Ihe anyị ma gbasara mwakpo e mere n'ụlọakwụkọ dị n'Ebonyi Steeti
Ndị ojiegbe awakpoola ụlọakwụkwọ a na-amụ ihe gbasara ahụike dị n'Ebonyi Steeti bụ Ebonyi State School of Health Mgbo, nke mere ka ụmụakwụkwọ asaa merụọ ahụ, ebe ọtụtụ ngwonwgo lara n'iyi.
Oge ọ na-akọwa nke a dịka eziokwu, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na ndị ojiegbe a na-amatabeghị ndị ha bụ mere mwakpo ahụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere abụọ nke ime abalị n'ụbọchị Tuzde 9 Juun 2026.
Ukandu kwuru na ndị uweojii nwetara ozi gbatagbata n'ime abalị, nke mere ka ha were ọsọ na ije gbagaa n'ụlọakwụkwọ ahụ. Oge ha ruru, a kọọrọ ha na ụfọdụ ndị ojiegbe batara n'ụlọakwụkwọ ahụ izu ha ohi, mana tupu ha eruo, ndị ojiegbe ahụ eriela mbọmbọ.
O kwuru na ụmụakwụkwọ anọ ndị merụrụ ahụ na-anara ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ dị n'Ezzamgbo ebe atọ ndị nke ọzọ na-anara ọgwụgwọ nke ha n'ụlọọgwụ dị n'Abakaliki.
Ka ọ dị, Ukandu kwuru na ndị uweojii esinyela imi n'ala iji chọpụta ebe mmiri siri banye n'opi ụgbọghọrọ.



