Sit at home: Etu e siri wakpo akụkụ Imo steeti na Ebonyi steeti taa
Ndị bu egbe na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ nke alaka Ipob kpọrọ n'Ọwụwa Anyanwụ egbuola ọtụụ ndị mmadụ, merụọ ụfọdụ ahụ, tọrọ ụfọdụ n'Imo steeti.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chigozie Ohaka
Sit at home: Egbuola otu onye na mwakpo mere n’ahịa Nwakpu n’Ikwo, Ebonyi steeti
Ndị ojiegbe
wakporo ahịa Nwakpu nke dị n’obodo Ndufu Alike okpuruọchịchị Ikwo n’Ebonyi
steeti taa bụ ụbọchị Wenezde abalị 14 nke ọnwa Disemba, 2022.
Akụkọ
na-ekwu na ndị ojiegbe ahụ bịara zuru ọgba tum tum abụọ ma gbagbuo otu onye nwe
ya bụ ọgba tum tum dịka ọ nọ na-azọsị ndị ojiegbe ahụ ya bụ ụgbọala.
Otu n’ime
ndị isi otu nchekwa nke Ebubeagu na steeti abụ Maazị Friday Nnanna Ujor gbara
ama na ya bụ mwakpo mre n’ebe elekere 12 nke ehihe.
Ọ gwara BBC
Igbo na ndị ahịa ahụ malitere chụwụ ndị mere ya bụ mwakpo ọsọ dịka ha malitere iti
mkpu banyere wakpoo ahụ.
O kwukwara
na ndị ọrụ nchekwa Ebubeagu na-ama imi n’ala ugbua inwudo ndị mere mwakpo a dịka
ndị ahịa ahụ gbara ha ama uwe ndị mere ya bụ mwakpo yi nakwa etu ha dị.
Etu ndị ojiegbe siri wakpoo Isinweke, n’Ihitte Uboma, Imo steeti
Ebe foto si, Screengrab
Akụkọ apụtala
na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ wakporo Isinweke dị n’okpuruọchịchị Ihitte
Uboma, Imo steeti.
Olu na-ada n’ihe onyonyo BBC Igbi hụrụ taa bụ Wenezde abalị
14 nke ọnwa Disemba 2022 kwuru na ndị amabeghị ndị ha bụ wakporo ebe ahụ ma
gbaa ọgbatum tum tum abụọ nakwa otu ụgbọala ọkụ.
Olu ahụ gara na-ekwu ‘Unu nọrọ n’ụlọ o, ndị a awakpolo
Isinweke’
‘Mwakpo a
mere n’ụtụtụ taa’.
Ndị nọ ebe ahụ hụ ihe mere kwuru na ndị a gbara egbe aghara aghara ebe ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Michael Abattam ekweghi zaa ajụjụ BBC Igbo jụrụ ya banyere mwakpo a a sị mere taa dịka o dobeghị anya ma e nwere onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na mwakpo a.
Nke a na-abịa dịka naanị abalị abụọ gachara ka ndị ojiegbe mere mwakpo n'ụlọ Inec nke Owerri, ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ha mana otu onye uweojii nwụrụ na mwakpo ahụ.
E jidere mmadụ abụọ na mwakpo ahụ mere n'ụlọ Inec ma nata ha ọtụtụ egbe, ọgwụ, ụgbọala abụọ, nakwa ihe ndị ọzọ.
Cheta na taa bụ ụbọchi ikpeazụ n’iwu onye nọrọ n’ụlọ Simon Ekpa tiri malite n’ụbọchị
itolu nke ọnwa Disemba ruo ụbọchị 14 nke ọnwa Disemba n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa
niile.
Ekpa, onye na-arụ
dịka onyeisi otu kpọrọ onwa ha ‘Autopilot’ bụ otu a na-eche si n’otu Indigenous
People of Biafra (Ipob) kwapụta kwuru kwuru na nso nso a na Facebook na
ihe ha ji kpoo oku nọrọ n'ụlọ abalị ise a bụ iji kwado ndị Ọwụwa Anyanwụ maka
ihe ga-eme n'afọ 2023 - "nkewapụ Biafra na Naijiria".
