Global Terrorism Index: GTI akọwaala ihe ha ji tinye IPOB dịka otu na-eyi ndụ egwu

Mgbe e biputara ya

Ụlọọrụ 'Vision of Humanity' ndị na-ewepụta ngụkọ gbasara mwakpo ndị oyi ndụ egwu a kpọrọ 'Global Terrorism Index' (GTI) akọwaala ihe ha ji tinye aha otu Ipob na ngụkọ ha nke afọ 2023.

Ipob nke bụ aha ịchafụ maka 'Indigenous People of Biafra' bụ otu na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, mana gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ha dịka otu na-eyi ndụ egwu.

Na ngụkọ GTI nke 2023, aha Ipob bụ ndị nke iri n'otu kacha gbuo mmadụ n'ụwa niile.

Mana ndị isi Ipob wepụtara akwụkwọ ma gọọ na otu ha anaghị akpa aghara kama ha bụ otu ji ụzọ udo achọ nnwereonwe.

Aloy Ejimakor, bụ ọkaiwu ndị Ipob, kwuru na ha dere akwụkwọ mkpesa degara ụlọọrụ 'Vision of Humanity' iji rụtụrụ ha aka maka mmehie ha mere ịdepụta aha Ipob dịka otu na-eyi ndụ ndị mmadụ egwu.

Nke a mere ka ụlọọrụ ahụ wepụta akwụkwọ ozi iji kọwaa onwe ha, ma kwuo na ọ bụ eziokwu na gọọmentị Naịjirịa machiri Ipob n'afọ 2017 ma kpọọ ha otu na-eyi ndụ egwu, mana otu ahụ enwebeghị mgbe ha kwetara ebubo mwakpo na ogbugbu mmadụ nke a na-ebo ha na ngalaba ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network.

"Ọ dị mkpa ka anyị kwupụta ndịiche dị n'usoro udo nke ndị Ipob ji eme ihe ha, nakwa ebubo mwakpo na ọgbaaghara nke a na-ebo ha. N'ihi nke a, anyi agbanweela Global Terrorism Index 2023 iji gosipụta ndịiche a," ka otu ahụ kọwara.

Oge BBC tulere mgbanwe e mere na ngụkọ GTI 2023 dịka ụlọọrụ 'Vision of Humanity' si kwuo, naanị mgbanwe dị na ya bụ na agbakwụnyela 'ESN' n'aha Ipob dịbu ebe ahụ.

Nke a pụtara na ebe ha deburu Ipob, ihe ha deziri ugbua bụ 'IPOB-ESN', mana otu ahụ ka bụkwa ndị nke iri n'otu kacha gbuo mmadụ n'afọ 2022.

Dịka ngụkọ ahụ si gosi, a na-eche na Ipob-ESN mere mwakpo 40 n'afọ 2022, nke kpatara ọnwụ mmadụ 57 ebe mmadụ 16 merụrụ ahụ.

Cheta na ọ bụ naanị gọọmentị Naịjirịa na-ahụta Ipob ka otu na-eyi ndụ egwu, ọtụtụ mba ụwa dị icheiche ekwenyeghị na nke a.

Ndị otu Ipob na-enwe ọgbakọ nakwa ngagharị udo na mba dị icheiche n'akụkụ ụwa niile na-enweghị mgbochi ọbụla.

Otu ahụ na-ekwu na ha chọrọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ mba nke onwe ya a na-akpọ Biafra.

Onyeisi otu a bụ Mazi Nnamdi Kanu nọ ugbua na mkpọrọ n'aka ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa dịka a na-ekpe ya ikpe maka iso n'otu na-eyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.

Ọ bụ aka ọrụ Gọọmentị Naijiria na ndị otu ha nọ ofesi- Ipob

Otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra(Ipob) ajụla ịnabata ngụnye a gụnyere ha n' otu ndị kachasị eji igbu ndị mmadụ eyi ndụ egwu, sị na ngụnye ahụ bụ aka ọrụ gọọmentị Naijiria bụ ndị ha sịrị ha na ndị ụlọọrụ mba ofesi konụkọ iji nye ha ajọ aha.

