University of Nigeria Nsukka: Ihe anyị ma maka akụkọ mwakpo a sị ndị "bandit" mere n’Enugwu

Egwu na ịchị aka n'obi ejidela ụmụakwụkwọ mahadum 'University of Nigeria Nsukka' na ndị nne na nna ha dịka UNN nọ na nnukwu egwu maka akụkọ na-efegharị na soshal midia ugbua nke kwuru na ndị ntọrị abatala na mahadum ahụ ịbịa tọrọ ụmụakwụkwọ.
Ọnụ n’ekwuchitere Ụlọ Akwụkwọ UNN bụ Maazi Inya Agha Egwu wepụtara ozi kwuo na akụkọ na ndị ekperima na ndị ntọrị abatala UNN abụghị eziokwu.
Agha kwuru na ha enyochaala mana ha ahụghị ihe iyi egwu ọbụla gosiri na ndụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi nọ na nsogbu.
Na-agbanyeghi, ha gara n’ihu dobe ndị uweojii na ndịagha na gburugburu mahadum UNN.
Kọmishọna Uweojii Enugwu bụ Mammam Bitrus Giwa gbarụrụ ihu kwuo na akụkọ na ndị ntọrị abatala UNN bụ okpotokpo asị.
Giwa boro ebubo na ọ bụ ndị ahụ amaghị ndị ha bụ na soshal midia, a kpọrọ 'Anọnymous' na-ebugharị akụkọ ụgha ahụ iji tinye egwu n’ime ndị mmadụ.
Giwa kwere nkwa na ha ga-achọpụtarịrị ndị ahụ na-efesa akụkọ ahụ.

Ebe foto si, UNN/Facebook
Ọzọ dịkwa ka ibe ya mere na Nsukka, ebe ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo gburu ụmụokorobịa abụọ n' obodo Nsụka.
Mkpa mkpa ahụ kpara n' ụbọchị nke asaa nke ọnwa Juun, afọ 2026 oge ndị omekome wakporo onye nke mbụ oge ọ lọtara n’ụlọ ya n'elekere iri na otu nke abali. Ha wakporo ya gbagbuo ya pii.
Ọzọkwa mere n’akụkụ 'Timber Shade' na Nsụka ebe onye amakekwu a ma ama ji mma sugbuo Nnaemeka Ishiwu, ọ bụrụ onye nke abụọ n’otu ụbọchi ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ewepụtabeghi ozi gbasara nwoke a ma ama na Nsụka asiri na ọ bụ ya mara mma ahụ.
Anyị si na Nsụka town gaa Obukpa bụ obodo dị nso na mahadum UNN n'abalị 10 nke ọnwa Juun,afọ 2026, ebe kepu kepu pụtara na ndị ọchiehi abatala ịtọrọ ụmụakwụkwọ.
Nke a butere ọgbaaghara, ụmụakwụkwọ na-ebe akwa na-agbala ụlọ ha ebe ndị nne na nna ji ọsọ akpọrọ ụmụ ha.
Site na Nsụka gaa ụlọakwụkwọ praimari n'Iwollo, okpruru ọchịchị Ezeagu, ọsọ bidoro gbawa n'abalị 10 nke ọnwa Juun na ndị Bandit abatala ịtọrọ ụmụaka, ndị nne na nna biara kpọrọ ụmụ ha.
N’ihi otu nchekwa si dị ọjọọ na Nsụka ugbua, onye isioche okpuru ọchịchị ahụ bụ Maazi Jude Asogwa amachiela ndị ọgbatumtum na keke ịgba n’abalị ma ọ bụ n’isi ụtụtụ.
O nyekwara ntuziaka ka keke ọbụla wepụ akwa ojii ma ghara iti egwu ọbụla.
Kọmishọna Uweojii Enugwu bụ Mamman Bitrus Giwa kwuru na enweghị ndị ọchị ehi, bandit(ekperima) maọbụ ndị ntọrị biara itọrọ ụmụakwụkwọ n' Obukpa maọbụ n'Ezeagu.
O kwuru na ha niile bụ asị. Kọmishọna wepụtara ekwentị ka ọhaneze kpọọ ma ha hụ ihe edoghị ha anya.
Kọmishona mgbasaozi nke Enugwu bụ Dọkita Malachy Agba kwuru na akụkọ ndị a niile bụ asi.
O boro ebubo na ọ bụ ndị ihe ọma na-asa afọ chọrọ ibute ọgbaaghara na egwu n’ime ndị mmadụ na gburugburu Enugwu.
O kwere ndị UNN nakwa ndị Enugwu niile nkwa na gọmenti Peter Mba ji akatamkpo atụmatụ akụrụngwa n’echekwa ndụ na-akụ na ụba n’Enugwu Steeti.
Ndị agha nakwa ndị uweojii nọ ugbua na gburu gburu UNN nakwa Nsukka n’eme nyocha nke “akpọrọ aerial and land surveillance”






