Emmanuel Kanu gbalịrị inye m aka azụ -Ọkaikpe Majie Kuje

Ọkaikpe nke Ụlọikpe Majie nke Kuje bụ Abubakar Umar Sai'id eboola nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu, ebubo ịgbali inye ya ngarị.
O kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde, mgbe a bịara ikpe Emmanuel Kanu, Omoyele Sowore, Aloy Ejimakor na mmadụ iri ọzọ ndị a boro ọtụtụ ebubo dịka ibute ọgba aghara maka isonye na ngagharịiwe ha ji eti mkpu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu nke ha mere n'Ọktoba 20 afọ 2025.

Ọkaikpe majie ahụ kpọpụtara akara ekwentị ahụ kpọrọ ya n'ihu ọha n'ụlọikpe, ma dọọ aka na ntị na ọ nweghị onye kwesịrị ịbịakwute ya gbasara okwu ikpe ọ bụla.
O kwuru nke a ka Barrister Nnaemeka Ejiofor wepụtara akwụkwọ ahụike n'ihu ụlọikpe, nke gosiri na Prince Emmanuel enweghị ike ịbịa n'ihi nsogbu ahụike.
Ọkaikpe ahụ gosipụtara nnukwu iwe, ma na-ekwusi ike na ebumnuche Emmanuel Kanu bụ imerụ aha ya maọbụ ịbanye ya ụjọ.
Ihe a na-ekpe anyị ikpe maka ya- Aloy Ejimofor

A na-ekpe anyị ikpe n'ihi ngagharị iwe anyị mere maka ntọhapụ Nnamdi Kanu — Aloy Ejimakor
Ọkaiwu Aloy Ejimakor ekwuola na akpụpụla ya n'ụlọikpe n'ihi ngagharị iwe ha mere n'Ọktoba afọ gara aga.
O kwuru nke a n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara mmekọrịta ya bụ X, nke a na-akpọbu Twitter.
Ejimakor sị na ya onwe ya, onye na-agbachitere ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore, Prince Emmanuel Kanu, nakwa mmadụ iri na abụọ ọzọ na-aga izara ọnụ ha n'ụlọịkpe n'ihi ngagharị iwe ha mere iji rịọ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu, onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB).
Ejimakor kọwara ebubo ahụ dịka mbọ a na-agba iji taa ha ahụhụ maka ikwpụta echiche ha n'ụzọ iwu obodo kwadoro.
O gbakwunyere na ndị ọchịchị egosila mkpebi siri ike ịma ha ikpe, ma kwuo na ha ga-enwekwa otu ụdị mkpebi siri ike ahụ n'ịgbachitere onwe ha.
O kwere nkwa na ya ga-ewepụta nkọwa ọhụrụ ma e kpechaa ikpe ahụ n'ụlọikpe.





























