Ihe mere anyị ji nwụchie onye otu anyị nwoke NYSC gbanyere ọla aka - Ndị agha Naịjirịa

Mgbe e biputara ya

Ndị agha Naịjiria ekwuola n'ezie na ha nwụchiri onye otu ha bụ onye ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ebe nwoke na-eme NYSC gbanyere ya ọla aka.

Ndị agha kwuru na nwaanyị ahụ dara iwu ha mgbe ya na onye ọ na-azụ ọzụzụ (onye NYSC) nwere mmekọ ka ọ nọ n'ihu ọrụ.

Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-ata ya ahụhụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjiria bụ Brig. Gen. Onyema Nwachukwu, kwuru sị na akparamagwa ya gosiri na ọ ghọgburu nke nwoke, nke na-abụghị etu onye nwere ọzụzụ ndị agha si eme.

O kwuru na nwaada ahụ dara iwu ndị agha abụọ; iwu soshal midia na ime ihe gbasara ịyị ọyị na mmekọ ka ọ ka yi uwe ndị agha.

Ruo ugbua, ma nwaada ahụ ma ndị NYSC ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya bụ ihe mere n'ọgbọ ndị NYSC dị na Yikpata, Kwara steeti.