You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Latest on Rochas Okorocha: E higharịala ikpe Okorocha na EFCC
Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja ehigharịala ikpe n'akwụkwọ EFCC gbara Rochas Okorocha maka ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri Naira abụọ na ụma gaa abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2022.
Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic and Financial Crime Commision' (EFCC) kpụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe n'ụbọchị Monde (Mee 30,2022) maka ebubo 17 metụtara nrụrụaka.
Ọkaikpe Jọstịs Inyang Ekwo nọ n'isi ikpe ahụ nyere Okorocha onye bụbu gọvanọ Imo steeti ikike isi n'ụlọ na-abịa azara ọnụn'ọnụ ego dị nde narị naịra ise ma ma kwuo ka o deda akwụkwọ njirimara ya nke e ji eje mba n'aka ụlọikpe.
Ọkaiwu Rochas Okorocha gwara ndị ntaakụkọ na ha na-agba mbọ ịhụ na Okorocha mezuru ọnọdụ ụlọikpe nyere ha ozigbo iji nye ohere ka Okorocha nwere ohere ịga nnyocha ndị chọọ ịzọọkwa onyeisiala nke pati APC na-eme taa.
Rochas Okorocha : Ụlọikpe enyela aka chịburu Imo steeti 'bail' n'ikpe imefu ego dị N2.9bn
Ụlọikpe Ukwu dị na-apụja enyela Senetọ Okorochaikike isi ụlọ na-abịa n'ikpe imefu ego dị N2.9bn.
Ọkaikpe na-ekpe ya bụ ihe bụ Jọstịs Inyang Ekwo onye higharịrị ikpe ahụ bịa taa bụ Mee 31,2022, nyere mkpebi ka a hapụ ka o si n'ụlọ na-abịa mana o dowe ego dị nde narị Naira 500 nakwa ụlọ ego ya ruru otu ọnụahịa ahụ.
Ọ ga-akpọtakwa onye akaebe na ọ gaghị agba ọsọ bụ onye nwekwara ụlọ ọnụahịa ya ruru nde naira 500.
Ụlọikpe ahụ gwakwara ya ka o dowe akwụkwọ njirimara e ji aga mba ofesi n'aka kọtụma.
Ọkaikpe nyekwara ntuziaka ka e jichie ya n'nga ndị EFCC were ruo oge ọ ga-emezu ọnọdụ isi n'ụlọ na-abịa ikpe nke ụlọikpe nyere ya.
Mana ọkaiwu EFCC bụ Gbolahan Latona, jụrụ sị na Okorocha ga-agba ọsọ dịka o meburu na mbụ bụ ebe ha sị na ọ jụụ ịza oku a kpọrọ ya.
Ọkaiwu Okorocha bụ Okey Amaechi SAN, gbaghara nke a sị na ọ bụ ikike dịrị onye nke Okorocha nwere ịrịọ ka e nye ya ohere isi n'ụlọ abịa ikpe.
O kwuru na ọ bụghị eziokwu na Okorocha gbara ọsọ kama na enyeghị ya akwụkwọ ịza oku a kpọrọ ụlọikpe.
Rochas awụchiela n'Ụlọikpe maka ikpe imefu ego dị N2.9bn
Rochas Okorocha awuchiela n'ụlọikpe maka ikpe metụtara imefu ijeri Naira 2.9bn.
Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic and Financial Crime Commision' (EFCC) kpụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe n'ụbọchị Monde (Mee 30,2022) maka ebubo 17 metụtara nrụrụaka.
Okorocha, onye na-anọchite Imo -West n'ụlọomeiwu Ukwu Naijiria wuchiri n'ụlọikpe ka ọ fọrọ nkeji 23 ka ọ kụọ Elekere Itoolu (8:37am) n'etiti ndị ọrụ EFCC.
Ndị ezinaụlọ ya na ndị na-akwado ya anọrọla n'ụlọikpe oge ahụ.
Taa ka ọkaike nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis Inyang Ekwo ka anụ arịrịọ ma a ga enye Okorocha ohere isi ụlọ abịa ya bụ ikpe maka ịzara ọnụ ya n'ebubo nrụrụaka nke Bekee kpọrọ 'bail'.
N'ebe Elekere 9:07 a kụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe, a maghị ihe kpatara nke a.
Mana ọ lọghachiri, were oche n'ebe Elekere 9:18.
Ụlọikpe juru kpụmkpụm dịka ụfọdụ kwụ ọtọ n'ihi na oche eruteghị ha.
Ọkaikpe na-ekpe ya bụ ikpe nbụ Jọstis Inyang Ekwo wụchiri ụlọikpe n'Elekere 9:35, ikpe malitere ozigbo.
Ngwa ngwa ọ batara, e nyere iwu ka ndị nile kwụ ọtọ pụọ.
Akụkọ ka na-abịa