From Entertainment to Politics: Funke Akindele, Trump, Tonto Dike na ndị ọzọ si n'ịkpa obi ụtọ banye ndọrọndọrọ

Mgbe e biputara ya

Na nsonso a, dịka Funke Akindele na Tonto Dikeh  kwụpụtara mmasị ha ibanye ndọrọndọrọ ọchịchị maka ntuliaka 2023, ọtụtụ ụmụ Naijira ji mkparị chụchụọ ha eze.

Akindele so Olajide Adediran nke pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ Legọs dịka osote ya, ebe Tonto Dikeh so Tonte Ibraye nke otu ADC azọ ọkwa Gọvanọ Rivas steeti dịka Osote ya.

Ụfọdụ kwuru na ụmụnwaanyị abụọ ndị a chere na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ "njakịrị'.

Mana ha abụghị ndị mbụ nke ha ga-abụ ndị ikpeazụ ga-esi n'ịkpa aṅụrị banye n' ọchịchị obodo.

Lee ụfọdụ ndị a na-anụ aha ha n'ụwa merela ya:

1. Donald Trump

Donald Trump bụ ojiegoachụehgo na onye ihe ejije  banyere na ndọrọndọr ọchịchị ma nweta ọnkwa onyeisiala 45 nke mba Amerịka.

Ọ bụ ya bụ onye haziri ma sonyekwa n'ihe onyonyo TV 'The Apprentice" bụ ebe o mere agwa onye nwe ụlọọrụ.

 O sonyekwala na ihe ejije ndị ọzọ nakwa na nkwado ịgba mgba  nke WWE kemgbe agbata 1980s.

Oge Trump kwupụtara n'ọnwa Juun afọ 2015 na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, Amerika, ndị  ma ihe ekwe na-akụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, eleghị ya anya ugboro abụo.

Mana mgbe oge ruru,  Trump mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya dịka o meriri Hilary Clinton  bụ onye ọtụtụ na-ele anya ga-ewere ọkwa ahụ.

Trump bụ onye Amerika mbụ na-aba n'ọkwa onyeisiala na-arụbeghị ọrụ onye agha maọbụ rụọ ọrụ gọọmentị.

2. Desmond Elliot

A ma Desmond Elliot dịka onye ejije  Nollywood na-egosikarị agwa ịhụnanya.

Oge ọ pụtara ịzọ ọkwa onyeomeiwu na Legọs steeti, ụfọdụ ụmụ Naijiria kpọrọ ya okwu njakịrị.

Mana Igbo si na e lelia nwa ite, ọ gbọnyụọ ọkụ. Ugbua, ọ bụghị naanị na Elliot bụ onye zọrọ ọkwa ịnọchite Surulere n'Ụlọomeiwu Legọs steeti n'aha otu APC meriri na ntuliaka  2015, ọ banyela n'agba nke abụọ ya n'afọ 2019.

3. Arnold Schwarzenegger

Arnold Alois Schwarzenegger bụbụ onye na-akpụ ụzụ (body builder) tupu ọ bụrụ onye na-eme ejije.

Nwa afọ Austria  a bụkwa onye Amerika a ma n'ihi ihe ejije na-egosi odogwu o merela.

Ọ burụ na i toro n'afọ 80s na 90s, ị ga-ama ụfọdụ ejije o mere dịka 'Terminator' , 'Commando', 'Twins' na 'Predator'.

Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya  oge Schwarzenegger wụbara na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Nwa amadi ahụ a mụrụ n'afọ 1947 bụ gọvanọ California n'aha otu 'Republican Party' malite  n'afo 2003 rue afọ 2011.

'Governator 'dịka e ji mara Schwarzenegger oge ọ nọ n'ọkwa gọvanọ banyere  n'ọkwa ahụ ka e mechara ntuliaka mgbakwụnye e mere iji wepụ Gray Davis bụ onye ọha ndị steeti ahụ si na ha achọghịzi dịka gọvanọ ha n'ihi nsogbu ọkụ latrik na nsogbu so Bọjet California na mbido agba nke abụọ ọchịchị Davis.

Ugbua, Schwarzenegger dị afọ 75 nọzị ezumike nka, ya na ụmụanụmanụ ya na-egoli.

Nwunye ya bụ Maria Shriver gbara ya arụkwaghị n'afọ 2021 dịka Schwarzenegger kwupụtara na odibo ha nwaanyị mụtara ya nwa.

4. Judith Babirye

 Judith Babirye bụ otiegwu ụka a ma ama na na mba Yuganda.

Ọ bụ onye ụkọchukwu ma bụrụkwa  omeiwu n'Ụlọomeiwu mba Yuganda malite n'afọ 20016 rue2021.

5. Kongara Jaggaya

Kongara Jaggaya bụ onye ihe ejije na onye nta akụkọ mba India a ma ama maka agwa o mere n'ọtụtụ ihe onyonyo karịrị 200 nke gụnyere "Alluri Sita Rama Raju", "Bobbili Simham".

Jaggaya a mụrụ n'afọ 1928 bụ onye ejije mbụ n'India na-abanye n'ụlọomeiwu mba ahụ.

Jaggaya nwụrụ n'afọ 2004.

6. George Weah

Ị ma na onyeisiala mba Liberia ugbua bụbụ ọgbabọọlụ  a ma ama?

Nwa amadi a gbara afọ 55( a mụrụ ya n'Oktoba 1, afọ 1966) bụbụ onye egwu bọọlụ wuru ewu n'ụwa dịka o riterela nturuugo  kara aka dị iche iche gụnyere;'Fifa World Player of the Year, 'CAF Award for Best  Ten Players of the Last 50 Years.'

Tupu ọ bụrụ onyeisiala, Weah zọrọ  ma nweta ọkwa Senetọ na-anọchite Montseerrado County n'Ụloomeiwu Ukwu mba Liberia. Tupu nke a, Weah  onye hiwere otu Congress for Democtaic Change zọsara Ellen  Sirleaf ọkwa onyeisiala n'afọ 2005 mana ọkwa ahụ eruteghị ya aka.

N'afọ 2011, ọ zọrọ dịka osote Winston Tubman mana ọ kwara ya.

N'afọ 2014, ọ zọrọ seneto nweta mmeri. n'afọ 2017, ọ zọrọ ọkwa onyeisiala ọzọ, ma merịe Joseph Boakai bụ Osote Onyeisiala oge ahụ, e duo ya iyi ọrụ n'abalị 22 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2018

7. Ronald Reagan

Ọ bụghị naanị Trump bụ onye nụrụ ọrụ ịkpa obi ụtọ banyerela ọkwa onyeisiala mba Amerịka. Donald Reagan bụ onyeisiala Amerika nke 40 bụbụ onye ihe ejije Hollywood.

Ihe ejije o merela gụnyere 'Love is On the Air', 'Dark Victory','Santa Fe Trail'.

Ọ malitere ndọrndọrọ ọchịchị dịka Govanọ California  malite n'afọ 1966 rue afọ 1975.

O mechara bụrụ onyeisiala n'afọ 1981 rue afọ 1989.

8. Volodymyr Zelensky

Ọ bụrụ na ị mabughị Zelensky, Agha Rushịa na Yukren, emela ya otu onyeisiala a kp u n'ọnụ kemgbe Febụwarị afọ 2021 bụ oge Rọshia wakpro mba ya.

Mana Ị ma Zelensky bụbụ ọkpaọchị tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị?

Ọ gụrụ  maka iwu (Law) na mahadum mana pute mewe ejije ịkpaọchị dịka ọ malitere ụlọọrụ na-eme ejije a kpọrọ Kvartal 95 bụ ebe o mepụtara ihe onyonyo TV dị iche iche gụnyere nke ọ kpọrọ 'Odibo ndị mmadụ bụ eme o na-eme agwa onyeisiala. malite n'afọ 2015 rue afọ 2019.

N'afọ 2018, ndị ọrụ ụlọọrụ Kvartal malitere party ha kpọrọ  'Odibo ndị mmadụ. Zelensky pụtara zọọ ọkwa onyeisiala Yukren n'afọ 2019, merie aka na-achị mba ahụ mgbe ahụ bụ Petro Poroshenko.

E ji  iji shosal midia  ọkachasi Instagram agbasa ozi mara Zelensky.

9. Allessandra Mussolino

Allessandra Mussolino bụ nwanwa Benito Mussolino bụbụ Praim Minista mba Italy malite n'afọ 1922 rue afọ 1945 bụ oge e gburu ya.

Ọ bụbụ onye ihe ejije nakwa onye e ji ihu ya ere ahịa tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ihe ejije ndị o sonyere na ya gụnyere 'Ferragosto Ok', 'Vincere per vincere' na 'Ha-Derech L'ein harod' bụ nke ikpeazụ ya o mere n'afọ 1990.

Nwaany a lụrụ di ma jide ụmụ atọ bụbụ onye omeiwu ụlọomeiwu ukwu mba Italy (2013-2014) mecha bụrụ onye omeiwu nke  otu EU 'European Parliament'. malite n2014 rue na 2019.

