You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Michael Cardoso: Ihe ị kwesịrị ịma banyere Onyeisi CBN Tinubu họpụtara ọhụrụ
Onyeịsịala Bola Tinubu ahopụtala Olayemi Michael Cardoso dika onyeịsị ụlọakụ etịtị (CBN) ọhụrụ nke ala Naịjịrịa.
Onye na-ekwuru Onyeịsịala Bola Tinubu bụ Ajuri Ngelale bụ onye gbara ama na mgbede Fraide( 15 Septemba 2023).
Cardoso ga-anọ dịka onyeisi ụlọakụ Etiti ruo afo ise. n’ịme afaọ ịse a, senetị ga elezi ya anya marama o mere ọfuma.
Iwu na- achị Ụlọaku Etiti nke di na Akụkụ nkeji asatọ nke 1 (section 8) ACT ,2007, nyere onyeịsịala Naijịrịa ikike ịhọpụta onye ga-achị ulọakụ etiti nịjịrịa nakwa mmadu anọ(4) gaa bụ ndị enyemaka govanọ ụlọakụ etiti.
Na otu aka ahụ, Onyeịsịala Bola Tinubu họpụtara mmadu anọ ga ano dika ndị enyemaka Gọvanọ ụlọakụ etiti na afo ịse o ga achị.
Aha mmadu anọ a bụ: Emem Nnana Usoro, Muhammad Sani Abdullahi Dattijo, Ikeazor nakwa Bala M. Bello.
Cheta na Onyeịsịala Naijirịa napụrụ Godwin Emefiele ịkịkere dịka Gọvanọ Ụlọakụ Etiti n' ọnwa Juunụ 2023.
Emefiele bụ onyeisi Ụlọakụ Etiti Naịjịria bido n' afọ 2014 wee ruo Juunụ 2023 bụ oge Tinubu kwụsịrị ya ọrụ n'ike.
Onye bụdị Cardoso?
- Cardoso Olayemi bụ Onyeisi Ụlọakụ Etiti a họpụtara ọhụ bụbu Komishiona na-ahụ maka nhazi akụnaba na bọjet na -agbata afọ 1999 n'oge ọchịchị Bola Tinubu dịka gọvanọ steeti ahụ.
- Cardoso gụrụ mahadum mbụ ya na " University of Aston, dị na mba Briten bụ ebe ọ gụrụ "Managerial and Administrative Studies".
- mahadum nke abụọ ya bụ na "Harvard University" dị na mba Amerịka.
- Ọ lụkwara ọrụ dika onyeisi ọgbakọ ndiịsị ụlọakụ "Citibank na Naijirịa.
- Ọ rụọla ọrụ n'ụlọakụ mbaụwa ndị ọzọ dịka na "Chase' nakwa "Citizens International Bank".