Ụlọikpe
maka ntuliaka malitere ịnụ mkpesa ndị otu PDP ọzọ taa bụ Wenezde abalị 31 nke ọnwa
Mee, 2023.
Dịka ụlọikpe nụchara ya ma natacha mkpesa, PDP rịọrọ ka eyigharịa ya dịka Ọkaiwu onyeisiala Tinubu,
APC na Inec nabatara nke a.
Ọkaiwu PDP
bụ Chris Uche wụchiri n’oge ebe ọkaiwu Kemi Pinheiro na-agbachitere Inec, L.O
Fagbemi nke APC nakwa Wole Olanipekun na-agbachitere onyeisiala Bola Tinubu wụchikwara
ebe ahụ.
PDP butere
ihe aka egbe ha maka mkepsa ha bụ akwụkwọ ndị e ji tụọ vootu si Abia, Bayelsa,
Ogun na Kaduna steeti.
Ọkaiwu Uche
rịọrọ ụlọikpe ka ogbo ya bụ Eyitayo Jegede nọchite ya n’ikpe nke taa.
Ụlọikpe nabatara
mkpesa ahụ.
PDP buteere
ụlọikpe ihe akaebe si n’ime ọbaozi Inec bụ Irev ha kpọrọ akwụkwụ EC8A.
Ụlọikpe nabatara
akwụkwọ a dịka PDP mere mkpesa ịgba ụfọdụ n’ime ha n’anwụ site na gụpụta ya n’ihu
ọha mana ndị ọkaiwu APC, Tinubu na Inec gbaghara nke a.
E mere ọtụtụ nrụrụtaka ụka banyere akwụkwọ si steeti ndị a ga-anụ na ndị agaghị anụ tupu e mechaa yigharịa ikpe a.
Nkọwa foto, Ihe akaebe bụ akwụkwọ ndị e ji tụọ vootu na ntuliaka
Nkọwa foto, Ihe akaebe bụ akwụkwọ ndị e ji tụọ vootu na ntuliaka
Ụlọikpe ntuliaka eyigharịala ikpe Peter Obi na Labour Party
Dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka dị n'Abuja malitere ịnabata ndị akaebe si n'aka Peter Obi na Labour Party, e nwere ha ohere ịkpọpụta ndị akaebe nakwa igosi akwụkwọ akaebe ndị ha ji.
Mana oge a kpọrọ ọkaiwu Labour Pati bụ Awa Uma Kalu ka ọ bịa gosi akwụkwọ akaebe ha, o kwuru na ha agaghị emenwu nke a maka ihe mere n'isiụlọọrụ ha kama ka a eyigharịa ya echi bụ Tọzde 1 Juun, 2023.
O kwuru na o meela ka ọkaiwu Wole Olanipekun bụ ogbo na-anọchịteanya Tinubu na Shettima mara maka nke a.
Mmadụ niile nabatara mkpebi a, ebe ọkaikpe nọ n'isi ikpe dọrọ ha aka na ntị maka igbu oge na sị na ọ gaghị agbakwụnyere ha ụbọchị ọzọ n'ime ụbọchị ole ha nwere igosi ndị akaebe ha.
Ọkaikpe a gara n'ihu pịachie ikpe taa ma yigharịa ya gawa n'ụbọchị Tọzde 1 Juun, 2023.
Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka ka na-anabata ndị ga-abụ ndị akaebe
Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka dị n'Abuja ga-akwa n'ihu ileba anya n'akwụkwọ mkpesa ụfọdụ ndị gbara megide ntuliaka ahụ nyere Bola Tinubu nke All Progressive Congress (APC) mmeri.
Ihe a ga-eme taa bụ ịnabata ndị ga-abụ ndị akaebe Peter Obi nke Labour Pati na Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party nakwa ndị ọzọ.
Nnabata ndị akaebe a malitere na Tuzde 30 Mee, 2023 mana e yigharịrị ya taa bụ 31 Mee, 2023.
Peter Obi na ndị otu ya adịla na mbụ wụchie n'ụlọikpe a n'ụtụtụ.
Ụlọikpe mkpesa eyigharịala ụbọchị ikpe mkpesa Labour Party gbara maka mpụtara ntụkliaka onyeisiala Naịjrịa gaa ụbọchị 31 nke ọnwa Mee afọ 2023 nke bụ ụbọchị wenezde n'elekere 09:00 nke ụtụtụ ebe ikpe nke ndị otu PDP gbara ga-abụ n'otu ụbọchị ahụ n'elekere 02:00 nke ehihe.
