Inec gụghị vootu, ha kenyere pati masịrị ha vootu- Yunusa Tanko

Ọnụ na-ekwuru otu Labour Party bụ Yunusa Tanko akpọọla ụlọikpe oku ka ha kagbuo mpụtara Ntuliaka Onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.
Tanko, onye kwuru nke a n'ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka onyeisiala n'ụbọchị Fraide dịka a kpọrọ ya akaebe kwuru na Inec gụghị vootu na ntuliaka ahụ kama, ha kenyere pati masịrị ha vootu.
Tanko kọwara na ụbochi ntuliaka ahụ na ya agaghị ebe ọbụla karịa ọgbọ atụmvootu ya nakwa ụlọ ebe pati ha nọ achịkọta ka ihe si aga na ntuliaka ahụ nke Bekee kpọrọ, 'Situation Room'.
Otu Labour Party kpọkwara onye akaebe ọzọ bụ Peter Emmanuel Yari, si Kaduna steeti.
Yari rụrụ ọrụ na ntuliaka dịka 'presiding officer" sịrị na ya enweghị ike ime nnyocha aha ndị debanyere aha ha maka atụmvootu nke Bekee kpọrọ"accreditation".
O kwukwara na ya enweghị ike iji igwe zipụ mpụtara ntuliaka e mere n'ebe ọ rụụ ọrụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ngwangwa nke a mere na ya kpesaara onyisi ya (supervising Presiding officer).
Yari kwukwara na ndị nnochite anya pati nọ n'ọgbọ atumvootu ya binyechara aka n'akwụkwọ EC8A ma narakwa nke ha.
























