Ihe mere mụ na Peter Obi ji hapụ ADC... - Kwankwaso

Aha onyonyo, Mụ na Peter Obi hapụrụ ADC n’ihi na anyị na ha enweghị otu ụdị echiche
Ihe mere mụ na Peter Obi ji hapụ ADC... - Kwankwaso
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Abba Auwalu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Rabiu Kwankwanso bụ aka chịburu Kano steeti na osote Peter Obi maka ife ọkọlọtọ otu pati NDC na ntuliaka 2027.

Na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere n'ụlọ ya dị n'Abuja, na nsonso a, Kwankwaso katọrọ usoro ntuliaka 'direct primaries'.

"Amaghị m ihe mere na Ụlọomeiwu Naijirịa na Onyeisiala kpebiri ịkagbu ohere ndị a họro ahọro ịtụ vootu na ntuliaka imeụlo."

"Ntuliaka imeụlọ nke ndị a họpụtara na-atụ ezughị oke kama I lee anya n'ihe mere n'afọ1999 oge pati anyị bụ PDP mere ntuliaka imeụlọ nke ndị pati anyị niile sonyere, o nyere nsogbu."

"Ya mere, n'oge e mechara ya bụ ntuliaka nke afọ1999, anyị kpebiri ịgbanwe ya ka ọ bụrụ ndị a họpụtara ga-atụ vootu na ntuliaka imeụlọ."

"Ana m eche na Ụlọomeiwu ajụghị ese ọfụma, ikekwe, ọtụtụ n'ime ha batara ọhụrụ. Maọbụ patị nọ n'ọchịchị chọrọ ịghasa patị ndị anọghị n'ọchịchị maka na gọọmentị nọ n'etiti nwere ike ya na mmadụ nile ịkpa."

"E lee ya( ntuliaka ya (direct primaries) anya , ọ dị mma n'ihi na o nyere ndị niile nọ na pati ohere ịga tụọ vootu, mana a sị ka e tinye ya n'ọrụ, ọ dabaghị."

Kwankwaso kọwara ihe mere ha ji hapụ ADC banye NDC na ihe ndị ọzọ.

"I lee anya, anọbu m n'otu NNPP tupu m gawa ADC.

"A hapụrụ NNPP maka na gọọmentị steeti m na ụfọdụ ndị nọ n'etiti malitere ịgbanye nje na patị anyị n'ụdị m chere nwere ike imerụ m nnukwu ahụ ma m gaa n'ihu nọrọ.

"Anyị nwere ọtụtụ ikpe n'ụlọikpe, ha tinyere nkewa dị iche iche, na-akwado onye ọbụla na-emegide anyị wdg.

"Ya mere anyị ji kpebie; mụ na ndị nkwado m ịga ADC."

"Echere m na ọ bụ otu ihe ahụ mere Peter Obi nakwa ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bara ADC."

"Ka anyị banyechara, anyị chọpụta na ha nwere ọtụtụ nsogbu. ọzọ bụ kedụ ka anyị ga-esi ahazi ọchịchọ obi anyị n'otu aka, n'aka nke ọzọ nke ADC.

"N'aka nke ọzọ, anyị nwere ikpe atọ kara aka n'ụlọikpe n'ime ndị ọzọ.

"Ọzọ bụ ihe Inec mere pati anyị site na iwepụ aha odeakwụkwọ na onyeisioche pati bụ Aregbesola na David Mark.

"Ụlọikpe Kachasị kpebiri ka e tighachi aha ha, e mee ya ozigbo mana pati ichighachi azụ bido n'isi, anyị chọpụta na oge adịghịzị."

"Ikpe nke abụọ bụ ebe Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja kpebiri ka a kagbuo ntuliaka niile anyị mere."

"Ya mere oge anyị hụrụ onwe anyị n'ọnọdụ dị otu a, anyị sị na ọ ka mma idebanye aha patị ọhụrụ. Ugbua ọ dị onwa abụọ, o nweghị ikpe ọbụla so ya.

"I lee ka ntuliaka imeụlọ ADC si gaa, ịhụ na na ụta adịghị n'ihe anyị mere.

"Ọzọ bụ na patị anyi nọdụrụ ala lee ihe na-eme n'obodo anyị, anyị were kpebie na ọ bụ onye Ndịda ga-efere anyị ọkọlọtọ iji mezuo afọ anọ nke agba nke abụọ nke Ndịda kwesịrị inwe."

"Ya mere e kenyere Ugwu Naijiria ọkwa Osote Onyeisiala ma kpebie na ọ bụ m ga aga."

"Ebumnobi anyị bụ ịzọpụta Naijiria. Ọ bụghị iwu na ọ bu m ga-abụ onyeisiala maọbụ Osote ya, ihe ka mkpa bụ ka Naijiria di mma."

Kirie ya n'uju n'ihe onyonyo a: