Gịnị na-esere Soludo na Fada Ebube Muonso?

Mgbe e biputara ya

Aka na-achị Anambra steeti agbarụọla ihu na-ebe ụkọchukwu Katolik a ma ama bụ Fada Emmanuel Obimma n'ihi amụma o buru na nsonso a n'ọgbakọ mịnịstrị ya ọ kpọrọ Holy Ghost Adoration Ministry dị n'Ọnịcha .

Nke a na-apụta ihe dịka akwụkwọ ozi Soludo degara Obimma bụ onye a ma ama dịka Fada Ebube Muonso hipụtara n'ọha ụbọchị Tuzde.

Akụkọ na-efegharị na-ekwu na Fada Muonso buru amụma na ndị ọchịehi ga-awakpo obi gọọmenti steeti ahụ dị n'Ọka, ebe Soludo ga-ebu ọbara n'ahụ gbapụta.

Dịka ndị mmadụ na-atụ uche maka ya bụ ozi,Gọvanọ Soludo wepụtara ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka were gwa ndị Anambra ka ha ghara itinye uche n’akụkọ na-efegharị maka amụma Fada Emmanuel nke buru n’isi ya nakwa steeti ahụ.

N'akwụkwọ ozi Soludo degaburu Fada Ebube Muonso, nke hipụtara n'ọha, ọ gbarụrụ ihu na ụkọchukwu Katolik ahụ ama gbahapụrụ ịgbanye ya izu banyere "ọfụ ọ fụrụ" n'isi ya kama ịnọ n'elu ọlta gbasaa ozi ahụ dịka o siri mee.

Soludo, onye kwuru na ọrụ Fada dịka onye ndu kwesịrị ịbụ ikpalite ndị na-eso ya ka ha na-agba ndị omekome ama nye gọọmentị kama okwu iyi ndị mmadụ egwu maka ọnọdụ nchekwa.

Soludo sịrị, "Akpọrọ m gị ugboro abụọ dịka m gechara amụma i buru maka ndị Fulani Ọchịehi gburu ichi wakporo obi Gọọmentị n'Ọka na etu m si buru ọbara n'ahụ gbapụta nakwa nkatọ ị katọsiri ike maka ọnọdụ mkpocha ahịhịa."

"Ndụ m dị n'aka Chukwu, Ọ marala abalị ole maọbụ afọ ole o dere m.

"O nweghị onye nwere ikwu echiche Chukwu banyere ndụ m.

"Ekweghị m n'amụma e ji eme ka a hụtacha n'ihi na ọ bụghị etu e si zụọ m dịka onye Katolik.

"I nwere ekwentị, nke bụ na ọ bụrụ na o nwere ozi e ziri gị, ọ bụ n'elu ọlta ka ọ ka mma gị inye m ozi e ziri gị banyere m?"