Ihe m ga-eme ma m bụrụ osote Gọvanọ Legọs steeti - Funke Akindele

Funke Akindele

Ebe foto si, funkejenifaakindele

Mgbe e biputara ya

Funke Akindele egosipụtala onwe ya dịka onye ga-azọ ọkwa osote gọvanọ Legọs steeti n'otu 'Peoples Democratic Party'.

Funke kwupụtara nke a n'ụbọchị Tuzde site n'ihe onyonyo o tinyere n'akara soshal midia ya dị icheiche.

O kwuru na njem ọhụrụ a ọ na-amalite bụ "ngalaba ọzọ nke ịgbara ọha mmadụ odibo."

"Arụọla m ọrụ dịka onye na-akpa ndị mmadụ obi ọma ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Chineke nyekwara m nnukwu ọganihu," Akindele kwuru.

"Ọ bụ ya mere na mgbe onye na-azọ ọkwa gọvanọ na Legọs steeti bụ Abdul-azeez Olajide Adediran, rịọrọ m ka m bụrụ osote ya, ahụtara m ya dịka ohere ọma iji nye aka zọpụta ma wulite ọnọdụ ndụ ndị be anyị."

Ụfọdụ ihe Funke Akindele kwuru na ọ ga-eme

Funke Akindele

Ebe foto si, funkejeniakindele/Instagram

Nkọwa foto, Funke Akindele
  • Iwulite ọnọdụ ndụ ndị mmadụ
  • Inye aka ịhụ na Legọs dị mma maka onye ọbụla, ọ bụghị naanị maka ụfọdụ ndị ọgaranya
  • Ịgba mbọ maka ụmụaka ụmụnwaanyị, ụmụ nwaanyị, na ndị ntorobịa
  • Inye aka weghachi ikuku ndụ na Legọs steeti

Onye bụ Funke Akindele

Funke Akindele

Ebe foto si, funkejenifaakindele

  • Funke Akindele bụ onye a ma ama n'ejije Nollywood, aha ọtụtụ mmadụ ji mara ya bụ jenifa
  • A mụrụ ya n'Ikorodu Legọs Steeti n'afọ 1976
  • Nna ya bụ onye nkuzi Sekọndịrị ebe nne ya bụ dọkịta
  • Funke bụụrụ onye a ma ama n'ihi ejije a kpọrọ "I need to know" bụ nke wuru ewu ọtụtụ afọ gara aga.
  • Ọ bụ ya nwe ejije TV a na-akpọ 'Jenifa's Diary', bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ si kpọwazie ya Jenifa
  • O ritela nturuugo dị icheiche na Naịjirịa nakwa mba ofesi maka ọrụ ya dịka onye ejije
  • N'ọdị nso ka di Funke bụ Abulrasheed Bello, onye e ji JJC Skillz mara, kwuru na ha agbasaala dịka di na nwunye
  • Funke na JJC Skillz mụrụ ụmụ abụọ, ejima nwoke.