You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fake News: Ihe anyị ma maka 'helicopter' a sị tudara ndị amaghị na Coal Camp, Enugu
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na akụkọ na e ji ụgbọelu tudaa ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchị ehi n'ọhịa dị n'Ugwu dị na 'Jamboree', dị na Coal Camp, Enugwu bụ "Akụkọ ụgha".
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ụgbọelu helikọpta tụdara ndị mmadụ ruru 30 n’ọhịa dị n’ugwu Coal Camp n’ehihie 14 nke ọnwa Oktoba, afọ 2022.
Akụkọ ahụ so ihe onyonyo feghararịrị, nke gosiri ebe helikọpta na-efegharị ọhịa dị n’ugwu na ụlọ dị nso na Coal Camp, Enugwu.
Olu otu nwaanyị nke e chere sere ya bụ ihe onyonyo, na-ebo ebubo na ọ hụrụ ụgbọelu helikọta nke ọtụtụ ndị mmadụ ruru 30 yi uwe nkịtị si na ya wutuo n’ebe Ugwu Camp dị n'Enugwu.
N’ihe onyonyo ahụ nke dị nkeji asatọ na ụma iri abụọ na abụọ (8.22 Minutes), olu ahụ kwuru na ndị ọ hụrụ nwere ike iru opekata mpe, mmadụ iri atọ.
Olu ahụ dọrọ ndị bi na nso ebe ahụ aka na ntị ka ha kee nkwụcha ma bekuo gọọmentị Enugwu ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka dịka o siri metụta nchekwa.
Ọ siri: “ Ndị bi nso Jamboree, Camp, Enugu steeti, Ologo, kpachapụnu anya ụnụ. Helikọpta bịara na-erugharị kemgbe ụtụtụ, rute n’ugwu ebe a tụpụ mmadụ yi akwa nkịtị.
"Ha buru ibu ruo iri atọ... Ndị Jamboree Camp Enugu.
Ndị a riri nne. Ha were oge tupu ha apụtawa. Ihe a anaghị atọ ọchị."
Olu ahụ kwuru na ndị ọ hụrụ nwere ike iru mmadụ iri atọ (30) ma nke e nwere onye yi akwa ọcha, "nke yi akwa na-acha akwụkwọ ndụ na nke yi akwa na-acha mmee mmee.”
Ọtụtụ ndị bi n'ogbe Ologo-Jamboree-Coal camp Enugwu, gwara BBC Igbo na n’ezie helikọpta fegharịrị ọtụtụ awa n'agbataobi ha ụbọchị Fraide, mana ha ahụghị ka ọ tụdatara mmadụ dịka ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia siri boo n’ebubo.
Otu onye bị n’Ologo Coal Camp na-achọghị ka a kpọọ aha ya iji chekwa ya, gwara BBC Igbo na malite n'elekere iri na abụọ nke ehihie ka ọ hụrụ ya bụ helikọpta ka ọ na efegharị.
Ọ sịrị, “Ahụrụ m ya bụ helikọpta, mana echere m n'obi m na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa na-efe ya.”
“N’izizi, ọ gbadatara ala nke ukwuu nke mere m ka m gbagoro ụlọelu were lee ya anya nke ọma”.
Onye ọzọ bi na mpaghara ahụ gwara BBC Igbo na ya hụrụ ụgbọelu ahụ, sịrị na ya chere na o nwere ihe ndị ọrụ nchekwa na-achọ ime n'ime ọhịa ahụ.
Ọ siri na egwu tụrụ ya na mbụ mana nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe ahụ na-eme .
Mana ndị uweojii agọọla sị na o nweghị udị ihe ahụ mere na mpaghara ahụ dịka ha kwuru na ha na-enyocha ya bụ ihe.
Kọmishọna Ahmed Ammani, onye katọrọ ihe onyonyo ahụ sị na udị akparamagwa ahụ jọgburu onwe ya, kwuru na nwaanyị mere ihe onyonyo ahụ adanyela n'ọnya ndị uwe ojii.
Ammani sịrị: “Ndị uweojii Enugwu steeti chọrọ ime ka ndị bi na mpaghara a sị na ihe mere nakwa na steeti a niile mara, na ihe onyonyo a bụ akpụrụ akpụ nke ozi dị n'ime ya bụ akụkọ ụgha iji duhie ndị mmadụ ma bute egwu na ọgbaghara n’etiti ndị ama ala steeti a.”