Ọkaịkpe yigharịrị ya bụ ikpe dịka ọ bụ naanị otu onye pụtara ịgbara ndị Labour Party akaebe.
N'aka nke ọzọ ka eyigharịrị ikpe otu party Allied Peoples Movement gaa ụbọchị abụọ nke ọnwa Jun afọ 2023.
Nke a na-eso nrụrịta ụka so akwụkwọ ha agbara nke kwuru na Kashim Shettima nwere akwụkwọ kwadoro ya ịzọ ọkwa omeiwu na nke osote onyeisiala nke iwu Naịjirịa akwadoghị.
Kama ndị ọkaiwu APC kwuru na ka ụlọikpe cheta na ụlọịkpe kụpụrụ ya bụ ikpe n'ụbọchị frịde.
Ebe ndị ọkaiwu pati APM kwuru na ha enwetaghị akwụkwọ maka ya bụ mpụtara ikpe.
Ndị ọkaiwu Labour Party adịla njikere ịwepụta akwụkwọ ha jiri kwado ikpe ha kama ndị nke ọzọ ekweghị.
Ha ekweghị n'ihi na ha kwuru na ha ahụghị akwụkwọ ndị a ndị ọkaiwu Labour Party wepụtara.
Ha gwara ụlọikpe ka ha cheta na tupu ikpe a ebido na ha niile nwere nkwekọrịta na otu niile ikpe a metụtara ka atule akwụkwọ niile eji agba akaebe maka ikpe a.
Ụlọikpe ji ohere nwee ezumike nkeji 10.
Dịka o siri dị, ebidola ịgba ndị akaebe ajụjụ ọnụ maka ikpe a.
Peter Obi awuchiela n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ikpe mkpesa maka ntuliaka onyeisiala, Taata, ọkaikpe na-ege ikpe gbasara otu patị Labour, Peter Obi na Inec, Bola Ahmed Tinubu, Kashim Shetima na APC
Nkọwa foto, Foto ụbọchị 17 Mee, oge Peter Obi nọ n'ụlọikpe
Taata bụị ụbọchi Mee 30, 2023, ọkaikpe na-ege ikpe gbasara otu patị Labour, Peter Obi na ngalaba na-eme ntuliaka bụ Inec, Onyeisiala Naịjirịa Bola Ahmed Tinubu, osote ya bụ Kashim Shetima na otu pati All Progresssive Congress, APC
Onye nnọchịanya Inec bụ Odoziakụ May Agbamuche (bụ kọmishọna INEC na Naịjirịa), ọkaiwu nọchịrịanya ndị Inec bụ A.B Mahmood.
Ọkaiwu nọchịrịanya ndị otu patị Labour bụ Livy Uzoukwu, SAN.
Ọkaiwu nọchịrịanya otu patị ndị APM bụ S.A.T Abubakar, SAN.
Ha malitere ya bụ ikpe n'elekere itoolu n'ụtụtụ ruo elekere iri na abụọ n'ehihie.
Ha ga-enwetu oge ezumike otu awa, ma malitekwa n'elekere nke mbụ ruo elekere nke abụọ n'ehihie.
Ikpe otu pati Labour amalitela ugbua.
Ndeewo Igbo ndị ma!
Ebe a ka any ga-ewetara unu ihe niile na-eme n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ikpe mkpesa maka ntuliaka Onyeisiala Naịjirịa 2023
Ụlọikpe akụchapụla ebubo e boro Tinubu gbasara afọ ole ọ dị nakwa mba o si
Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akụchapụla akwụkwọ nke mmadụ atọ gbara megide Bola Ahmaed Tinubu, bụ onye a họpụtara ga-anọchi Muhammadu Buhari dịka onyeisiala Naịjirịa, nakwa osote ya bụ Kashim Shettima.
Ndị gbara akwụkwo a, mmadụ atọ aha ha bụ Praise Ilemona Isaiah, Paul Isaac Audu, na Anongu Moses, na-ebo ebubo na Tinubu kwuru okwu ụgha gbasara afọ ole ọ dị nakwa mba ebe ọ bụ nwa afọ, n'akwụkwọ nke o nyere ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec).
Mana n'ụbọchị taa bụ Fraịde, Mee 26, ka ọkaikpe James Omotosho kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na ha achịtaghị aja.
