Aka akparala nwaanyị ji ọkụ “candle” rekasia ahụ nwa ya na ya bi n’Anambra

Aka akparala nwaanyị ji ọkụ “candle” rekasia ahụ nwa ya na ya bi n’Anambra
Ihe a mere n’Awada, Obosi Anambra steeti ebe a sị na otu nwaanyị weere ọkụ candle, rekasia nwatakiri gbara afọ iri ya na ya bi n’ụlọ aha ya bụ Chiziterem.
Ọbụghị nanị na o rere nwata ahụ ọkụ, o jikwa mma, ụtalị, igwe e ji ede akwa dị ọkụ na ihe ndị ọzọ meruchaa ya ahụ, kpọchie ya n’ụlọ ma kwụba ya agụụ.
Arụ ahụ nwaanyị ahụ na di ya na-eme na nzuzo pụtara ihe oge ndị agbataobi hụrụ ka ha siri bekasia ahụ nwatakịrị nwoke ahụ.
Ijiji na-esoghari nwa ahụ.
Ndị agbata obi ha na Minaj Junction n’Obosi jiri iwe kpụrụ nwaanyị ahụ mụrụ ụmụ atọ nke ya na di ya.
Ka ọgbaaghara ahụ na-ada, ndị otu Anambra Vigilante napụtara ha n’aka ndị mmadụ were kpụga ya n’Awada Police Station.
Nne mụrụ Chizitere kwara arịrị na ọ bụ nwa nwanne ya nwoke bụ nwaanyị ahụ chọrọ ịgbu nwa ya.
Ka ọ dị ugbua, ọnụ na-ekwuchutere ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC na ndị Uweojii ji nwaanyi ahụ ugbua n’eme nnyocha maka ihe ahụ merenụ.
Ọzọkwa mere n'Nkpor, Anambra steeti ebe a na-ebo nwa okoroọbịa aha ya bụ Ifechukwu Okechukwu gbara afọ 33 ebubo igbu enyi ya nwaanyị gbara afọ 23.
Ụmụnne na ndị enyi nwatanwaanyị ahụ e gburu kwuru na ha sere okwu oge gara aga, n’ihi na nke nwaanyị achọghịzị ọyị ha abụọ. Ha mechara dozie tupu ọ gaa be enyi ya nwoke.
Ka a chọrọ ya ọtụtụ ụbọchị ka ndị uweojii jidere Ifechukwu, onye gara n’azụ ụlọ ya gosi ebe o liri ozu nwata nwaanyị ahụ.
Ndị agbata obi nọ n’ahụ ọma jijiji ugbua.
Kọmishọna Uweojii Anambra bụ Ikioye Orutugu yọrọ ndị mmadụ ka ha nyere ndị uweojii aka site n'ịgba ama ajọ ihe ọbụla ha hụrụ na gburu gburu ha.



