You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị bụ 'fuel subsidy' a ọha kpụ n'ọnụ ugbua?
E duru Onyeisiala ọhụrụ Naijiria bụ Bola Tinubu iyi ọrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023 dịka o kwupụtara n'okwu mbụ ya na a ga-ewepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala (Fuel subsidy) na Naịjirịa.
Ọ kọwara na bọjeetị Naịjirịa ugbua enyeghi ohere ịga n'ihu na-ewepụ ego mbelata a.
N'okwu ya, ọ sị:
"Ọ (ịkwụ ego mbelata a) na-akwado naanị ndị ọgaranya ọ naghị enye ndị ogbenye nkwado ọbụla, ihe a bụzị ihe dị oke ọnụ ịga n'ihu na-eme."
Naịjirịa weputara ijeri dọla 7.5 maka ịkwụ ụgwọ enyemaka mbelata mmanụ ụgbọala site n'ọnwa Jenụwarị ruo etiti afọ 2023 mgbe ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari onye nyere Tinubu ọchịchị.
Buhari wepụtara atụmatụ iwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala a mana o meghị nke a tupu o nyefee ọchịchị ya n'aka ọchịchị ọhụrụ.
Naijiria bụ mba nke abụọ na-emepụta mmanụ n'Afrịka dịka ha na-esote mba Angola mana Naịjirịa na-ebubata ihe karịrị pasentị 90 mmanụ ya n'ihi enweghị ike ịmepụta mmanụ nke ya n'ụlọọrụ mmepụta mmanụ agbidi anọ nọ n'ọnọdụ ọjọọ n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
Agbanyeghi na ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa bụ NNPC kwuru na e nwere mmanụ ụgbọala zuruoke iji gboo mkpa ndị mmadụ n'oge a ụzụ ndị mmadụ na-agbazị n'akụkụ Naijirịa dị iche iche dịka ụmụafọ ji ụjọ awụjuu na ọdọ mmanụ ụgbọala dị iche iche, kwujuo n'arịrị maka egwu ụkọ mmanụ ụgbọala.
N'ozi ọhụrụ ndị mgbasaozi onyeisiala ọhụrụ bụ Tinubu zipụtara, ọ rịọrọ ọha ka ha dere duu ma kwuo na ya bụ mwepụ ga-adị ire n'ebe etiti afọ a dịka ọchịchị gara aga siri nye ohere maka ya. Ndị ọkaibe n'ihe gbasara akụnaụba na-ekwu na okwu mwepụ ego mbeleta mmanụ ụgbọala a nwereike imetụta ego ihe ahịa na-ada nakwa mee ego ime njem arịa elu nke ga-emetụta ego mmepụta ihe nakwa akụkụ azụmahịa ndị ọzọ.
Mana gịnị bụ ego mbelata mmanụ ụgbọala a?
- Ego mbelata mmanụ ụgbọala (Fuel subsidy) bụ ego gọọmentị na-akwụ iji nyere ọha aka dịka ego mmanụ agbidi na-ada n'ụwa na-arị elu.
- Naịjirịa malitere ịkwụ ụgwọ iji nyere ụmụafọ Naijirịa aka kemgbe ebe afọ 1970.
- E tinyere n'wiu n'afọ 1977 n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo oge o hibere iwu nhazi ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ 'Price Control Act'.
- Iwu a mere ka ọ bụrụ ihe megidere iwu mmadụ ire mmanụ ụgbọala gafee ego gọọmentị tinyere ya.
- Malite n'afọ 2006 ruo afọ 2018 Naịjirịa mefuru ego ruru tarị 10 Naịra n''ịkwụ ụgọ ego mbelata mmanụ ụgbọala.
- Ugbua, gọọmentị na-ekwu na ego a na-ebuzi ha aka ịkwụ nke mere ọtụtụ ji atụ egwu na ego mmanụ ụgbọala ga-arị oke elu ma ewepụ ya.
Ihe ndị ọkaibe n'okwu akụnụba na-ekwu
Ọkammụta n'ịhe gbasara akụnaụba bụ Boniface Chizea kọwara na-uru dị n'iwepụ ego mgbakwụnye a na-akwụ na mmanụ ụgbọala nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na Bekee karịrị ọghọm dị na ya.
Cheta na onyeisi International Monetary Fund bụ Christine Lagarde kpọrọ gọọmenti etiti oku ka ha wepụ ego ha na-agbakwụnye iji hụ na mmanụ ụgbọala dị ọnụ ala.
Ngwa ngwa o kwuru nke a, ụkọ mmanụ ụgbọala malitere n'ụfọdụ obodo ndị mepere emepe dịka ndị mmadụ malitere ịzụ mmanụ ụgbọala aghara aghara n'ihi egwu ụkọ ya.
Mana na mkparịaụka ya na BBC Igbo nwere, Chizea kọwara na mbido na iwepụ 'fuel subsidy ga-ebute ihe ịda oke ọnụahịa mana ahapụ ya n'ihe ga-adịkwa mma dịka gọọmentị enwe ike ịchekwa ego a kara imefu n'ikwụ ụgwọ 'subsidy. tinye ya n'ọrụ.
"Ndị mmadụ anaghị aghọtacha: Ọ ga-ebute ihe ịda oke ọnụ obere."
"Ndị ji ya enwe ego karịrịị akarị: ndị ọnọ-na-etiti, ndị na-ezupu mmanụ anyị na mba ọzọ bụ ndị 'subsidy dabanyere."
Chizea onye bụbu onye ọrụ ụlọakụ kwuru na ọ bụ oge gọọmenti nọ ugbua weliiri ego a na-ere mmanụ kwesịrị ka ha wepụ aka n'itinye ego ole a na-ere mmanụ.
Na nkọwa ya, ọghọm dị na ya gụnyere:
- Fuel subsidy mere na ego e kwesịrị inye ndị na-arụpụta ngwaahịa iji tubata akọrọngwa ha ji arụ ọrụ a na-enye ya ndị na-atụbata mmanụ ụgbọala.
- Gọọmenti na-ebi ego were na-akwụ ụgwọ subsidy, o kwuru na ọ bụụ na enweghị ihe e mere maka nke a, Naijiria ga-alọghachi n'ọnọdụ ọ nọ tupu Ngozi Okonjo-Iwela nweta mgbaghara ụgwọ e bitere.