Atiku Campaign in Uyo: Wike, Seyi Makinde, Ikpeazu agaghị

Mgbe e biputara ya

Aka na-achị Rivas steeti, ogbo ya nke Oyo bụ Seyi Makinde na Okezie Ikpeazu nke Abia steeti agaghị mmalite achụmnta vootu nke Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha pati PDP mere n' amaegwuregwu 'Nest of Champions Stadium dị n Uyo,isisobodo Akwa-Ibom, taa bụ Monde, abalị 10 nke ọnwa Oktoba afọ 2023.

Ndị mmadụ pụtara n'igwe dịka Atiku na ndị ọzọ nwere agba na pati ahụ na ndị nkwado ha wujuru amaegwuregwu ahụ ịgbasa ozi achụmtavootu maka ntuliaka 2023.

Cheta na kemgbe e mechara ntuliaka imeụlọ ha, Atiku merie, esemokwu dapụtara na pati ahụ dịka Wike na ndị gọvanọ na-akwado ya na-akpo oku ka onyeisioche pati ahụ bụ iyorchia Ayu rituo n'ọkwa ya.

Ọtụtụ ndị welitere isi na pati ahụ ji ohere ọgbakọ ahụ were kpokuo ụmụ Naijiria ka ha tụnyere pati ahụ na ntuliaka na-abịa.

N'okwu ya, Senetọ Uche Ekwunife na-anọchite Anambra -Centralụ n'Ụlọomeiwu nke Ukwu sịrị, " Anyị achọghị onyeisiala ọta-akara, anyị chọrọ onyeisiala kara aka."