You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe Gọọmentị Anambra kwuru maka ntọrọ ụmụaka ọhụrụ anọ a sị mere n'Aguata
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari agbarụọla ihu banyere kepukepu na a tọọrọ ụmụaka ọhụrụ ise n’ụlọọgwụ a kpọrọ Stanley Hospital na Nkpologwu dị n’Aguata, Anambara state.
Buhari, onye mere nke a site n’ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu wepụtara ụbọchị Fraide , nyere ndị ọrụ nchekwa iwu kama imi n’ala na-egbughị oge hụ isi ya bụ okwu iji hụ na ụdị ihe ahụ emekwaghị ọzọ.
Akụkọ pụtara n’ụbọchị Wenezde na ndị ojiegbe wakporo ma tọrọ ụmụaka ọhụrụ anọ n’otu ụlọọgwụ n’obodo Nkpologwu nke okpuruọchịchị Aguta, Anambra steeti.
Ihe Gọọmentị Anambra kwuru maka ntọrọ ụmụaka ọhụrụ anọ a sị mere n'Aguata
Kọmịshịọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Paul Nwosu zipụtara ozi na-ekwu ya bụ akụkọ na-efegharị bụ okpotokp ụgha.
N’ozi ya, o kwuru “Akụkọ a na-efegharị ekwupụtaghị aha ụlọọgwụ mwakpo a mere nke o e jiri kwupụta aha ezinaụlọ ihe a metụtara.”
Nwosu kwusiri ike na ya bụ akụkọ bụ ezigbote akụkọ ụgha ma kwuo “enweghị mwakpo ọbụla mere n’akụkụ Anambra ọbụla nke gụnyere ntọrọ ụmụaka ọhụrụ.”
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Tochukwu Ikenga gbaara BBC Igbo ama n'Tọọzde na ya bụ akụkọ emeghị ebe ọbụla n’Anambra ma were olu dara ụda kwusie ike na akụkọ ahụ achitaghị aja.
Nwosu kwukwara na ndị na-ekesa akụkọ a bụ ndị ntaakụkọ na amaghị ọrụ ha ma bụrụkwa ndị chọrọ ikesa ụjọ na egwu nye ndị Anambara.
O kwukwara na gọọmentị Anambra eforola ntutu taa iji hụ na e chekwara ndụ ndị mmadụ n’oge emume ekeresemisi a ma kwuo ka ndị mmadụ gawa mkpa ha n’ihi na ụjọ adịghị.
Na nchịkọta, ọ sị “Onye ọbụla nwara gọọmentị n’okwu inye ndị Anambra udo kwesiiri ha n’oge a, ga-eji anya ya hụ ntị ya.”
BBC Igbo gbara mbọ kemgbe ụbọchị Tọọzde ịchọpụta ma ihe a e mere n'ezie mana enweghi onye obodo ahụ nwereike ịgba ama ya bụ akụkọ.
Enweghị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa
Ọkwa a Nwosu na-ama na-abaịa dịka nsogbu enweghị nchekwa ka bụ nnukwu okwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ruo ugbua. Ọnọdụ a maliter na-arị elu kemgbe afọ 2021. Nke a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa, ogbugbu ndị uweojii na ndị agha, ntọrọ mmadụ na ihe ndị ọzọ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'Indigenous People of Biafra', nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a.Mana Ipob ekwuola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha maka na ha abụghị otu na-achọ ọgbaaghara.
Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa boro Mazi Kanu ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu nakwa onye na-achọ ịkwatu ọchịchịonye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.
Gọọmentị Anambar aṅụọla iyi ugboro ugboro, ma gwa ọha na ha dị njikere n'ọrọ ibuso ndị na-eme mkwapo ndị a na steeti ahụ agha. Ndị ọrụ nchekwa wụchiri akụkụ steeti ahụ dị iche iche dịka a na-anwụchi ụfọdụ ndị ojiegbe a na-akpa ike mana ọ dị ka ya bụ ọnọdụ enweghị nchekwa ka na aga n'ihu.