Ndị ọrụ gọọmentị Imo emechiela ụlọọrụ mgbasaozi Boss FM, ụlọ nkwari

Mgbe e biputara ya

Ndị ọrụ gọọmentị Imo styteeti agbachiela ụlọọrụ mgbasaozi Boss FM, ụlọ nkwari 'All Seasons Hotel', Havana Cinema nakwa Mini place restaurant na-agbanyeghị ntuziaka Ụlọikpe megide nke a.

Ụlọọrụ ndị a mmechi metụtara bụ nke onye otu PDP nwre agba bụ Myke Ikoku.

Dịka ya na ndị ntaakụkọ na-ekwe mkparịtaụka maka ihe meren'Owere ụbọchị Monde, Ikoku boro Gọọmentị Imo steeti ịcebubo ịchụ ọbọ metụtara ndọndọọ ọchịchị.

O kwuru na Ụlọikpe nyere mkpebi machie ndị ọrụ gọọmentị ịbata na ngwuru ọụlọrụ ya. mana ha ejighị ya kpọrọ ihe.

Ikoku bọro ebubo na ndị ọrụ gọọmenti dọkara akwụkwọ si ụlọikpe ma tikwa ndị ọrụ ha kwuruo aka ,tọọrọ ụfọdụ pụọ.

Ọ sịrị, " Gọọmentị Immo steeti nara ụlọọrụ m ụtụ isi, gba isi akwara na anyị ga-akwụ ụgwọ ọbụladị maka oge ọrịa Covid-19 bụ oge e mechiri ọtụtụ ọdọahịa.."

Anyị gara ụlọikpe nwekta ikike ụlọikpe."

"Oge ha bịara , e gosiri m ka akwụkwọ ụlọikpe, mana ha dọkara ya, mebisịara m ihe."

" Ha gbara egbe ma nwụkwa ụfọdụ ndị ọrụ m".

" Ihe abụghị ihe ọzọ karịa Gọọmentị Imo steeti ịbọ ọbọ ndọrọndọọ ọchịchị."

Onye nọ ebe ihe mere gwara onye ntakụkọ anyị na ebe ahụ na-ede jijiji dịka ọrụ nchekwa bu egbe ruru 50 na ndị ọrụ ngalaba na-anakọ ụtụ isi nke Imo steeti bụ Imo Internal Revenue Service, IIRS wujuru ogige ụlọrụ ahụ malite gbawa egbe aghara aghara nke mere ka ndị bịara ịzụ ahị rie mbọmbọ ọsọ.

Ha mechara kpụrụ ndị ọrụ ụlọọrụ Mimi's Place na Havana Cinemaruru 20 gawa ebe amabeghị. "Egbe ahụ a wụrụ mere ka okporo 'All Seasons Avenue mere ka ụgbọala kwụsị ịgba dn'ihi egwu ." Oge anyị kpọtụụ ya, ọnụ na-ekwuru gọvanọ Imo steeti bụ Oguwike Nwachuku, sị na ya ga-ajụta ese ihe mere mana rue oge anyị wepụtara ozi a, o nwefghị ozi onye re onye ntaakụkọ anyị.