10.  Lech Kaczynski

Lech Kaczynski gụrụ maka iwu na mahadum 'Warsaw University"na ejima ya sonyere n'ihe Ejije Poland ama dịka " The Two who stole the Moon."

Ọ bụrụ onye 'senetọ n'afọ 1989,, ọ rụkwara ọrụ dịka Mịnịsta nchekwa na mba ahụ. tupu a chụọ ya n'ọrụ. maka nsogbu dapụtara n'Ọchịchị Jan Olszekwi.

 N'afọ 2003, Kaczynski na nwanne ya gara malite pati nke ha  a kpọrọ Law and Justice party bụ ebe ọ zọrọ ọkwa onyeisial ma merịe n'afọ 2005.

N'afọ 2006, Kaczynski họpụtara ejima ya dịka Praim Minista nke  mere ya mbụ n'ụwa ụmụnne abụọ ịbụ onyeieisla na Praim Minista. N'afọ 2007, ejima Lech dara na ntuliaka, ebe Leech Kaczynski na nwunye ya bụ Maria nwụrụ na mkpọkasị ụgbọelu n'afọ 2010.

11. Gideon Kipsiele Moi

Gideon Kipsiele Moi bụ onye egwuregwu polo mba Kenya zọrọ ma nweta ọkwa onye omeiwu n'Ụlọomeiwu Ukwu mba Kenya.

Kipsiele Moi nọchitere anya mpaghara Baringo n'ụlọomeiwu Ukwu mba Kenya.

12. Jesse Ventura

Jesse Ventura bụ  ọgbamgba  a mabu a ma dịka  "the Body"n'otu mgba Word Wrestling Federation mechia banye n' ihe ejije na ndọrọndọrọ ọchịchị mba Amerika. Ihe ejije o merela gụnyere "Predator",

Ventura bụ gọvanọ Minnesota malite n'Afọ 1999 rue afọ 2003 n'aha Reform Party.

Ventura onye aha ya bụbụ James George Janos tupu ọ gbanwe ya ji ịgbasa ozi n' ịntanet were dọta ndị ntorobia ike pati abụọ na-achị Amerika gwụrụla ike.

Mmeri ya na tuliaka tụrụ ndị mmadụ na anya n'ihi na  na ọ bụ mbụ onye si Reform Party na emere na ntuliaka steeti na Amerika.

Naijiria ọ na-aga kwa?

Ọ na-aga! Naijiria nwere ọtụtụ ndị na-akpa obi ụtọ nwalerela ndọrọndọrọ ọchịchị ma zọọ ọkwa dị iche iche.

Mana imirikiti ka a kpọrọ, ole na ole ka a họtara.

Ụfọdụ n'ime ndịa ha achịtabeghị aja n'okwu ndị na-ekwu ighe na-eme n'obodo.

Ndị dịka ;

Kenneth Okonkwu

Kenneth Okonkwo zọrọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti n'aha APC n'afọ 2015 mana o nwtaghị ikike pati ahụ ife ọkọlọtọ ha.

Yul Edochie

Yul Edochie zọrọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2017 n'aha otu DPC.

Banky W

Bankole Wellington bụ otiegwu a ma dịka 'Banky W' si n'iti egwu wụba ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị. O malitere iti egwu kemgbe afọ 2002 ma mepekwa ụlọegwu nke ya akpọrọ 'Empire Mates Entertainment' bụ E.M.E.Ọ lụrụ omeeiheonyonyo bụ Adesuwa Etomi n'afọ 2017

O bu ụzọ kwuo na ọ ga-azọ nnọchi anya Eti-Osa Federal Constituency n'ụlọomeiwu nta n'okpuru otu Modern Democratic Party n'afọ 2018 nke Babajide Obanikoro meriri ya na ya.

Ugbua ọ na-azọ otu ọkwa ahụ mana ọ bụ n'okpuru otu Peoples Democratic Party (PDP) dịka ọ ritere ikike iji aha ha zọ ya bụ ọkwa n'ọnwa Juun afọ 2022.

N'Afrika, John Dumelo nke Ghana zọrọ ọkwa onye ụlọmeiwu mana ọ chịtaghị aja.

N'abalị anọ nke ọnwa Ọgụstụ afọ 2019, Dumelo nwetara ikike ịzọ ọkwa omeiwu ga-anọchite anya mpaghara Ayawaso West Wougon n'ụlọomeiwu mba Ghana.

Mana na ntuliaka e mere ọ chịaghị aja dịka  Lydia Alhassan jibu ọkwa ahụ meriri ya.