Ihe ndị uweojii kwuru maka ọkụ gbara n’ụlọikpe majistratị, Owerri, Imo steeti

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii n’Imo steeti ekwuola na akụkọ fegharịrị ebe niile n’ụbọchị ụka bụ ụbọchị 18 nke ọnwa Disemba, 2022 bụ ezigbote akụkụ ụgha gbara agba.

Ọnụ na-ekwuru ha n’Imo bụ Michael Abattam zipụtara ozi n’ụbọchị Mọnde ma kọwa na ndị kwuru na a tụnyere ogbunigwe n’ime ụlọikpe ahụ bụgharịrị akụkọ ụgha dịka ọ gara n’ihu kọwa na ọkụ gbara n’ụlọikpe bụ ihe ọdachị ọkụ latrịk kpatara.

Abattam gbara ama na emenyụọla ya bụ ọkụ kpam kpam ma kwuo na nnyocha ka na-aga n’ihu maka ọkụ nakwa ngụkọ ihe ndị ọ metụtara.

Ụlọikpe ukwu nke Imo nke dị n'Owerri nọ nso ụlọikpe majistratị a gbara ọkụ.
Nkọwa foto, Ụlọikpe ukwu nke Imo nke dị n'Owerri nọ nso ụlọikpe majistratị a gbara ọkụ.

Cheta na akụkọ pụtara ma fegharịa n'ụbọchị Sọnde nke kwuru na ndị ekperiema sunyere akụkụ ụlọikpe Majistratị ahụ ọkụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam gbara ama ya bụ ọkụ mana o kwupụtaghị etu ya bụ ọkụ siri malite.

O kwuru n'ezie na ha na-eme nnyocha banyere ya bụ ọkụ.

Ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ kwuru na ndị ekperima ahụ gbapụrụ ogbunigwe n'ime ụlọikpe ahụ nke kpatara o jiri nwuru ọkụ.

Akụkụ ụlọikpe majịstratị nke Owerri
Nkọwa foto, Akụkụ ụlọikpe majịstratị nke Owerri

Akụkụ ụlọikpe majịstratị a nọ n’ime Owerri bụ isi obodo steeti ahụ ma bụrụkwa ụlọikpe agbataobi ụlọikpe ukwu nke Owerri gbariri ọkụ dịka ọtụtụ chere n'ụfodụ ihe ndị nọ n’ime ya bibiri.

Ụfọdụ ndị mmadụ nọ ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị n’ehihe Sọnde na a na-eche na ụfọdụ akwụkwọ ikpe ndị dị mkpa gbariri ọkụ dịka a hụrụ oke anwụrụ ọkụ si n’ime ụlọikpe ahụ alaali elu.

Nke na-abịa dịka naanị otu abalị gachara ka ndị ojiegbe mụnyere ụlọikpe ukwu nke Imo dị n’Orlu Ọkụ ma gbachakwa ụgbọala ndị nọ ebe ọkụ.

Etu e si gbaa ụlọikpe ukwu Imo dị n'Orlu ọkụ

Ụlọikpe ukwu dị n'Orlu

Ebe foto si, Other

Ndị ojiegbe a maghị ndị ha bụ wakporo ma gbaa ụlọikpe ukwu Imo Steeti dị n’Orlu ọkụ n’ụbọchị Satọde 17 Disemba 2022.

Akụkọ kwuru na ndị a gbara mpaghara ụlọ ọrụ ahụ ebe ndị a na-edosa ọtụtụ akwụkwọ ikpe ndị dị mkpa ọkụ.

Otu onye na-arụ n’ụlọikpe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị ntaakụkọ sị na nke a bụ eziokwu ma tinyere na akwụkwọ ndị a dị oke mkpa rere ọkụ pịa.

Mwakpa a na-abịa n’ime ụbọchị ole na ole ndị ojiegbe wakpochara isiụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) dị n’Owere.

Ụlọ a gbara ọkụ

Ebe foto si, Other

Ebe ụlọikpe a dị nọ nso n’okporoụzọ ebe ndị nchekwa na-anọ nakwa n’akụkụ isiụlọọrụ ndị uweojii n’Orlu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Micheal Abattam sị na mwakpo a mere n’ezie, gbakwụnyere na ha amalitela ime nyocha banyere mwakpo.

N’otu aka ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị ọkaiwu n’Orlu bụ Barnabas Munonye sị na nke a bụ ihe ọjọọ mere ha.

O kwuru na ọ bụ odeakwụkwọ ndị otu ha mere ka ọ mata maka ọdachi a mere n’ụtụtụ Satọde.

Ime ụlọọrụ a gbara ọkụ

Ebe foto si, Other

Cheta nke a abụghị mbụ ndị ojiegbe ga-awakpo ụlọikpe ukwu a, nke mbụ mere n’afọ 2018. N’otu aka ahụ a gbakwara ụlọọrụ Inec dị n’Orlu ọkụ.

Kamgbe afọ ole na ole gara aga rute ugbua, ọtụtụ mpaghara n'Imo steeti abụrụla ebe ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ.

Mpaghara ndị a gụnyere Orlu, Orsu, nakwa ebe ndị ọzọ bụ ebe ndị ojiegbe na-awakpoola ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche.

Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ebubo na ọ bụ aka ọrụ ndị otu Indeginous People of Biafra (Ipob) na ndị nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN).

Mana Ipob site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ekwuola ugboro ugboro na aka ha adịghị na mwakpo ndị a.