You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abia State Police: Etu otu nwoke si daa ma nwụọ n'okporoụzọ dị n'Umuahia, Abia Steeti
Ndị uweojii Abia steeti sị na ha na-arịọ ezinaụlọ nwoke ahụ a hụrụ ozu ya n'okporoụzọ Lagos street dị n'Umuahia ka ha bịa buru ya.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na nwoke a gbara afọ iri isii na itoolu nwụrụ n'ezie.
Ọ sị na ọ bụ ndị ọrụ ha buuru ozu nwoke ahụ gawa n'ụlọọgwụ ebe dọkịta nyoro ya ahụ ma sị na ọ nwụọla.
"Agaghị m akọwanwu ihe gburu nwoke ahụ mana ndị ọrụ ahụike na-eme nnyocha banyere ya," Ogbonna kwuru.
"Anyị hụrụ mpekere akwụkwọ 'driving licence' gosiri aha nwoke ahụ mana anyị amaghị ebe o si maọbụ ezinaụlọ ya.
"Eji m ohere a akpọku ezinaụlọ nwoke a ka ha bịa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Umuahia."
Cheta na akụkọ pụtara na Twitter gosiri ka otu nwoke tọgbọrọ n'okporoụzọ dị n'Umuahia.
Nke a bụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme, n'izuụka ole na ole gara aga, otu nwoke a na-amghị onye ọ bụ dakwara n'okporoụzọ dị n'Aba ma nwụọ.
BBC Igbo na-agba mbọ inwete ezinaụlọ nwoke ahụ.
Akụkọ ka na-abịa...