Prince Emma Buchi: Ihe ndị AGN kwuru maka ọnwụ onye otu ha.

Mgbe e biputara ya

Onyeisi otu na-achịkọta otu Actors Guild of Nigeria bụ AGN n'ịchafụ aha ya bụ Emeka Rollas kwuru na ha amaghị onye gburu Emma Buchi.

Rollas kwuru sị, " Ka onye ọbụla ọkachasị ndị otu anyị kpachapụ anya etu ha si etinye ọnụ n'okwu a, Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ PA ya gburu ya, enwebeghị onye kpọrọ aha ya, PA ọ bụ aha mmadụ. Ka enye ndị uweojii ohere ka ha rụọ ọrụ ha".

O kwuru na ha amaghị onye bụ onye enyemaka ahụ pụrụiche ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.

Kama o kwuru ka enye ndị uweojii ohere ka ha rụọ ọrụ n'ihi na ọ bụ ebubo ka a ka na-ebo onye ahụ.

O kwuru sị, " Mgbe m nụru ozi ọnwụ ya, e mere nyocha were chọpụta na Buchi emezughị ihe ọ kwesịrị ime dịka onye otu anyị kamgbe afọ atọ".

O kọwara na-agbanyeghị nke a, na ọ zịgara onyeisi otu ha na Delta Steeti ka ọ gaa gwa ndị uweojii ihe mere ka ha bido nyocha ha.

Rollas kwuru sị, " Ugbua, anyị ga-akwado ndị ezinụlo n'ụzọ ọbụla anyị nwereike maka ya bụ ihe mere".

O ji ohere a rịọ ndị otu ha niile ka ha gbaa mbọ hụ na ha mezuru ihe ha kwesịrị ime dika ndị so n'otu AGN.

Ọ kọwara na Buchi debanyere aha ya dịka onye otu ha n'ụmụahịa kama na ọ kwesịrị ịgwa ndị nke nọ n'Asaba mgbe ọ bịara biri ebe ahụ.

Ndị uweojii nọ na Delta steeti ekwuola etu ha si nweta mkpesa gbasara ọnwụ

Emma Buchi na-eme ejije Nollywood n'Asaba.

Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta steeti kwuru na ọ bụ ụnyahụ bụ Jụlai iri na otu ka otu onye na-emekwa ejije Nollywood bia mee mkpesa etu e si nụ isi ozu Emma Buchi rewerela n'ụlọ ya.

O kwuru na ka ọ dị ugbua na o nwebeghị akụkọ zuru oke ha nweterela gbasara ọnwụ ya kama ndị mere mkpesa kwuru na ọ bụ ogbugbu ka e gburu ya.

Kedụ ihe ndị uweojii na-eme ugbua?

Edafe kwuru na mgbe ndị uweojii ruru ebe ahụ na ha hụrụ ozu Emma Buchi rewerelanụ dịka ọ nwụrụ n'abali ole na ole gara aga. Ndị uweojii kwuru na ha amabeghị kpọmkwem ụbọchị ọ nwụru.

O kwuru na onye uweojii o zigara kwuru na o tiwara ụzọ ụlọ Buchi iji wee chọpụta ebe isi ahụ si apụta kpọkwem.

Edafe kwuru na ọ bụghị ndị uweojii ya bupuru ozu Buchi nwụrụlanụ maka etu ozu ya si rekasia kama ọ bụ ndị e nyere ọzụzụ pụrụ iche mere ya.

O kwuru na ọ bụ ndị ụlọ ọrụ si n'ụlọ ozu dị n'Abia steeti bupuru ozu Buchi ahụ rekesigoronụ maka ihe ọ kpọrọ "technical issues' na bekee.

"Ka ọ dị ugbua, anyị ka na-eme nyocha ịmata etu Buchi si nwụọ kpọmkwem", bụ ihe Edafe kwuru.

Akụkọ ka na-abịa

Ihe ikwesiri íma maka Prince Emma Buchi

  • Emma Buchi bụ onye na-eme ejije Nollywood.
  • Ọ na-akpọkarị onwe Abia boy mgbe ọ dị ndụ
  • Ọ bụ onye Abia steeti.