You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
"Etu m si gbapụta Ngozi Umeadi onye nkwado Nnamdi Kanu n'ụlọmkpọrọ"
Ọkaiwu nọchiri anya otu nwaanyị anwụchiri kemgbe afọ abụọ maka ebubo ịbụ onye IPOB akọwaala ihe nwaanyị ahụ gabigara.
Nwaanyị aha ya bụ Ngozi Umeadi, onye Anambra steeti bụ nke ndị uweojii nwụchiri n'afọ 2021 maka ebubo ịma anya ESN.
Kemgbe ahụ, ka a na-agba mbọ ịtọghapụ ya rue mgbe otu ụlọikpe kwuru na njichi ejichiri ya megidere ikike ruru onye ma kwuo ka atọghapụ ya.
Ọkaiwu ya bụ Umez Prince Mandela gwara BBC na kemgbe ụlọikpe si ya gawa n'ọnwa Disemba afọ 2021, ọ ka tọrọ ebe ahụ.
"E weghara m okwu ikpe ya(Umeadi) naanị ọnwa abụo gara aga were gbaa mbọ gbapụta ya" ka ọ gwara BBC.
"Ihe mere o ji norue ogologo oge a bụ n'ihi ọkaiwu ochie ya ekpeghi ikpe ya ka o si kwesi" ka ọ gwakrwa BBC.
Gbasara nwaanyị a toghapụrụ, Umez kwuru na emegburu nwaanyị ahụ mgbe ọ nọ na mkpọrọ.
Ọ sị "ihe ndị ọ gwara m ọ gabigara wutere m nke ukwu mgbe m nụrụ ya".
Gịnị mere o ji dị mkpa?
Kemgbe emechara ngagharịiwe END SARS, akụkọ pụtara na ndị agha nwụchiri ọtụtụ ndị ntorobia ma gbuo ụfọdụ na mpaghara Obigbo dị na Rivas steeti.
E boro aka na-achị steeti ahụ bụ Nyesom Wike ebubo inye ikike ka e mee nke a nke ọ gọrọ kpam kpam.
Ọzọ bụkwa ụlọorụ Amnesty International kwuru na kemgbe Jenuwarị afọ 2021, ndị ọru nchekwa zoro n'okpuru ịchọpụta ndị Eastern Security Network (ESN) ịmebi ikike ruru ndị mmadụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
N'ime akwụkwọ ozi ha biputara maka ya bụ ihe, ha sị na anwụchiri ihe karịrị mmadụ narị ise n'ụzọ ezighi ezi.
Ha dere "Ihe akaebe dị adị gosiri na ndị ọrụ nchekwa ji obi tara mmiri mesie ndị mmadụ ike n'Imo, Anambra nakwa Abia steeti.
Ihe ọzọ pụtara n'akwụkwọ ozi ahụ bụ na ndị ọrụ nchekwa gọrọ ebubo ndị a eboro ha ma n'agbanyeghi na ihe akaebe dị na ha mere ihe ndị ahụ.