Coscharis Group: Ka akwamozu Charity, nwunye Cosmas Maduka, kpọtụọ

Mgbe e biputara ya

Ndị nwere agba gụnyere ndị ojiegoacghụego,ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị isi ụka na ndị ntaakụkọ tụụrụ n'Umudim Nnewi,Anambara steeti na ngwuru Cosmas Maduka' a ma dịka 'Coscharis' maka akwamozu odoziakụ ya bụ Charity Maduka.

Charity Maduka nwụrụ n'abalị 27 nke ọnwa Novemba, 2021 na Nnewi, Anambara State ka ọ gbachara afọ 63.

A kaara ya ụka ikpeazu bu ebe ụkọchukwu di iche iche sonyere na ofufe nro kọwara Charity Maduka dika onye dị asọ ga-agba ezigbo mmụọ.

Ha kwuru na Charity bụ "onye dị umeala' ma na-enyere umuogbenye aka nke ukwuu.

Cosmas Maduka bụ di ya ekwuola ọtụtụ mgbe na mkparịtaụka na ọ bụ nwunye ya bụ isi akụnaụba ọ kpatara na ndụ ya dịka ọ lụrụ ya oge o nweghị ka ọ ha ya.

Ndị bịara akwamozu ahụ gụnyere Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano na nwunye ya bụ Ebere Obiano.

Ndị ọzọ bụ aka chịburu steeti ahụ bụ Peter Obi.

Nwaanyi mbu chiburu steeti ahụ bu Virgy Etiaba nakwa Valentine Ozigbo onye so zọọ ọkwa Govanọ steeti ahu na ndọrọndọrọ nke e mere n' ọnwa Novemba 2021 nakwa ndi ozo bịakwara ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: