You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu ka bụ onye ndu Ipob, Ọ bụghị Chika Edoziem- Emma Powerful
Otu Indigenous People of Biafra bụ Ipob n'ịchafụ ekwuola na o nweghị mgbe ha gbanwere Nnamdi Kanu dịka onyeisi otu ha.
Nke a na-abịa dịka kepukepu na-efeghari na a haọpụtara Chika Edoziem ka ọ na-arụ ọrụ dịka onye ndu otu ahụ nwa mgbe nta.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful wepụtara ụbọchị Tuzde, o kwuru na ndị na-efesa akụkọ na e wepụla Kanu tinye Chika Edoziem.
dịka onye ndu Ipob bụ asị ndị na-agbasara ndị ụlọ anụmanụ ozi na-ekesa iji megharịa ndị obi esighị ike anya."
Powerful gara n'ihu kwuo na Chika Edoziem bụ onyeisi ọrụ Ipob na ọ bụghị onye ndu.
Ebe okwu si malite
Kemgbe ihe karịrị otu afọ e jiri nwuchie Nnamdi Kanu maka ebubo metụtara iyi ndu egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
Kemgbe ahụ, nghọtahịe adapụtala n'otu ahụ dịka a na-enwe ndị kwe na ndị ekweghị.
Nghọtahịe ahụ pụtara ihe n'ụfọdụ ihe ndị otu Ipob na-eme.
Iji maa atụ, dịka Ipob kwuru na ha agahị na-eme nọọ n'ụlọ ma ewezụga ụbọchị ọbụla nnamdi Kanu nwere ikpe n'ụlọikpe, otu ahụ nke Simon Ekpa na-edu kwuru na 'nọrọụlọ' ụbọchị Monde ga na-aga n'ihu rue oge a tọhapụrụ onye ndu ha Nnamdi Kanu.