Ihe m gatara ka m gara ịhụ Nnamdi Kanu ụbọchị Eprelụ 28,2022 - Ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor

Mgbe e biputara ya

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejofor etiela mkpu na na-agbanyeghị ntuziaka ọkaikpe na-ekpe ikpe Kanu bụ Binta Nyako nyere ka e nye ya ohere ịgbanwe akwa ya, na ndị uweojii DSS ekweghị nke a.

Ejiofor bokwara ebubo na a na-akwụ Nnamdi Kanu agụụ site inye ya nri naanị otu ugboro n'ụbọchị.

Ebubo ndịa niile dị na ozi o wepụtara ụbọchị Tọzde, abalị 28 nke ọnwa Eprelụ dịka ọ gara zute Kanu n'ogige ndị uweojii pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) nke o depụtara ka njem a si gaa n'akara Facebook ya.

Ejiofor sịriị: "Ọ bụ ihe mwute na na-agbanyeghị ntuzIaka nke Ọkaikpe nyere ọkaiwu DSS ka enye onye ndu (Nnamdi Kanu) mgbanwe akwa, were rue taa m gara hụ ya, e nyebeghị onye ndu mgbanwe akwa."

Ọ gara n'ihu kwu, "Ọzọ, ọ gwara anyị bụ na anaghị enyezikwa ya nri ugboro ugboro. Iri nri otu ugboro n'ụbọchị na-emetụta ọnọdụ ahụike ya nke daturula adatu."

O kwuru na na-agbanyeghị nke a, na Kanu na-ekele ndị na-eso ya ma kwuo na ọ na-ekpere ha ekpere.

Cheta na a na-ekpe Nnamdi Kanu, onye ndu bụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) ikpe maka ebubo metụtara ịkpa nkata ịkwatu Gọọmenti Naịjirịa nakwa iyi ndu egwu.

Nke a na-abịa dịka Gọọmenti Etiti Naịjirịa si Kenya kpụlata ya n'ọnwa Juun afọ 2021.

Onye bụdị Nnamdi Kanu na-ewu?

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), o hiwere n'afọ 2012.

A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa.

Ndị Department of State Services (DSS) nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015.

Ọ gara ụlọikpe na Nọvemba 18, 2015. Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo be ya, dịka akụkọ siri kwuo.

Kamgbe ahụ o nweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechị anyị jụrụ ajụjụ n'afọ 2018 sị na ọ maghị ebe Kanu nọ.

N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

N'ọnwa Juun 27 afọ 2021, a nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa mana mana onyeisi ụlọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na aka ha adịghị na nwuchi ya.

Gọọmentị Naịjirịa kpọpụrụ Kanu n'ụlọikpe maka ọtụtụ ebubo gụnyere ibuagha megide gọọmentị nọ n'ọchịchị.

Kanu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya agọọla ọtụtụ oge na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị ahụ.

A na-atụ anya na ọkaikpe Binta Nyako ji ikpe ahụ ga-ekpebi okwu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ, 2022 n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.