Human Rights Day: Mụta ikike ndị ruru gị ma ndị uweojii nwụchie gị

Mgbe e biputara ya

Taa bụ ụbọchị 10 nke ọnwa Disemba kwa afọ bụ nke ngalaba United Nations mapụtara iji cheta ikike ndị ruru ndị mmadụ n'ụwa niile.

Ọ bụ n'ihi na ngalaba a ehibere ịhụ maka ọdịmma ndị mmadụ na mba ụwa niile kwenyere na a mụrụ mmadụ niile nhatanha nakwa na mmadụ niile nwere ugwu na ikike ruru ha niile.

Ikike ndị mbụ kachasị dị mkpa bụ ikike ndụ, ikike nwereonwe nakwa ikike nchekwa onwe.

Nke anyị ga-eleba anya ugbua bụ ikike nwereonwe ọ kachasị ka iwu Naịjirịa si kwado ya.

Ikike ruru gị ma anwụchie gị

Iji ghọtazuo etu iwu Naịjirịa si kpuchie ikike ruru onye ọ kachasị n'oge nwụchi maọbụ ihe ọbụla jikọrọ mmadụ na ndị uweojii, BBC Igbo kpọtụrụ ọkaiwu Precious Nwankwo itinye ọnụ n'okwu a.

Nwankwo kọwara na ndị uweojii nwụchie gị maka ihe ọbụla ị nwere ikike abụọ

- Ị nwere ikike ịgbachi nkịtị azaghị ajụjụ ọbụla ndị uweojii na-ajụ gị

- Ị nwere ikike ịnweta onye ga-anọchị anya gị dịka ọkaiwu maọbụ ọkaiwu

- Ị nwere ikike nkwanye ugwu na-etighi gị ihe, gbaa gị egbe maọbụ merụọ gị ahụ.

"Ụfọdụ ndị uweojii Naịjirịa nwụchie ndị mmadụ ha amalite iti ha ihe mana nke a ekwesighi n'ihi na n'anya Iwu ala aka gị dị ọcha rue oge ikpe mara gị" ka ọ kọwara.

Ọ sịkwa na ụfọdụ ndị mmadụ amaghị na he nwere ikike a nke mere ka ha nabata mmegbu n'aka ndị uweojii maọbụ ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ha.

Ikike ruru gị n'ime nga/mkpọrọ

Kedụ maka mgbe a nwụchiri gị?

Nwankwo kwuru na ndị uweojii nwụrụ gị gaa n'ụlọọrụ ha maọbụ na nga ebe ị ga-anọ, ị nwere ikike:

- ị nwe nleta n'aka onye ọkaiwu gị nakwa ebe unu ga-anọ gbaa izu

- ị kpọọ ezinaụlọ maọbụ ọkaiwu gị n'ekwentị

- Ọ bụrụ na ị ga-anọ ogologo oge, ha ekwesighi ịkwụ gị agụ maọbụ gbochie ndị mmadụ ibutere gị nri.

"Ihe ndị mmadụ kwesiri ịma bụ na ebe ọbụla ịnọ, ikike ruru gị dịka mmadụ ka kwesiri iso gị gaa ebe ahụ.

Ọ kachasị ikike nchekwa onwe nke pụtara na ekwesighi ịmaja gị, ịbara gị mba, iti gị ihe maọbụ imegbu gị n'ụzo ọbụla. Ọzọ bụ ikike nkwanye ugwu" ka o kwuru.

Ikike ruru gị ma ịpụta nwa oge (Bail)

A bịa n'okwu ịgbapụta mmadụ nwa obere oge bụ Bail na Bekee, Ọkaiwu Nwankwo kwuru na e nwere ebe abụọ ịnwere ike itinye akwụkwọ maka ya.

"Ị nwereike ịgbapụta onwe gị n'ụlọikpe maọbụ n'ụlọorụ ndị uweojii" ka o kwuru.

Mana o nweghi mgbe iji kwesi ịkwụ kọpọ ọbụla n'aka ndị uweojii n'ihi na ịkwesiri ịnweta ya bụ 'bail' n'efu.

"Ndị na-akwụnye ndị uweojii ego ọbụla iji gbapụta onwe ha maọbụ onye ọzọ na-akwado mpụ na nrụrụaka n'amaghị nke iwu machiri"

N'agbanyeghi nke a, e nwere ụfọdụ iwu ị ga-emezu tupu enye gị 'bail' nke gụnyere

- ị kpọta onye nnọchite anya bụ 'Guarantor' na Bekee

- ịkwe nkwa na ị gaghị ahapụ obodo ahụ maọbụ ala Naịjirịa rue mgbe ekpechara ikpe gị

- ikwe nkwa na ị ga-aza oku ndị uweojii mgbe ọbụla ha ji kpọọ gị maka ajụjụ maọbụ nyocha ha na-eme.

"N'ọnọdụ a niile, e kwesiri ị debe ikike ahụ ruru gị dịka mmadụ akpọrọ 'Human Rights' gụnyere ikike nchekwa onwe nakwa ikike nkwanye ugwu" ka Nwankwo kọwara.