Christmas Bombing: Ụzọ ise gọọmentị Naịjirịa si dọọ aka na ntị maka mwakpo oge ekeresimesi

Mgbe e biputara ya

Akụkọ pụtara taa na-ekwu na gọọmentị etiti adọọla ndị ọrụ nchekwa oke ala Naịjirịa gụnyere Nigeria Immigration Service aka na ntị site n'ozi ngwa ngwa ha ziri ha.

Gọọmentị kwuru na o nwere ndị oyi ndụ egwu a na-atụ anya na ha na-akwado ịwakpo Abuja n'oge emume ekeresimesi.

Dịka ụfọdụ ụlọorụ ntaakụkọ si kwuo, ọ bụ otu onye mba Algeria nakwa otu onye mba Niger na-akwado ịme nke a.

Gọọmentị si ha chekwaa oke ala Naịjirịa niile dị n'elu, n'ala nakwa na mmiri n'ebe mwakpo a nọ.

Ihe ise ọzọ gọọmentị Naịjirịa kwuru maka mwakpo nwereike ịme

- Ha sị na ndị oyinduegwu abụọ ahụ bụ ndị mba Algeria na Niger

- Ha kwuru na e nwere mmadụ anọ bụ ndị Naịjirịa na-enyere ha aka

- A an-atụ anya na mwakpo ahụ nwereike ime site n'ụịbọchị 17 Disemba rue 31 Disemba.

- Ha kwuru na a na-atụ anya na ha ga-esi mba Mali jiri ụgbọala bata.

- E cheere na otu n'ime ndị oyindụegwu ahụ ji akwụkwọ njem pụrụiche akpọrọ 'Diplomatic Passport'