Cheta na ndị
ojiegbe awakpobuola ndị ọrụ Inec n’ihitte Uboma n’ọnwa Eprel, 2022 ma gbuo otu
onye n’ime ha oge ndị mmadụ nọ na-edebanye aha ha maka inweta akwụkwọ ikike itu
vootu ebe ahụ.
Ebe foto si, Screengrab
Sit-at-home: Owere na-ekwo taa na-agbanyeghị mwakpo mere ụnyaahụ
Nkọwa foto, Ụgbọala na ndị mmadụ na-agara onwe ha ebe masịị ha n'Owere taa 10/12/2022
Ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha dịka
Owere, isiobodo Imo steeti na-ekwo na-agbanyeghị mwakpoom ndị bu egbe mere na
mpaghrara dị iche iche na steeti ahụ ụbọchị Fraide.
Ndị bu egbe na-amanye ndị mmadụ nọrọ
n'ụlọ abalị ise etu otu alaka Ipob kpọrọ onwe ha "Autopilot" tiri
n'iwu wakporo ọtụtụ ebe, gbuo ndị mmadụ, tọọrọ ụfọdụ, merụọ ọtụtụ ahụ maa
gbakwa ọtụtụ ọdọahịa ọkụ na mpaghara dịka ndị bu.
Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Owere
ụbọchị Satode kwuru na ndị mmadụ na ụgbọala na-agagharị ka ọ na-adị na mbụ.
Mahadum Imo State University Junction',
'Government House Roundaboutnakwa Ama JK na-ebe ndị ọzọ a ma ama na-ekwo.
Ndị nwere agbamakwụkwọ na ihe ndị ọzọ dị
ha mkpa gaara ya.
Cheta na ụnyaahụ, ndị ojiegbe gbagburu
nwanne Osita Iheme na-eme ejije bụ Chidi Iheme; makasịa Komishona steeti ahụ bụ
Martin Eke mma.
Ha tọọrọ ndịọcha abụọ na-arụ ọrụ
okporoụzọ ma gbaa ahịa obodo Ọkaiwu Nnamddi Kanu bụ Aloy Ejimakor ọkụ.
Ndị uweojii ezipula ndị otu ha n'igwe na mpaghara Enugwu steeti
Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ahmed Ammani agwaala ndị Enugwu steeti ha gaa mkpa ha n'atụghị ụjọ ọbụla.
Nke a na-abịa dịka o zipuru ndị otu ya n'igwe na mpaghara Enugu ịhụ na o nweghi onye manyere ndị mmadụ 'sit at home' bụ nke iwu machiri.
Onyekwara ndị otu ya iwu ha nwụchie ndị omekome na-achọ ibute ọgbaghara na steeti ahụ site n'imanye ya bụ 'sit at home'.
Kọmịshọna Ammani n'ozi o ziputere nke Daniel Ndukwe binyere aka na ya kwuru na ihe na-aga nke ọma ugbua dịka ndị omekome ahụ maliteburu ịgbasasi egbe n'akụkụ New Market dị n'Enugwu ma majaa ndị mmadụ na-aga mkpa ha.
Nwaanyị dị ime a nwụrụ n'ihe a?
Ihe onyonyo na-efegharị nke BBC hụrụ anya na-egosi ebe ozu mmadụ atọ tọgbọ n'ala dịka e kwuru na ndị na-amanye sit at home n'Enugwu gbara egbe iji chụlaa ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'ụzụ ụtụtụ.
Otu n'ime ndị ozu ha tọgbọ bụ nwaanyị dị ime mana ndị nọ n'ebe ahụ na-ekwu na mgbọ atụghị nwaanyị ahụ kama ncha dịka a na-eche na obi koropuru ya.
Onye ntaakụkọ BBC nụrụ na ozu ndị ahụ dị n'ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ Park Lane dị n'Enugwu.
Ndị uweojii ekwughi ihe ọbụla gbara ndị nwụrụ n'ozi nke ha ziputere n'ehihie ụbọchị Satọde mana BBC Igbo ka na-agba mbọ inweta ha n'ekwentị.
Ndị bu egbe awakpoola obodo ọkaiwu Nnamdi Kanu, gbaa ahịa, ụgbọala ọkụ
Ebe foto si, Aloy Ejimakor/Twitter
Ndị bu egbe wakporo obodo Aloy Ejimakor, ọkaiwu onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu' bụ Uruala, nke dị n'Okpuru Ọchịchị Ideato-North, n’Imo steeti ụbọchị Fraide, gbaa ọtụtụ ọdọahịa, ngwahịa,dị n'ahịa Afo Ilo nakwa ụgbọala ndị mmadụ ọkụ.
Ejimakor bụ onye gbara nke a n'anwụ n'akara Twitter ya ụbọchị Fraide tụrụ arịrị maka ihe e bibiri.
Ọ sịrị, " Taa bụ abalị Itoolu nke ọnwa Disemba, ọtụtụ ụmụnwoke bu egbe wụbatara obodo m, wakpoo
N’ihe onyonyo otu
n’ime ọkaiwu Nnamdi
Kanu bụ Aloy Ejimakor wepụtara na Twitter ya, a hụrụ ka ụgbọala ndị metụtara, mebie akụ n'ihe enwenwe ha, isunye ọkụ n'ahịa obodo anyị .
"Ọ bụ ụbọchị ọjọọ agaghị echefu echefu."
"Obi adịghị m mma. Obi adịghị m m mma. Oni adịghị ndị be anyị mma."
A gbagbuola nwanne Osita Iheme na ndị ọzọ, tọrọ ndịọcha abụọ n'Imo steeti
Ndi bu egbe agbagbuola ndị mmadụ n'ebe abụọ ha wakporo, ma tọrọ ndị ofesi mmadụ abụọ na mgbede Fraide dịka ha na-amanye ndị mmadụ iube isi n' oku nọrọnụlọ abalị ise nke otu alaka otu 'Indigenous People of Biafra'(Ipob) kpọrọ.
Mana ndị uweojii Imo steeti jụrụ ikwu ihe ọbula banyere ọdachi a mere ụnyaahụ dịka mbọ nile a gbara ịnụta olu ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam amịtaghị mkpụrụ.
Otu alaka Ipob kpọrọ onwe ha "Autopilot" nke Simon Ekpa na-edu tinyere iwu onye nọrọ n'ụlọ abali ise malite n'ụbọchị Fraide abalị Itoolu nke ọnwa Disemba, afọ 2022.
Mana ndị mmadụ bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị iche iche egeghị ha ndị, kama ha gawara mkpa, mana egwu dagharịrị ka ehihie ruru.
A gbagburu nwanne nwoke Osita Iheme, omeeihe ejije Nollywood a ma ama dịka "Paw-Paw" bụ Chidi Iheme n'Ụbomiri dị n'Okpuru Ọchịchị Mbaitoli n'ehihie Fraide dịka ha na-aga oku achumtavootu nke Akarachi Amadi bụ onye APC na-azọ ịnọchịte ndị Mbaitolu /Ikeduru n'Ụlọomeiwu kpọrọ.
Ebe foto si, Osita iheme/Instagram
Nkọwa foto, Osita iheme bụ onye ejije Nollywood na-akpakarị ọchị e ji "Paw-Paw" bụ agwa o mere n'otu ejije mara
Iheme nọ n’ime ụgbọala Kọmịshọna Imo steeti na-ahụ maka ọnatarachi bụ Martin Eke oge ihe ahụ mere.
Ndị ojiegbe ahụ gbukasịrị Eke mma, e buga Eke ụlọọgwụ a kpọghị aha ya maka nleta.
N'otu aka ahụ, ndị omekataraihedaaụjọ gbukwara ndị mmadụ n'Umuna dị n'Okpuru Ọchịchị Onuimo dịkwa na steeti ahụ.
N' aka nke ọzọ, ndị ojiegbe bu ụgbọala atọ tọọrọ ndị ndịọcha na-elekọta ọrụ okporoụzọ Owere gawa Okigwe nke ụlọọrụ ndị Jamini a ma dịka "Cremburg " na-arụ n' Umunachi dịkwa n'Imo steeti dịka ha gbatuchara ndị ọrụ nchekwa e chere bụ ndị na-echekwa ndịọcha ahụ.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na mgbede Fraide nke onye ntaakụkọ huru gosiri okorobia abụọ ọbara juru ahụ tọgbọ nke ndị nọ n'ihe onyonyo ahụ na-ekwu na o mere na Umuna.
Ka ọ dị ugbua, Amadi, onye kọwara Iheme dịka otu na ndị na-enye ya ezi nkwado ya, katọrọ ogbugbu ya nakwa ahụ e merụrụ Kọmishọna Ọnatarachi steeti ahụ.
N'ozi iti aka n'obi nke ọnụ na-ekwuru Amadi bụ Darlington Irobi binyere aka ma wepụta n'abalị Fraide,ọ sịrị, " Ọ bụ n'obi arịrị na mwute ka anyị ji akatọ ihe mere taa n' Amawuihe dị n'Okpuru Ọchịchị Mbaitoli."
"Ozi na a wụrụ mgbọ n'Amawuihe Ubomiri tara isi otu ezi onye nkwado APC bụ Chidi Iheme, oge anyị nọ n'obodo Egbeada na-achụ nta vootu bụ ihe tara ọjị anya."
"Anyị na-akatọkwa wakpo a wakporo Kọmịshọna Imo steeti na-ahụ maka ọnatarachi bụ Martin Eke bụ onye ya na Iheme nọ n'otu ụgbọala."
Ọnọdụ nchekwa akpụọla afọ n'ala n'Ọwụị̀a Anyanwụ kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021 bụ mgbe oke ogbugbu mmadụ, ịwakpo ogige ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ntọ na mpụ ndị ọzọ riri elu.
Gọọmentị Etiti eboola otu Ipob ebubo na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi.
Mana Ipob agọọla nke onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu agọọla ugboro ugboro site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful na aka ha dị ọcha.
Alaka Ipob nke Simon Ekpa na-edu tinyere nọọnọọ n'ụlọ abalị ise si na ọ bụ iji kwado ndị Biafra nọ n'Ọwụwa anyanwụ maka ikewapụta Biafra na Naijiria bụ nke o kwuru gaemezu n'afọ 2022.
OỌnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful, na ọtụtụ ndị okenye Igbo na ndị onụ na-eru n'okwu gụnyere otu Ohaneze katọọ atụmatụ nọọn'ụlọ ahụ si na ọ bụ ịta ndị Igbo nọrọla n'oke ihe isi ike ahụhụ.
Ndewoonu,Igbo ndị ọma!
Igbo ndị ọma, anyị ekelee!
Ndụ mmiri, ndụ azụ.
Egbe bere, ugbo bere.
Nke si ibe ya ebelela, nku kwaa ya!
Ndị na-amanye 'Sit-at-home' e gburu onye uweojii n'Imo taa?
Ebe foto si, Screenshot/Other
Nkọwa foto, Foto a gosiri mwakpo yiri nke a mekwara n'Owere n'afọ 2021 mana ọ bụghị nke taa.
Akụko na-ekwu na ojiegbe na-amanye atụmatụ ‘Sit at home’ awakpoola ọtụtụ
ndị mmadụ n’Imo steeti .
Otu
onye gwara BBC na ọ hụrụ ebe ndị ahu ji ụgbọala ọkwụọtọ gbagburu onye ụweojii n’ụzọ
7up Junction dịka ha na ndị uweojii zutere onwe ha n'ebe ahụ.
Onye ahụ kwukwara na ndị mmadụ zutere ndị ojiegbe ahụ hapụrụ ụgbọala ha ma gbapụ ọsọ ndụ ebe ndị na-azụ ahịa kpọchiri ọdọ ahịa ha walụ ọsọ.
Ndị ahụ hụrụ ebe ihe mere kwukwara na n'Orji bụ obodo ya na Owere nwere okeala, ndị omekome ahụ bu egbe yi ụwe ojii n'ahụ ji ụgbọala atọ gbochie ụzọ na-amaja ndị mmadụ.
"Ha kwụsịrị anyị, gbalie egbe elu ma sị anyị laghachi be anyị. O doro m anya na ha agbagbughị anyị n'ihi na a nọ m n'etiti ndị agadị nwaanyị" ka o kwuru.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam gwara BBC na o nweghi mwakpo ọbụla mere na gburugburu Imo steeti taa.
Lekwa ka Nnewi, Anambra Steeti dị taa amara ọkwa Sit-at-home
Nnewi bụ obodo ọkwa Sit-at-home na-emetụkarị dị iche taa dịka ndị mmadụ na-aga mkpa ha agbanyeghị ọkwa sit-at-home otu BIafra Auto Pilot nke onyeisi ha bụ Simon Ekpa nyere.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru ebe dịka Izuchukwu Junction, Bank Road, Ibeto Junction, Nnewi Roundabpout, Orizu Palace na-ebe ndị ọzọ na-ekwo ekwo dịka o si adị n'ụbọchị Frịde ọbụla.
Lee ka ọnọdụ Abakịlikị, Ebonyi dị taa
Onye ntaakụkọ BBC gagharịrị n'isi obodo Ebonyi steeti bụ Abakịliki chọpụtara na ọtụtụ ndị pụtara n'ụtụtụ a aga mkpa dịịrị ha.
Nke a na-eme agbanyeghị oku alaka Ipob bụ Biafra Auto Pilot nere ka ndị mmadụ hara ịpụta ezi.
Ndị ọkwọọ ụgbọala na-eme kwa njem ha ma enweghị ndị nchekwa ọbụla onye ntaakụkọ BBC a hụrụ mgbe ọ gagharịrị n'ụtụtụ taa.
Ndị Ọka na-aga mkpa dịịrị ha
Ndị Mmadụ erubeghị isi n'iwu sit-at-home otu Biafra Auto Pilot hiwere .
Dịka onye ntaakụkọ BBC siri chọpụta, ndị mmadụ gaara mkpa dịịrị ha, ahịa Eke Ọka mepere nke ọma, ndị ọkwọ ụgbọala na-arụ ọrụ ebe ụlọakụ na ụlọọrụ ndị ọzọ na-arụ ọrụ nke ọma.
Gọọmentị Anambra Steeti n'ụbọchị wenezde kwara ndị steeti ahụ ka ha pụta gaa ihe dịịrị ha dịka onụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Emma Powerful depụtara akwụkwọ ozi ma kagbup ya bụ sitathome.
Enweghị ihe dịka Sit-at-home n'Enugwu
Nkọwa foto, New Haven Market nke dị N'Enugwu
Enweghị sit-at-home ọbụla n'Enugwu taata, ndị mmadụ bi n'Enugwu na-agagharị dịka o si adibu kwa Fraide ọbụla.
BBC Igbo gagharrị site Ogui road gaa Obiagu, ahịa New Haven na Artisan were hụ na onweghị onye rubere isi na ya bụ sit-at-home otu Biafra Auto Pilot hiwere.
