

    Mana ọkaikpe nọ n’isi ikpe a sị na ha chọrọ ka e leba anya n’akwụkwọ ha gbara na a gaghi agbọchi ha ọnụ.

    Ụlọikpe bugara ikpe ha n’ụbọchị 21 Juun, 2023 iji leba ya anya.

    Ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala
  10. Igbo ndị ọma ndewonụ

    Nke a bụ ịnabata unu n'ọgbakọ anyị maka etu ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala si aga.

  11. PDP akpọọla Dino Melaye onye akaebe

    Dino Melaye

    Ebe foto si, Dino Melaye-Facebook

    Otu PDP akpọọla onye nchịkọta vootu ha na ntuliaka 2023 bụ Senetọ Dino Melaye onye akaebe n'akwụkwọ nke pati ahụ na onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka ahụ bụAtiku Abubakar ụbọchị Faride.

    Melaye gwara ụlọikpe na ọ bụghị akwụkwọ mpụatara ntuliaka n'ọgbọ atụmvootu a kpọrọ EC8A ka ndị nnọchiteanya ha binyere aka mana o kwughị mmadụ ole emeghị nke a.

    O kwuru na ndị ọrụ ha n'ọ n'ọgbọ atụmvootu wetara ha ozi ka o si aga na ntuliaka ahụ.

    O kwuru na ya ji iwe pụọ n'ọgbọ Nchịkọta mpụtara ntuliaka n'Abuja n'ihi ka ihe siri gaa.

  12. Onye ntaakụkọ Arise TV bịarala ndị LP akaebe

    Ndị otu pati LP kpokukwara onyeakaebe ha nke abụọ nke taata bụ onye ntaakụkọ Arise News TV ka o nye ihe akaebe nke aka ya. Ha nyere ya na mkpisi osisi kọmputa a kpọrọ flash drive bu ihe onyoonyo bịa ụlọikpe.

    Maazị Ikweto nyere ụlọikpe ya b u mkpisi kọmputa a ka akpọ onyoonyo dị na ya. Ndị ọkaiwu ndị mmegide ekweghị ịnabata ya bụ mkpịsị ckọmputa mana ha kwetere ka a kpọọ ya n'ụlọikpe.

    Ụlọikpe nabatara ya ma kwete ka mmadụ niile kirie ihe nyoonyo ahụ n'anya mmadụ niile. Ihe onyoonyo gosiri ihe onyeisi ụlọọrụ Inec Ọkammuta Mahmood Yakubu kwuru na Chatham House ebe o kwuru maka ntuliaka ma nyekwa ndị mmadụ na ha ga-emete Bimodal Voter Accreditation System n'igwe IReV tupu eme ntuliaka. Ọkaikpe Jammani nabatara mkpisi kọmputa a dịka akaebe ruo echi bụ ụbọchị Juunu 16 ka ikpe na-aga n'ihu.

  13. "A hụrụ m akwụkwọ e jiri dee mpụtara ntuliaka 18,088 akagburu" - Onye aka ebe

    "A hụrụ m akwụkwọ e jiri dee mpụtara ntuliaka 18,088 akagburu" - Onye aka ebe
    Nkọwa foto, "A hụrụ m akwụkwọ e jiri dee mpụtara ntuliaka 18,088 akagburu" - Onye aka ebe

    Onye akaebe ndị otu pati Labour jiri akwụkwọ ụlọikpe kpokuo n'ụlọikpe gwara ụlọikpe na o jiri anya ya hụ akwụkwọ e jiri dee mpụtara ntuliaka 18,088 akagburu edebanyerela n'ebe ndị Inec na-edebanye mpụtara ntuliaka a kpọrọ Result Viewing (IReV) portal; iRev n'ichafu.

    Ka ụlọikpe maliterkwara ikpe, onyeakaebe ndị LP a bụ onye ọrụngo ndị ụlọorụ Independent National Electoral Commission bụ Inec n'ichafu gwara ụlọikpe na o mere nnyocha na mpụtara ntuliaka Onyeisiala 2023 dị na IReV.

    Onyeaka ebe a gwakwara ụlọikpe na o mere nnyocha mpụtara ndị si Rivas na Benue steeti gosiri etu a.

