Southeast insecurity: Ihe mere Ohanaeze Ndigbo jiri nye ndị gọvanọ izuụka abụọ ihibe Ebubeagụ na steeti ha

Mgbe e biputara ya

Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor ekwuola ka ehibe atụmatụ nchekwa Ebubeagụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile tupu afọ 2021 abịa na ngwụcha.

Ọ sị na ihe a bụ imezu nkwa gọvanọ ndị a kwere, nke ọ sị ga-enye nka nke ukwuu banyere nchekwa mmadụ na akụnaụba ọha.

Maazị Obiozor kwuru nke a dịka ọ na-agbasa ozi Ekeresimasị ya n'Owere n'ụbọchi Fraịde.

O kwuru na afọ 2021 tarala ụwa dum ma ndị Igbo akpụ dịka ndi ntoroọbịa malitere inye nsogbu.

Ọ sịkwa na mmekpa ahụ ndị ọrụ nchekwa sokwa na nsogbu zutere Ọwụwa Anyanwụ n'afọ 2021.

Mana, banyere nchekwa adịghị etu o siri kwesi na mpaghara ahụ, Maazị Obiozor ihe amalitela ịgbanwe ugbua.

Ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchi butere nchekwa adịghị n'Ọwụwa Anyanwụ

Obiozor sịrị na ọ bụ site na ndọrọndọrọ ọchịchi ka mkpa mkpa na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ siri malite. Ọ sịrị na nke a bụ iji meghara ihu ndị Ọwụwa Anyanwụ na nke ndị Naịjirịa.

Dịka o siri kwuo: "Nchekwa adịghị bu ajọ ụta a gbara Ọwụwa Anyanwụ. Anyị bụ Ohaneze na-ekwu na ndị kpara nkata a adara ajọ ada.

Okwu maka inye Ọwụwa Anyanwụ ọchịchị Naịjirịanwonw

Dịka onyeisi Ohanaeze Ndigbo siri kọwa, atụmatụ nchekwa adịghị etu o siri kwesi abụghị ihe ga-eme ka aghara inye ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ohere ịchị mba ahụ dịka onyeisiala.

Ohanaeze Ndigbo na ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa na-ekwu na afọ 2023 bụ oge ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwesiri iwepute onye ga-azọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa n'okpuru patị abụọ seputere isi ọfụma.

Mana ruo ụgbụa, pati "All Progressives Congress" (apc) na pati "Peoples Democratic Party" (PDP) ekwubeghị ma ha a ga-enye ohere.

Patị APC ekwuola na ha ga-enye ndị ndịda Naịjirịa ohere ịzọ ọkwa ahụ, mana PDP ekwubeghị mpaghara ọbụla ma ncha.

Obiozor siri na ndị Igbo kwenyere n'ịdị n'otu Naịjirịa mana ọ bụghị ịdị n'otu nke ga-eme ụfọdụ eze ma mee ụfọdụ ndị odibo.

Ọhanaeze sị na atụmatu ime ndị Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa ka obi dị ha mma ma mezie ọnọdụ Naịjirịa mere e jiri nye ha ohere ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 1999.

Ugbua, dịka Maazị Obiozor siri kwuo, inye onye Ọwụwa Anyanwụ ohere ịbụrụ onyeisiala Naịjirịa ga-eme ka ndị Igbo kwenyere na ha kwụsị ike na Naịjirịa.

Ihe ndị ọzọ Obiozor metụrụ ọnụ bụ mkpa mkpa ọgwụike a na-akpọ mkpụrụ mmiri na akpa n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọ dọrọ ndị ntoroọbịa aka na ntị banyere itinye aka n'ụdịrị ihe a.

Ọ sịkwa na aka ọgwụike a dị n'ọgbaghara na-ada na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na nso nso a.