Lee ka Enugwu di
Nkọwa foto, Mpaghara Njemanze
Ndị mmadụ na-aga mkpa ha enweghị mgbochi ọbụla n'Ụmụahịa
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gagharịrị n'isi obodo Abia Steeti nke bụ Umuahia ma chọpụta na ndị mmadụ na-aga mkpa ha na-enweghị nsogbu ọbụla.
Ụlọakụ, Ụlọakwụkwọ, ụlọọrụ gọọmentị, ụlọọrụ na-ere mmanụ ụgbọala na ebe oriri na ọnụnụ niile mepere emepe n'Ụmụahịa.
Ọnọdụ Owere : Ndị mmadụ na-aga mkpa dịịrị ha
Ndị mmadụ pụtara agaara mkpa ha n'isi obodo Imo steeti dịka ụgbọala, ụlọọrụ, ndị agha na ụmụ akwụkwọ na-aga mkpa dịịrị ha.
Cheta na ndị kpọrọ onwe ha Biafra Auto Pilot nke onyeisi ha bụ Simon Ekpa nyere iwu ka enwee ọnọdụ onye apụtala ezi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa dịka ha na-azọ nwereonwe Biafra.
Kedụ etu ọkwa sit-at-home ụbọchị ise siri bido
Simon Ekpa bụ onyeisi otu Biafra Auto Pilot kpọrọ oku sị onye ọbụla apụtala ezi ụbọchị ise na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa nke ga-esite n'ụbọchị itolu ruo ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba afọ 2022 dịka ụzọ esi enweta nwereone Biafra.
Ọtụtụ ndị Igbo apụtala katọọ ma tụhapụ oku a Ekpa kpọrọ.
Egwu bara ndị mmadụ ahụ dịka ihe onyonyo nke gosiri egbe na olu mmadụ na-ekwu na onye apụtala ezi ụbọchị ise, ma sị na onye pụtara ezi ga-eji anya ya hụ ntị ya.
Ihe Ohaneze kwuru
Otu Ohanaeze Ndịgbo gbarụrụ ihu n'oku Simon Ekpa kpọrọ ka a nọrọ n'ụ;ọ abalị ise.
Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru site n'ozi nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnia ya binyere aka ma wepụta sị, " Onyeisi Ohaneze Ndigbo gburu gburu bụ George Obiozor nakwa ụmụ Igbo nwoke na nwaanyị Igbo ihe ọma na adị mma na-akpoku onye nọ dịka eze obodo Umueziaka bụ onbodo Simon Ekpa; aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi na ndị ọzọ jide Simon Ekpa aka, hụ na ọ kwụsị oke aghara ndị ntorobia dị ya n'ahụ."
Ebe foto si, George Obiozor
"Ha chetara Ekpa na o nwenubeghị onye na-alụ ọgụ nnwereonwe na-eche ihu egbe na ndị ọ na-alụrụ ọgụ."
N’ụbọchị Wenezde, otu Indigenous People of Biafra (Ipob) wepụtara ozi nke na-ekwu na ọbụghị ha wepụtara ihe onyonyo na-akpọ oku nọrọ n'ụlọ n’Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa malite n’abalị itoolu ruo abalị 14 nke ọnwa Disemba afọ 2022 na-efegharị na soshal midia.
N’ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru ndị Ipob bụ Emma Powerful binyere aka, ọ sị: “Ipob enweghị iwu nọrọ n’ụlọ ha tinyere maka ụbọchị ndị a, maka anyị abụghị ndị agboro na-enweghị uche, maọbụkwanụ na-enweghị aka ọrụ.”
“Nwa bịafra ọbụla maọbụ onye ọbụla bi n’ala Biafra gbaa ụdị ozi a nkiti bụ ozi si n’aka ndị azụghị azụ na ndị enweghị ụbụrụ ndị ebunombi ha bụ ime ka ọha kpọọ mbọ nnwereonwe Biafra asị.”
“Onye Biafra ọbụla gawa mkpa ya n’ụbọchị ndị ahụ.”