Obialor Donald Ibe: Etu e si gbuo dọkịta na-akwado ịfepụ mba Amerịka n'ụlọ ya

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii n'Abuja ekwuola na ha ebidola nnyocha banyere ọnwụ otu nwoke akpoọrọ Obialor Donaldo Ibe dị afọ 37.

Ha kwukwara na ha achọpụtala ma weghachite ụgbọala ya dịka ha mechara ezigbo nnyocha.

Ihe ọzọ pụtara n'akụkọ ahụ bụ na ha sị na e gbukwara otu nwoke bụ Ezekiel Edoga bụ enyi dọkịta ahụ ya na ya bi n'ụlọ.

Akụkọ na-efegharị maka ọnwụ nwoke a kwuru na ọ bụ n'ụbọchị ọ na-akwado ịfepu gawa mba Amerịka ka ọnwụ bịara ya.

Ha kwukwara na asụkasịrị ya na enyi ya ahụ mma mgbe achọtara ozu ha n'ụlọ Obialor n'ebe akpọrọ 'Games Village' n'Abuja.

Ndị ziputara ozi ọnwụ a bokwara onye ya na dọkịta a bi dịka onye kpara mkpa mkpa a mana ndị uweojii sị na ọ bụ otu ndị omekome ka hanwa na-eche mere ihe a.