Ọkaikpe Omotosho kwukwara na akwụkwọ ahụ ndị a gbara bụ imebi usoro ụlọikpe n'ihi na enweghị ihe ọbụla gbasara ha na ya bụ okwu nke kpatara ha kwesịrị iji weta ya n'ụlọikpe.
O kwukwara na ebe okwu ahụ gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala, ụlọikpe ahụ enweghị ikike ọbụla itinye ya ọnụ.
Ụlọikpe ahụ dakwara mmadụ atọ wetara mkpesa ahụ nha nde naịra 15 maka iweta okwu na-enweghị isi n'ụlọikpe.
Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akụpụla ikpe PDP gbara Kashim Shettima
Ebe foto si, Kashim Shettima/Facebook
Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akụchapụla ikpe otu Peoples Democratic Party gbara nke na-ekwu na Kashim Shettima onye bụ osote Bola Tinubu nke otu All Progressive Congress ekwesịghị ịbụ osote Tinubu mgbe ha zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
Ngalaba Independent National Electoral Commission kpọpụtara Bola Tinubu dịka onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023.
Akwụkwọ PDP gbara hiwere isi na Shettima nwetara akwụkwọ ịzọ ọkwa ụlọomeiwu ma nwetekwa akwụkwọ ịzọ ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa nke ha si megidere iwu Naịjirịa.
Kama ụlọikpe kachasị na Naịjirịa nke nọ n'Abuja kụpụrụ ya bụ ikpe.
Ndị ọkaikpe ụlọikpe kachasị kwuru na pati PDP enweghị ikike ọbụla itinye anya n'etu otu ndọrọndọrọ ọzọ si ahazi ihe gbasara ha nke gụnyere etu ha si họpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa ọchịchị.
"Etu ọbụla ọ sọrọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla si hazie ihe usoro ha siri họpụta onye ga-anọchi anya ha na ntuliaka ọbụla, ọ gbasaghị otu ndọrọndọrọ ozọ, naanị ihe pati ndị ọzọ nwereike ime bụ ịnọrọ na-ele anya, mana ha enweghị ikike ọbụla ịgba akwụkwọ n'ụlọikpe banyere usoro nhọpụta a," ndị ọkaikpe ahụ kwuru.
"Ngalaba 285(14)(c) nke iwu Naịjirịa nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ike ịgbagha mkpebi Inec ma ọ bụrụ na Inec achụpụ onye otu ha iso zọọ ọkwa ọbụla na ntuliaka."
Nke a pụtara na mkpesa ahụ ndị PDP wetara n'ụlọikpe enweghị isi ma bụrụkwa nke dara ada.
Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa
Ebe foto si, Iwaria
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị si mba ụwa niile
Ụlọikpe ntuilaka ekpebiela ịchịkọta mkpesa APM, LP na PDP ọnụ maka ntuliaka 2023
Nke a na-abịa
dịka okwu ịchịkọta mkpesa ndị a dapụtara n’ụbọchị Mọnde.
Atụmatụ a
kwuru a na nke a ga-enyeaka hụ na ikpe a gara ngwa ngwa ma gaa siriri werere.
Nke a pụtara
na aga anụkọ mkpesa ndị pati ndị a ọnụ nakwa n’otu oge.
Agbanyeghi
na ndị ọkaiwu na-anọchite Tinubu/Shettima nakwa APC ekweghi mkpesa a mgbe ọ dapụtara.
Ọkaikpe Haruna Tsammani nabatara nke a n’ụbọchị
Tuzde.
N’otu aka ahụ, ihe
niile gbasara ịnụ mkpesa idi njikere ga-ebi taa bụ Tuzde, abalị 23 nke ọnwa Mee
dịka ụlọịkpe a siri kwuo.
A ga-amalitezi ịnụ ya
mkpesa ndị pati a n’uju n’ụbọchị 30 nke ọnwa Mee, 2023.
Amalitela ikpe mkpesa LP na Peter Obi maka ntuliaka 2023
Nkọwa foto, Peter Obi wụchiri n'oge sonye n'ikpe a
Dịka eyigharịrị
ikpe a gaa ụbọchị Tuzde, abalị 23 nke ọnwa Mee, ndị ọkaiwu Labour Party, Peter
Obi onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala, ndị ọkaiwu Bola Tinubu nakwa All Progressives
congress nakwa ndị ọkaiwu na-agbachitere Inec awụchiela.