    Ka akpọpụtara onyeakaebe a, ọkaiwu Inec bụ A. B. Mahmood (SAN) gwara ụlọikpe na e nyere ya akwụkwọ a n'ụlọikpe nakwa ọ gụbeghị ya bụ akwụkwọ nakwa ọ maghị ka ha ga-esi aga n'ihu ma jụta ya ajụjụ ka e kwesịrị.

    Onyeisi ndị ọkaiwu Tinubu na Shetimma bụ Wole Olanipekun (SAN) na Lateef Fagbemi nọchịrị anya ndị All Progressives Congress (APC) debekwara ọnụ n'otu okwu Mahmood (SAN) mana ọ sị ka a nabata ihe akaebe ya ka a jụọ ya ajụjụ n'ọdịnihu.

    Dr. Ikpeazu (SAN) yọrọ ha mgbaghara maka na o nyeghị ha akwụkwọ a n'oge. Ọ kọwara na ọ bụ maka na ụlọikpe enyeghị ha akwụkwọ iji kpoku onyeakaebe ọsịịsọ, ha natara ya n'ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị iri na anọ n'ọnwa Juune.

    Ndị otu ọkaikpe onye ndu ha bụ Haruna Tsammani nabatara ayịyọ ha ma si na ha ga-ajụ ha ajụjụ a echi - Fraịde. Onyeisi n'otu ndị ọkaiwu nyere ụlọikpe akwụkwọ niile dịka ihe akaebe na mkpesa n'ihu ụlọikpe. Ndị ọkaiwu ndị Inec na ndị ọkaiwu Tinubu na Shetimma jụrụ ịnabata akwụkwọ e denyere mana ha nabatara akwụkwọ mkpokwu, onye ọkaiwu APC jụrụ ịnabata akwụkwọ mkpokwu ana ọ nabatara akwụkeọ edemede ha denyere ụlọikpe. Ọkaikpe Tsammani kwenyere ma nabata akwụkwọ niile LP butere bịa ụlọikpe dịka ihe akaebe nye ikpe mkpesa ha.

  14. Ihe ndị gbara okpụrụkpụ n'ikpe otu pati Labour taata, Taata bụ ụbọchị 13 n'ikpe ha n'ụloikpe mkpesa maka ntuliaka 2023

    Ihe ndị gbara okpụrụkpụ n'ikpe otu pati Labour taata
    Nkọwa foto, Ihe ndị gbara okpụrụkpụ n'ikpe otu pati Labour taata

    Ikpe Maazị Peter Gregory Obi nke, otu pati Labour na INEC, Tinubu, Shettima na APC malitereka okaiwu onye otu pati Labour bụ Dọkinta Livy Uzoukwu. SAN gwara ụlọikpe na dị nkwadobe imalite ikpe ha taata a kpọọkwa onyeakaebe PW4, bụkwa ọkammụta mgbakọ na mwepụ (Mathematics) na Mahadum dị na Naịjirịa.

    Aha ya bụ Okammụta Henry Uwadiegwu Ofoeidu. Onye akaebe a bụ onye ụlọikpe mara ọkwa kpọta ma bụrụkwa onye nke ise nke ndị otu pati Labour.

    Ka akpọbara onyeaka ebe ọ ga-azara ọnụ ya, ndị ọkaiwu Inec bụ A. B. Mahmood, onye ọkaiwu Tinubu, Shettima nakwa nke APC gwara ụlọikpe na ọ bụ ụtụtụ ụbọchị a ka e nyere ha akwụkwọ okwu onyeakaebe nke ọ ṅụrụ iyi ya, nakwa ọ ha kpebiri na ha ga na-enye akwụkwọ ha elekere 24 tupu ikpe ahu na ha enwebeghị ohere gụọ akwukwọ ahụ.

    Ha si ka e nye ha ohere gụọ ya bụ akwụkwọ, ụlọikpe wee kwete.

  15. Anyị ekele unu o!, Lee akụkọ si ụlọikpe ebe ikpe mkpesa Peter Obi si aga taata

    Lee ka ikpe mkpesa LP na PDP si gaa taa
    Nkọwa foto, Lee ka ikpe mkpesa LP na PDP si gaa taa

    Ikpe LP na PDP agawala n'ihu taata.

