Salwa Eid Naser: Nwa afọ a gbajọrọ Nigeria ga tụtara Bahiain ugo ọlaedo n'asọmpị IAAF

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọbụghị Salwa Eid Naser ka nne na nna ọgbọsọ a dị afọ 21 kpọrọ mgbe amụrụ ya.

Nwa agbọghọ a gbafere Miller-Uibo ma merie asọmpị ọsọ 400m nke ụmụnwaanyị na "IAAF World Athletics Championships" nke 2019 bidoro ndụ ka Ebelechukwu Agbapuonwu.

Nwa ada Naser na-agbaburu Naịjirịa ọsọ tupu o nyefe nkwado ya mba Bahrain.

Ka o meriri unyaahu, ọ sị; "Nke a na-agbaka isi!

"Ọ bu sọso olilanya ime ọfụma mana ugbua atụọla m ugo."

N'afọ 2017 Naser ritere ọra nchara na IAAF agbara na London.

Mgbe ahu ọ sị na ya enweghi ihe o ga-agwa ngalaba na-ahụ maka ndi ọgbọsọ na Naịjirịa.