Ndị ọkaiwu ndị a gụnyere Livy Uzoukwu na-agbachitere LP, Mainnaya Essien na-agbachitere Inec Mike Igbokwe na-agbachitere Tinubu na Shettima nakwa Adeniyi Akintola na-agbachitere APC.
Ọkaikpe Haruna Tsammani bụ onye nọ n'isi ikpe a.
Peter Obi
na onwe ya nọkwa n’ime ụlọikpe mkpegharị nke Abuja bụ ebe a nọ anụ mkpesa maka
ntuliaka 2023.
Obi na-ekwuru onwe ya nakwa pati ya dịka May Agbamuche bụ Kọmịshọna Inec na-ekwuru Inec. Maazị Sanusi Samaila bụ onye nlekọta ikpe otu APC na-ekwuru APC n'ikpe a.
A malitere ịnụ
mkpesa nke abalị 23 n’ọnwa Mee a n’ebe elekere 10.
Unu asaala chi?
Nnọọ n'ọba ozi anyị taa bụ Tuzde, abalị 23 nke ọnwa Mee, 2023.
Soro akụkọ banyere ikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 na-aga n'ihu n'Abuja taa, ebe a.
N’otu aka ahụ
ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka lebakwara anya n’ikpe banyere akwụkwọ Peter Obi na
Labour Pati gbara megide Inec, APC, Tinubu na Shettima.
Peter Obi n’onwe
ya abịaghị n’ụlọikpe taa mana ndị ọkaiwu ya na Labour pati gụnyere Awa Uma Kalu
nọ ya ebe osote onyeisi pati ha bụ Ladi Ilya nọ nọchitereanya ha.
Ọkaiwu Akim
Olujimi nọchiri anya Tinubu na Shettima ebe ọkaiwu L.O Fagbemi nọchitereanya pati
ha bụ APC.
Labour pati
enweghi mkpebi ọbụla banyere mpịachi mkpesa niile kama ha sị na mkpebi ọbụla ụlọikpe
nyere ka ha ga-akwụ na ya.
Ọkaikpe
Haruna Tsammani nọ n’isi ikpe ahụ kwuru na ihe niile banyere ikpe a kwesiri ịkụrụ
ọnụ n’ụbọchị 16 Sepụtemba.
Ụlọikpe
gwara ọkaiwu Kalu ka o nye ha o ga-ewe ya ikwupụta mkpesa ha niile maọbụ ha ekenye
ya ụbọchị ọbụla masịrị ha.
Mana ọkaiwu
Kalu kwuru na ha na ụlọọrụ Inec ka na-enwe nsogbu n’inyocha akụrụngwa BVAS e ji
mee ntuliaka, na ọ bụrụ ha mee nke a na ọ ga-ewe ha izuụka abụọ ịpịachi mkpesa
ha.
Mana ọkaiwu
Kemi Pinheiro nke Inec sị na Labour Pati degaara ha akwụkwọ maka inyocha ihe ndị
a n’ụbọchị Satọde na ihe niile ha chọrọ ga-eru ha aka ma ọ bụrụ ha kwụọ ụgwọ ndị
dị na ya.
E yigharịrị
ikpe ahụ gawa n’ụbọchị Tuzde 23 Mee, 2023.
Ihe ndị a
na-atụ anya ikpe taa gụnyere; ma a ga-agbasa usoro ikpe ahụ n’ihe onyonyo, mmadụ
ole pati dị iche iche ga-ahọpụta dịka ndị akaebe ha, oge ole ọ ga-efu iji kpee
ikpe ahụ dgz.
Ikpe nke taa malitere na pati Allied People Movement (APM) nke S.A.T Abubakar bụ ọkaiwu ha.
Ndị na-azara ọnụ ha bụ ụlọọrụ Inec nke May Agbamuche na-anọchite anya ha ebe Kemi Pinheiro bụ ọkaiwu ha.
Ọkaiwu L.O Fagbemi na-anọchiteanya All Progressive Congress (APC) ebe ọkaiwu Akim Olujimi na-anọchiteanya Bola Tinubu na Kashim Shettima.
Ndị ọkaikpe gwara pati ndị a ka ha zukọọ ma kpebie ndị akaebe ole ha ga-enwe, akwụkwọ nyocha nakwa oge ọ ga-ewe iji kpee ikpe a.
