You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọọrụ Nafdac awakpola ọdọ ahịa Abia na Anambra steeti maka ọgwụ adịgboroja
Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ adịgboroja a na-akpọ National Agency for Food, Drug Administration and Control (Nafdac) awakpola ọdọ ahịa Arịarịa dị n'Abia nakwa Anambra steeti maka ọgwụ.
Ụlọọrụ Nafdac gara n'ahịa Ariaria bụ ebe ha nwetara ọtụtụ ọgwụ adịgboroja nakwa ọgwụ ndị nke ha machiri n'oge garaaga.
Oge ndị ntaakụkọ gbara Omoyeni Babatunde bụ osote onyeisi ngalaba ụlọọrụ Nafdac na-ahụ maka nnyocha ajuju ọnụ, o kwuru na ha ebidola ime nnyocha n'isi ndị ha na-enyo enyo na aka ha dị na-ire ọgwụ adịgboroja ahụ.
Omoyeni kwuru na Nafdac dị njikere ibu agha gaa n'ụlọahịa ọnụ ọgụgụ ya ruru otu puku n'ime ọdụ ahịa a maama na Naịjirịa.
Mana oge ndị Nafdac gara n'ahịa Ariaria ahụ, enweghị onye ha jidere maka na ọ bụ ụbọchị ndị ahịa abịahị zụọ ahịa.
N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ Nafdac gara n'ọgbọ-ọgwụ dị n'Ọnịcha, Anambra steeti ma machie ọdọ ahịa ndị mmadụ ma nwetakwa ọgwụ adịgboroja dị iche iche ebe ahụ.
Onye du ndị Nafdac gaa njem ahụ bụ Emeka Oriajiaka kwuru na ụlọọrụ ha amalitela ịgagharị n'ahịa dị iche iche na Naịjirịa iji hụ na e kpochapụrụ ọgwụ adịgboroja.
Emeka sị na "ha nwetara ọtụtụ ọgwụ adịgboroja nakwa ọgwụ mebiri emebi n'ahịa ahụ".