  16. PDP akpọọla onye 'statistician' akaebe

    Ụlọikpe taa

    Otu PDP akpọọla otu nwoke bụ onye ngụkọ were anya nke Bekee kpọrọ "statistician" dịka onye akaebe n'ikpe ha ji agbagha onye meriri na ntuliaka onyeisiala afọ 2023 2023.

    N'ikpe ahụ nke akara ya bụ 'CA/PEPC/05/2023, nke Atiku Abubakar na otu PDP gbara Inec, Bola Tinubu na otu APC nke e kpere nụbọchị Wenezde, ọkaiwu PDP bụ Eyitayo Jegede rịọrọ ụlọikpe ka ọ nabata akwụkwọ iyi akaebe nakwa ozi si n'aka . Samuel Oduntun bụ onye ọrụ ngọkọ bi na Kaduna.

    Mana ndị a gbara akwụkwọ jụrụ sị ka a ghara ịnabata akwụkwọ iyiakaebe nakwa ozi nke si n'aka onyeakaebe ahụ. Mana ụlọikpe ghara n'ihu nabata ihe akaebe ndị ahụ.

    E higharịrị ikpe ahụ gaa echi bụ Tozde, abalị 15 nke ọnwa Juun, afọ 2023.

  17. Etu e si dọrịtaụka n’ikpe mkpesa LP maka ntuliaka 2023

    Ndị ọkaiwu

    Iwe, anụma na ndọrịtaụka dapụtara n’oge ikpe mkpesa Labour Party (LP) nye Inec, Onyeisiala Bola Tinubu na All Progressives Congress (APC) maka ntuliaka 2023 taa bụ Wenezde abalị 14 nke ọnwa Juun.

    Ihe a bụ ikpe nke ụbọchị 12 kemgbe amalitere.

    Okwu dapụtara dịka onye ọkaiwu LP bụ Livy Uzoukwu butere ụlọikpe mkpesa ahụ akwụkwọ ozi si na ngwa Bvas nakwa asambodo usoro ọrụ Inec si na steeti 28, gụnyere Abuja.

    Uzoukwu gwara ụlọikpe ahụ na onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu ekweghi zaa oku mmanye ụlọikpe nyere ya ka ọ bịa zara ọnụ ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Mahmood natara ha akwụkwọ iji gosi nke a mana n’oge ahụ ọbụ naanị akwụkwọ okwu a nke nọ na ịntanetị bụ ihe ha ji ma rịọ ka eyigharia ya bụ ikpe ruo mgbe ha nyere ya akwụkwọ oku a nke nkiti dịka o siri chọọ.

    Ọkaiwu Inec bụ Kemi Pinheiro ji iwe kwuo na ọ bụrụ nandị ọkaiwu LP enweghi ihe ha ji onwe ha eme taa ka ha kwuo ma ghara iji aha Inec na-egwu egwu.

    O kwuru “Amaghi m amka nkata ọbụla unu na Mahmood kpara mana ọ bụ okwu asị na onyeisi ụlọọrụ Inec agaghị aza oku a kpọrọ ya.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ nabatara oku a kpọrọ ya maka okwu ndị PDP ma jụọ ihe mere nke LP ga-eji dị iche.

    H agara n’ihu kwuo na ha nabatara atụmatụ nyighari ya bụ ikpe.

    Iji saa ihe o kwuru, Uzoukwu kwuru na ọ nabataghi etu ọkaiwu Inec siri gwaa ya okwu ma kwuo na onye ọrụ ụlọikpe ahụ ekweghi binyeaka n’akwụkwọ okwu mmanye ahụ nke mere ha enyeghi ya Mahmood.

    E kwuru na a ga-enyocha okwu ahụ.

    Ụlọikpe ahụ gara n’ihu dajụọ iwe ndị ọkaikpe ahụ ma yigharia ikpe ahụ gaa ụbọchị Tọọzde.

    Ọkaiwu
  18. PDP akpọọla onyeisi Inec, Mahmood Yakubu, ka ọ bịa gbaa akaebe n'ụlọikpe

    Mahmood Yakubu

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Dmemocratic Party' (PDP) ekwuola na ha enyela Mahmood Yakubu, bụ onyeisi ngalaba nhazi ntuliaka bụ Inec n'ịchafụ, akwụkwọ ka ọ bịa gbaa akaebe n'ụlọikpe dịka ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 ka na-aga n'ihu.

