You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị 'unknown gunmen' awakporo ndị ụka Anglịkan na Nnewi?
Anglịkan Dayọsis nke Nnewi, Anambra steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ tọrọla ụfọdụ ndị ụlọụka ha na 'mwakpo' mere n'ụbọchị ụka, 23 nke ọnwa Ọktoba, 2022.
Ọnụ na-ekwuru ha ma bụrụkwa odeakwụkwọ Dayọsis ahụ bụ Ven. Dkt. Godfrey Mortanya, gwara BBC Igbo na ndị ojiegbe ahụ ebughi ndị otu ha n'obi, na ha awakpoghi ha.
O kwuru na ihe mere bụ na ndị ojiegbe ahụ ji ụgbọala ọ dị ka ha anapụtara n'aka mmadụ wee na-agba ọsọ, mana n'ihi na okporo ụzọ ahụ adịghị wara wara, ụgbọala ha kpọkanyere na nke ndị ụka ha.
O kwukwara na ya bụ ụgbọala bu ndị ọrụ ngalaba mgbasaozi Dayọsis ha mgbe ya bụ ihe mere.
Ven Mortanya kwuru na ndị ojiegbe ahụ nọ na-akwa mgbọ, nke mechara tụọ onye ọkwọụgbọala bu ndị ọrụ mgbasaozi ahụ.
O kwukwara na enweghi onye ọrụ ha atọrọla dịka ha gbapụrụ ọsọ n'ihi ụjọ ihe mere.
Nke a na-abịa dịka akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na ndị ojiegbe a na-akpọkarị 'unknown gunmen' wakporo ma tọrọ ụfọdụ ndị ụlọụka ahụ nọ n'ụgbọala e dere 'Bishop's court' n'ahụ ya.
BBC Igbo kpọtụrụ Tochukwu Ikenga, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, onye kwuru na ha anatabeghi akụkọ ọbụla gbasara ya bụ ihe mere.