Ọkaiwu Pati APM bụ S.A.T Abubakar sị na ha nwere naanị otu onye akaebe na ọ ga-ewe ha ụbọchị abụọ ịgba ihe nyocha ha n’anwụ.
Ụlọọrụ Inec sị na ha nwere otu onye akaebe ebe ha ga-eji otu ụbọchị kwupụta mkpesa ha.
Pati APC kwuru na ha nwere otu onye akaebe ebe .
Tinubu na Shettima kwuru na ha nwere ndị akaebe atọ na ọ ga-ewe ha ụbọchị anọ igosi na mkpesa ha bụ eziokwu.
Pati APM kwenyere
ka a pịachie mkpesa niile ma malite ịchabi ikpe, APC, Tinubu na Shettima jụrụ
ajụ ma sị na ọ bụ ịkpagbu ikpe ziri ezi, mana mgbe ndị ọkaikpe gwara ya na oge
adịghịzi, ha sị na a ga-ekwe n’ihi oge adịghị ma magide ikpe ziri ezi.
Ụlọọrụ Inec
enweghi ebe ha kwụụ n’okwu mpịachi ikpe a.
E yigharịala
ikpe a gawa n’ụbọchị Mee 23, 2023.
Presidential Election Tribunal: "Ha si ka anyị ewebatakwala ekwenti n'ụlọikpe ka a ga-ekpe ikpe taa" Onye ntakụkọ BBC, Taata ka ọkaikpe ga-ekpe ma a ga-egosi ya bụ ikpe Peter Obi na otu pati Labour ka o si aga.
Ndị na-arụ n'ụlọikpe a na-akpọ Presidential Election Petition Court PEPC dobere ozi n'ebe niile n'ụlọ ikpe ebe a ga-ekpe ikpe mkpesa maka ntuliaka si ka ndị mmadụ emekeala ewebata ekwenti maọbụ ngwa ọrụ ọbụla dịka kọmpụta taata n'ime ụlọikpe.
Ha nyara ya bụ ozie ebe niile a ga-ekpe ya bụ ikpe mkpesa ntuliaka taata.
Cheta na a ka na-ekwu ma a ga-ekwe ka e gosi ya bụ ikpe n'onyoonyo; ka o si aga.
Taata ka ọkaikpe ga-ekpe ma a ga-egosi ya bụ ikpe Peter Obi na otu pati Labour ka o si aga.
Ṅaa ntị ka BBC Igbo kọọrọ gị akụkọ ka o si aga.
Nkọwa foto, Ụzọ ụlọikpe ebe a nyara ya bụ ozi
Election Tribunal: Labour Party chọrọ izu ụka asaa iji kpọọ ndị akaebe 50
Dịka ikpe gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023 ga-amalite n'uju n'izuụka na-abịanụ, ndị Labour Party ekwuola na ha ga-akpọ ndị akaebe 50 iji gosipụta etu e si mee nrụrụaka na ntuliaka ahụ.
Awa Uma Kalu bụ ọkaiwu ndị LP kwuru nke a n'ụlọikpe mkpegharị taa bụ Satọde, dịka ikpe ahụ na-aga n'ihu.
Kalu kwuru na ha na ndị ọkaiwu Inec, APC na Tinubu enweela ọgbakọ ma kwekọrịta usoro ha ga-agbaso n'ikpe ahụ.
Usoro ndị a gụnyere:
Ndị akaebe LP ga-akpọ n'ikpe a - mmadụ 50
Oge a ga-enye onyeisi akaebe iji gbaa akaebe ya - Nkeji 30
Oge a ga-enye ọkaiwu ndị nke ọzọ iji jụọ onyeisi akaebe ajụjụ (Cross examination & re-examination) - Nkeji 20
N'aka nke ọzọ, A.B Mahmood bụ ọkaiwu Tinubu bụ Roland Otaru (SAN) kwuru na ha ga-akpọ ndị akaebe asaa n'ime abalị itoolu.
Onyeisi akaebe ga-enwe nkeji 20 iji gbaa akaebe ya, ebe a ga-eji nkeji 20 jụọ ya ma jụgharịkwa ya ajụjụ (Cross examination & re-examination).
Ọkaiwu Inec bụ A.B. Mahmood kwuru na ha ga-akpọ ndị akaebe ise n'ime abalị asaa.
Nkeji 30 ka onyeisiakaebe ha ga-eji gbaa akaebe, jirikwa nkeji 20 zaa ajụjụ na njụgharị ajụjụ.