A kpọpụtala Lucky Aiyedatiwa nke APC dịka onye meriri na ntuliaka Gọvanọ Ondo Steeti

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commision (INEC) akpọpụtala Gọvanọ Lucky Aiyedatiwa dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ondo Steetị.

Aiyedatiwa meriri Agboola Ajayi nke PDP na mmadụ iri na isii ndị ọzọ zọsịrị ya ọkwa ahụ.

Ọkammụta Olayemi Akinwunmi nke mahadum Federal University Lokoja bụ onye ọrụ onyeisi ngụkọ mpụtara ahụ kpọpụtara aha ya n’ehihie Sọnde.

Ọkammụta a kwuru na APC nwetere vootu 366,781 iji merie ebe PDP nwetere vootu 117,845 na-esote ya.

Ọ bụ mmadụ abụọ a jibu ọkwa osote gọvanọ nke steeti ahụ mgbe Rotimi Akeredolu na-achị dịka gọvanọ.

A pịachiela ntuliaka dịka ngụkọ malitere n'Ondo

Ntuliaka nke ọkwa Gọvanọ emere n'Ondo apịachiwala ndịka amalitere ịgụkọ vootu n'ụfọdụ okpuruọchịchị na steeti ahụ.

N'ọgbọ ntuliaka nke dị n'Akure, ndị ọrụ mgbakwunye nke Inec amalitela ịkwakọ ngwo ngwo ntuliaka ha tupu ha amalite ịgụ vootu ndị a tụrụ atụ.

Ụfọdụ apụwaala n'ebe a tụrụ vootu na-agazi n'ebe a ga-eme ngụkọ nke mbụ ma gazie n'ebe a ga-eme ngụkọ nke steeti niile.

Usoro ntuliaka mere taa gara n'udo n'ọtụtụ ebe na steeti ahụ n'agbanyeghi na ndị mmadụ apụtaghị ka esi tụ anya.

Mana n'aka nke ọzọ e nwere akụkọ esemokwu na ịzọ igbe ntuliaka n'akụkụ steeti ahụ a kpọrọ Idanre.

Agboola Ajayi ji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ Ondo steeti atụọla vootu

Onye ji aha pati Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa Gọvanọ n’Ondo steeti bụ Agboola Ajayi atụọla vootu ya na wọdụ 2 dị na Kiribo, dị n'okpuru ọchịchị Ede-Odo nke steeti ahụ.

Ajyi gbara afọ 54 bụ onye na-atụ anya na ọ ga-enweta mmeri na ntụliaka ọkwa Gọvanọ Ondo a na-eme ụbọchị Satọde 16 Nọvemba, 2024.

Gọvanọ Lucky Aiyedatiwa atụọla vootu ya

Gọvanọ Ondo steeti bụ Lucky Aiyedatiwa nke pati APC ebinyela aka na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ssteeti ahụ a na-eme taa Satọde 16 Nọvemba 2024.

Gọvanọ Aiyedatiwa binyere aka n’okpuru ọchịchị Illaje.

Cheta na Aiyedatiwa banyere n’ọkwa Gọvanọ n’ọnwa Disemba afọ 2023 ka onye bụbu Gọvanọ bụ Rotimi Akeredolu nwụrụ.

Lee mmadụ 18 na-azọ ọkwa Gọvanọ n’Ondo steeti

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị iri na asatọ na-azọ ọkwa Gọvanọ Ondo steeti nke a aga-eme na Satọde, Novemba 16, 2024.

A ga-eme ya n’ọgbọ ntuliaka dị 3,933 n’okpuruochichi dị iri na asatọ na steeti ahụ.

Mana na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ niile, enweghị onye nyere nwaanyị ohere iji otu ha zọọ ọkwa gọvanọ.

Aha ndị na-azọ ọkwa ahụ gunyere:

  • Falaiye Abraham Ajibola - A
  • Akinuli Fred Omolere - AA
  • Ajayi Adekunle Oluwaseyi - AAC
  • Nejo Adeyemi - ADC
  • Akinnodi Ayodeji Emmanuel - ADP
  • Aiyedatiwa Lucky Orimisan - APC
  • Popoolqa Olatunji Tunde - APGA

Ndị maara nke ekwe na-akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na ndị kacha ewuewu bụ mmadụ abụọ nọ na otu Lucky Aiyedatiwa (APC) na Agboola Ajayi (PDP).

8. Ogunfeyimi Isaac Kolawole – APM

9. Fadoju Amos Babatunde – APP

10. Ebiseni Olusola Nehemiah – LP

11. Olugbemiga Omogbemi Edema – NNPP

12. Ajaunoko Funmilayo Jenyo – NRM

13. Ajayi Alfred Agboola – PDP

14. Alli Babatunde Francis – PRP

15. Akingboye Benson Bamidele – SDP

16. Adegoke Kehinde Paul - YP

17. Akinmurele John Otitoloju – YPP

18. Mimiko Olubansile Abbas - ZLP

Onye APC bubu osete gọvanọ Ondo steeti mechere bụrụ gọvanọ oge Rotimi Akeredolu bụ gọvanọ ha nwụrụ n’ọnwa Desemba 2023.

Onye nke PDP bụ Agboola Ajayi bubu osote gọvanọ steeti ahụ.

Etu INEC si na-akwado ntuliaka ahụ

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola ha ga-eme ka ọ gaa nke ọma na-enweghi ọgbaaghala ma ọ bụ mpụ.

Onyeisioche INEC bụ Mahmood Yakubu gara hụ ka ndị ọlụ ya si akwado.

Ha emegoro ndị ọlụ ha nkuzi, ma ndị niile ga-eso hazie ntuliaka ahụ, ndị isi obodo, ma ndị ntaakụkọ ma kọwaala ha ka ha ga-esi nyereaka mee ka ntuliaka ahụ gaa nke ọma.

Yakubu kwuru na ya “biara na hụ ndi niile ma ndị ọkwọụgbọala bụ ndị ga-ebuga ihe e ji atụ vootu n’ọgbọ ntuliaka ruru 4,154”.

Mana n’oge na adịghị anya ka ndị niile na-azọ ọkwa gọvanọ Ondo steet binyere aka ma nwee nkwekọrịta maka udo na ime ka ntuliaka ahụ gaa n’enweghị ọgbaaghara.