June 12: Igwe mmadụ pụtara mee ngagharịiwe maka ọnọdụ nchekwa na ọtanisi

Ngagharịiwe iwe Juun 12, 2006, mere n'Abuja
Nkọwa foto, Ngagharịiwe iwe Juun 12, afọ 2026, mere n'Abuja
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Dịka a na-eme Ncheta ụbọchị Ọchịchị Onyekwuoucheya ụbọchị Fraide, igwe mmadụ wụjuru n' ama n'Abụja mee ngagharịiwe maka ọnọdụ nchekwa nakwa ọnọdụ akụnaụba Naijiria.

Onọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naijịrịa dịka ntọ na wakpo na-arị elu ọkachasị na Ndịda Anyanwụ Naịjiria ebe ndị ntọọ tọọrọ ụmụakwụwkọ 46 na ndị nkuzi ha ma jichie ha ihe karịala izuụka atọ.

Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ndị na-eme ngagharịiwe
Nkọwa foto, Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ndị na-eme ngagharịiwe

Ụfọdụ ndị pụtara ime ngagharịiwe ahụ bucha akwụkwọ nke ha dere ihe bụ iwe ha ma na-agụ egwu na-akpọ oku ka onyeisiala gbaa arụkwaghịm.

Akwụkwọ ahụ na-ekwu gụnyere,"Ọ bụrụ na nchekwa adịghị, ọchịchị onyekwuoucheya adịghị'; "O nweghị nwata kwesịrị ịna-atụ ụlọakwụkwọ egwu'; 'Tinubu zọpụta ụmụaka a tọọrọ' wdg.

Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Abuja kọwara na ọ bụ ụzọ ngagarịiwe abụọ mere n'Abuja.

Otu bụ otu jikọrọ ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye nke gụnyere otu 'Revolution Now','Non-Goverment Workers' Association', 'End Bad Governance Movement' na ndị ọzọ.

Ha si okpuru akwa 'Berger' gagharịa gafee Ahịa Wuse ma gaa n'ihu isiụlọọrụ Gọọmentị Etiti(Federal Secretariat) bụ ebe ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ha.

Very Dark Man

Ebe foto si, Verydarkblackman/Instagram

Nkọwa foto, Vincent Otse onye a maara dịka Very Dark Man na soshial midịa na-edu ngagharịiwe

N'aka nke ọzọ, otu nke abụọ mere ngagharịiwe bụ ndị otu 'Ratel' bụ nke Martins Vincent Otse a ma ama dịka 'Very DarkMan' bụ onye ndu ha.

June 12: Gịnị ka ọchịchị onyekwuoucheya wetara Naịjirịa n'ime afọ 27?

Kwa afọ Juun 12, Naịjirịa na-eme emume 'Democracy Day' iji cheta ntuliaka onyeisiala e mere n'afọ 1993, nke ọtụtụ ndị na-ewere dịka otu n'ime ntuliaka kacha bụrụ nke ziri ezi.

Na mbụ, a na-eme emume Democracy Day na Mee 29, ụbọchị ndị agha nyefere ọchịchị n'aka ndị nkịtị n'afọ 1999. Ma n'afọ 2018, gọọmenti onyeisiala Muhammadu Buhari gbanwere ya ka ọ bụrụ June 12 iji sọpụrụ otu ọgaranya na onye ndọrọndọrọ a ma ama bu MKO Abiola na ndị ọzọ lụrụ ọgụ maka ọchịchị ohakarasi.

Moshood Kashimawo Ọlawale (MKO) Abiola
Nkọwa foto, Onyendọrọndọrọ ọchịchị meriri ntuliaka Juun 12, 1993 bụ Moshood Kashimawo Ọlawale Abiola a marala dịka MKO Abiola, weliri aka ya elu, kele ndị nkwado ya mgbe ọ na-azọ ntuliaka afọ ahụ.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gịnị mere Juun 12 ji bụrụ ụbọchị pụrụ iche?

Na Juun 12, afọ 1993, ndị Naịjirịa gara ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchi ọchịchị ndị agha. Ọtụtụ ndị kwenyere na MKO Abiola meriri ntuliaka ahụ, ma ọchịchị ndịagha nke Ibrahim Babangida kagburu nsonaazụ ya.

Ihe a kpatara nnukwu iwe na ọgbaaghara n'obodo.

Ọtụtụ bidoro jiri olu ike na ngaghari iwe na-akatọ ọchịchị ndịagha, na-akpọ okwu ka ha nyefe ọchịchị Naịjirịa nye ndị nkịtị. Nke mechara pụta ihe n'afọ 1999.

Gịnị ka ọchịchị ọhakarasi wetara?

Kemgbe 1999, Naịjirịa enweela afọ 27 nke ọchịchị ndị nkịtị na-enweghị nkwụsị. Obodo anyi ahụla mgbanwe ọchịchị site n'otu onyeisiala ruo n'aka onye ọzọ site na ntuliaka.

N'afọ ndị na-adịbeghị anya, e webatala teknụzụ dịka BVAS na IReV iji mee ka usoro ntuliaka bụrụ nke doro anya ma belata ụfọdụ ụdị aghụghọ ntuliaka.

Kedu ihe ka bụ ihe ịma aka?

N'agbanyeghị afọ 27 nke ọchịchị onye kwuo uche ya, ọtụtụ ndị Naịjirịa ka na-eche nsogbu akụ na ụba, enweghị ọrụ, nchekwa na ntụkwasị obi n'usoro ntuliaka.

Onye nyocha ndọrọndọrọ ọchịchị na ọkaikpe bụ Aham Njoku kwuru na ihe nketa Juun 12 ga-apụta ihe karịa ma ọbụrụ na ọtụtụ ndị debanyere aha ịtụ vootu apụta n'ezie ịtụ vootu ma jụọ ndị ọchịchị ajụjụ gbasara ọrụ ha.