Ngụkọ 'Global Terrorism Index' nke afọ 2023 nke ụlọ mmụta Institute for Economics and Peace haziri gụnyere otu Ipob dịka otu n'ogogo iri na otu kachasị egbu mmadụ n'ụwa.

Onụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful bụ onye kwuru nke a n'ozi o wepụtara ụbọchị Tozde.

Ozi ọkaiwu otu ahụ bụ Aloy Ejimakor wepụtara n'akara Twitter n'ụbọchị Tozde, kwuburu na ngụkọ ahụ bụ ụgha.

Ejimakor kwuru sị, "Ọ bụ ụgha na a kpọpụtara Ipob dịka otu nọ n'ogogo iri n'otu ndị na-eyi ndụ egwu kachasị egbu mmadụ n'ụwa."

"A kpọrọ aha Ipob dịka otu e kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu na Naijiria".

"E debanyere Ipob n'akwụkwọ(gọọmentị). Otu ndị na-enyi ndu egwu anaghị edebanye aha ha n'akwụkwọ gọọmenti, imee otu a, anwụchcie gị."

Global Terrorism Index: Etu Ipob si banye na ngụkọ dịka otu nọ n'ogogo 10 na ndị kachasị egbu mmadụ n'ụwa

A gụpụtala otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra(Ipob) dịka otu n'ogogo iri na otu kachasị egbu mmadụ n'ụwa.

Ngụkọ nke afọ 2023 nke a kpọrọ 'Global Terrorism Index' nke ụlọ mmụta 'Institute for Economics & Peace (IEP) na-ahazi gosiri na otu Ipob gburu mmadụ 57 dịka ha mere mwakpo 44 n'afọ 2022.

Na ngụkọ otu ahụ, otu Islamic State(IS) bụ otu mbụ kachasị akpa mkpa mkpa; otu al-Shabaab na-eso ya dịka ndị nke abụọ; Balochistan Liberation Army (BLA) gbara ndị atọ,ebe Jamaat Nusrat Al-Islam wal Muslimeen (JNIM) gbara ndị nke anọ na otu ndị kachasị egbusisi mmadụ ma jiri ya eyi ndị mmadụ egwu.

Etu nguko a si aga

Dịka GTI si kwuo, tigbuo-zọgbuo bụ ihe na-akwanyere iyindụ ọkụ dịka n'ime pasent 88 mwakpo e mere, nakwa pasentị ndị 98 ndị e gburu na mwakpo metụtara ityi ndụ egwu, mere na mba ndị nwere nsogbu ọgbaghara e ji ngwa agha alụ.

Mwakpoo ndị e mere na mba ndị nọ na nsogbu ọgbaghara ji mgbaji asaa karịa mwakpo ndị mere na mba nọ n'udo.

Gọọmentị Naijiria gụnyere otu Ipob dịka otu na-eyi ndụ egwu n'afọ 2017.

Gọọmentị Naijiria na ndị ọrụ nchekwa eboola otu ahụ na-eti mkpu ka e kewapụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie ka ọ bụrụ mba ọhụrụ a ga-akpọ Biafra ebubo na ọ bụ ha mere ọtụtụ mwakpo ogige ndị uweojii na ogbugugbu ndị uweojii ,ndị aghara nakwa ndị ọzọ nwwere agba n'Ọwụwa Anyanwu nke malitere rịwa elu n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

Mana ugboro ugboro otu Ipob agọọla n'aka ha dị ọcha.

Na ngwụcha afọ gara aga, ndị bu egbe gburu ndị mmadụ gbara isi akwara pụta ama dịka alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'auto-pilot' nke Simon-Ekpa bụ onye ndu ha tinyere nọrọnụlọ abalị ise (Disemba 9-14, 2022).