Ihe mere anyị ji nwụchie onye otu anyị nwoke NYSC gbanyere ọla aka - Ndị agha Naịjirịa

Nwaanyị onye NYSC gbanyere ọla n'aka

Ebe foto si, Others

Mgbe e biputara ya

Ndị agha Naịjiria ekwuola n'ezie na ha nwụchiri onye otu ha bụ onye ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ebe nwoke na-eme NYSC gbanyere ya ọla aka.

Ndị agha kwuru na nwaanyị ahụ dara iwu ha mgbe ya na onye ọ na-azụ ọzụzụ (onye NYSC) nwere mmekọ ka ọ nọ n'ihu ọrụ.

Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-ata ya ahụhụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjiria bụ Brig. Gen. Onyema Nwachukwu, kwuru sị na akparamagwa ya gosiri na ọ ghọgburu nke nwoke, nke na-abụghị etu onye nwere ọzụzụ ndị agha si eme.

O kwuru na nwaada ahụ dara iwu ndị agha abụọ; iwu soshal midia na ime ihe gbasara ịyị ọyị na mmekọ ka ọ ka yi uwe ndị agha.

Ruo ugbua, ma nwaada ahụ ma ndị NYSC ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya bụ ihe mere n'ọgbọ ndị NYSC dị na Yikpata, Kwara steeti.

Aha onyonyo, Ihe mere m ji chịnye nwa m uwe NYSC m yiri afọ 37 gara aga