Etu 'unknown gunmen' si gbuo ụmụnne m abụọ - Onye ọchịehi

Mgbe e biputara ya

Ndị otụ Miyetti Allah bụ otu jikoro ndị ọchịehi niile na Naịjirịa gbaa gburugburu ekwuola na ihe ruru mmadụ narị anọ na iri ise (450) agbaala ọsọ ndụ ha na Naịjirịa maka mmekpe ahụ a na-enye ha.

Ha na-ebo na e gburu onye otu ha mmadụ anọ na ehi ha dị iri isii ụbọchị Mọnde na ọwụwa anyanwụ.

BBC nwetere onye nwe ya bụ ehi e gburu na mmadụ abụọ bụ ndị ọchịehi a.

Ismaila sị na “Ụbịọchị Mọnde ka a bịara gbagbuo ụmụaka abụọ na-achịrị ya ehi na ọtụtụ ehi m. Ndị ọrụ nchekwa abịala nyere m aka buru ozu ụmụnwanne ahụ gburu”.

“Ndị a e gburu bụ ụmụnne m, afọ nna. Ọ bụ Idiris ka anyị niile n’aza. Otu n’ime ha dị afọ iri atọ na otu ebe onye nke ọzọ dị afọ iri abụọ na anọ”.

Ọ sị na ya bụ ihe mere na Ndịufuenu dị n’Okpuruọchịchị Orumba Nọtụ na Anambra steeti.

Ismaila na-akọwa na ya ma ndị mere ya bụ ihe maka na ọ bụ na obodo ahụ ka a mụrụ ya, ya too.