You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Osinachi Nwachukwu: Ụlọikpe enyela iwu ka a kwụgbuo Paul Nwachukwu,di Otiegwu ụka a ma ama
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja amaala di otiegwu a ma ama bụ Paul Nwachukwu ikpe ọnwụ maka ọnwụ nwunye ya bụ Osinachi Nwachu.
Ọkaikpe Jọstịs Njideka Nwosu-Iheme nyere iwu ka a kwụọ nwa amadi ahụ ụdọ ganye na ya anwụọ maka ọnwụ nwunye ya.
Jọstịs Nwosu-Iheme kwuru na ihe akaebe e wetara n'ụlọikpe gosiri n'aka Maazi Nwachukwu dị n'ihe butere ọnwụ Osinachi nwụrụ.
Cheta na a kpụpụrụ Nwachukwu n'abalị atọ nke ọnwa Juun ,afọ 2022 maka ebubo dị 23 nke gụnyere igbu mmadụ.