    Ọkaiwu ndị PDP bụ Chris Uche, kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde dịka ikpe nke taa bịara n'isi njedebe n'ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja.

    Nke a na-abịa dịka ndị PDP kpọrọ ndị akaebe ha nke 19 na 20 n'ụlọikpe taa.

    Onye akaebe nke mbụ bụ nwa amadị aha ya bụ Alex Adum Ter, onye lekọtara atụmatụ ngụkọ etu ntuliaka si gaa maka party ahụ bụ nke a kpọrọ na bekee 'coordinator PDP national situation room'.

    Nwoke a gosiri ụlọikpe onyonyo dị icheiche ebe onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu nakwa ndị isi Inec ndị ọzọ nke tinyere onyeisi mgbasaozi ha bụ Festus Okoye, na-ekwu na dịka ntuliaka na-aga n'ihu, a ga na-eziga mpụtara ntuliaka n'ọbaozi 'Inec Result Viewing Portal' maọbụ Irev n'ịchafụ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na n'agbanyeghị nkwa niile ndị a Inec kwere, ha emezughị ya n'ụbọchị ntuliaka.

    Ndị ọkaiwu PDP

    Alex Adum Ter gosikwara ụlọikpe ahụ akwụkwọ ha wetara n'ọbozi Inec gosiri mpụtara ntuliaka si n'ọgbọ vootu dị icheiche.

    O wetakwara akwụkwọ ọzọ gosiri ọgbọ vootu ọnụọgụgụ ya dị 9,403 bụ ebe Inec etinyeghị mpụtara ntuliaka.

    Ndị ọkaiwu APC na ndị nke Tinubu kwuru ka ụlọikpe ghara ịnabata ihe akaebe ndị ahụ, mana ụlọikpe nabatara ha.

    Ọzọkwa, ndị PDP kpọrọ onye akaebe ọzọ aha ya bụ Olatunji Shelle, bụbụ onye agha mmiri lara ezumike nka.

    Ọ gwara ụlọikpe ahụ na e nwere ọgbaaghara n'ọgbọ vootu 15 dị na mpaghara ya. O kwuru na ya nwetara akụkọ maka ọgbaaghara a mana ya ejighị ụkwụ ya garuo n'ebe ndị ahụ.

    Ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị ụbọchị Wenezde, ụbọchị 14 nke ọnwa June 2023.

  19. Ndị ọkaiwu Peter Obi egosila ụlọikpe ihe akaebe si na steeti Rivers na ndị ọzọ

    Ndị ọkaiwu nọ n'ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka onyeisiala gara n'ihu leba n'akwụkwọ Peter nke Labour Pati gbara Onyeisiala Bola Tinubu, ụlọọrụ Inec nakwa pati APC.

    N'ikpe nke taa, Obi na Labour Pati gosiri ihe akaebe ha nwe banyere etu ntuliaka si gaa na Niger, Oyo, Osun, Edo, Adamawa, Ogun, Ekiti, Rivers na Akwa Ibom steeti.

    Ihe ha gosiri bụ akwụkwọ akaebe a kpọrọ 'form EC40G nakwa EC40GBU" bụ nke ụlọọrụ Inec banyere aka na ya.

    Ihe akaebe

    Ndị ọkaiwu APC, Inec, Tinubu na Shettima jụrụ ịnabata akwụkwọ akaebe ndị a mana ụlọikpe gara n'ihu nabata ha dịka ihe a ga-eji ekpe ikpe.

    Dịka nke a mechara ọkaiwu Labour Pati bụ Livy Uzoukwu gwara ụlọikpe na ha ka nwere ihe akaebe ndị ọzọ igosi mana na oge ha agaala, ma rịọ ka ụlọikpe nye ha ụbọchị Wenezde 14 Juun, 2023 ime nke a.

    Ndị ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ nabatara arịrịọ ya ma yigharịa ụbọchị ikpe ahụ gawa ụbọchị Wenezde.

  20. Igbo ndị daalụ nụ ooo

    Ikpe banyere etu ntuliaka Naịjirịa si gaa ka na-aga n'ihu.

    Buru oche gị bịa ka ịnọnyere anyị maka akụkọ etu o si aga.