PVC Collection: A hụghị ndị ọrụ Inec ebe ndị ha sị na ha na-eke PVC

Mgbe e biputara ya

Ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission ngalaba nke Enugwu ekwuola na ọ bụ PVC ndị a gbara n'afọ 2014, 2015 rue 2021 ka ụlọọrụ ha na-eke ugbua, dịka ọnụ na-ekwuru Inec n'Enugwu si kwuo.

Ozi ha wepụtaburu kwuru na iwere PVC ga-amalite ụbọchị 12 nke ọnwa Novemba wee ruo 19 nke November 2022.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya inweta akwụkwọ atumvootu ha denyere aha maka ya na ọnwa ole na ole gara.

Mana ọnụ na-ekwuru Inec n'Enugwu bụ Maazị Eze gwara BBC na mkaprịtaụka sị, "Anyị ebidobeghị kewa PVC ndị a gbara na 2022."

"Anyị na-eke kaadị ndị e weghị kemgbe 2011,2014,2015,2019 na ndị e debanyere aha na June 28, afọ gara aga rue Jenụwarị afọ a."

Ndị ọrụ anyị nọcha na wọọdị 60 dị n'Enugwu ebe ahụ a gbasara aha ndị aha ha dị n'akwụkwọ."

Ọ gara n'ihu kọwaa na PVC ndị e debanyere aha ha malite n'ọnwa Jenụwarị afọ rue Julai 2022, anyị na-atụ anya inata PVC maka nkesa na ngwụcha ọnwa Novemba, afọ a.

Mana BBC gagharịrị gburu gburu Enugwu wee hụ na o nweghị center ebe INEC na eke ya bụ pvc. Okwuchite ọnụ INEC Enugwu bụ Maazi Eze, nyere anyị aha ọtụtụ ward ebe ọ sị ha nọ eke ya bụ PVC. Mana onye ntakụkọ anyị gagharịrị ebe ndị ahụ nakwa ebe ndị ọzọ kwuru na o nweghị ebe ndị ọrụ Inec na-eke PVC dịka ozi ha si kwuo.

N' Assumption Parish Nkwo Nike Enugwu, anyị hụrụ ọtụtụ mmadụ na-eche ka Inec malite kewa ya bụ ihe. Nwada Gloria Edeh gwara BBC na ya na-abịa ka mgbe abalị12 nke ọnwa Novemba mana o nweghị onye Inec ha hụrụ.

BBC Igbo gakwara n' Okpara Square nakwa ụlọụka 'St Barth's dịkwa n'Enugwu were gbaa aka ebe na ndị INEC anọghị ebe ahụ.

Nigeria ga-eme ntuliaka onyeisiala nakwa ụlọ omeiwu n'ọnwa Februwari, Afọ 2023.

Dịka ntuliaka 2023 na-abịa nso, ọtụtụ ụmụ Naijiria , ọkachasị ndị na-eto eto, denyere aha ha na nsonso a iji nweta ohere isonye ịtụ vootu n'afọ 2023.