O kwuru, "Ọ bu nnukwu nsogbu na ndị mmadụ anaghi ewezi mmasi n'ịtụ vootu. Nke a na-aga n'ihu kemgbe ọtụtụ afọ. Dịka ọmụmaatụ, e dekọrọ na n'ntuliaka AMAC ikpeazụ e mere na Abuja, naanị pasent asatọ nke ndị debanyere aha ịtụ vootu pụtara ịtụ vootu. Ọnụ ọgụgụ vootu e tụrụ erughị puku iri isii (60,000), ebe ihe karịrị mmadụ puku narị asatọ (800,000) debanyere aha ịtụ vootu na Abuja."

Nkoju kwuru na ọtụtụ mmadụ na-atụkwasịghị ụlọọrụ ntuliaka INEC obi. O tinyekwara na ụfọdụ ndịọrụnchekwa na-akwado ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ gbakwunyere na ntụkwasị obi ụmụ Naịjirịa n'ụlọikpe na-ebelata, ebe usoro ime ntuliaka imeụlọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị anaghị agbaso usoro doro anya.

Ndịuweojii nọ nche n'ihu isiụlọọrụ Gọọmentị Etiti

Ọkpụrụkpu ihe isii Tinubu kwuru n'okwu ncheta ụbọchị Ọchịchị Onyekwoucheya nke afọ 2026

Bola Tinubu, Onyeisiala Naịjirịa

Ebe foto si, Bola Tinubu/x

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu nke Naịjirịa na-ele anya n'akụkụ, ma na-eyi efe anụnụ

Onyeisiala Naijirịa bụ Bola Tinubu adọọla nnukwu aka na ntị nye ndị ntọ, ndị ekeprima na ndị oyindụ egwụ na-akpa mkpamkpa na Naịjịrịa sị ha ' chilie aka ha elu, e meghị otu ahu, gọọmentị ga-eji ike abagide ha."

Tinubu kwuru nke a n'ụbọchị Fraide n'ozi mmerube Juun 12 bụ ụbọchị ncheta Ọchịchị Onyekwuoucheya.

Lee Ihe isii gbara ọkpụrụkpụ Tinubu kwuru n'okwu ụbọchị Democracy Day 2026:

  • Nchekwa: Tinubu kwuru na gọọmenti ya ewepụtala ihe karịrị ndị uweojii ọhụrụ 50,000 ma tinye ijeri naira puku ise na narị anọ na iri (₦5.41tn) n'ọrụ nchekwa n'afọ 2026.
  • Nchụso ndị omekome: O kwuru na ọnụọgụ ndị na-eyi ọha egwu na-egbu ebelatala n'ihe ruru pasent iri asatọ na otu (81%) kemgbe 2015, ma na e gburu ihe karịrị ndị na-eyi ọha egwu 13,000 n'ime otu afọ.
  • Ịweta Udo na Nchekwa: Ndị omekome sịrị n'ọhịa pụta na ndị nkwado n'isi ha karịrị 124,000 atọgbọla ngwa ọgụ kemgbe 2023. Gọọmentị kpọkwuru ndị na-eyi ọha egwu fọrọ afọ ka ha tọgbọ ngwa ọgụ tupu ha ahụ iwe na ike ala Naịjirịa.
  • Akụnaụba: Onye isi ala ahụ kwuru na mgbanwe gọọmenti ya mere kemgbe 2023 emeela ka ego gọọmenti bawanye ma mee ka ndị ọchụnta ego malite itinye ego ọzọ na Naịjirịa.
  • Ọkụ eletrik na ọrụ ugbo: Tinubu kwuru na gọọmenti ya na-arụ ọrụ iji meziwanye ọkụ latrik, belata nsogbu mita ma kesaa traktọ 10,000 nye ndị ọrụ ugbo n'ime afọ ise.
  • Ndị dike Juun 12: O kwupụtara na a ga-enye ọtụtụ ndị so n'agha ọchịchị onyekwuoucheya nturuugo ala Naịjirịa maka mbọ ha gbara n'iweta na ichekwa ọchịchị onyekwuoucheya na Naịjirịa.

Ka Ebonyi steeti si gbaa ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya nke 2026

Gọvanọ Francis Nwifuru kwụ ọtọ na-ele ndị uweojii ka ha na-eme mmemme ha ụbọchị Juun 12 2026
Nkọwa foto, Oge Gọvanọ na-ele ndị uweojii pụtara mee mmemme n'Ebonyi steeti

N'Ebonyi steeti, ha emeghị mkpọtụ dịka a na-eme na mbụ. Ha kpọghị ọtụtụ mmadụ ịbịa na ncheta ọchịchị onyekwuouche ya nke afọ 2026.

Mana Gọvanọ Francis Ogbonna Nwifuru jiri ohere a nye onyinye ụgbọala atọ na otu (31) iji kwalite ọrụ ndị nchekwa dị na steeti ahụ, ma kwuokwa na nchekwa nke ndụ na ihe onwunwe nwere ebe pụrụ iche n'ọchịchị ya.

Ụgbọala Gọvanọ Nwifuru nyere ndị ụlọọrụ nchekwa
Nkọwa foto, Ụgbọala Gọvanọ Nwifuru nyere ndị ụlọọrụ nchekwa
Ụgbọala Gọvanọ Nwifuru nyere ndị uweojii n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Juun 12, 2026
Nkọwa foto, Ụgbọala Gọvanọ Nwifuru nyere ndị uweojii n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Juun 12, 2026

____________________________________________________________________________

Pịa aka ebe a soro BBC Igbo na Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ.