You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe m ga-eme ma m bụrụ osote Gọvanọ Legọs steeti - Funke Akindele
Funke Akindele egosipụtala onwe ya dịka onye ga-azọ ọkwa osote gọvanọ Legọs steeti n'otu 'Peoples Democratic Party'.
Funke kwupụtara nke a n'ụbọchị Tuzde site n'ihe onyonyo o tinyere n'akara soshal midia ya dị icheiche.
O kwuru na njem ọhụrụ a ọ na-amalite bụ "ngalaba ọzọ nke ịgbara ọha mmadụ odibo."
"Arụọla m ọrụ dịka onye na-akpa ndị mmadụ obi ọma ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Chineke nyekwara m nnukwu ọganihu," Akindele kwuru.
"Ọ bụ ya mere na mgbe onye na-azọ ọkwa gọvanọ na Legọs steeti bụ Abdul-azeez Olajide Adediran, rịọrọ m ka m bụrụ osote ya, ahụtara m ya dịka ohere ọma iji nye aka zọpụta ma wulite ọnọdụ ndụ ndị be anyị."
Ụfọdụ ihe Funke Akindele kwuru na ọ ga-eme
- Iwulite ọnọdụ ndụ ndị mmadụ
- Inye aka ịhụ na Legọs dị mma maka onye ọbụla, ọ bụghị naanị maka ụfọdụ ndị ọgaranya
- Ịgba mbọ maka ụmụaka ụmụnwaanyị, ụmụ nwaanyị, na ndị ntorobịa
- Inye aka weghachi ikuku ndụ na Legọs steeti
Onye bụ Funke Akindele
- Funke Akindele bụ onye a ma ama n'ejije Nollywood, aha ọtụtụ mmadụ ji mara ya bụ jenifa
- A mụrụ ya n'Ikorodu Legọs Steeti n'afọ 1976
- Nna ya bụ onye nkuzi Sekọndịrị ebe nne ya bụ dọkịta
- Funke bụụrụ onye a ma ama n'ihi ejije a kpọrọ "I need to know" bụ nke wuru ewu ọtụtụ afọ gara aga.
- Ọ bụ ya nwe ejije TV a na-akpọ 'Jenifa's Diary', bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ si kpọwazie ya Jenifa
- O ritela nturuugo dị icheiche na Naịjirịa nakwa mba ofesi maka ọrụ ya dịka onye ejije
- N'ọdị nso ka di Funke bụ Abulrasheed Bello, onye e ji JJC Skillz mara, kwuru na ha agbasaala dịka di na nwunye
- Funke na JJC Skillz mụrụ ụmụ abụọ, ejima nwoke.