Lee etu ụlọ ebe otu nwaanyị na ezinaụlọ ya nwụrụ n'Enugwu si tọgbọ chakoo

Mgbe e biputara ya

Ụlọ ebe otu nwaanyị, ụmụ ya abụọ na ụmụnne ya abụọ neụrụ n’obodo Amutenyi, Obollo-Afor dị n’okpuruọchịchị Udenu nke Enugwu steeti tọgbọ chakoo.

BBC Igbo mere njem ebe ahụ ịchọpụta ka ihe a siri mee mana o nweghi onye ọbụla a hụrụ n'ụlọ ndị a.

Ọtụtụ ndị agbataobi na ndị n'obodo BBC Igbọ hụrụ achọghị ikwu okwu maka na ụjụ na-atụ ha.

Ụfọdụ n'ime gbara ama na di nwaanyị ahụ anọghị n'ụlọ mgbe ha nwụrụ na ha ahụbeghi ya anya kamgbe.

BBC Igbo chọpụtakwara na nwaanyị ahụ nwere ụlọakwụkwọ 'Gifted Nursery and primary school' dị n'Ubollo Afor mana ndị nkuzi na-arụrụ ya ọrụ jụkwara ikwu okwu.

Kedụ etu e si chọpụta ọnwụ ndị a?

Ndị uweojii Enugwu steeti kwuru na a chọtara nwaanyị ahụ a kpọrọ Chinyere Odoh, ụmụ ya abụọ bụ Udochukwu (dị afọ asaa) na Chukwuemeka (dị afọ anọ), ụmụnne ya abụọ bụ Martina na Ngozi Ezeme, n'ime ụlọ ha, n'ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Satọde, asatọ nke ọnwa Ọktoba 2022.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, kwuputere n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Satọde, na ndị otu ha gawara n'ụlọ ahụ ozugbo ha natara ozi gbatagbata.

O kwuru na ọ bụ mgbe ha gbakara ụzọ wee banye n'ime ụlọ ahụ ka ha chọpụtara na ezinaụlọ a etetaghị ụra n'ụtụtụ ahụ dịka ha labachara ụra n'abalị.

Ndukwe dere sị "A mabuuru ha gawa n'ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta nọ kwuo na ha abụrụla ozu. Ebubala ozu ha n'ụlọozu maka nchekwa na nnyocha."

O kwuru na kọmishọna uweojii steeti ahụ bụ Ahmed Ammani, enyela iwu ka e mee nnyocha ịma ihe gburu ndị a.

Ammani tiri ndị ezinụlọ ya bụ ihe metụtara aka n'obi ma kwuo na ọ bụ ihe "ọdachi" mere.

Cheta na nso nso a, mmadụ isii nwụkwara n'ime otu ụlọ dịka ha gachara agbamakwụkwọ n'okpuruọchịchị Uzo-Uwani, Enugwu Steeti.