Toilet Infection: I nwereike ịbute ọkọ maọbụ ọrịa site n'ụlọmposi?

Mgbe e biputara ya

Mgbe ọbụla ị gafere n'ahịa, ị ga-anụ ebe ndị na-ere ọgwụ mgbọrọgwu na-ekwu okwu ịgwọ ọrịa a sị na-esi n'ụlọ mposi a kpọrọ a kpọrọ 'toilet infection'.

Dịka ha si akọwa, ọrịa a metụtara ọrịa niile gụnyere ọkọ, isi ọjọ, ụfụ ma ọrịa ịnyụ mamịrị na ihe ndị ọzọ.

Ihe ọzọ a na-echekwa bụ na ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na-ebutekaarị ọrị a.

Mana ọ bụ eziokwu na ọ bụ n'ụlọmposi ka e si ebute ọrịa ndị a? Anyị jụrụ otu dọkịnta pụrụiche bụ 'Gynaecologist' na Bekee maka nke a.

Gụrụ gawa ka ị hụ ihe ndị dị mkpa ọ kọwaara.

Nke bụ eziokwu

Dọkịnta Akinde Joseph kwuru hoo haa na o nweghi ihe dị ka 'toilet disease' a na-ebute n'ụlọmposi.

Ọ kọwara na ọrịa ahụ bụ 'vaginal candidiasis' nakwa nje na-akpata ya bi n'akụkụ ike mmadụ bụ 'genital tract' na Bekee.

O kwuru sị "ndị mmadụ na-akpọ ya aha a n'ihi na ha cheere na ọ bụ n'ụlọmposi ka ha na-ebute ụdịrị ọrịa a".

Akinde Joseph kwuru na ọtụ na ike nwaanyị nọketere onwe ha nso nke mere na ọ bụrụ na nwaanyị akpachaghị anya debe onwe ya ọcha, ọ ga-adị mfe ka nje ahụ si n'ime ike fere n'ime ọtụ nwaanyị.

Ọ kọwara na ọ bụrụ na nje ahụ buru n'ime ike ebe o kwesiri ị nọ, ọ gaghị enye nsogbu ọbụla mana ọ banye n'ọtụ, ọ ghọọ ọrịa.

Ihe ọzọ tụrụ n'anya Dọkịnta Akinde kwuru bụ na nwoke nwereike ị sị na mmekọ nwoke na nwaanyị bute ọrịa a.

Ọ sị "ọ bụrụ na nwoke zutere nwaanyị bu ọrịa ahụ, o ga-ebute ya bụ ọrịa. O nwekwara ike ibunye nwaanyị ọzọ site n'ụzọ mmekọ"

Nke a pụtara na ọrịa a bụ vagina candidiasis nwereike iso n'ọrịa 'Sexually Transmitted Infections' mana ụzọ nke ya pụrụiche.

Ndị ọrụ ahụike kọwara na ọ ga-ara ezigbo ahụ tupu mmadụ ebute ọrịa ndị a dị aṅaa.

Nnyocha sanyesị gosiri na nje ndị na-akpalite ọrịa ndị a n’ahụ ndị mmadụ anaghị enwe ike dị ndụ maọbụ dị ire ma ha ebighi n’ime ahụ mmadụ.

Nke a pụtara na nje ndị a agaghị enweike dị ndị mmadụ kpalitere mmadụ ọrịa site n’ụlọipo nsi n’ihi na ọ bụ site na mmekọ ahụ na ahụ ka ha na-esi awụfụ n’ahụ otu onye ma wụba n’ahụ onye ọzọ.

Agbanyeghị nke a, mmadụ nwereike ibute ọrịa  ‘trichomoniasis’ site n’oche ụlọipo nsi mana ọ bụ naanị ma onye ọzọ nọrọ n’oche ahụ ngwa ngwa onye bụ ọrịa a si n’oche ahụ pụọ.

Mmadụ nwekwaraike ibute ọrịa Hepatitis B site n’oche ụlọipo mana ọ bụ naanị ma ọ bụrụ na onye nọrọ n’oche ahụ nwere ọnya maọbụ apa mepere emepee. Nke a ga-adị ere naanị ọ bụrụ na onye nọbu n’elu oche ahụ gbaa ọbara ọhụrụ maọbụ nyụsa uhe n’elu ya bụ oche nke metụtara ya bụ ọnya mepere emepee.

Etu ị ga-esi gwọ ọrịa maọbụ ọkọ i butere

Tupu e kwuo okwu ọgwụgwọ, Akinde nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ịgba mbọ debe onwe ha ọcha.

"Ị debe ebe ahụ ọcha bụ naanị ihe kachasị mma ga-egbo nsogbu ibute ọrịa a" ka o kwuru.

A bịazie n'okwu ọgwụgwọ, ọ kwuru na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ gaa n'ụlọogwụ, nyochaa onwe ha ọfụma ma ṅụchaa ọgwụ niile e nyere ha.

"Ndị mmadụ na-emekaarị ha nwete ọgwụ ṅụọ ya abalị abụọ, ọrịa mee ka ọ lawala, ha akwụsị ịṅụ ọgwụ"

Ọ kọwara na agwa a jogburu onwe ya n'ihi na nje butere ọrịa ahụ ka dị ndụ na-enye nsogbu.

O kwukwara na agwọghị ọrịa a ọfụma ga-eme ka ọ dịrịzịa ka ọrịa ala ala mana o kwesighi ị dị etu ahụ.